Ezekiel 20 (BOICB)

1 O ruo, nʼọgwụgwụ ọnwa ise, nʼafọ nke asaa, ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel bịara ịjụta ONYENWE ANYỊ ase. Ha nọdụrụ ala nʼihu m. 2 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 3 “Nwa nke mmadụ, gwa ndị okenye Izrel okwu sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ajụ, Ọ bụ ịjụpụta ase nʼaka m ka unu bịara? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase ọbụla, ọ bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ 4 “Ị ga-ekpe ha ikpe? Ị ga-ekpe ha ikpe, nwa nke mmadụ? Mee ka ha mara banyere ihe arụ niile nna nna ha mere. 5 Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, nʼụbọchị m họpụtara Izrel, eweliri m aka m ṅụọrọ ya na ụmụ ya bụ ụlọ Jekọb iyi ma kpugheekwa onwe m gosi ha nʼala Ijipt. Site nʼiweli aka m, agwara m ha okwu sị, “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu.” 6 Nʼụbọchị ahụ, aṅụụrụ m ha iyi na m ga-esi nʼala Ijipt dupụta ha baa nʼala nke m chọpụtara ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, bụ ala nke kachasị ibe ya mma. 7 Mgbe ahụ, agwara m ha, “Onye ọbụla nʼime unu, wezuganụ oyiyi ihe arụ niile ndị ahụ bụ nke unu legidere anya, unu ejikwala arụsị niile nke Ijipt merụọ onwe unu. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu.” 8 “ ‘Ma ha nupuru isi megide m. Ha aṅaghị m ntị. Ha ewezugakwaghị oyiyi ihe arụ ndị a, bụ nke ha lekwasịrị anya, maọbụ hapụkwanụ arụsị niile nke ndị Ijipt. Nʼihi ya, aga m awụkwasị ha oke iwe m, meekwa ka iwe m zuo oke nʼahụ ha nʼIjipt. 9 Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha. 10 Nʼihi ya, esitere m nʼIjipt dupụta ha, dubata ha nʼọzara. 11 Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ. 12 Ọzọ, e nyekwara m ha ụbọchị izuike, ka ọ bụrụ ihe ịrịbama dị nʼetiti mụ na ha, ka ha maara na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, na-edo ha nsọ. 13 “ ‘Ma ụlọ nke Izrel nupuru isi megide m. Nʼime ọzara ahụ, ha jụrụ idebe iwu m. Ha agbasoghị usoro m, ọ bụ ezie na ịgbaso ya pụtara ịdị ndụ. Ha edebeghị ụbọchị izuike m nsọ. Nʼihi ya, ekpebikwara m na m ga-awụkwasị ha iwe ọkụ m, ka m kpochapụ ha nʼime ọzara. 14 Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha. 15 Ma nʼime ọzara ahụ, eweliri m aka ṅụọrọ ha iyi na m agaghị eduba ha nʼala ahụ m nyere ha, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ala ahụ kachasị ala niile ọzọ dị nʼụwa mma. 16 Nʼihi na ha jụrụ iwu m, ha jụkwara ịgbaso ụkpụrụ m niile. Ha merụrụ ụbọchị izuike m, nʼihi na obi ha niile dị nʼebe arụsị ha dị. 17 Ma eji m obi ebere lee ha anya ma ghara ịla ha nʼiyi. Ekpochapụghị m ha nʼọzara. 18 Mgbe ahụ, agwara m ụmụ ha okwu nʼọzara, “Unu agbasola nzọ ụkwụ nna unu ha maọbụ debe iwu ha maọbụ jiri arụsị ha merụọ onwe unu. 19 Mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke gị. Gbasoonụ iwu m niile, lezie anya ka ị sorokwa ụzọ m niile. 20 Doonụ ụbọchị izuike m nsọ, ka ha ghọọkwa ihe ịrịbama nʼetiti mụ na unu. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe na Chineke unu.” 21 “ ‘Ma ụmụ ahụ nupuru isi megide m. Ha ejegharịghị nʼụkpụrụ m, ha elezighị anya ka ha debe iwu nke m kwuru banyere ha, “Na onye ọbụla na-erubere ha isi ga-adị ndụ site na ha,” ha merụrụ ụbọchị izuike m. Nʼihi ya, asịrị m, Aga m awụkwasị ha ọnụma m, mezuokwa iwe m megide ha nʼọzara. 22 Ọzọkwa, eseghachiri m aka m, nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha 23 E jikwa m iweli aka elu ṅụọrọ ha iyi nʼime ọzara, na m ga-achụsasị ha nʼetiti mba niile, mee ka ha gbasaa nʼakụkụ niile nke ụwa, 24 nʼihi na ha edebeghị iwu m, kama ha jụrụ ụkpụrụ niile, lelịa ma merụọkwa ụbọchị izuike m. Naanị ihe na-agụ ha bụ arụsị niile nke nna ha. 25 Ahapụrụ m ha ka ha nabatara onwe ha iwu na omenaala dị iche iche nke na-abaghị uru. Nʼihi na site nʼidebe omenaala ndị a, ha apụghị inweta ndụ. 26 E merụrụ ha site nʼonyinye ha, bụ, iji nwa mbụ ọbụla chụọ aja, ka m si otu a menye ha egwu ka ha mara na mụ onwe m bụ Onyenwe.’ 