2 Samuel 17 (BOICB)

1 Ahitofel gwara Absalọm sị ya, “Kwere ka m họpụta puku ndị ikom iri na abụọ ka m duru ha chụso Devid ọsọ nʼazụ nʼabalị taa. 2 Aga m abịakwasị ya mgbe ike gwụrụ ya, mgbe obi ya na-ada mba. Aga m emenye ya egwu nke ga-eme ka ọ maa jijiji. Mgbe ahụ, ndị niile so ya ga-agbasasịkwa. Ọ bụ naanị eze ka m ga-egbu 3 Aga m eme ka ndị ya niile lọghachikwute gị. Ọnwụ nke otu nwoke a ị na-achọsi ndụ ya ike ga-eme ndị ọzọ niile ịlọghachikwute gị, onye ọbụla ga-anọ nʼudo.” 4 Atụmatụ ahụ ziri ezi nʼanya Absalọm na ndị okenye niile nke Izrel. 5 Ma Absalọm kwuru sị, “Kpọọ Hushaị onye Akai ka anyị jụọ ya ihe ọ chere banyere okwu a.” 6 Mgbe Hushaị bịakwutere ya, Absalọm sịrị ya, “Ahitofel nyere ndụmọdụ dị otu a. Gịnị ka ị chere? Anyị ga-eme ihe o kwuru? Ọ bụrụ na anyị agaghị eme ya, gị onwe gị kwuo nke gị.” 7 Hushaị zara Absalọm sị, “Ndụmọdụ Ahitofel dụrụ nʼoge a adịghị mma. 8 Ọ sịrị, Gị onwe gị maara nna gị na ndị ikom ya; ha bụ ndị dike nʼagha, mkpụrụobi ha dịkwa ilu ugbu a dịka anụ ọhịa bịa a gbabara aka nwa nʼọhịa. Nna gị bụ onye ihe banyere agha doro anya. Ọ gaghị eso ndị ya nọọ ọnọdụ abalị. 9 Ọ bụladị ugbu a, o zoola onwe ya nʼime otu olulu maọbụ nʼime ọgba nkume. Ọ bụrụ na ọ pụta buru ụzọ buso ndị agha gị agha, onye ọbụla nụrụ ya ga-ekwu sị, ‘Etigbuola ndị agha Absalọm oke ntigbu.’ 10 Mgbe ahụ, ọ bụladị dimkpa nʼagha ndị nwere obi ọdụm, ụjọ ga-atụkwa ha. Ha agaghị ekwekwa ịga nʼihu ọgụ. Nʼihi na Izrel niile maara na nna gị bụ dike. Ha maakwara na ndị agha ya bụkwa ndị obi kara aka. 11 “Ndụmọdụ m na-enye bụ nke a: chịkọtaa ndị Izrel niile, site na Dan ruo Bịasheba, ha dịka aja nke dị nʼakụkụ oke osimiri. Ọ bụkwa gị ga-edu ha nʼagha ahụ. 12 Mgbe ahụ, anyị ga-ebuso ya agha ebe ọbụla anyị hụrụ ya; anyị ga-abịakwasị ya dịka igirigi si adakwasị ala. Anyị ga-egbu ya, gbukwaa ndị niile so ya. Otu onye agaghị afọdụkwa nʼime ha. 13 Ọ bụrụkwa na o zoo onwe ya nʼotu obodo, mgbe ahụ Izrel niile ga-eweta ụdọ nʼobodo ahụ, anyị ga-adọtu ya dọbanye ya na ndagwurugwu, ruo mgbe ọ bụladị otu nkume ga-afọdụ nʼebe ahụ.” 14 Absalọm na ndị ikom Izrel niile sịrị, “Ndụmọdụ Hushaị, onye Akai dị mma karịa nke Ahitofel.” Ma ONYENWE ANYỊ ekpebielarị imebi ezi ndụmọdụ Ahitofel ka o si otu a wetara Absalọm ihe ndakwasị ọjọọ. 15 Hushaị gwara Zadọk na Abịata, ndị nchụaja, “Otu a na ihe ndị a ka Ahitofel dụrụ Absalọm na ndị okenye Izrel nʼọdụ ka ha mee, ma otu a na nke a ka mụ onwe dụkwaranụ nʼọdụ. 