Exodus 26 (BOICB)

1 “Rụọ ụlọ nzute nke ga-enwe akwa mgbochi iri, nke e ji ezi ogho na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie kpaa akwa ndị a. Onye ọrụ aka na-eme ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ha. 2 Akwa mgbochi ndị a ga-aha nʼotu. O nweghị nke ga-aka ibe ya. Ogologo akwa mgbochi ọbụla ga-abụ mita iri na abụọ na ọkara. Obosara ya bụ otu mita na sentimita asatọ. 3 Dụkọtaa akwa mgbochi ise nʼotu, dụkọtaakwa ise nke ọzọ nʼotu. 4 Jiri akwa na-acha anụnụ anụnụ dụnye anya nko nʼelu ọnụ akwa mgbochi nke otu ụzọ, otu a ka ị ga-emekwa na nsọtụ ọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. 5 Dụnye iri anya nko ise nʼotu akwa mgbochi, dụnyekwa iri anya nko ise nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ. Mee ka anya nko ndị a chee ibe ha ihu. 6 Ị ga-emekwa iri nko ọlaedo ise, nke ị ga-eji jikọta akwa mgbochi abụọ ahụ nʼotu, si otu a mee ka ụlọ nzute ahụ bụrụ otu. 7 “Ị ga-eji akpụkpọ ajị ewu mee akwa mgbochi maka i ji kpuchie elu ụlọ nzute ahụ. Iri na otu ka ha ga-adị nʼọnụọgụgụ. 8 Akwa mgbochi iri na otu ndị a ga-aha nʼotu. Ọ ga-abụ mita iri na atọ na ọkara nʼogologo. Ebe obosara ya bụ otu mita na iri sentimita asatọ. 9 Dụkọtaa ise nʼime akwa mgbochi ahụ. Debe ya iche. Dụkọtakwa isii nke fọdụrụ debekwa ya iche. Pịajie akwa mgbochi nke isii ụzọ abụọ nʼihu ụlọ nzute ahụ. 10 Dụnyekwa iri anya nko ise nʼelu ọnụ otu akwa mgbochi ndị ahụ. Meekwa otu ihe ahụ nʼọnụ akwa mgbochi nke ọzọ e debere iche. 11 Meekwa iri nko bronz ise, mee ka nko ahụ baa nʼanya nko nke ọzọ, i ji jikọta ụlọ nzute ahụ ka ọ bụrụ otu. 12 Ma banyere ogologo akwa mgbochi nke fọdụrụ maka ụlọ nzute, ya bụ ọkara akwa mgbochi nke mapụtara, nke a ga-akwụba nʼazụ ụlọ nzute ahụ. 13 Akwa mgbochi ahụ ga-eji ihe ruru ọkara mita nʼogologo karịa nʼakụkụ abụọ. Ụma ndị a mapụtara ga-akwụdata nʼakụkụ abụọ nke ụlọ nzute ahụ ikpuchi ya. 14 Ị ga-eji akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie mee ihe mkpuchi maka ụlọ nzute ahụ, ya na akwa mkpuchi ọzọ nke e ji akpụkpọ ehi mmiri mee maka ikpukwasị nʼelu ya. 15 “Ị ga-emere ụlọ nzute ahụ mbudo ibo osisi akashia, guzo ọtọ. 16 Mbudo ibo ọbụla ga-adị mita anọ na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita asaa nʼobosara. 