27 “Ya mere, nwa nke mmadụ, gwa ụlọ Izrel okwu, sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Nna unu ha kwuluru m na nke a, site na-ekwesighị ntụkwasị obi nye m. 28 Mgbe m dubatara ha nʼala ahụ nke m ṅụrụ nʼiyi inye ha, ha hụrụ ugwu dị elu maọbụ osisi nwere ọtụtụ akwụkwọ, ebe ahụ ha chụrụ aja ha, nyekwa onyinye ha, si otu a kpasuo m iwe. Ha doro ha ihe ndị ahụ niile na-esi isi ụtọ, wụsakwara ha aja ihe ọṅụṅụ 29 Ya mere a jụrụ m ha, Gịnị ka a na-akpọ ebe ịchụ aja a unu na-aga?’ ” (A na-akpọ ya Baama ruo taa.) 30 “Nʼihi nke a, gwa ụlọ Izrel, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Unu ọ ga-emerụ onwe unu dịka nna nna unu ha mere site nʼịchụso oyiyi ihe arụ ha dị iche iche? 31 Mgbe unu na-enye onyinye unu, na-eme ka ụmụ unu site nʼọkụ gafee, unu na-aga nʼihu jiri arụsị unu niile na-emerụ onwe unu ruo taa. Mụ onwe m, m ga-ekwe ka unu jụta m ase, O ụlọ Izrel? Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri, agaghị m ekwe ka unu jụọ m ase. 32 “ ‘Unu na-ekwu nʼobi unu sị, “Anyị chọrọ ịdị ka mba ndị ọzọ, dịka agbụrụ ndị ọzọ nọ nʼụwa, ndị na-akpọ isiala nye osisi na nkume.” Ma ihe unu bu nʼobi agaghị emezu. 33 Dịka m na-adị ndụ, aga m eji aka ike na ogwe aka e setịrị eseti nakwa nwụpụ nke oke iwe m chịa unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 34 Aga m akpọpụta unu site na mba dị iche iche, chịkọtaa unu site na mba ndị ahụ a chụsasịrị unu. Ọ bụ aka m dị ike, aka m setịpụrụ na ọnụma a wụpụrụ ka m ga-eji mee ya. 35 Aga m akpọbata unu nʼọzara nke mba niile, nọdụ nʼebe ahụ kpee unu ikpe nʼihu nʼihu. 36 Dịka m kpere nna nna unu ha ikpe nʼọzara nke dị nʼala Ijipt, otu a ka m ga-esi kpee unu ikpe, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 37 Aga m eme ka unu si nʼokpuru mkpanaka m gafee, aga m akpọbata unu na njikọ nke ọgbụgba ndụ ahụ. 38 Aga m esi nʼetiti unu wezuga ndị na-ekwe ntị ike ma na-enupu isi megide m. Ọ bụ ezie na m ga-akpọpụta ha site nʼala ahụ ha bi, ma ha agaghị abata nʼala Izrel. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 39 “ ‘Ma banyere unu, bụ ụlọ Izrel, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Gaanụ fee arụsị unu niile dị iche iche, onye ọbụla nʼime unu. Ma emesịa, unu aghaghị ịṅa m ntị, ọ dịghịkwa mgbe unu ga-eji onyinye na arụsị unu niile merụọ aha nsọ m. 40 Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu m dị nsọ, nke bụ elu ugwu ukwu nke Izrel, ka Izrel niile ga-anọ fee m. Nʼebe ahụ ka m ga-anọkwa nabata onyinye unu na onyinye pụrụ iche unu, na aja nsọ unu dị iche iche. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 41 Aga m anabatakwa unu dịka onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, mgbe m si na mba dị iche iche kpọlata unu, mgbe m ga-achịkọta unu site nʼobodo ahụ niile a chụgara unu. Mgbe ahụ, mba niile ga-amata na m dị nsọ. 42 Mgbe m mere ka unu lọta nʼala Izrel, bụ ala ahụ m weliri aka elu ṅụọ iyi inye nna nna unu ha, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 43 Nʼebe ahụ, unu ga-echeta obibi ndụ na omume mmehie niile unu ji merụọ onwe unu. Unu ga-asọkwa onwe unu oyi, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere. 44 Unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, mgbe m mesochara unu mmeso nʼihi aha m, na-agụghị ajọ omume unu maọbụ otu ụzọ ọjọọ niile unu si dị, unu bụ ụlọ Izrel. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara.’ ” 45 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 46 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ ndịda. Kwuokwa okwu megide ala ahụ dị na ndịda, na oke ọhịa niile dị na ndịda. 47 Sị oke ọhịa ndịda ahụ, ‘Nụrụ okwu nke ONYENWE ANYỊ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ana m akwado isunye gị ọkụ, nke ga-erechapụ osisi niile dị nʼime gị, ma ndị dị ndụ ma ndị kpọnwụrụ akpọnwụ. A pụghị imenyụ oke ọkụ ahụ, ọ ga-erechapụkwa ihu niile site na ndịda ruo nʼugwu niile. 48 Ihe niile bụ mmadụ, ga-ahụ na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, sunyere ọkụ ahụ. A gaghị emenyụkwa ya.’ ” 49 Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ ha na-ekwu banyere m, sị, ‘Ọ bụghị naanị ilu ka ọ na-atụ?’ ”

