Leviticus 14 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis, sị, 2 “Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja. 3 Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala, 4 onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha. 5 Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja. 6 Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ. 7 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa. 8 “Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee. 9 Nʼụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụchapụ ntutu isi ya, na afụọnụ ya, na ikuanya ya, na ajị ndị ọzọ dị ya nʼahụ. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya niile. Mgbe ahụ, a ga-agụ ya nʼonye dị ọcha. 10 “Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ. 11 Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. 12 “Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka aja mfufe. 13 Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ. 14 Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya. 15 Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya, 16 ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị. 17 Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee. 18 Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị. 19 “Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ, 20 were ya na onyinye mkpụrụ ọka chụọrọ onye ahụ aja, maka ikpuchiri ya mmehie ya. Mgbe ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dị ọcha. 21 “Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye onye na-enweghị ike iweta ihe ndị a, ha aghaghị iwere otu nwa ebule dịka aja ikpe ọmụma nke a ga-efufe nʼihi aja ikpuchi mmehie ha, Ọ ga-ewetakwa iko ọka a kwọrọ nke ọma asaa maọbụ ihe ọtụtụ efaa a gwara mmanụ oliv dịka aja mkpụrụ ọka, ya na otu iko mmanụ. 22 Ọ ga-ewetakwa nduru abụọ maọbụ kpalakwukwu abụọ, nke ọbụla o nwere ike iweta. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ. 23 “Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha. 24 Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye ONYENWE ANYỊ. 25 Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya. 26 Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya, 27 ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu ONYENWE ANYỊ. 28 Ọ ga-etekwa ụfọdụ mmanụ ahụ dị nʼaka ya nʼebe ndị ahụ o tere ọbara ikpe ọmụma ahụ, nke bụ nʼọnụ ntị onye ahụ nke a na-eme ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya. 29 Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu ONYENWE ANYỊ. 30 Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja. 31 Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ, ha na aja mkpụrụ ọka. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu ONYENWE ANYỊ, bụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha.” 32 Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha. 33 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn okwu sị, 34 “Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe, 35 onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’ 36 Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ. 37 Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya, 38 onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa. 39 Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ, 40 onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. 41 Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. 42 A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ. 43 “Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya, 44 onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe. 45 Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. 46 “Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi. 47 Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya. 48 “Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala. 49 Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha. 50 Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja. 51 Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa. 52 Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha. 53 Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.” 54 Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ, 55 na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ, 56 maọbụ etuto, maọbụ ntụpọ, maọbụ ọnya. 57 Iwu ndị a ga-enye aka ịmata ihe rụrụ arụ maọbụ ihe na-adịghị ọcha.Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta na ọrịa na-efe efe.

