1 Samuel 2 (BOICB)

1 Mgbe ahụ Hana kpere ekpere sị:“Obi m na-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYỊ;nʼime ONYENWE ANYỊ ka e buliri mpi m elu.Ọnụ m na-anya isi megide ndị iro m,nʼihi na-enwere m mmasị na nzọpụta gị. 2 “O nweghị onye dị nsọ dịka ONYENWE ANYỊ;o nweghị onye dị karịa gị,o nweghị nkume ọzọ yiri Chineke anyị. 3 “Anọgidela na-ekwu okwu site na mpako,ekwekwala ka ọnụ gị kwupụta okwu nganga.Nʼihi na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke maara ihe niile,ya bụ onye na-anwale ọrụ niile. 4 “Ụta ndị na-ebu agha agbajielama ndị ahụ dara mba ka e nyere ike. 5 Ndị na-eriju afọ e meela onwe ha ndị ọrụ ngo maka nri,ma ndị na-adịghị eriju afọ na mbụ aghọọla ndị agụụ adịghị agụkwa.Nwanyị aga amụtala ụmụ asaama nwanyị ahụ mụrụ ọtụtụ ụmụ adịghị amụtakwa. 6 “ONYENWE ANYỊ na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ,ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. 7 ONYENWE ANYỊ na-ezite ụbịam na akụnụba;ọ na-eweda nʼala, ma na-ebulikwa elu. 8 Ọ na-esite na ntụ welite onye ogbenyena-ebuli ndị mkpa na-akpa site nʼikpo ntụ.Ọ na-eme ka ha soro ụmụ eze nọdụ,na-emekwa ka ha keta ocheeze nsọpụrụ. “Nʼihi na ntọala ụwa bụ nke ONYENWE ANYỊnʼelu ya ka ọ dọkwasịrị ụwa. 9 Ọ ga-echebe ụkwụ ndị nsọ yama ndị ajọ omume ka ọ ga-eme ka ha dere duu nʼime ọchịchịrị. “Ọ bụghị site nʼịdị ike ka mmeri si abịa. 10 Ndị ahụ na-ebuli onwe ha imegide ONYENWE ANYỊ ka a ga-etipịa.Onye kachasị ihe niile elu ga-ebigbọ site nʼeluigwe megide ha. ONYENWE ANYỊ ga-ekpe nsọtụ niile nke ụwa ikpe. “Ọ ga-enye eze ya ikebulikwaa ịdị ike nke onye ya e tere mmanụ.” 11 Mgbe ahụ, Elkena na Hana laghachiri Rema, ma ha hapụrụ Samuel nʼebe ahụ. Nwata ahụ ghọrọ onyeozi ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ọ nọ na-enyere Elayị onye nchụaja aka. 12 Ụmụ Elayị bụ ndị omume ha jọgburu onwe ya; ha na-elelị ONYENWE ANYỊ anya. 13 Dịka mmeso ndị nchụaja nʼebe ndị mmadụ si dị: mgbe onye ọbụla bịara ịchụ aja, onyeozi onye nchụaja na-abịa mgbe a na-esi anụ, jiri ndụdụ nwere eze atọ nʼaka ya. 14 Ọ na-adụnye ya nʼime efere anụ maọbụ ite, maọbụ iko e ji esi anụ. Ihe ọbụla ndụdụ ahụ dụpụtara ka onye nchụaja na-ewere. Otu a ka ha si emeso ndị Izrel niile na-abịa na Shaịlo. 15 Mgbe ụfọdụ, tupu e suree abụba anụ nʼebe ịchụ aja, ndị ozi onye nchụaja na-abịa gwa onye wetara anụ ịchụ aja sị ya, “Nye onye nchụaja anụ ndụ nke ọ ga-ahụ nʼọkụ, nʼihi na ọ chọghị iri anụ e siri esi, kama anụ ndụ ka ọ chọrọ.” 16 Ọ bụrụ na onye ji anụ ahụ bịa ịchụ aja agwa onyeozi ahụ okwu sị, “Chere ka anyị buru ụzọ suo abụba ndị a ọkụ tupu i were ihe ị chọrọ,” onyeozi ahụ na-aza sị, “Nye m anụ ahụ ugbu a, ọ bụrụ na i nyeghị m ya aga m eji ike were ya.” 17 Mmehie ụmụ okorobịa ndị a na-eme dị ukwuu nʼanya ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ha na-eleda onyinye a na-ewetara ONYENWE ANYỊ anya. 18 Nʼoge a, Samuel na-agakwa ozi ya nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ọ bụ ezie na ọ bụ naanị nwantakịrị, ọ na-eyi akwa ọcha efọọd dịka ndị nchụaja. 