16 Ugbu a, meenụ ngwa, ziga ozi gwa Devid sị, ‘Anọkwala ọnọdụ abalị nʼụzọ ngabiga nke osimiri nʼime ọzara, kama gabiga na-atụfughị oge, ma ọ bụghị otu a, ma eze ma ndị niile ya na ha soo ga-abụ ndị elodara.’ ” 17 Jonatan na Ahimaaz nọ nʼakụkụ En-Rogel ka a ghara ihu ha mgbe ha na-abata nʼobodo. Otu nwaagbọghọ na-eje ozi na-aga zie ha ozi, ha onwe ha agaa zie eze Devid. 18 Ma otu nwokorobịa hụrụ ha gaa gwa Absalọm. Ya mere, ha abụọ mere ngwangwa baa nʼụlọ otu nwoke onye Bahurim, onye nwere olulu mmiri nʼogige ya, ha rịdara nʼime olulu ahụ 19 Nwunye nwoke ahụ weere ihe mkpuchi ya tụsaa nʼọnụ olulu mmiri ahụ gbasaakwa mkpụrụ ọka nʼelu ya. Ọ dịghị onye maara maka ya. 20 Mgbe ndị ozi Absalọm bịaruru jụọ nwanyị ahụ, “Olee ebe Ahimaaz na Jonatan nọ”?Nwanyị ahụ zara, “Ha agafeela mmiri iyi.” Ndị ozi Absalọm chọrọ ha ma ha ahụghị ha. Ha laghachiri na Jerusalem. 21 Mgbe ha lawara, mmadụ abụọ ahụ sitere nʼolulu mmiri ahụ rigopụta, gaa gwa eze Devid. Ha sịrị ya, “Bilie gafeenụ mmiri ngwangwa, nʼihi na Ahitofel adụọla Absalọm ọdụ otu a na otu a megide gị.” 22 Nke a mere Devid na ndị niile so ya biliri gafee osimiri Jọdan. Mgbe chi ụtụtụ na-abọ, ha niile nọ nʼofe nke ọzọ Jọdan. 23 Mgbe Ahitofel hụrụ na-emeghị ndụmọdụ ya, o biliri jikwaa ịnyịnya ibu ya, laa nʼụlọ ya nʼobodo ya. Mgbe o ruru nʼụlọ ya, o doziri nʼezinaụlọ ya nʼusoro, were ụdọ kwụgbuo onwe ya. Ọ nwụrụ. E lie ya nʼili nna ya. 24 Devid batara Mahanaim oge Absalọm gabigara Jọdan, ya na ndị ikom Izrel so ya. 25 Absalọm họpụtakwara Amasa mee ya onyeisi ndị agha, nʼọnọdụ Joab. Amasa bụ nwa nwoke Itra, onye Ishmel, onye lụrụ Abigel, nwa nwanyị Nahash, onye bụkwa nwanne nwanyị Zeruaya nne Joab. 26 Absalọm na ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼala Gilead. 27 Mgbe Devid bịarutere Mahanaim, Shobi nwa Nahash onye obodo Raba nke dị nʼala ndị Amọn, na Makia nwa Amiel onye si Lo Deba, na Bazilai, onye Gilead si Rogelim 28 wetara ute e ji edina ala, na ite isi nri, na efere e ji eri nri bụ ọrụ onye ọkpụ ite. Tinyere ọka wiiti na ọka balị, ụtụ ọka na ọka a ṅara nʼọkụ, akịdị na lentil. 29 O wetakwara mmanụ aṅụ, na bọta, atụrụ na chiizi nke sitere na mmiri ara ehi nye Devid na ndị so ya ka ha rie. Nʼihi na ha sịrị, “Ike agwụla ndị mmadụ, agụụ na-agụ ha, akpịrị na-akpọkwa ha nkụ, nʼime ọzara.”

