1 Chronicles 12 (BOICB)

1 Ndị a bụ ndị ikom bịakwutere Devid na Ziklag, mgbe e si nʼihu Sọl nwa Kish chụpụ ya. (Ha so nʼime ndị ọka agha nyeere Devid aka ibu agha. 2 Ngwa agha ha bụ ụta, ha nwere ike iji aka nri maọbụ aka ekpe gbapụ àkụ maọbụ fee ebe; ndị a bụ ndị ikwu Sọl si nʼebo Benjamin.) 3 Onyeisi ha bụ Ahieza na Joash, bụ ụmụ Shema onye Gibea.Ndị ọzọ bụ, Jeziel na Pelet ụmụ Azmavet,Beraka, Jehu onye Anatot, 4 Ishmaya onye Gibiọn, dimkpa nʼetiti iri mmadụ atọ ndị ahụ, onye bụ onyendu iri mmadụ atọ ahụ,Jeremaya, Jahaziel, Johanan, Jozabad onye Gedera, 5 Eluzai, Jerimot, Bealia, Shemaraya, na Shefataya onye Haruf; 6 Elkena, Ishaya, Azarel, Joeza na Jashobeam, ndị Kora; 7 Juela na Zebadaya ụmụ Jeroham onye Gedoa. 8 Ndị a bụkwa dike nʼagha sitere nʼebo Gad gbasoo Devid nʼebe e wusiri ike ya dị nʼọzara. Ha bụkwa ndị ọka nʼiji ùbe na ọta alụ agha. Ha dịkwa gara gara dịka ele nʼelu ugwu, ihu ha dịkwa ka ihu ọdụm. 9 Eza, bụ onyeisi ha.Ọbadaya bụ onye na-eso ya, tupu Eliab esoro. 10 Onye nke anọ bụ Mishmana. Ndị ọzọ nʼusoro ha bụ, Jeremaya, 11 na Atai bụ nke isii, na Eliel bụ nke asaa, 12 na Johanan bụ nke asatọ, na Elzabad bụ nke itoolu, 13 na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu. 14 Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha. 15 Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. 16 Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike. 17 Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.” 18 Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya,“Anyị bụ ndị gị, Devid!Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi!Udo, udo ga-abụ nke gị,udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka,nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.”Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe. 19 Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.” 20 Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase. 21 Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha. 22 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke. 23 Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka ONYENWE ANYỊ kwuru. 24 Ndị sitere nʼebo Juda, ndị bu ọta na ùbe ha dị puku isii na narị asatọ. (6,800) 25 Ndị Simiọn a maara aha ha nʼibu agha dị puku asaa na otu narị. (7,100) 26 Ndị Livayị dị puku anọ na narị isii. (4,600), 27 tinye Jehoiada, onyendu nʼezinaụlọ Erọn na puku ndị ikom atọ na narị asaa (3,700), 28 na Zadọk, nwokorobịa bụ dike na dimkpa nʼagha, onyendu ndịisi agha iri abụọ na abụọ (22) ndị si nʼezinaụlọ ya. 29 Ụmụ Benjamin, ndị ikwu Sọl, dị puku atọ (3,000), nʼihi na nʼoge a, ọtụtụ ha nọnyeere Sọl. 30 Ụmụ Ifrem dị iri puku abụọ na narị asatọ (20,800), ndị dị ike nʼagha, ndị a makwaara aha ha nʼikwu ha. 31 Site nʼọkara ebo Manase, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ (18,000) ka a họpụtara ịga inyere Devid aka ịbụ eze. 32 Ụmụ Isaka; narị ndịisi abụọ (200), na ndị ha na-edu. Ndịisi a bụ ndị nwere nghọta oge ha nọ nʼime ya marakwa ihe Izrel kwesiri ime nʼoge ahụ. 33 Ụmụ Zebụlọn dị iri puku ise. (50,000) Ha enweghị obi abụọ ọbụla iso Devid. A zụkwara ha nʼiji ụdị ngwa agha ọbụla na-ebu agha. 34 Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku (1,000), tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa (37,000), ndị ji ùbe na ọta. 35 Ụmụ Dan dị iri puku abụọ na asatọ, na narị isii. (28,600) Ha bụkwa ndị agha jikeere ibu agha. 36 Ụmụ Asha dị iri puku anọ (40,000). Ha bụ ndị ibu agha doro nnọọ anya. 37 Sitekwa nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, site nʼebo Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase bi, ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku na iri abụọ (120,000), ndị ji ụdị ngwa agha ọbụla pụtara soro Devid. Ha bukwa ngwa agha ha pụta. 38 Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta. Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel. 39 Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri. 40 Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.

