Daniel 12 (BOICB)
1 “Nʼoge ahụ, Maikel, onyeisi ọchịchị ukwuu ahụ, nke na-eche ndị unu, ga-ebili. Ọ ga-abụ oge nhụju anya, a na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe mba ọbụla malitere ruo ugbu a. Ma mgbe ahụ, ndị gị niile, ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ ahụ, ka a ga-anapụta. 2 Igwe ndị niile nwụrụ anwụ, ndị e likwara, ha ga-ebilite. Ụfọdụ ha ga-ebili baa na ndụ ebighị ebi, ma ụfọdụ ga-ebili keta ihere na ịbụ ọnụ nke ebighị ebi. 3 Ndị ahụ bụ ndị maara ihe, ka a ga-eme ka ha nwuo ọcha dịka ihe mbara eluigwe. Ndị ahụ niile na-emekwa ka ọtụtụ si nʼihe ọjọọ mee ezi omume ga-enwukwa dịka kpakpando ruo mgbe ebighị ebi. 4 Ma gị bụ Daniel, zoo okwu e dere nʼakwụkwọ a, mechiekwa ma kachiekwa ha akara tutu ruo ọgwụgwụ oge. Ọtụtụ ga-agbagharị ebe na ebe ọzọ, ma ihe ọmụma ga-aba ụba.” 5 Mgbe ahụ, mụ bụ Daniel weliri anya hụ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha nọ nʼakụkụ osimiri ahụ, otu nʼakụkụ nke a, otu nʼakụkụ nke ọzọ. 6 Otu nʼime ha juru nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke guzo nʼakụkụ elu elu nke osimiri ahụ ajụjụ, sị, “Olee mgbe ihe ndị a na-eyi egwu ga-emezu?” 7 Nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, nke nọ nʼakụkụ elu elu mmiri nke osimiri ahụ chịlịri aka nri na aka ekpe ya elu. Anụkwara m mgbe o ji Onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi, “Nʼihe ndị a ga-emezu naanị mgbe afọ atọ na ọkara gafere, tupu onye ahụ na-emebi ike nke ndị dị nsọ ga-abịa nʼisi ngwụcha ndụ ya, ihe ndị a niile ga-emezucha.” 8 Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?” 9 Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge. 10 Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara. 11 “Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu. (1,290) 12 Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise (1,335) ahụ gafere. 13 “Ma gị onwe, gawara onwe gị ruo ọgwụgwụ ihe ndị a. Ị ga-ezukwa ike, ị ga-ebilitekwa nʼoge ikpeazụ ịnara ihe nketa nke ruuru gị.”
In Other Versions
Daniel 12 in the ANGEFD
Daniel 12 in the ANTPNG2D
Daniel 12 in the AS21
Daniel 12 in the BAGH
Daniel 12 in the BBPNG
Daniel 12 in the BBT1E
Daniel 12 in the BDS
Daniel 12 in the BEV
Daniel 12 in the BHAD
Daniel 12 in the BIB
Daniel 12 in the BLPT
Daniel 12 in the BNT
Daniel 12 in the BNTABOOT
Daniel 12 in the BNTLV
Daniel 12 in the BOATCB
Daniel 12 in the BOATCB2
Daniel 12 in the BOBCV
Daniel 12 in the BOCNT
Daniel 12 in the BOECS
Daniel 12 in the BOGWICC
Daniel 12 in the BOHCB
Daniel 12 in the BOHCV
Daniel 12 in the BOHLNT
Daniel 12 in the BOHNTLTAL
Daniel 12 in the BOILNTAP
Daniel 12 in the BOITCV
Daniel 12 in the BOKCV
Daniel 12 in the BOKCV2
Daniel 12 in the BOKHWOG
Daniel 12 in the BOKSSV
Daniel 12 in the BOLCB
Daniel 12 in the BOLCB2
Daniel 12 in the BOMCV
Daniel 12 in the BONAV
Daniel 12 in the BONCB
