Numbers 25 (BOICB)
1 Mgbe Izrel bi na Shitim, ndị ikom ha malitere isoro ndị inyom Moab na-akwa iko. 2 Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile. 3 Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa. Nke a mere ka iwe ONYENWE ANYỊ nwuru ọkụ megide ha. 4 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Duru ndị ndu ebo niile nke Izrel gbuo ha ma kwụnye ha nʼosisi nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼetiti ehihie, ka oke iwe ONYENWE ANYỊ dị ọkụ ghara ịbịakwasị ndị Izrel.” 5 Ya mere, Mosis sịrị ndị ọkaikpe Izrel, “Onye ọbụla nʼime unu aghaghị igbu ndị unu, bụ ndị jikọtara onwe ha na Baal nke Peoa.” 6 Mgbe ahụ, otu nwoke onye Izrel kpọbatara nʼime ụlọ ikwu otu nwanyị onye Midia, nʼihu Mosis na nzukọ Izrel niile, mgbe ha niile nọ na-akwa akwa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 7 Mgbe Finehaz na Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja hụrụ ihe a, ọ hapụrụ ọgbakọ Izrel. O were ùbe nʼaka ya, 8 soro nwoke ahụ baa nʼime ụlọ, ebe ya na nwaagbọghọ ahụ dina. Ọ mara ha ùbe ahụ, nke si nʼahụ nwoke ahụ gafee mikpuo nʼafọ nwaagbọghọ ahụ. Nke a mere ka ihe otiti ahụ na-emegide ndị Izrel kwụsị. 9 Ma tupu ihe otiti ahụ akwụsị, ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ruru iri puku abụọ na anọ (24,000) anwụọlarị. 10 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 11 “Finehaz nwa Elieza, nwa Erọn, onye nchụaja, emeela ka iwe m megide Izrel dajụọ. Nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi dịka mụ onwe m banyere idebe nsọpụrụ m nsọ nʼetiti ha, ka m ghara isite nʼịnụ ọkụ nke obi m bibie ha. 12 Ya mere, gwa ya, na m na-eme ka ọgbụgba ndụ udo m dịrị ya. 13 Ya na ụmụ ụmụ ya ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi nke ịrụ ọrụ nchụaja ga-adịrị, nʼihi na o nwere ịnụ ọkụ nʼobi banyere nsọpụrụ nke Chineke ya, si otu a chụọrọ ndị Izrel aja ikpuchi mmehie.” 14 Aha nwoke Izrel ahụ e gburu ya na nwanyị onye Midia ahụ bụ Zimri, nwa Salu, onyendu otu ezinaụlọ nʼebo Simiọn. 15 Aha nwanyị Midia ahụ e gburu bụ Kozbi, nwa nwanyị Zua, onye bụ otu nʼime ndịisi ezinaụlọ na Midia. 16 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 17 “Mesoo ndị Midia mmeso dịka ndị iro. Gbukwaa ha. 18 Nʼihi na ha mesoro unu mmeso dịka ndị iro mgbe ha ji ụzọ aghụghọ ghọgbuo unu nʼokwu Peoa, na nʼokwu Kozbi nwanne ha nwanyị, bụ nwa nwanyị otu nʼime ndịisi Midia, onye e gburu mgbe ihe otiti ahụ bịara nʼihi okwu Peoa.”