17 Mbudo ibo ndị a ga-enwe ihe nhịọnye abụọ nke ga-abanye nʼime ibe ya ijikọ ha nʼotu. Ị ga-arụ mbudo ibo ụlọ nzute ahụ niile otu a. 18 Ị ga-arụ mbudo ibo iri abụọ maka akụkụ ndịda nke ụlọ nzute ahụ. 19 Meekwa iri ụkwụ ọlaọcha anọ nʼokpuru ha. Otu mbudo ibo ga-enwe ụkwụ abụọ, otu ụkwụ nʼokpuru otu ihe nhịọnye, otu ụkwụ nʼokpuru ihe nhịọnye nke ọzọ. 20 Nʼakụkụ nke ọzọ, bụ akụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ, ị ga-arụkwa iri mbudo ibo abụọ. 21 Rụkwaa iri ụkwụ ọlaọcha anọ, ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla. 22 Nʼebe isi isi nsọtụ, ya bụ akụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute, ị ga-arụ mbudo ibo isii. 23 Rụọ mbudo ibo abụọ, ga-adị na nkuku niile nke nsọtụ ụlọ nzute ahụ. 24 Nʼisi nkuku abụọ ndị a, ha ga-anọ iche iche site nʼokpuru ruo nʼelu ya, ma a ga-ejikọ ha ọnụ nʼime otu mgbaaka, ha abụọ ga-adị otu ahụ. 25 Ha niile ga-adị mbudo ibo asatọ na ụkwụ ọlaọcha dị iri na isii, ya bụ ụkwụ abụọ nʼokpuru mbudo ibo ọbụla. 26 “Jiri osisi akashia mee osisi ntụbichi, ise maka mbudo ibo ndị dị nʼotu akụkụ nke ụlọ nzute, 27 ise nke ọzọ maka ndị dị nʼakụkụ nke ọzọ, ise nke ọzọ maka mbudo ibo dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, nʼebe ndịda ndịda nke ụlọ nzute ahụ. 28 Osisi ntụbichi nke dị nʼetiti ga-esite nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ nke mbudo ibo ahụ. 29 Jiri ọlaedo machie mbudo ibo ndị ahụ niile, kpụọ mgbaaka ọlaedo ka ọ bụrụ ọnọdụ ịchịkọta osisi ntụbichi ndị a. Jirikwa ọlaedo machie osisi ntụbichi ndị a. 30 “Guzobe ụlọ nzute a nʼusoro dịka ụdịdị ihe ahụ m ziri gị nʼelu ugwu si dị. 31 “Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya. 32 Were anya nko ọlaedo kwụba ya nʼelu ogidi osisi akashia anọ nke e ji ọlaedo machie, mee ka o guzoro nʼelu ụkwụ ọlaọcha anọ. 33 Konye akwa mgbochi ahụ na nko ndị ahụ, ma dọnye igbe ihe ama ahụ nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Akwa mgbochi ahụ ga-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ site nʼEbe Kachasị Nsọ. 34 Tinye ihe mkpuchi mmehie ahụ nʼelu igbe ihe ama nʼime Ebe Kachasị Nsọ. 35 Dọnye tebul ahụ na mpụta nke akwa mgbochi ahụ, nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. Dọnyekwa ihe ịdọkwasị iheọkụ na ncherita ihu tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda. 36 “Ị ga-eme akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ nke eji ogho na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka. 37 Ị ga-arụrụ akwa mgbochi a anya nko ọlaedo na ogidi ise nke osisi akashia nke e ji ọlaedo machie. Ị ga-arụkwa ụkwụ bronz ise maka ha.