In Other Versions

Ezekiel 20 in the ANGEFD

Ezekiel 20 in the ANTPNG2D

Ezekiel 20 in the AS21

Ezekiel 20 in the BAGH

Ezekiel 20 in the BBPNG

Ezekiel 20 in the BBT1E

Ezekiel 20 in the BDS

Ezekiel 20 in the BEV

Ezekiel 20 in the BHAD

Ezekiel 20 in the BIB

Ezekiel 20 in the BLPT

Ezekiel 20 in the BNT

Ezekiel 20 in the BNTABOOT

Ezekiel 20 in the BNTLV

Ezekiel 20 in the BOATCB

Ezekiel 20 in the BOATCB2

Ezekiel 20 in the BOBCV

Ezekiel 20 in the BOCNT

Ezekiel 20 in the BOECS

Ezekiel 20 in the BOGWICC

Ezekiel 20 in the BOHCB

Ezekiel 20 in the BOHCV

Ezekiel 20 in the BOHLNT

Ezekiel 20 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 20 in the BOILNTAP

Ezekiel 20 in the BOITCV

Ezekiel 20 in the BOKCV

Ezekiel 20 in the BOKCV2

Ezekiel 20 in the BOKHWOG

Ezekiel 20 in the BOKSSV

Ezekiel 20 in the BOLCB

Ezekiel 20 in the BOLCB2

Ezekiel 20 in the BOMCV

Ezekiel 20 in the BONAV

Ezekiel 20 in the BONCB

Ezekiel 20 in the BONLT

Ezekiel 20 in the BONUT2

Ezekiel 20 in the BOPLNT

Ezekiel 20 in the BOSCB

Ezekiel 20 in the BOSNC

Ezekiel 20 in the BOTLNT

Ezekiel 20 in the BOVCB

Ezekiel 20 in the BOYCB

Ezekiel 20 in the BPBB

Ezekiel 20 in the BPH

Ezekiel 20 in the BSB

Ezekiel 20 in the CCB

Ezekiel 20 in the CUV

Ezekiel 20 in the CUVS

Ezekiel 20 in the DBT

Ezekiel 20 in the DGDNT

Ezekiel 20 in the DHNT

Ezekiel 20 in the DNT

Ezekiel 20 in the ELBE

Ezekiel 20 in the EMTV

Ezekiel 20 in the ESV

Ezekiel 20 in the FBV

Ezekiel 20 in the FEB

Ezekiel 20 in the GGMNT

Ezekiel 20 in the GNT

Ezekiel 20 in the HARY

Ezekiel 20 in the HNT

Ezekiel 20 in the IRVA

Ezekiel 20 in the IRVB

Ezekiel 20 in the IRVG

Ezekiel 20 in the IRVH

Ezekiel 20 in the IRVK

Ezekiel 20 in the IRVM

Ezekiel 20 in the IRVM2

Ezekiel 20 in the IRVO

Ezekiel 20 in the IRVP

Ezekiel 20 in the IRVT

Ezekiel 20 in the IRVT2

Ezekiel 20 in the IRVU

Ezekiel 20 in the ISVN

Ezekiel 20 in the JSNT

Ezekiel 20 in the KAPI

Ezekiel 20 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 20 in the KBV