In Other Versions

1 Chronicles 12 in the ANGEFD

1 Chronicles 12 in the ANTPNG2D

1 Chronicles 12 in the AS21

1 Chronicles 12 in the BAGH

1 Chronicles 12 in the BBPNG

1 Chronicles 12 in the BBT1E

1 Chronicles 12 in the BDS

1 Chronicles 12 in the BEV

1 Chronicles 12 in the BHAD

1 Chronicles 12 in the BIB

1 Chronicles 12 in the BLPT

1 Chronicles 12 in the BNT

1 Chronicles 12 in the BNTABOOT

1 Chronicles 12 in the BNTLV

1 Chronicles 12 in the BOATCB

1 Chronicles 12 in the BOATCB2

1 Chronicles 12 in the BOBCV

1 Chronicles 12 in the BOCNT

1 Chronicles 12 in the BOECS

1 Chronicles 12 in the BOGWICC

1 Chronicles 12 in the BOHCB

1 Chronicles 12 in the BOHCV

1 Chronicles 12 in the BOHLNT

1 Chronicles 12 in the BOHNTLTAL

1 Chronicles 12 in the BOILNTAP

1 Chronicles 12 in the BOITCV

1 Chronicles 12 in the BOKCV

1 Chronicles 12 in the BOKCV2

1 Chronicles 12 in the BOKHWOG

1 Chronicles 12 in the BOKSSV

1 Chronicles 12 in the BOLCB

1 Chronicles 12 in the BOLCB2

1 Chronicles 12 in the BOMCV

1 Chronicles 12 in the BONAV

1 Chronicles 12 in the BONCB

1 Chronicles 12 in the BONLT

1 Chronicles 12 in the BONUT2

1 Chronicles 12 in the BOPLNT

1 Chronicles 12 in the BOSCB

1 Chronicles 12 in the BOSNC

1 Chronicles 12 in the BOTLNT

1 Chronicles 12 in the BOVCB

1 Chronicles 12 in the BOYCB

1 Chronicles 12 in the BPBB

1 Chronicles 12 in the BPH

1 Chronicles 12 in the BSB

1 Chronicles 12 in the CCB

1 Chronicles 12 in the CUV

1 Chronicles 12 in the CUVS

1 Chronicles 12 in the DBT

1 Chronicles 12 in the DGDNT

1 Chronicles 12 in the DHNT

1 Chronicles 12 in the DNT

1 Chronicles 12 in the ELBE

1 Chronicles 12 in the EMTV

1 Chronicles 12 in the ESV

1 Chronicles 12 in the FBV

1 Chronicles 12 in the FEB

1 Chronicles 12 in the GGMNT

1 Chronicles 12 in the GNT

1 Chronicles 12 in the HARY

1 Chronicles 12 in the HNT

1 Chronicles 12 in the IRVA

1 Chronicles 12 in the IRVB

1 Chronicles 12 in the IRVG

1 Chronicles 12 in the IRVH

1 Chronicles 12 in the IRVK

1 Chronicles 12 in the IRVM

1 Chronicles 12 in the IRVM2

1 Chronicles 12 in the IRVO

1 Chronicles 12 in the IRVP

1 Chronicles 12 in the IRVT

1 Chronicles 12 in the IRVT2

1 Chronicles 12 in the IRVU

1 Chronicles 12 in the ISVN

1 Chronicles 12 in the JSNT

1 Chronicles 12 in the KAPI

1 Chronicles 12 in the KBT1ETNIK

1 Chronicles 12 in the KBV

1 Chronicles 12 in the KJV