In Other Versions
Numbers 25 in the ANGEFD
Numbers 25 in the ANTPNG2D
Numbers 25 in the AS21
Numbers 25 in the BAGH
Numbers 25 in the BBPNG
Numbers 25 in the BBT1E
Numbers 25 in the BDS
Numbers 25 in the BEV
Numbers 25 in the BHAD
Numbers 25 in the BIB
Numbers 25 in the BLPT
Numbers 25 in the BNT
Numbers 25 in the BNTABOOT
Numbers 25 in the BNTLV
Numbers 25 in the BOATCB
Numbers 25 in the BOATCB2
Numbers 25 in the BOBCV
Numbers 25 in the BOCNT
Numbers 25 in the BOECS
Numbers 25 in the BOGWICC
Numbers 25 in the BOHCB
Numbers 25 in the BOHCV
Numbers 25 in the BOHLNT
Numbers 25 in the BOHNTLTAL
Numbers 25 in the BOILNTAP
Numbers 25 in the BOITCV
Numbers 25 in the BOKCV
Numbers 25 in the BOKCV2
Numbers 25 in the BOKHWOG
Numbers 25 in the BOKSSV
Numbers 25 in the BOLCB
Numbers 25 in the BOLCB2
Numbers 25 in the BOMCV
Numbers 25 in the BONAV
Numbers 25 in the BONCB
Numbers 25 in the BONLT
Numbers 25 in the BONUT2
Numbers 25 in the BOPLNT
Numbers 25 in the BOSCB
Numbers 25 in the BOSNC
Numbers 25 in the BOTLNT
Numbers 25 in the BOVCB
Numbers 25 in the BOYCB
Numbers 25 in the BPBB
Numbers 25 in the BPH
Numbers 25 in the BSB
Numbers 25 in the CCB
Numbers 25 in the CUV
Numbers 25 in the CUVS
Numbers 25 in the DBT
Numbers 25 in the DGDNT
Numbers 25 in the DHNT
Numbers 25 in the DNT
Numbers 25 in the ELBE
Numbers 25 in the EMTV
Numbers 25 in the ESV
Numbers 25 in the FBV
Numbers 25 in the FEB
Numbers 25 in the GGMNT
Numbers 25 in the GNT
Numbers 25 in the HARY
Numbers 25 in the HNT
Numbers 25 in the IRVA
Numbers 25 in the IRVB
Numbers 25 in the IRVG
Numbers 25 in the IRVH
Numbers 25 in the IRVK
Numbers 25 in the IRVM
Numbers 25 in the IRVM2
Numbers 25 in the IRVO
Numbers 25 in the IRVP
Numbers 25 in the IRVT
Numbers 25 in the IRVT2
Numbers 25 in the IRVU
Numbers 25 in the ISVN
Numbers 25 in the JSNT
Numbers 25 in the KAPI
Numbers 25 in the KBT1ETNIK
Numbers 25 in the KBV
Numbers 25 in the KJV
Numbers 25 in the KNFD
Numbers 25 in the LBA
Numbers 25 in the LBLA
Numbers 25 in the LNT
Numbers 25 in the LSV
Numbers 25 in the MAAL
Numbers 25 in the MBV
Numbers 25 in the MBV2
Numbers 25 in the MHNT
Numbers 25 in the MKNFD
Numbers 25 in the MNG
Numbers 25 in the MNT
Numbers 25 in the MNT2
Numbers 25 in the MRS1T
Numbers 25 in the NAA
Numbers 25 in the NASB
Numbers 25 in the NBLA
Numbers 25 in the NBS
Numbers 25 in the NBVTP
Numbers 25 in the NET2
Numbers 25 in the NIV11
Numbers 25 in the NNT
Numbers 25 in the NNT2
Numbers 25 in the NNT3
Numbers 25 in the PDDPT
Numbers 25 in the PFNT
Numbers 25 in the RMNT
Numbers 25 in the SBIAS
Numbers 25 in the SBIBS
Numbers 25 in the SBIBS2
Numbers 25 in the SBICS
Numbers 25 in the SBIDS
Numbers 25 in the SBIGS
Numbers 25 in the SBIHS
Numbers 25 in the SBIIS
Numbers 25 in the SBIIS2
Numbers 25 in the SBIIS3
Numbers 25 in the SBIKS
Numbers 25 in the SBIKS2
Numbers 25 in the SBIMS
Numbers 25 in the SBIOS
Numbers 25 in the SBIPS
Numbers 25 in the SBISS
Numbers 25 in the SBITS
Numbers 25 in the SBITS2
Numbers 25 in the SBITS3
Numbers 25 in the SBITS4
Numbers 25 in the SBIUS
Numbers 25 in the SBIVS
Numbers 25 in the SBT
Numbers 25 in the SBT1E
Numbers 25 in the SCHL
Numbers 25 in the SNT
Numbers 25 in the SUSU
Numbers 25 in the SUSU2
Numbers 25 in the SYNO
Numbers 25 in the TBIAOTANT
Numbers 25 in the TBT1E
Numbers 25 in the TBT1E2
Numbers 25 in the TFTIP
Numbers 25 in the TFTU
Numbers 25 in the TGNTATF3T
Numbers 25 in the THAI
Numbers 25 in the TNFD
Numbers 25 in the TNT
Numbers 25 in the TNTIK
Numbers 25 in the TNTIL
Numbers 25 in the TNTIN
Numbers 25 in the TNTIP
Numbers 25 in the TNTIZ
Numbers 25 in the TOMA
Numbers 25 in the TTENT
Numbers 25 in the UBG
Numbers 25 in the UGV
Numbers 25 in the UGV2
Numbers 25 in the UGV3
Numbers 25 in the VBL
Numbers 25 in the VDCC
Numbers 25 in the YALU
Numbers 25 in the YAPE
Numbers 25 in the YBVTP
Numbers 25 in the ZBP