Exodus 9 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya, “Jekwuru Fero sị ya. ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ Chineke ndị Hibru kwuru, “Hapụ ndị m ka ha gaa fee m.” 2 Ọ bụrụ na ị jụ, ma gaa nʼihu igbochi ha, 3 aka ONYENWE ANYỊ ga-ewebata oke ọrịa na-efe efe nke ga-abịakwasị igwe anụ ụlọ unu niile dị nʼubi. Ya bụ, ịnyịnya unu, na ịnyịnya ibu unu, na ịnyịnya kamel unu, na ehi unu, na atụrụ unu na ewu unu. 4 ONYENWE ANYỊ ga-akpa oke nʼetiti anụ ụlọ ndị Ijipt na nke ndị Izrel. Nʼihi ya, o nweghị anụ ụlọ ọbụla si nʼetiti anụ ụlọ ndị Izrel ga-anwụ.’ ” 5 ONYENWE ANYỊ ekwuola oge nke a ga-amalite sị, “Echi ka ONYENWE ANYỊ ga-eme ihe dị otu a nʼala a.” 6 Nʼụtụtụ echi ya, ONYENWE ANYỊ mere dịka o kwuru. Igwe anụ ụlọ niile dị nʼIjipt nwụrụ. Ma ọ dịghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. 7 Mgbe ahụ Fero zipụrụ ndị mmadụ ndị gara chọpụta na o nweghị otu nʼime anụ ụlọ ụmụ Izrel nwụrụ. Ma ọ bụladị mgbe ọ chọpụtara na nke a bụ eziokwu, ọ gbanweghị obi ya, ọ nọgidere jụ ikwe ka ndị Izrel laa. 8 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn sị, “Sitenụ nʼekwu e ji esi nri kporo ntụ nke Mosis ga-awụli elu nʼihu Fero. 9 Ntụ ahụ ga-efesasị, dịka uzuzu nʼala Ijipt niile. Ọ ga-ebute etuto nke ga-aghọ ọnya nʼahụ ndị mmadụ na ụmụ anụmanụ dị iche iche dị nʼala ahụ niile.” 10 Mosis na Erọn kpooro ntụ gaa guzo nʼihu Fero. Mgbe Fero nọ na-ele anya Mosis wụliri ntụ ahụ elu. Ọ ghọrọ etuto, nke gbawara ghọọ ọnya nʼahụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ niile. 11 Ndị majiki Ijipt enweghị ike iguzo nʼihu Mosis, nʼihi etuto ndị jupụtara ha nʼahụ dịka ọ dị nʼahụ ndị Ijipt ndị ọzọ. 12 Ma ONYENWE ANYỊ mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na ọ ga-eme. 13 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis ọzọ sị, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi gaa gwa Fero okwu sị ya, ‘Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ Chineke ndị Hibru kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe. 14 Ma ọ bụghị ya, nʼoge a, aga m ezite ọrịa ọjọọ niile nke na-efe efe, ka ha bịakwasị gị, na ndị na-ejere gị ozi, na ndị Ijipt niile. Nke a ga-eme ka unu ghọta na ọ dịghị Onye ọzọ dịka m nʼelu ụwa niile. 15 Nʼihi na tupu oge a, agaara m esetipụ aka m, jiri ajọ ọrịa tie gị na ndị gị niile nke ga-egbuchapụ unu site nʼelu ụwa. 16 Ma ọ bụ nʼihi nke a ka m ji guzobe gị, ka m gosipụta ike m nʼebe ịnọ, ka e nwe ike kwusaa aha m nʼụwa niile. 