Deuteronomy 2 (BOICB)

1 Anyị laghachiri azụ chee ihu nʼọzara nʼụzọ gawara Osimiri Uhie, dịka ONYENWE ANYỊ gwara m. Ọtụtụ afọ ka anyị nọ na-awagharị gburugburu ugwu Sia. 2 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị m, 3 “Unu agbaala ala ugwu ugwu a gburugburu ogologo oge, cheenụ ihu nʼakụkụ ugwu. 4 Nye ụmụ Izrel iwu ndị a: ‘Unu ga-aga site nʼala ụmụnna unu ndị Edọm gafee. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, onye biri na Sia. Ha ga-atụ egwu mgbe ha nụrụ na unu ga-esi nʼala ha gafee, ma kpachapụnụ anya. 5 Unu akpasukwala ha ka ha lụsoo unu ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ọbụla sitere nʼala ha, ọ bụladị ebe ga-ezuru unu ịzọkwasị ụkwụ unu. Enyela m Ịsọ ala niile nke ugwu Sia dịka nke aka ya. 6 Jirinụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nri ọbụla unu riri, jirikwanụ ọlaọcha kwụọ ha ụgwọ nʼihi mmiri ọbụla unu ṅụrụ.’ ” 7 ONYENWE ANYỊ Chineke unu agọziela unu nʼihe ọbụla bụ akaọrụ unu. O cheela nzọ ụkwụ unu nche iri afọ anọ ndị a niile unu wagharịrị nʼọzara ukwuu a. ONYENWE ANYỊ Chineke unu anọnyerela unu, ọ dịkwaghị ihe kọrọ unu. 8 Ya mere, anyị sitere nʼala ụmụnna anyị bụ ụmụ Ịsọ, ndị bi na Sia gafee. Anyị hapụkwara ụzọ Araba nke si Elat na Eziọn Geba, tụgharịa gawa elu elu ụzọ ọzara Moab. 9 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ dọrọ anyị aka na ntị sị, “Unu esogbula maọbụ lụso ndị Moab ọgụ nʼihi na unu enweghị oke nʼala ha, nʼihi na enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala Ar ka ọ bụrụ ihe nketa nke ha.” 10 (Ndị biri nʼebe ahụ na mgbe gara aga bụ ndị Emim, agbụrụ ha gbara dimkpa dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ. Ha toro ogologo dịka ndị Anak. 11 A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim. 12 Ma mgbe gara aga ọ bụ ndị Hor bi na Sia, ma ndị Edọm, ụmụ Ịsọ, chụpụrụ ha. Ha bibiri ndị Hor bichikwaa ala ha, dịka ụmụ Izrel si bichie nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ nyere ha dịka ihe nketa.) 13 ONYENWE ANYỊ gwara anyị okwu sị, “Ugbu a bilienụ, gafee Ndagwurugwu Zered.” Anyị bilikwara gafee. 14 Iri afọ atọ na asatọ gasịrị, site na mgbe anyị hapụrụ Kadesh Banea ruo mgbe anyị gafere Ndagwurugwu Zered! Nʼoge a, ọgbọ ndị ikom ahụ niile na-alụ agha anwụchaala site nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka ONYENWE ANYỊ ṅụrụ ha nʼiyi. 15 E, aka ONYENWE ANYỊ dị megide ha, ruo mgbe o mere ka ha niile nwụchaa site nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. 16 Mgbe onye nke ikpeazụ nʼime ndị niile a tozuru ije agha nwụchara, 17 ONYENWE ANYỊ sịrị m, 18 “Taa, ụmụ Izrel ga-esi na Ar gafee oke ala ndị Moab. 19 Mgbe unu bara nʼala ndị Amọn, unu esogbula ha, unu alụsola ha ọgụ, nʼihi na agaghị m enye unu ala ndị Amọn. Enyela m ụmụ ụmụ Lọt ala ahụ dịka ihe onwunwe ha.” 20 Ndị bi nʼebe a na mbụ bụ ndị Refaim, ma ụmụ Amọn na-akpọ ha ndị Zamzum. 