19 Afọ ọbụla, nne ya na-akwara ya uwe mwụda, nke ọ na-ewetara ya mgbe ya na di ya bịara ịchụ aja. 20 Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka ONYENWE ANYỊ nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri ONYENWE ANYỊ.” 21 ONYENWE ANYỊ gosiri Hana amara. Ọ tụrụ ime mụta ụmụ ndị ikom atọ, na ụmụ ndị inyom abụọ. Ma Samuel tokwara nʼije ozi ya nʼihu ONYENWE ANYỊ. 22 Nʼoge a, Elayị abụrụla nnọọ agadi. Ọ nọkwa na-anụ ihe ọjọọ niile ụmụ ya ndị ikom na-eme ndị Izrel niile, ya na otu ha si edinakwuru ụmụ nwanyị na-eje ozi nʼọnụ ụzọ ebe ịchụ aja ụlọ nzute. 23 Ya mere, Elayị gwara ụmụ ya sị, “Anụla m site nʼọnụ ndị ONYENWE ANYỊ, banyere ihe ọjọọ niile dị iche iche unu na-eme. Gịnị mere unu ji na-eme ihe ọjọọ dị otu a? 24 Ọ bụghị akụkọ ọma ka m na-anụ site nʼọnụ ndị ONYENWE ANYỊ banyere unu. 25 Ọ bụrụ na mmadụ emehie megide mmadụ, Chineke nwere ike gbooro ya ọgụ. Ma ọ bụrụ na mmadụ emehie megide ONYENWE ANYỊ, onye ga-egboro ya ọgụ?” Ma ụmụ ya ndị ikom egeghị nna ha ntị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-akwado ịla ha nʼiyi. 26 Nwata ahụ bụ Samuel na-eto, na-agba dimkpa, bụrụkwa onye ihe ya dị ONYENWE ANYỊ na mmadụ mma. 27 Otu onye nke Chineke bịara gwa Elayị okwu sị ya, “Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru: Ọ bụ na m ezipụtaghị ike m nʼụzọ pụtara ihe mgbe nna nna gị ha bụ ohu nʼala Ijipt nʼokpuru Fero? 28 Ahọpụtara m nna nna unu ochie site nʼetiti ebo niile nke Izrel mee ya ka ọ bụrụ onye nchụaja m, ka ọ chụọ aja nʼebe ịchụ aja m, isure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na iyi uwe efọọd ndị nchụaja nʼihu m. Enyere m ezinaụlọ nna nna gị onyinye niile Izrel ji chụọ aja nsure ọkụ. 29 Gịnị mere unu ji na-elelị aja a na-achụrụ m, na onyinye a na-ewetara m nʼusoro dịka m si nye ya nʼiwu anya? Gịnị mere i ji na-asọpụrụ ụmụ gị karịa m, ime onwe unu ka unu gbaa abụba site nʼidebere onwe unu akụkụ kachasị mma nke onyinye niile ụmụ Izrel, ndị m, na-ewetara m. 30 “Nʼihi ya, otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, kwupụtara, sị, ‘Ekwere m nkwa na ndị ezinaụlọ gị na nke nna gị ga-eje ozi nʼihu m ruo mgbe ebighị ebi,’ ma ugbu a, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya, ‘Ọ gaghị adịkwa otu a nʼebe m nọ! Nʼihi na ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ, ma ndị niile na-eleda m anya, ka a ga-akpọ ihe efu. 31 Oge na-abịa mgbe m ga-ebipụ ike gị na ike ezinaụlọ nna gị, wezuga ha ka nwoke ọbụla nʼezinaụlọ gị hapụ ito ghọọ agadi. 32 Ị ga-ahụ mkpagbu nʼebe obibi m; a ga-emere Izrel ihe ọma nke ga-eme ka i nwee anya ụfụ, ma ọ dịghị onye ga-eme agadi nʼezinaụlọ gị. 33 Onye ọbụla nʼime unu nke m na-ebipụghị site nʼebe ịchụ aja m ga-adị ndụ naanị nʼọnọdụ anya mmiri akwa nke ga-ekpuchi ya anya, na iru ụjụ nke obi. Ụmụ ụmụ gị niile ga-anwụ tupu ha eruo agadi. 34 “ ‘Ihe ga-adakwasị ụmụ gị ndị ikom, bụ Hofni na Finehaz, ga-abụrụ gị ihe ama. Ha abụọ ga-anwụ nʼotu ụbọchị. 35 Aga m akpọlite nye onwe m, onye nchụaja kwesiri ntụkwasị obi, onye ga-eme ihe dị m nʼuche na nʼobi. Aga m eme ka ezinaụlọ ya guzosie ike. O ga-eje ozi nʼihu Onye m e tere mmanụ oge niile. 36 Mgbe ahụ, ndị niile fọdụrụ nʼezinaụlọ gị ga-abịa kpọọ isiala nye ya, rịọọ ya ego na ihe oriri. Ha ga-asị, “Biko, nyetụ m ọrụ m ga-arụ nʼetiti ndị nchụaja, ka m hụ ihe m ga-eri.” ’ ”