17 Ma ị nọ na-ebuli onwe gị elu megide ndị m, jụ na ha agaghị ala. 18 Ya mere, nʼoge dịka oge a echi, aga m ezipu oke ifufe nke ya na akụmmiri igwe so nʼala Ijipt niile. Ụdị ifufe a adịbeghị mbụ nʼala Ijipt, malite nʼoge a tọrọ ntọala ya rute ugbu a. 19 Ya mere, nye iwu ka a gaa ngwangwa nʼubi unu webata anụ ụlọ unu na ihe ndị ọzọ unu nwere nʼebe a ga-echebe ha, nʼihi na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-egbu mmadụ na anụ ụlọ ọbụla a hapụrụ nʼezi.’ ” 20 Ụfọdụ ndị na-ejere Fero ozi, ndị na-atụ okwu ONYENWE ANYỊ egwu mere ngwangwa gaa dulata anụ ụlọ ha, na ndị ohu ha. 21 Ma ndị ahụ na-enweghị nrube isi nye okwu ONYENWE ANYỊ hapụrụ ndị ohu ha nakwa anụ ụlọ ha nʼọhịa. 22 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis, “Setịpụ aka gị nʼeluigwe. Nke a ga-eme ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so malite izokwasị ala Ijipt niile, na ụmụ mmadụ, na anụmanụ, na ihe niile a kụrụ nʼubi nʼIjipt.” 23 Mgbe Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼihu eluigwe, ONYENWE ANYỊ zidatara egbe eluigwe na oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so. Amụma egbe eluigwe chakwara nʼala. Ya mere, ONYENWE ANYỊ zidatara oke ifufe nke ya na mkpụrụ mmiri so nʼala Ijipt. 24 Mkpụrụ mmiri dara, amụma gbukwara nʼihu nakwa nʼazụ. Nʼezie, ọ bụ oke ifufe dị njọ, ụdị nke a na-ahụtụbeghị nʼala Ijipt kemgbe ọ ghọrọ nnukwu mba. 25 Mkpụrụ mmiri ahụ tigburu ihe niile dị nʼọhịa, ma mmadụ ma anụmanụ niile dị nʼala Ijipt. O feturu ihe niile na-epu nʼubi, ma ahịhịa niile dị nʼosisi. 26 Ma akụkụ ebe mkpụrụ mmiri ndị a na-erughị bụ naanị Goshen, ebe ụmụ Izrel bi. 27 Mgbe ahụ Fero ziri ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. O kwupụtara nʼihu ha sị, “Nʼoge a, emehiela m. ONYENWE ANYỊ bụ onye ezi omume, mụ na ndị m bụ ndị mejọrọ. 28 Kpee ekpere rịọọ ONYENWE ANYỊ nʼihi na oke mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe a ezuola. Aga m ekwe ka unu gaa, unu agaghị atụfukwa mgbe.” 29 Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke ONYENWE ANYỊ. 30 Ma amaara m na gị onwe gị na ndị na-ejere gị ozi adịghị atụ ONYENWE ANYỊ Chineke egwu.” 31 Oke ifufe ahụ nke ya na mkpụrụ mmiri so mebiri ihe a kụrụ nʼubi, dịka flakisi na ọka balị. Nʼihi na nʼoge a, ọka balị emenyela isi, flakisi etojuokwala maa ifuru. 32 Ma ifufe na mmiri ukwu ahụ emebighị ọka wiiti na spelti, nʼihi na ha achabeghị. 33 Mosis hapụrụ Fero si nʼobodo ahụ pụọ. Ọ gbasapụrụ aka ya abụọ nʼihu ONYENWE ANYỊ, egbe eluigwe na mkpụrụ mmiri ahụ kwụsịrị. Mmiri ozuzo kwụsịkwara izo nʼala ahụ. 34 Mgbe Fero hụrụ na mmiri ozuzo na mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe akwụsịla, o mehiere ọzọ. Ya na ndị na-ejere ya ozi gara nʼihu nyịchie obi ha. 35 Ya mere, Fero mere ka obi ya sie ike. Ọ jụrụ ikwere ka ụmụ Izrel pụọ, dịka ONYENWE ANYỊ gwararịị Mosis.