21 Ha bụ agbụrụ dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, siekwa ike nke ukwuu, ha toro ogologo dịka ụmụ Anak. ONYENWE ANYỊ sitere nʼaka ndị Amọn laa ha nʼiyi, bụ ndị chụpụrụ ha ma bichie nʼobodo ha. 22 ONYENWE ANYỊ mekwara otu ihe ahụ nye ndị agbụrụ Ịsọ bụ ndị bi nʼugwu Sia mgbe ọ lara ndị Hor bụ ụzọ biri nʼebe ahụ nʼiyi. Ha chụpụrụ ha, bichie ala ha ruo taa. 23 Ebe ọzọkwa ONYENWE ANYỊ mere ihe dị otu a bụ mgbe o mere ka ndị Kafto laa ndị Avim nʼiyi. Ha bichiri obodo nta niile ndị Avim nwere nke dị gburugburu ebe ahụ rukwaa Gaza. 24 Emesịa, ONYENWE ANYỊ sịrị, “Gafeenụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, baakwanụ nʼalaeze Saịhọn, onye Amọrị, eze obodo Heshbọn. Lụsonụ ya agha, bichiekwanụ nʼala ya nʼihi na enyefeela m ya bụ eze na ala ya nʼaka unu. 25 Site taa gaa nʼihu, aga m etinye egwu na ụjọ nʼobi ndị niile bi nʼokpuru mbara eluigwe. Ha ga-anụ akụkọ unu tụọ oke egwu, maakwa jijiji nʼihi unu.” 26 Esitere m nʼọzara Kedemot zipụ ndị ozi, ka ha jekwuru Saịhọn, eze Heshbọn, zie ya ozi na anyị chọrọ udo, sị, 27 “Kwere ka anyị site nʼobodo gị gafee. Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-anọ. Anyị agaghị atụgharị gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 28 Renye anyị ihe oriri anyị ga-eri na mmiri anyị ga-aṅụ nʼọnụ ahịa ọlaọcha. Naanị kweere ka anyị gabiga nʼụkwụ ala, 29 dịka ụmụ Ịsọ, bụ ndị bi na Sia, nakwa ndị Moab bi nʼobodo Ar meere anyị, ruo mgbe anyị gafere Jọdan banye nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị na-enye anyị.” 30 Ma Saịhọn, eze Heshbọn, ekweghị ka anyị si nʼala ya gafee. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu mere ka mmụọ ya sie ike, meekwa ka o mesie obi ya ike, ka o si otu a nyefee ya nʼaka unu dịka ọ mere ugbu a. 31 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara m sị, “Lee, amalitela m iwere Saịhọn na obodo a nyefee unu nʼaka. Ngwanụ, malitenụ ibuso ya agha! Merienụ ya, nwetakwanụ ala ya.” 32 Mgbe Saịhọn na ndị agha ya niile pụtara izute anyị nʼagha nʼebe a na-akpọ Jehaz, 33 ONYENWE ANYỊ Chineke anyị nyefere ya nʼaka anyị. Anyị gburu ya, gbukwaa ụmụ ya ndị ikom niile, na ndị agha ya niile. 34 Nʼoge ahụ, anyị meriri obodo ya niile, bibiekwa ha niile kpamkpam, ma ndị ikom, ma ndị inyom, ma ụmụntakịrị. Anyị ahapụghị mmadụ onye ndụ. 35 Ma ihe ndị anyị bukọọrọ bụ naanị anụ ụlọ, na ngwongwo ndị ọzọ dị iche iche anyị si nʼobodo ndị anyị meriri kwata. 36 Anyị lụgburu ndị niile bi nʼobodo dị site nʼAroea ruo nʼọnụ ndagwurugwu dị warawara nke Anọn, na site nʼetiti ndagwurugwu ahụ ruo Gilead. O nweghị obodo ọbụla rara anyị ahụ imeri, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke nyefere ha niile nʼaka anyị. 37 Ma dịka usoro iwu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị si dị, anyị abanyeghị ala ndị Amọn ọbụla maọbụ ruokwa nʼala dị nʼakụkụ iyi Jabọk nso, maọbụ nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼugwu.

