2 Kings 25 (BOICB)

1 Nʼafọ nke itoolu nke ọchịchị ya, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, Nebukadneza, eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ọ mara ụlọ ikwu nʼazụ obodo ahụ, wukwaa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ. 2 Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya. 3 Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri. 4 Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Kaldịa nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba. 5 Ma ndị agha Kaldịa chụsoro eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya, 6 e jide ya.Ha kpụgara ya eze Babilọn, nʼobodo Ribla, ebe a nọ maa ya ikpe. 7 Ha gburu ụmụ ndị ikom Zedekaya nʼihu ya. Ha ghụpụrụ anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya gaa Babilọn. 8 Nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke ise nke afọ iri na itoolu nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche, onyeisi nʼọrụ eze Babilọn, bịarutere Jerusalem. 9 O sunyere ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ ọkụ, ụlọeze na ụlọ niile dị na Jerusalem, ụlọ ọbụla bụ nke dị mkpa ka o surere ọkụ 10 Ndị agha Kaldịa niile bụ ndị nọ nʼokpuru onyeisi ndị nche eze kwaturu mgbidi niile gbara Jerusalem gburugburu. 11 Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, buuru ụfọdụ mmadụ ndị fọdụrụ nʼobodo, na ndị niile fọdụkwara, ha na ndị ọzọ ahụ ji aka ha gbakwuru eze bulaa ha Babilọn, ka ha ga biri nʼala ọzọ. 12 Ma ọchịagha ahụ, hapụrụ ụfọdụ na ndị ahụ bụ nnọọ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ka ha na-elekọta ubi vaịnị niile a gbara ogige na ala ubi niile. 13 Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, buru bronz ndị ahụ bulaa Babilọn. 14 Ha chịkọọrọ ite niile, na shọvel niile, na ihe ịkpakepụ ọkụ, na ngaji ukwu niile na ngwa bronz niile nke e ji eje ozi nʼime ụlọnsọ ahụ. 15 Ọchịagha ndị nche eze, chịrị ihe ịgụnye ọkụ niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ya bụ ihe ndị ahụ niile e ji ọlaedo a nụchara anụcha maọbụ ọlaọcha kpụọ. 16 O bukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Ha karịrị ihe a ga-eji ihe ọtụtụ tụọ. 17 Ị dị elu nke otu nʼime ogidi abụọ ndị a bụ mita asatọ na ụma nʼọtụtụ. Isi bronz nke e kpukwasịrị nʼotu ogidi dị otu mita na ọkara nʼịdị elu. Ọ bụkwa ihe yiri mkpụrụ pomegranet e ji bronz kpaa, ka e ji chọọ ya mma gburugburu ya niile. Ogidi nke abụọ nwekwara pomegranet, yiri ibe ya. 18 Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata. 19 O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom ise na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii ndị ọrụ mmanye, ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ. 20 Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla. 21 Nʼebe ahụ, na Ribla dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile.Ya mere, a dọọrọ Juda nʼagha, mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. 22 Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa nwa Shefan, ka ọ bụrụ onye na-elekọta ndị fọdụrụ na Juda, 23 Mgbe ndịisi agha na ndị ikom ha nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya onye na-achị ala ahụ, ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ, Ishmel nwa Netanaya, Johanan nwa Kariya, Seraya nwa Tanhumet, onye Netofa, na Jaazanaya nwa onye Maaka, na ndị ikom ha. 24 Gedaliya ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha, sị, “Unu atụla egwu nʼihi ndịisi ọrụ Babilọn. Birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.” 25 Ma nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye ya onwe ya si nʼagbụrụ eze, duuru mmadụ iri bịa Mizpa, tigbuo Gedaliya, na ndị ikom Juda na ndị Kaldịa niile, bụ ndị ya na ha nọ. 26 Nke a mere ka ndị Juda niile, site nʼonye nta ruo nʼonye ukwu, ha na ndịisi agha ndị ahụ biliri gaa Ijipt, nʼihi na ha tụrụ ndị Kaldịa egwu. 27 Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn, o mere ka Jehoiakin si nʼụlọ mkpọrọ pụta nwere onwe ya. Ọ bụ nʼụbọchị nke iri abụọ na asaa nke ọnwa iri na abụọ ka o mere nke a. 28 Ọ gwara ya okwu ọma, nye ya oche ọnọdụ ya dị elu karịa nke ndị eze ndị ọzọ ya na ha nọ na Babilọn. 29 Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri. 30 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ.