In Other Versions

Leviticus 14 in the ANGEFD

Leviticus 14 in the ANTPNG2D

Leviticus 14 in the AS21

Leviticus 14 in the BAGH

Leviticus 14 in the BBPNG

Leviticus 14 in the BBT1E

Leviticus 14 in the BDS

Leviticus 14 in the BEV

Leviticus 14 in the BHAD

Leviticus 14 in the BIB

Leviticus 14 in the BLPT

Leviticus 14 in the BNT

Leviticus 14 in the BNTABOOT

Leviticus 14 in the BNTLV

Leviticus 14 in the BOATCB

Leviticus 14 in the BOATCB2

Leviticus 14 in the BOBCV

Leviticus 14 in the BOCNT

Leviticus 14 in the BOECS

Leviticus 14 in the BOGWICC

Leviticus 14 in the BOHCB

Leviticus 14 in the BOHCV

Leviticus 14 in the BOHLNT

Leviticus 14 in the BOHNTLTAL

Leviticus 14 in the BOILNTAP

Leviticus 14 in the BOITCV

Leviticus 14 in the BOKCV

Leviticus 14 in the BOKCV2

Leviticus 14 in the BOKHWOG

Leviticus 14 in the BOKSSV

Leviticus 14 in the BOLCB

Leviticus 14 in the BOLCB2

Leviticus 14 in the BOMCV

Leviticus 14 in the BONAV

Leviticus 14 in the BONCB

Leviticus 14 in the BONLT

Leviticus 14 in the BONUT2

Leviticus 14 in the BOPLNT

Leviticus 14 in the BOSCB

Leviticus 14 in the BOSNC

Leviticus 14 in the BOTLNT

Leviticus 14 in the BOVCB

Leviticus 14 in the BOYCB

Leviticus 14 in the BPBB

Leviticus 14 in the BPH

Leviticus 14 in the BSB

Leviticus 14 in the CCB

Leviticus 14 in the CUV

Leviticus 14 in the CUVS

Leviticus 14 in the DBT

Leviticus 14 in the DGDNT

Leviticus 14 in the DHNT

Leviticus 14 in the DNT

Leviticus 14 in the ELBE

Leviticus 14 in the EMTV

Leviticus 14 in the ESV

Leviticus 14 in the FBV

Leviticus 14 in the FEB

Leviticus 14 in the GGMNT

Leviticus 14 in the GNT

Leviticus 14 in the HARY

Leviticus 14 in the HNT

Leviticus 14 in the IRVA

Leviticus 14 in the IRVB

Leviticus 14 in the IRVG

Leviticus 14 in the IRVH

Leviticus 14 in the IRVK

Leviticus 14 in the IRVM

Leviticus 14 in the IRVM2

Leviticus 14 in the IRVO

Leviticus 14 in the IRVP

Leviticus 14 in the IRVT

Leviticus 14 in the IRVT2

Leviticus 14 in the IRVU

Leviticus 14 in the ISVN

Leviticus 14 in the JSNT

Leviticus 14 in the KAPI

Leviticus 14 in the KBT1ETNIK

Leviticus 14 in the KBV

Leviticus 14 in the KJV

Leviticus 14 in the KNFD

Leviticus 14 in the LBA

Leviticus 14 in the LBLA

Leviticus 14 in the LNT

Leviticus 14 in the LSV

Leviticus 14 in the MAAL

Leviticus 14 in the MBV

Leviticus 14 in the MBV2

Leviticus 14 in the MHNT

Leviticus 14 in the MKNFD

Leviticus 14 in the MNG

Leviticus 14 in the MNT

Leviticus 14 in the MNT2

Leviticus 14 in the MRS1T

Leviticus 14 in the NAA

Leviticus 14 in the NASB

Leviticus 14 in the NBLA

Leviticus 14 in the NBS

Leviticus 14 in the NBVTP

Leviticus 14 in the NET2

Leviticus 14 in the NIV11

Leviticus 14 in the NNT

Leviticus 14 in the NNT2

Leviticus 14 in the NNT3

Leviticus 14 in the PDDPT

Leviticus 14 in the PFNT

Leviticus 14 in the RMNT

Leviticus 14 in the SBIAS

Leviticus 14 in the SBIBS

Leviticus 14 in the SBIBS2

Leviticus 14 in the SBICS

Leviticus 14 in the SBIDS

Leviticus 14 in the SBIGS

Leviticus 14 in the SBIHS

Leviticus 14 in the SBIIS

Leviticus 14 in the SBIIS2

Leviticus 14 in the SBIIS3

Leviticus 14 in the SBIKS

Leviticus 14 in the SBIKS2

Leviticus 14 in the SBIMS

Leviticus 14 in the SBIOS

Leviticus 14 in the SBIPS

Leviticus 14 in the SBISS

Leviticus 14 in the SBITS

Leviticus 14 in the SBITS2

Leviticus 14 in the SBITS3

Leviticus 14 in the SBITS4

Leviticus 14 in the SBIUS

Leviticus 14 in the SBIVS

Leviticus 14 in the SBT

Leviticus 14 in the SBT1E

Leviticus 14 in the SCHL

Leviticus 14 in the SNT

Leviticus 14 in the SUSU

Leviticus 14 in the SUSU2

Leviticus 14 in the SYNO

Leviticus 14 in the TBIAOTANT

Leviticus 14 in the TBT1E

Leviticus 14 in the TBT1E2

Leviticus 14 in the TFTIP

Leviticus 14 in the TFTU

Leviticus 14 in the TGNTATF3T

Leviticus 14 in the THAI

Leviticus 14 in the TNFD

Leviticus 14 in the TNT

Leviticus 14 in the TNTIK

Leviticus 14 in the TNTIL

Leviticus 14 in the TNTIN

Leviticus 14 in the TNTIP

Leviticus 14 in the TNTIZ

Leviticus 14 in the TOMA

Leviticus 14 in the TTENT

Leviticus 14 in the UBG

Leviticus 14 in the UGV

Leviticus 14 in the UGV2

Leviticus 14 in the UGV3

Leviticus 14 in the VBL

Leviticus 14 in the VDCC

Leviticus 14 in the YALU

Leviticus 14 in the YAPE

Leviticus 14 in the YBVTP

Leviticus 14 in the ZBP