In Other Versions

Exodus 9 in the ANGEFD

Exodus 9 in the ANTPNG2D

Exodus 9 in the AS21

Exodus 9 in the BAGH

Exodus 9 in the BBPNG

Exodus 9 in the BBT1E

Exodus 9 in the BDS

Exodus 9 in the BEV

Exodus 9 in the BHAD

Exodus 9 in the BIB

Exodus 9 in the BLPT

Exodus 9 in the BNT

Exodus 9 in the BNTABOOT

Exodus 9 in the BNTLV

Exodus 9 in the BOATCB

Exodus 9 in the BOATCB2

Exodus 9 in the BOBCV

Exodus 9 in the BOCNT

Exodus 9 in the BOECS

Exodus 9 in the BOGWICC

Exodus 9 in the BOHCB

Exodus 9 in the BOHCV

Exodus 9 in the BOHLNT

Exodus 9 in the BOHNTLTAL

Exodus 9 in the BOILNTAP

Exodus 9 in the BOITCV

Exodus 9 in the BOKCV

Exodus 9 in the BOKCV2

Exodus 9 in the BOKHWOG

Exodus 9 in the BOKSSV

Exodus 9 in the BOLCB

Exodus 9 in the BOLCB2

Exodus 9 in the BOMCV

Exodus 9 in the BONAV

Exodus 9 in the BONCB

Exodus 9 in the BONLT

Exodus 9 in the BONUT2

Exodus 9 in the BOPLNT

Exodus 9 in the BOSCB

Exodus 9 in the BOSNC

Exodus 9 in the BOTLNT

Exodus 9 in the BOVCB

Exodus 9 in the BOYCB

Exodus 9 in the BPBB

Exodus 9 in the BPH

Exodus 9 in the BSB

Exodus 9 in the CCB

Exodus 9 in the CUV

Exodus 9 in the CUVS

Exodus 9 in the DBT

Exodus 9 in the DGDNT

Exodus 9 in the DHNT

Exodus 9 in the DNT

Exodus 9 in the ELBE

Exodus 9 in the EMTV

Exodus 9 in the ESV

Exodus 9 in the FBV

Exodus 9 in the FEB

Exodus 9 in the GGMNT

Exodus 9 in the GNT

Exodus 9 in the HARY

Exodus 9 in the HNT

Exodus 9 in the IRVA

Exodus 9 in the IRVB

Exodus 9 in the IRVG

Exodus 9 in the IRVH

Exodus 9 in the IRVK

Exodus 9 in the IRVM

Exodus 9 in the IRVM2

Exodus 9 in the IRVO

Exodus 9 in the IRVP

Exodus 9 in the IRVT

Exodus 9 in the IRVT2

Exodus 9 in the IRVU

Exodus 9 in the ISVN

Exodus 9 in the JSNT

Exodus 9 in the KAPI

Exodus 9 in the KBT1ETNIK

Exodus 9 in the KBV

Exodus 9 in the KJV

Exodus 9 in the KNFD

Exodus 9 in the LBA

Exodus 9 in the LBLA

Exodus 9 in the LNT

Exodus 9 in the LSV

Exodus 9 in the MAAL

Exodus 9 in the MBV

Exodus 9 in the MBV2

Exodus 9 in the MHNT

Exodus 9 in the MKNFD

Exodus 9 in the MNG

Exodus 9 in the MNT

Exodus 9 in the MNT2

Exodus 9 in the MRS1T

Exodus 9 in the NAA

Exodus 9 in the NASB

Exodus 9 in the NBLA

Exodus 9 in the NBS

Exodus 9 in the NBVTP

Exodus 9 in the NET2

Exodus 9 in the NIV11

Exodus 9 in the NNT

Exodus 9 in the NNT2

Exodus 9 in the NNT3

Exodus 9 in the PDDPT

Exodus 9 in the PFNT

Exodus 9 in the RMNT

Exodus 9 in the SBIAS

Exodus 9 in the SBIBS

Exodus 9 in the SBIBS2

Exodus 9 in the SBICS

Exodus 9 in the SBIDS

Exodus 9 in the SBIGS

Exodus 9 in the SBIHS

Exodus 9 in the SBIIS

Exodus 9 in the SBIIS2

Exodus 9 in the SBIIS3

Exodus 9 in the SBIKS

Exodus 9 in the SBIKS2

Exodus 9 in the SBIMS

Exodus 9 in the SBIOS

Exodus 9 in the SBIPS

Exodus 9 in the SBISS

Exodus 9 in the SBITS

Exodus 9 in the SBITS2

Exodus 9 in the SBITS3

Exodus 9 in the SBITS4

Exodus 9 in the SBIUS

Exodus 9 in the SBIVS

Exodus 9 in the SBT

Exodus 9 in the SBT1E

Exodus 9 in the SCHL

Exodus 9 in the SNT

Exodus 9 in the SUSU

Exodus 9 in the SUSU2

Exodus 9 in the SYNO

Exodus 9 in the TBIAOTANT

Exodus 9 in the TBT1E

Exodus 9 in the TBT1E2

Exodus 9 in the TFTIP

Exodus 9 in the TFTU

Exodus 9 in the TGNTATF3T

Exodus 9 in the THAI

Exodus 9 in the TNFD

Exodus 9 in the TNT

Exodus 9 in the TNTIK

Exodus 9 in the TNTIL

Exodus 9 in the TNTIN

Exodus 9 in the TNTIP

Exodus 9 in the TNTIZ

Exodus 9 in the TOMA

Exodus 9 in the TTENT

Exodus 9 in the UBG

Exodus 9 in the UGV

Exodus 9 in the UGV2

Exodus 9 in the UGV3

Exodus 9 in the VBL

Exodus 9 in the VDCC

Exodus 9 in the YALU

Exodus 9 in the YAPE

Exodus 9 in the YBVTP

Exodus 9 in the ZBP