In Other Versions

Deuteronomy 2 in the ANGEFD

Deuteronomy 2 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 2 in the AS21

Deuteronomy 2 in the BAGH

Deuteronomy 2 in the BBPNG

Deuteronomy 2 in the BBT1E

Deuteronomy 2 in the BDS

Deuteronomy 2 in the BEV

Deuteronomy 2 in the BHAD

Deuteronomy 2 in the BIB

Deuteronomy 2 in the BLPT

Deuteronomy 2 in the BNT

Deuteronomy 2 in the BNTABOOT

Deuteronomy 2 in the BNTLV

Deuteronomy 2 in the BOATCB

Deuteronomy 2 in the BOATCB2

Deuteronomy 2 in the BOBCV

Deuteronomy 2 in the BOCNT

Deuteronomy 2 in the BOECS

Deuteronomy 2 in the BOGWICC

Deuteronomy 2 in the BOHCB

Deuteronomy 2 in the BOHCV

Deuteronomy 2 in the BOHLNT

Deuteronomy 2 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 2 in the BOILNTAP

Deuteronomy 2 in the BOITCV

Deuteronomy 2 in the BOKCV

Deuteronomy 2 in the BOKCV2

Deuteronomy 2 in the BOKHWOG

Deuteronomy 2 in the BOKSSV

Deuteronomy 2 in the BOLCB

Deuteronomy 2 in the BOLCB2

Deuteronomy 2 in the BOMCV

Deuteronomy 2 in the BONAV

Deuteronomy 2 in the BONCB

Deuteronomy 2 in the BONLT

Deuteronomy 2 in the BONUT2

Deuteronomy 2 in the BOPLNT

Deuteronomy 2 in the BOSCB

Deuteronomy 2 in the BOSNC

Deuteronomy 2 in the BOTLNT

Deuteronomy 2 in the BOVCB

Deuteronomy 2 in the BOYCB

Deuteronomy 2 in the BPBB

Deuteronomy 2 in the BPH

Deuteronomy 2 in the BSB

Deuteronomy 2 in the CCB

Deuteronomy 2 in the CUV

Deuteronomy 2 in the CUVS

Deuteronomy 2 in the DBT

Deuteronomy 2 in the DGDNT

Deuteronomy 2 in the DHNT

Deuteronomy 2 in the DNT

Deuteronomy 2 in the ELBE

Deuteronomy 2 in the EMTV

Deuteronomy 2 in the ESV

Deuteronomy 2 in the FBV

Deuteronomy 2 in the FEB

Deuteronomy 2 in the GGMNT

Deuteronomy 2 in the GNT

Deuteronomy 2 in the HARY

Deuteronomy 2 in the HNT

Deuteronomy 2 in the IRVA

Deuteronomy 2 in the IRVB

Deuteronomy 2 in the IRVG

Deuteronomy 2 in the IRVH

Deuteronomy 2 in the IRVK

Deuteronomy 2 in the IRVM

Deuteronomy 2 in the IRVM2

Deuteronomy 2 in the IRVO

Deuteronomy 2 in the IRVP

Deuteronomy 2 in the IRVT

Deuteronomy 2 in the IRVT2

Deuteronomy 2 in the IRVU

Deuteronomy 2 in the ISVN

Deuteronomy 2 in the JSNT

Deuteronomy 2 in the KAPI

Deuteronomy 2 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 2 in the KBV

Deuteronomy 2 in the KJV

Deuteronomy 2 in the KNFD

Deuteronomy 2 in the LBA

Deuteronomy 2 in the LBLA

Deuteronomy 2 in the LNT

Deuteronomy 2 in the LSV

Deuteronomy 2 in the MAAL

Deuteronomy 2 in the MBV

Deuteronomy 2 in the MBV2

Deuteronomy 2 in the MHNT

Deuteronomy 2 in the MKNFD

Deuteronomy 2 in the MNG

Deuteronomy 2 in the MNT

Deuteronomy 2 in the MNT2

Deuteronomy 2 in the MRS1T

Deuteronomy 2 in the NAA

Deuteronomy 2 in the NASB

Deuteronomy 2 in the NBLA

Deuteronomy 2 in the NBS

Deuteronomy 2 in the NBVTP

Deuteronomy 2 in the NET2

Deuteronomy 2 in the NIV11

Deuteronomy 2 in the NNT

Deuteronomy 2 in the NNT2

Deuteronomy 2 in the NNT3

Deuteronomy 2 in the PDDPT

Deuteronomy 2 in the PFNT

Deuteronomy 2 in the RMNT

Deuteronomy 2 in the SBIAS

Deuteronomy 2 in the SBIBS

Deuteronomy 2 in the SBIBS2

Deuteronomy 2 in the SBICS

Deuteronomy 2 in the SBIDS

Deuteronomy 2 in the SBIGS

Deuteronomy 2 in the SBIHS

Deuteronomy 2 in the SBIIS

Deuteronomy 2 in the SBIIS2

Deuteronomy 2 in the SBIIS3

Deuteronomy 2 in the SBIKS

Deuteronomy 2 in the SBIKS2

Deuteronomy 2 in the SBIMS

Deuteronomy 2 in the SBIOS

Deuteronomy 2 in the SBIPS

Deuteronomy 2 in the SBISS

Deuteronomy 2 in the SBITS

Deuteronomy 2 in the SBITS2

Deuteronomy 2 in the SBITS3

Deuteronomy 2 in the SBITS4

Deuteronomy 2 in the SBIUS

Deuteronomy 2 in the SBIVS

Deuteronomy 2 in the SBT

Deuteronomy 2 in the SBT1E

Deuteronomy 2 in the SCHL

Deuteronomy 2 in the SNT

Deuteronomy 2 in the SUSU

Deuteronomy 2 in the SUSU2

Deuteronomy 2 in the SYNO

Deuteronomy 2 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 2 in the TBT1E

Deuteronomy 2 in the TBT1E2

Deuteronomy 2 in the TFTIP

Deuteronomy 2 in the TFTU

Deuteronomy 2 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 2 in the THAI

Deuteronomy 2 in the TNFD

Deuteronomy 2 in the TNT

Deuteronomy 2 in the TNTIK

Deuteronomy 2 in the TNTIL

Deuteronomy 2 in the TNTIN

Deuteronomy 2 in the TNTIP

Deuteronomy 2 in the TNTIZ

Deuteronomy 2 in the TOMA

Deuteronomy 2 in the TTENT

Deuteronomy 2 in the UBG

Deuteronomy 2 in the UGV

Deuteronomy 2 in the UGV2

Deuteronomy 2 in the UGV3

Deuteronomy 2 in the VBL

Deuteronomy 2 in the VDCC

Deuteronomy 2 in the YALU

Deuteronomy 2 in the YAPE

Deuteronomy 2 in the YBVTP

Deuteronomy 2 in the ZBP