Daniel 12 in the BONLT
Daniel 12 in the BONUT2
Daniel 12 in the BOPLNT
Daniel 12 in the BOSCB
Daniel 12 in the BOSNC
Daniel 12 in the BOTLNT
Daniel 12 in the BOVCB
Daniel 12 in the BOYCB
Daniel 12 in the BPBB
Daniel 12 in the BPH
Daniel 12 in the BSB
Daniel 12 in the CCB
Daniel 12 in the CUV
Daniel 12 in the CUVS
Daniel 12 in the DBT
Daniel 12 in the DGDNT
Daniel 12 in the DHNT
Daniel 12 in the DNT
Daniel 12 in the ELBE
Daniel 12 in the EMTV
Daniel 12 in the ESV
Daniel 12 in the FBV
Daniel 12 in the FEB
Daniel 12 in the GGMNT
Daniel 12 in the GNT
Daniel 12 in the HARY
Daniel 12 in the HNT
Daniel 12 in the IRVA
Daniel 12 in the IRVB
Daniel 12 in the IRVG
Daniel 12 in the IRVH
Daniel 12 in the IRVK
Daniel 12 in the IRVM
Daniel 12 in the IRVM2
Daniel 12 in the IRVO
Daniel 12 in the IRVP
Daniel 12 in the IRVT
Daniel 12 in the IRVT2
Daniel 12 in the IRVU
Daniel 12 in the ISVN
Daniel 12 in the JSNT
Daniel 12 in the KAPI
Daniel 12 in the KBT1ETNIK
Daniel 12 in the KBV
Daniel 12 in the KJV
Daniel 12 in the KNFD
Daniel 12 in the LBA
Daniel 12 in the LBLA
Daniel 12 in the LNT
Daniel 12 in the LSV
Daniel 12 in the MAAL
Daniel 12 in the MBV
Daniel 12 in the MBV2
Daniel 12 in the MHNT
Daniel 12 in the MKNFD
Daniel 12 in the MNG
Daniel 12 in the MNT
Daniel 12 in the MNT2
Daniel 12 in the MRS1T
Daniel 12 in the NAA
Daniel 12 in the NASB
Daniel 12 in the NBLA
Daniel 12 in the NBS
Daniel 12 in the NBVTP
Daniel 12 in the NET2
Daniel 12 in the NIV11
Daniel 12 in the NNT
Daniel 12 in the NNT2
Daniel 12 in the NNT3
Daniel 12 in the PDDPT
Daniel 12 in the PFNT
Daniel 12 in the RMNT
Daniel 12 in the SBIAS
Daniel 12 in the SBIBS
Daniel 12 in the SBIBS2
Daniel 12 in the SBICS
Daniel 12 in the SBIDS
Daniel 12 in the SBIGS
Daniel 12 in the SBIHS
Daniel 12 in the SBIIS
Daniel 12 in the SBIIS2
Daniel 12 in the SBIIS3
Daniel 12 in the SBIKS
Daniel 12 in the SBIKS2
Daniel 12 in the SBIMS
Daniel 12 in the SBIOS
Daniel 12 in the SBIPS
Daniel 12 in the SBISS
Daniel 12 in the SBITS
Daniel 12 in the SBITS2
Daniel 12 in the SBITS3
Daniel 12 in the SBITS4
Daniel 12 in the SBIUS
Daniel 12 in the SBIVS
Daniel 12 in the SBT
Daniel 12 in the SBT1E
Daniel 12 in the SCHL
Daniel 12 in the SNT
Daniel 12 in the SUSU
Daniel 12 in the SUSU2
Daniel 12 in the SYNO
Daniel 12 in the TBIAOTANT
Daniel 12 in the TBT1E
Daniel 12 in the TBT1E2
Daniel 12 in the TFTIP
Daniel 12 in the TFTU
Daniel 12 in the TGNTATF3T
Daniel 12 in the THAI
Daniel 12 in the TNFD
Daniel 12 in the TNT
Daniel 12 in the TNTIK
Daniel 12 in the TNTIL
Daniel 12 in the TNTIN
Daniel 12 in the TNTIP
Daniel 12 in the TNTIZ
Daniel 12 in the TOMA
Daniel 12 in the TTENT
Daniel 12 in the UBG
Daniel 12 in the UGV
Daniel 12 in the UGV2
Daniel 12 in the UGV3
Daniel 12 in the VBL
Daniel 12 in the VDCC
Daniel 12 in the YALU
Daniel 12 in the YAPE
Daniel 12 in the YBVTP
Daniel 12 in the ZBP