1 Kings 12 (BOICB)

1 Rehoboam gara Shekem, nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze. 2 Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ ka nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn), o sitere Ijipt lọta. 3 Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ọgbakọ Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya: 4 “Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị, dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.” 5 Rehoboam zara ha sị, “Laanụ, ụbọchị atọ gasịa unu bịaghachikwutenụ m.” Nʼihi ya ndị ahụ lara. 6 Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?” 7 Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-abụ odibo nye ndị a taa, jeere ha ozi, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.” 8 Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ. 9 Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ” 10 Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m. 11 Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ” 12 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.” 13 Eze sara ndị a okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ nke ndị okenye nyere ya, 14 ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere. Ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.” 15 Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ, ka e mezuo okwu ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo. 16 Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị,“Olee oke anyị nwere nʼime Devid?Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi?Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu!Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.”Ya mere, ndị Izrel lara nʼụlọ ha. 17 Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha. 18 Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram, onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye, ma ndị Izrel niile ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem. 19 Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa. 20 Mgbe ndị Izrel nụrụ na Jeroboam alaghachitala, ha ziri ya ozi sị ya pụta nʼihu ọha mmadụ. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee ya eze Izrel. Ọ dịghị ebo ọbụla kwenyere iso ụlọ Devid, karịakwa ebo Juda. 21 Mgbe Rehoboam bịarutere Jerusalem, ọ kpọkọtara ndị ụlọ Juda niile na ndị ebo Benjamin, ha dị narị puku na iri asatọ nʼọnụọgụgụ, ụmụ okorobịa ndị tozuru ịga agha, ka ha gaa buso ụlọ Izrel agha ma weghachitekwa alaeze nʼokpuru ọchịchị Rehoboam, nwa Solomọn. 22 Ma okwu Chineke rutere Shemaya onye nke Chineke ntị, sị, 23 “Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na ndị Juda niile, na Benjamin na ndị ọzọ niile, sị ha, 24 Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ụmụnna unu, bụ ndị Izrel agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme nke a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu ONYENWE ANYỊ, onye ọbụla nʼime ha laghachikwara nʼụlọ ya dịka ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu. 25 Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel. 26 Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid. 27 Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.” 28 Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.” 29 Otu nʼime ha ka o guzobere na Betel, tinyekwa nke ọzọ na Dan. 30 Ihe a ghọrọ mmehie dịrị ha, nʼihi na ndị mmadụ na-abịa kpọọ isiala nye nke dị na Betel ma gaakwa ebe dị anya, dịka Dan, nʼihi ife ehi ọlaedo nke dị nʼebe ahụ ofufe. 31 Jeroboam wuru ebe ịchụ aja nʼebe dị elu dị iche iche. Ọ họpụtara ndị nchụaja site nʼetiti ndị Izrel niile, nʼagbanyeghị na ha abụghị ndị Livayị. 32 O hiwere mmemme a na-eme nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke asatọ, dịka mmemme a na-eme na Juda. Ọ chụkwara aja nʼebe ịchụ aja. O mere nke a na Betel, chụọrọ ụmụ ehi ọlaedo ahụ ọ kpụrụ aja. O tinyere ndị nchụaja nʼọrụ nʼebe niile dị elu nke o mere ka ha dịrị na Betel. 33 Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa asatọ, bụ ọnwa nke ya onwe ya chepụtara, ọ chụrụ aja dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja o wuru na Betel. Ya mere, o hiwere mmemme a ka ọ dịịrị ndị Izrel niile; ya onwe ya kwa gara chụọ aja onyinye dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja.