1 Chronicles 12 in the KNFD

1 Chronicles 12 in the LBA

1 Chronicles 12 in the LBLA

1 Chronicles 12 in the LNT

1 Chronicles 12 in the LSV

1 Chronicles 12 in the MAAL

1 Chronicles 12 in the MBV

1 Chronicles 12 in the MBV2

1 Chronicles 12 in the MHNT

1 Chronicles 12 in the MKNFD

1 Chronicles 12 in the MNG

1 Chronicles 12 in the MNT

1 Chronicles 12 in the MNT2

1 Chronicles 12 in the MRS1T

1 Chronicles 12 in the NAA

1 Chronicles 12 in the NASB

1 Chronicles 12 in the NBLA

1 Chronicles 12 in the NBS

1 Chronicles 12 in the NBVTP

1 Chronicles 12 in the NET2

1 Chronicles 12 in the NIV11

1 Chronicles 12 in the NNT

1 Chronicles 12 in the NNT2

1 Chronicles 12 in the NNT3

1 Chronicles 12 in the PDDPT

1 Chronicles 12 in the PFNT

1 Chronicles 12 in the RMNT

1 Chronicles 12 in the SBIAS

1 Chronicles 12 in the SBIBS

1 Chronicles 12 in the SBIBS2

1 Chronicles 12 in the SBICS

1 Chronicles 12 in the SBIDS

1 Chronicles 12 in the SBIGS

1 Chronicles 12 in the SBIHS

1 Chronicles 12 in the SBIIS

1 Chronicles 12 in the SBIIS2

1 Chronicles 12 in the SBIIS3

1 Chronicles 12 in the SBIKS

1 Chronicles 12 in the SBIKS2

1 Chronicles 12 in the SBIMS

1 Chronicles 12 in the SBIOS

1 Chronicles 12 in the SBIPS

1 Chronicles 12 in the SBISS

1 Chronicles 12 in the SBITS

1 Chronicles 12 in the SBITS2

1 Chronicles 12 in the SBITS3

1 Chronicles 12 in the SBITS4

1 Chronicles 12 in the SBIUS

1 Chronicles 12 in the SBIVS

1 Chronicles 12 in the SBT

1 Chronicles 12 in the SBT1E

1 Chronicles 12 in the SCHL

1 Chronicles 12 in the SNT

1 Chronicles 12 in the SUSU

1 Chronicles 12 in the SUSU2

1 Chronicles 12 in the SYNO

1 Chronicles 12 in the TBIAOTANT

1 Chronicles 12 in the TBT1E

1 Chronicles 12 in the TBT1E2

1 Chronicles 12 in the TFTIP

1 Chronicles 12 in the TFTU

1 Chronicles 12 in the TGNTATF3T

1 Chronicles 12 in the THAI

1 Chronicles 12 in the TNFD

1 Chronicles 12 in the TNT

1 Chronicles 12 in the TNTIK

1 Chronicles 12 in the TNTIL

1 Chronicles 12 in the TNTIN

1 Chronicles 12 in the TNTIP

1 Chronicles 12 in the TNTIZ

1 Chronicles 12 in the TOMA

1 Chronicles 12 in the TTENT

1 Chronicles 12 in the UBG

1 Chronicles 12 in the UGV

1 Chronicles 12 in the UGV2

1 Chronicles 12 in the UGV3

1 Chronicles 12 in the VBL

1 Chronicles 12 in the VDCC

1 Chronicles 12 in the YALU

1 Chronicles 12 in the YAPE

1 Chronicles 12 in the YBVTP

1 Chronicles 12 in the ZBP