Ezekiel 20 in the KJV

Ezekiel 20 in the KNFD

Ezekiel 20 in the LBA

Ezekiel 20 in the LBLA

Ezekiel 20 in the LNT

Ezekiel 20 in the LSV

Ezekiel 20 in the MAAL

Ezekiel 20 in the MBV

Ezekiel 20 in the MBV2

Ezekiel 20 in the MHNT

Ezekiel 20 in the MKNFD

Ezekiel 20 in the MNG

Ezekiel 20 in the MNT

Ezekiel 20 in the MNT2

Ezekiel 20 in the MRS1T

Ezekiel 20 in the NAA

Ezekiel 20 in the NASB

Ezekiel 20 in the NBLA

Ezekiel 20 in the NBS

Ezekiel 20 in the NBVTP

Ezekiel 20 in the NET2

Ezekiel 20 in the NIV11

Ezekiel 20 in the NNT

Ezekiel 20 in the NNT2

Ezekiel 20 in the NNT3

Ezekiel 20 in the PDDPT

Ezekiel 20 in the PFNT

Ezekiel 20 in the RMNT

Ezekiel 20 in the SBIAS

Ezekiel 20 in the SBIBS

Ezekiel 20 in the SBIBS2

Ezekiel 20 in the SBICS

Ezekiel 20 in the SBIDS

Ezekiel 20 in the SBIGS

Ezekiel 20 in the SBIHS

Ezekiel 20 in the SBIIS

Ezekiel 20 in the SBIIS2

Ezekiel 20 in the SBIIS3

Ezekiel 20 in the SBIKS

Ezekiel 20 in the SBIKS2

Ezekiel 20 in the SBIMS

Ezekiel 20 in the SBIOS

Ezekiel 20 in the SBIPS

Ezekiel 20 in the SBISS

Ezekiel 20 in the SBITS

Ezekiel 20 in the SBITS2

Ezekiel 20 in the SBITS3

Ezekiel 20 in the SBITS4

Ezekiel 20 in the SBIUS

Ezekiel 20 in the SBIVS

Ezekiel 20 in the SBT

Ezekiel 20 in the SBT1E

Ezekiel 20 in the SCHL

Ezekiel 20 in the SNT

Ezekiel 20 in the SUSU

Ezekiel 20 in the SUSU2

Ezekiel 20 in the SYNO

Ezekiel 20 in the TBIAOTANT

Ezekiel 20 in the TBT1E

Ezekiel 20 in the TBT1E2

Ezekiel 20 in the TFTIP

Ezekiel 20 in the TFTU

Ezekiel 20 in the TGNTATF3T

Ezekiel 20 in the THAI

Ezekiel 20 in the TNFD

Ezekiel 20 in the TNT

Ezekiel 20 in the TNTIK

Ezekiel 20 in the TNTIL

Ezekiel 20 in the TNTIN

Ezekiel 20 in the TNTIP

Ezekiel 20 in the TNTIZ

Ezekiel 20 in the TOMA

Ezekiel 20 in the TTENT

Ezekiel 20 in the UBG

Ezekiel 20 in the UGV

Ezekiel 20 in the UGV2

Ezekiel 20 in the UGV3

Ezekiel 20 in the VBL

Ezekiel 20 in the VDCC

Ezekiel 20 in the YALU

Ezekiel 20 in the YAPE

Ezekiel 20 in the YBVTP

Ezekiel 20 in the ZBP