In Other Versions

1 Samuel 2 in the ANGEFD

1 Samuel 2 in the ANTPNG2D

1 Samuel 2 in the AS21

1 Samuel 2 in the BAGH

1 Samuel 2 in the BBPNG

1 Samuel 2 in the BBT1E

1 Samuel 2 in the BDS

1 Samuel 2 in the BEV

1 Samuel 2 in the BHAD

1 Samuel 2 in the BIB

1 Samuel 2 in the BLPT

1 Samuel 2 in the BNT

1 Samuel 2 in the BNTABOOT

1 Samuel 2 in the BNTLV

1 Samuel 2 in the BOATCB

1 Samuel 2 in the BOATCB2

1 Samuel 2 in the BOBCV

1 Samuel 2 in the BOCNT

1 Samuel 2 in the BOECS

1 Samuel 2 in the BOGWICC

1 Samuel 2 in the BOHCB

1 Samuel 2 in the BOHCV

1 Samuel 2 in the BOHLNT

1 Samuel 2 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 2 in the BOILNTAP

1 Samuel 2 in the BOITCV

1 Samuel 2 in the BOKCV

1 Samuel 2 in the BOKCV2

1 Samuel 2 in the BOKHWOG

1 Samuel 2 in the BOKSSV

1 Samuel 2 in the BOLCB

1 Samuel 2 in the BOLCB2

1 Samuel 2 in the BOMCV

1 Samuel 2 in the BONAV

1 Samuel 2 in the BONCB

1 Samuel 2 in the BONLT

1 Samuel 2 in the BONUT2

1 Samuel 2 in the BOPLNT

1 Samuel 2 in the BOSCB

1 Samuel 2 in the BOSNC

1 Samuel 2 in the BOTLNT

1 Samuel 2 in the BOVCB

1 Samuel 2 in the BOYCB

1 Samuel 2 in the BPBB

1 Samuel 2 in the BPH

1 Samuel 2 in the BSB

1 Samuel 2 in the CCB

1 Samuel 2 in the CUV

1 Samuel 2 in the CUVS

1 Samuel 2 in the DBT

1 Samuel 2 in the DGDNT

1 Samuel 2 in the DHNT

1 Samuel 2 in the DNT

1 Samuel 2 in the ELBE

1 Samuel 2 in the EMTV

1 Samuel 2 in the ESV

1 Samuel 2 in the FBV

1 Samuel 2 in the FEB

1 Samuel 2 in the GGMNT

1 Samuel 2 in the GNT

1 Samuel 2 in the HARY

1 Samuel 2 in the HNT

1 Samuel 2 in the IRVA

1 Samuel 2 in the IRVB

1 Samuel 2 in the IRVG

1 Samuel 2 in the IRVH

1 Samuel 2 in the IRVK

1 Samuel 2 in the IRVM

1 Samuel 2 in the IRVM2

1 Samuel 2 in the IRVO

1 Samuel 2 in the IRVP

1 Samuel 2 in the IRVT

1 Samuel 2 in the IRVT2

1 Samuel 2 in the IRVU

1 Samuel 2 in the ISVN

1 Samuel 2 in the JSNT

1 Samuel 2 in the KAPI

1 Samuel 2 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 2 in the KBV