In Other Versions

Exodus 26 in the ANGEFD

Exodus 26 in the ANTPNG2D

Exodus 26 in the AS21

Exodus 26 in the BAGH

Exodus 26 in the BBPNG

Exodus 26 in the BBT1E

Exodus 26 in the BDS

Exodus 26 in the BEV

Exodus 26 in the BHAD

Exodus 26 in the BIB

Exodus 26 in the BLPT

Exodus 26 in the BNT

Exodus 26 in the BNTABOOT

Exodus 26 in the BNTLV

Exodus 26 in the BOATCB

Exodus 26 in the BOATCB2

Exodus 26 in the BOBCV

Exodus 26 in the BOCNT

Exodus 26 in the BOECS

Exodus 26 in the BOGWICC

Exodus 26 in the BOHCB

Exodus 26 in the BOHCV

Exodus 26 in the BOHLNT

Exodus 26 in the BOHNTLTAL

Exodus 26 in the BOILNTAP

Exodus 26 in the BOITCV

Exodus 26 in the BOKCV

Exodus 26 in the BOKCV2

Exodus 26 in the BOKHWOG

Exodus 26 in the BOKSSV

Exodus 26 in the BOLCB

Exodus 26 in the BOLCB2

Exodus 26 in the BOMCV

Exodus 26 in the BONAV

Exodus 26 in the BONCB

Exodus 26 in the BONLT

Exodus 26 in the BONUT2

Exodus 26 in the BOPLNT

Exodus 26 in the BOSCB

Exodus 26 in the BOSNC

Exodus 26 in the BOTLNT

Exodus 26 in the BOVCB

Exodus 26 in the BOYCB

Exodus 26 in the BPBB

Exodus 26 in the BPH

Exodus 26 in the BSB

Exodus 26 in the CCB

Exodus 26 in the CUV

Exodus 26 in the CUVS

Exodus 26 in the DBT

Exodus 26 in the DGDNT

Exodus 26 in the DHNT

Exodus 26 in the DNT

Exodus 26 in the ELBE

Exodus 26 in the EMTV

Exodus 26 in the ESV

Exodus 26 in the FBV

Exodus 26 in the FEB

Exodus 26 in the GGMNT

Exodus 26 in the GNT

Exodus 26 in the HARY

Exodus 26 in the HNT

Exodus 26 in the IRVA

Exodus 26 in the IRVB

Exodus 26 in the IRVG

Exodus 26 in the IRVH

Exodus 26 in the IRVK

Exodus 26 in the IRVM

Exodus 26 in the IRVM2

Exodus 26 in the IRVO

Exodus 26 in the IRVP

Exodus 26 in the IRVT

Exodus 26 in the IRVT2

Exodus 26 in the IRVU

Exodus 26 in the ISVN

Exodus 26 in the JSNT

Exodus 26 in the KAPI

Exodus 26 in the KBT1ETNIK

Exodus 26 in the KBV

Exodus 26 in the KJV

Exodus 26 in the KNFD

Exodus 26 in the LBA

Exodus 26 in the LBLA

Exodus 26 in the LNT

Exodus 26 in the LSV

Exodus 26 in the MAAL

Exodus 26 in the MBV

Exodus 26 in the MBV2

Exodus 26 in the MHNT

Exodus 26 in the MKNFD

Exodus 26 in the MNG

Exodus 26 in the MNT

Exodus 26 in the MNT2

Exodus 26 in the MRS1T

Exodus 26 in the NAA

Exodus 26 in the NASB

Exodus 26 in the NBLA

Exodus 26 in the NBS

Exodus 26 in the NBVTP

Exodus 26 in the NET2

Exodus 26 in the NIV11

Exodus 26 in the NNT

Exodus 26 in the NNT2

Exodus 26 in the NNT3

Exodus 26 in the PDDPT

Exodus 26 in the PFNT

Exodus 26 in the RMNT

Exodus 26 in the SBIAS

Exodus 26 in the SBIBS

Exodus 26 in the SBIBS2

Exodus 26 in the SBICS

Exodus 26 in the SBIDS

Exodus 26 in the SBIGS

Exodus 26 in the SBIHS

Exodus 26 in the SBIIS

Exodus 26 in the SBIIS2

Exodus 26 in the SBIIS3

Exodus 26 in the SBIKS

Exodus 26 in the SBIKS2

Exodus 26 in the SBIMS

Exodus 26 in the SBIOS

Exodus 26 in the SBIPS

Exodus 26 in the SBISS

Exodus 26 in the SBITS

Exodus 26 in the SBITS2

Exodus 26 in the SBITS3

Exodus 26 in the SBITS4

Exodus 26 in the SBIUS

Exodus 26 in the SBIVS

Exodus 26 in the SBT

Exodus 26 in the SBT1E

Exodus 26 in the SCHL

Exodus 26 in the SNT

Exodus 26 in the SUSU

Exodus 26 in the SUSU2

Exodus 26 in the SYNO

Exodus 26 in the TBIAOTANT

Exodus 26 in the TBT1E

Exodus 26 in the TBT1E2

Exodus 26 in the TFTIP

Exodus 26 in the TFTU

Exodus 26 in the TGNTATF3T

Exodus 26 in the THAI

Exodus 26 in the TNFD

Exodus 26 in the TNT

Exodus 26 in the TNTIK

Exodus 26 in the TNTIL

Exodus 26 in the TNTIN

Exodus 26 in the TNTIP

Exodus 26 in the TNTIZ

Exodus 26 in the TOMA

Exodus 26 in the TTENT

Exodus 26 in the UBG

Exodus 26 in the UGV

Exodus 26 in the UGV2

Exodus 26 in the UGV3

Exodus 26 in the VBL

Exodus 26 in the VDCC

Exodus 26 in the YALU

Exodus 26 in the YAPE

Exodus 26 in the YBVTP

Exodus 26 in the ZBP