In Other Versions

1 Kings 12 in the ANGEFD

1 Kings 12 in the ANTPNG2D

1 Kings 12 in the AS21

1 Kings 12 in the BAGH

1 Kings 12 in the BBPNG

1 Kings 12 in the BBT1E

1 Kings 12 in the BDS

1 Kings 12 in the BEV

1 Kings 12 in the BHAD

1 Kings 12 in the BIB

1 Kings 12 in the BLPT

1 Kings 12 in the BNT

1 Kings 12 in the BNTABOOT

1 Kings 12 in the BNTLV

1 Kings 12 in the BOATCB

1 Kings 12 in the BOATCB2

1 Kings 12 in the BOBCV

1 Kings 12 in the BOCNT

1 Kings 12 in the BOECS

1 Kings 12 in the BOGWICC

1 Kings 12 in the BOHCB

1 Kings 12 in the BOHCV

1 Kings 12 in the BOHLNT

1 Kings 12 in the BOHNTLTAL

1 Kings 12 in the BOILNTAP

1 Kings 12 in the BOITCV

1 Kings 12 in the BOKCV

1 Kings 12 in the BOKCV2

1 Kings 12 in the BOKHWOG

1 Kings 12 in the BOKSSV

1 Kings 12 in the BOLCB

1 Kings 12 in the BOLCB2

1 Kings 12 in the BOMCV

1 Kings 12 in the BONAV

1 Kings 12 in the BONCB

1 Kings 12 in the BONLT

1 Kings 12 in the BONUT2

1 Kings 12 in the BOPLNT

1 Kings 12 in the BOSCB

1 Kings 12 in the BOSNC

1 Kings 12 in the BOTLNT

1 Kings 12 in the BOVCB

1 Kings 12 in the BOYCB

1 Kings 12 in the BPBB

1 Kings 12 in the BPH

1 Kings 12 in the BSB

1 Kings 12 in the CCB

1 Kings 12 in the CUV

1 Kings 12 in the CUVS

1 Kings 12 in the DBT

1 Kings 12 in the DGDNT

1 Kings 12 in the DHNT

1 Kings 12 in the DNT

1 Kings 12 in the ELBE

1 Kings 12 in the EMTV

1 Kings 12 in the ESV

1 Kings 12 in the FBV

1 Kings 12 in the FEB

1 Kings 12 in the GGMNT

1 Kings 12 in the GNT

1 Kings 12 in the HARY

1 Kings 12 in the HNT

1 Kings 12 in the IRVA

1 Kings 12 in the IRVB

1 Kings 12 in the IRVG

1 Kings 12 in the IRVH

1 Kings 12 in the IRVK

1 Kings 12 in the IRVM

1 Kings 12 in the IRVM2

1 Kings 12 in the IRVO

1 Kings 12 in the IRVP

1 Kings 12 in the IRVT

1 Kings 12 in the IRVT2

1 Kings 12 in the IRVU

1 Kings 12 in the ISVN

1 Kings 12 in the JSNT

1 Kings 12 in the KAPI

1 Kings 12 in the KBT1ETNIK

1 Kings 12 in the KBV

1 Kings 12 in the KJV

1 Kings 12 in the KNFD

1 Kings 12 in the LBA

1 Kings 12 in the LBLA

1 Kings 12 in the LNT

1 Kings 12 in the LSV

1 Kings 12 in the MAAL

1 Kings 12 in the MBV

1 Kings 12 in the MBV2

1 Kings 12 in the MHNT

1 Kings 12 in the MKNFD

1 Kings 12 in the MNG

1 Kings 12 in the MNT

1 Kings 12 in the MNT2

1 Kings 12 in the MRS1T

1 Kings 12 in the NAA

1 Kings 12 in the NASB

1 Kings 12 in the NBLA

1 Kings 12 in the NBS

1 Kings 12 in the NBVTP

1 Kings 12 in the NET2

1 Kings 12 in the NIV11

1 Kings 12 in the NNT

1 Kings 12 in the NNT2

1 Kings 12 in the NNT3

1 Kings 12 in the PDDPT

1 Kings 12 in the PFNT

1 Kings 12 in the RMNT

1 Kings 12 in the SBIAS

1 Kings 12 in the SBIBS

1 Kings 12 in the SBIBS2

1 Kings 12 in the SBICS

1 Kings 12 in the SBIDS

1 Kings 12 in the SBIGS

1 Kings 12 in the SBIHS

1 Kings 12 in the SBIIS

1 Kings 12 in the SBIIS2

1 Kings 12 in the SBIIS3

1 Kings 12 in the SBIKS

1 Kings 12 in the SBIKS2

1 Kings 12 in the SBIMS

1 Kings 12 in the SBIOS

1 Kings 12 in the SBIPS

1 Kings 12 in the SBISS

1 Kings 12 in the SBITS

1 Kings 12 in the SBITS2

1 Kings 12 in the SBITS3

1 Kings 12 in the SBITS4

1 Kings 12 in the SBIUS

1 Kings 12 in the SBIVS

1 Kings 12 in the SBT

1 Kings 12 in the SBT1E

1 Kings 12 in the SCHL

1 Kings 12 in the SNT

1 Kings 12 in the SUSU

1 Kings 12 in the SUSU2

1 Kings 12 in the SYNO

1 Kings 12 in the TBIAOTANT

1 Kings 12 in the TBT1E

1 Kings 12 in the TBT1E2

1 Kings 12 in the TFTIP

1 Kings 12 in the TFTU

1 Kings 12 in the TGNTATF3T

1 Kings 12 in the THAI

1 Kings 12 in the TNFD

1 Kings 12 in the TNT

1 Kings 12 in the TNTIK

1 Kings 12 in the TNTIL

1 Kings 12 in the TNTIN

1 Kings 12 in the TNTIP

1 Kings 12 in the TNTIZ

1 Kings 12 in the TOMA

1 Kings 12 in the TTENT

1 Kings 12 in the UBG

1 Kings 12 in the UGV

1 Kings 12 in the UGV2

1 Kings 12 in the UGV3

1 Kings 12 in the VBL

1 Kings 12 in the VDCC

1 Kings 12 in the YALU

1 Kings 12 in the YAPE

1 Kings 12 in the YBVTP

1 Kings 12 in the ZBP