1 Samuel 2 in the KJV

1 Samuel 2 in the KNFD

1 Samuel 2 in the LBA

1 Samuel 2 in the LBLA

1 Samuel 2 in the LNT

1 Samuel 2 in the LSV

1 Samuel 2 in the MAAL

1 Samuel 2 in the MBV

1 Samuel 2 in the MBV2

1 Samuel 2 in the MHNT

1 Samuel 2 in the MKNFD

1 Samuel 2 in the MNG

1 Samuel 2 in the MNT

1 Samuel 2 in the MNT2

1 Samuel 2 in the MRS1T

1 Samuel 2 in the NAA

1 Samuel 2 in the NASB

1 Samuel 2 in the NBLA

1 Samuel 2 in the NBS

1 Samuel 2 in the NBVTP

1 Samuel 2 in the NET2

1 Samuel 2 in the NIV11

1 Samuel 2 in the NNT

1 Samuel 2 in the NNT2

1 Samuel 2 in the NNT3

1 Samuel 2 in the PDDPT

1 Samuel 2 in the PFNT

1 Samuel 2 in the RMNT

1 Samuel 2 in the SBIAS

1 Samuel 2 in the SBIBS

1 Samuel 2 in the SBIBS2

1 Samuel 2 in the SBICS

1 Samuel 2 in the SBIDS

1 Samuel 2 in the SBIGS

1 Samuel 2 in the SBIHS

1 Samuel 2 in the SBIIS

1 Samuel 2 in the SBIIS2

1 Samuel 2 in the SBIIS3

1 Samuel 2 in the SBIKS

1 Samuel 2 in the SBIKS2

1 Samuel 2 in the SBIMS

1 Samuel 2 in the SBIOS

1 Samuel 2 in the SBIPS

1 Samuel 2 in the SBISS

1 Samuel 2 in the SBITS

1 Samuel 2 in the SBITS2

1 Samuel 2 in the SBITS3

1 Samuel 2 in the SBITS4

1 Samuel 2 in the SBIUS

1 Samuel 2 in the SBIVS

1 Samuel 2 in the SBT

1 Samuel 2 in the SBT1E

1 Samuel 2 in the SCHL

1 Samuel 2 in the SNT

1 Samuel 2 in the SUSU

1 Samuel 2 in the SUSU2

1 Samuel 2 in the SYNO

1 Samuel 2 in the TBIAOTANT

1 Samuel 2 in the TBT1E

1 Samuel 2 in the TBT1E2

1 Samuel 2 in the TFTIP

1 Samuel 2 in the TFTU

1 Samuel 2 in the TGNTATF3T

1 Samuel 2 in the THAI

1 Samuel 2 in the TNFD

1 Samuel 2 in the TNT

1 Samuel 2 in the TNTIK

1 Samuel 2 in the TNTIL

1 Samuel 2 in the TNTIN

1 Samuel 2 in the TNTIP

1 Samuel 2 in the TNTIZ

1 Samuel 2 in the TOMA

1 Samuel 2 in the TTENT

1 Samuel 2 in the UBG

1 Samuel 2 in the UGV

1 Samuel 2 in the UGV2

1 Samuel 2 in the UGV3

1 Samuel 2 in the VBL

1 Samuel 2 in the VDCC

1 Samuel 2 in the YALU

1 Samuel 2 in the YAPE

1 Samuel 2 in the YBVTP

1 Samuel 2 in the ZBP