In Other Versions

2 Samuel 17 in the ANGEFD

2 Samuel 17 in the ANTPNG2D

2 Samuel 17 in the AS21

2 Samuel 17 in the BAGH

2 Samuel 17 in the BBPNG

2 Samuel 17 in the BBT1E

2 Samuel 17 in the BDS

2 Samuel 17 in the BEV

2 Samuel 17 in the BHAD

2 Samuel 17 in the BIB

2 Samuel 17 in the BLPT

2 Samuel 17 in the BNT

2 Samuel 17 in the BNTABOOT

2 Samuel 17 in the BNTLV

2 Samuel 17 in the BOATCB

2 Samuel 17 in the BOATCB2

2 Samuel 17 in the BOBCV

2 Samuel 17 in the BOCNT

2 Samuel 17 in the BOECS

2 Samuel 17 in the BOGWICC

2 Samuel 17 in the BOHCB

2 Samuel 17 in the BOHCV

2 Samuel 17 in the BOHLNT

2 Samuel 17 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 17 in the BOILNTAP

2 Samuel 17 in the BOITCV

2 Samuel 17 in the BOKCV

2 Samuel 17 in the BOKCV2

2 Samuel 17 in the BOKHWOG

2 Samuel 17 in the BOKSSV

2 Samuel 17 in the BOLCB

2 Samuel 17 in the BOLCB2

2 Samuel 17 in the BOMCV

2 Samuel 17 in the BONAV

2 Samuel 17 in the BONCB

2 Samuel 17 in the BONLT

2 Samuel 17 in the BONUT2

2 Samuel 17 in the BOPLNT

2 Samuel 17 in the BOSCB

2 Samuel 17 in the BOSNC

2 Samuel 17 in the BOTLNT

2 Samuel 17 in the BOVCB

2 Samuel 17 in the BOYCB

2 Samuel 17 in the BPBB

2 Samuel 17 in the BPH

2 Samuel 17 in the BSB

2 Samuel 17 in the CCB

2 Samuel 17 in the CUV

2 Samuel 17 in the CUVS

2 Samuel 17 in the DBT

2 Samuel 17 in the DGDNT

2 Samuel 17 in the DHNT

2 Samuel 17 in the DNT

2 Samuel 17 in the ELBE

2 Samuel 17 in the EMTV

2 Samuel 17 in the ESV

2 Samuel 17 in the FBV

2 Samuel 17 in the FEB

2 Samuel 17 in the GGMNT

2 Samuel 17 in the GNT

2 Samuel 17 in the HARY

2 Samuel 17 in the HNT

2 Samuel 17 in the IRVA

2 Samuel 17 in the IRVB

2 Samuel 17 in the IRVG

2 Samuel 17 in the IRVH

2 Samuel 17 in the IRVK

2 Samuel 17 in the IRVM

2 Samuel 17 in the IRVM2

2 Samuel 17 in the IRVO

2 Samuel 17 in the IRVP

2 Samuel 17 in the IRVT

2 Samuel 17 in the IRVT2

2 Samuel 17 in the IRVU

2 Samuel 17 in the ISVN

2 Samuel 17 in the JSNT

2 Samuel 17 in the KAPI

2 Samuel 17 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 17 in the KBV

2 Samuel 17 in the KJV

2 Samuel 17 in the KNFD

2 Samuel 17 in the LBA

2 Samuel 17 in the LBLA

2 Samuel 17 in the LNT

2 Samuel 17 in the LSV

2 Samuel 17 in the MAAL

2 Samuel 17 in the MBV

2 Samuel 17 in the MBV2

2 Samuel 17 in the MHNT

2 Samuel 17 in the MKNFD

2 Samuel 17 in the MNG

2 Samuel 17 in the MNT

2 Samuel 17 in the MNT2

2 Samuel 17 in the MRS1T

2 Samuel 17 in the NAA

2 Samuel 17 in the NASB

2 Samuel 17 in the NBLA

2 Samuel 17 in the NBS

2 Samuel 17 in the NBVTP

2 Samuel 17 in the NET2

2 Samuel 17 in the NIV11

2 Samuel 17 in the NNT

2 Samuel 17 in the NNT2

2 Samuel 17 in the NNT3

2 Samuel 17 in the PDDPT

2 Samuel 17 in the PFNT

2 Samuel 17 in the RMNT

2 Samuel 17 in the SBIAS

2 Samuel 17 in the SBIBS

2 Samuel 17 in the SBIBS2

2 Samuel 17 in the SBICS

2 Samuel 17 in the SBIDS

2 Samuel 17 in the SBIGS

2 Samuel 17 in the SBIHS

2 Samuel 17 in the SBIIS

2 Samuel 17 in the SBIIS2

2 Samuel 17 in the SBIIS3

2 Samuel 17 in the SBIKS

2 Samuel 17 in the SBIKS2

2 Samuel 17 in the SBIMS

2 Samuel 17 in the SBIOS

2 Samuel 17 in the SBIPS

2 Samuel 17 in the SBISS

2 Samuel 17 in the SBITS

2 Samuel 17 in the SBITS2

2 Samuel 17 in the SBITS3

2 Samuel 17 in the SBITS4

2 Samuel 17 in the SBIUS

2 Samuel 17 in the SBIVS

2 Samuel 17 in the SBT

2 Samuel 17 in the SBT1E

2 Samuel 17 in the SCHL

2 Samuel 17 in the SNT

2 Samuel 17 in the SUSU

2 Samuel 17 in the SUSU2

2 Samuel 17 in the SYNO

2 Samuel 17 in the TBIAOTANT

2 Samuel 17 in the TBT1E

2 Samuel 17 in the TBT1E2

2 Samuel 17 in the TFTIP

2 Samuel 17 in the TFTU

2 Samuel 17 in the TGNTATF3T

2 Samuel 17 in the THAI

2 Samuel 17 in the TNFD

2 Samuel 17 in the TNT

2 Samuel 17 in the TNTIK

2 Samuel 17 in the TNTIL

2 Samuel 17 in the TNTIN

2 Samuel 17 in the TNTIP

2 Samuel 17 in the TNTIZ

2 Samuel 17 in the TOMA

2 Samuel 17 in the TTENT

2 Samuel 17 in the UBG

2 Samuel 17 in the UGV

2 Samuel 17 in the UGV2

2 Samuel 17 in the UGV3

2 Samuel 17 in the VBL

2 Samuel 17 in the VDCC

2 Samuel 17 in the YALU

2 Samuel 17 in the YAPE

2 Samuel 17 in the YBVTP

2 Samuel 17 in the ZBP