Job 26 (BOICB)
1 Mgbe ahụ, Job zaghachiri: 2 “Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka!Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị! 3 Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe!Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara. 4 Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a?Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu? 5 “Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu,ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya. 6 Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke;mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. 7 Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu.O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya. 8 Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii,ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa. 9 Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya,na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya, 10 O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri,ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị. 11 Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji,tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya. 12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri;ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab. 13 Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma;aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ. 14 Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya;lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya!Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?”