In Other Versions

2 Kings 25 in the ANGEFD

2 Kings 25 in the ANTPNG2D

2 Kings 25 in the AS21

2 Kings 25 in the BAGH

2 Kings 25 in the BBPNG

2 Kings 25 in the BBT1E

2 Kings 25 in the BDS

2 Kings 25 in the BEV

2 Kings 25 in the BHAD

2 Kings 25 in the BIB

2 Kings 25 in the BLPT

2 Kings 25 in the BNT

2 Kings 25 in the BNTABOOT

2 Kings 25 in the BNTLV

2 Kings 25 in the BOATCB

2 Kings 25 in the BOATCB2

2 Kings 25 in the BOBCV

2 Kings 25 in the BOCNT

2 Kings 25 in the BOECS

2 Kings 25 in the BOGWICC

2 Kings 25 in the BOHCB

2 Kings 25 in the BOHCV

2 Kings 25 in the BOHLNT

2 Kings 25 in the BOHNTLTAL

2 Kings 25 in the BOILNTAP

2 Kings 25 in the BOITCV

2 Kings 25 in the BOKCV

2 Kings 25 in the BOKCV2

2 Kings 25 in the BOKHWOG

2 Kings 25 in the BOKSSV

2 Kings 25 in the BOLCB

2 Kings 25 in the BOLCB2

2 Kings 25 in the BOMCV

2 Kings 25 in the BONAV

2 Kings 25 in the BONCB

2 Kings 25 in the BONLT

2 Kings 25 in the BONUT2

2 Kings 25 in the BOPLNT

2 Kings 25 in the BOSCB

2 Kings 25 in the BOSNC

2 Kings 25 in the BOTLNT

2 Kings 25 in the BOVCB

2 Kings 25 in the BOYCB

2 Kings 25 in the BPBB

2 Kings 25 in the BPH

2 Kings 25 in the BSB

2 Kings 25 in the CCB

2 Kings 25 in the CUV

2 Kings 25 in the CUVS

2 Kings 25 in the DBT

2 Kings 25 in the DGDNT

2 Kings 25 in the DHNT

2 Kings 25 in the DNT

2 Kings 25 in the ELBE

2 Kings 25 in the EMTV

2 Kings 25 in the ESV

2 Kings 25 in the FBV

2 Kings 25 in the FEB

2 Kings 25 in the GGMNT

2 Kings 25 in the GNT

2 Kings 25 in the HARY

2 Kings 25 in the HNT

2 Kings 25 in the IRVA

2 Kings 25 in the IRVB

2 Kings 25 in the IRVG

2 Kings 25 in the IRVH

2 Kings 25 in the IRVK

2 Kings 25 in the IRVM

2 Kings 25 in the IRVM2

2 Kings 25 in the IRVO

2 Kings 25 in the IRVP

2 Kings 25 in the IRVT

2 Kings 25 in the IRVT2

2 Kings 25 in the IRVU

2 Kings 25 in the ISVN

2 Kings 25 in the JSNT

2 Kings 25 in the KAPI

2 Kings 25 in the KBT1ETNIK

2 Kings 25 in the KBV

2 Kings 25 in the KJV

2 Kings 25 in the KNFD

2 Kings 25 in the LBA

2 Kings 25 in the LBLA

2 Kings 25 in the LNT

2 Kings 25 in the LSV

2 Kings 25 in the MAAL

2 Kings 25 in the MBV

2 Kings 25 in the MBV2

2 Kings 25 in the MHNT

2 Kings 25 in the MKNFD

2 Kings 25 in the MNG

2 Kings 25 in the MNT

2 Kings 25 in the MNT2

2 Kings 25 in the MRS1T

2 Kings 25 in the NAA

2 Kings 25 in the NASB

2 Kings 25 in the NBLA

2 Kings 25 in the NBS

2 Kings 25 in the NBVTP

2 Kings 25 in the NET2

2 Kings 25 in the NIV11

2 Kings 25 in the NNT

2 Kings 25 in the NNT2

2 Kings 25 in the NNT3

2 Kings 25 in the PDDPT

2 Kings 25 in the PFNT

2 Kings 25 in the RMNT

2 Kings 25 in the SBIAS

2 Kings 25 in the SBIBS

2 Kings 25 in the SBIBS2

2 Kings 25 in the SBICS

2 Kings 25 in the SBIDS

2 Kings 25 in the SBIGS

2 Kings 25 in the SBIHS

2 Kings 25 in the SBIIS

2 Kings 25 in the SBIIS2

2 Kings 25 in the SBIIS3

2 Kings 25 in the SBIKS

2 Kings 25 in the SBIKS2

2 Kings 25 in the SBIMS

2 Kings 25 in the SBIOS

2 Kings 25 in the SBIPS

2 Kings 25 in the SBISS

2 Kings 25 in the SBITS

2 Kings 25 in the SBITS2

2 Kings 25 in the SBITS3

2 Kings 25 in the SBITS4

2 Kings 25 in the SBIUS

2 Kings 25 in the SBIVS

2 Kings 25 in the SBT

2 Kings 25 in the SBT1E

2 Kings 25 in the SCHL

2 Kings 25 in the SNT

2 Kings 25 in the SUSU

2 Kings 25 in the SUSU2

2 Kings 25 in the SYNO

2 Kings 25 in the TBIAOTANT

2 Kings 25 in the TBT1E

2 Kings 25 in the TBT1E2

2 Kings 25 in the TFTIP

2 Kings 25 in the TFTU

2 Kings 25 in the TGNTATF3T

2 Kings 25 in the THAI

2 Kings 25 in the TNFD

2 Kings 25 in the TNT

2 Kings 25 in the TNTIK

2 Kings 25 in the TNTIL

2 Kings 25 in the TNTIN

2 Kings 25 in the TNTIP

2 Kings 25 in the TNTIZ

2 Kings 25 in the TOMA

2 Kings 25 in the TTENT

2 Kings 25 in the UBG

2 Kings 25 in the UGV

2 Kings 25 in the UGV2

2 Kings 25 in the UGV3

2 Kings 25 in the VBL

2 Kings 25 in the VDCC

2 Kings 25 in the YALU

2 Kings 25 in the YAPE

2 Kings 25 in the YBVTP

2 Kings 25 in the ZBP