Ezekiel 21 (BOICB)
1 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel 3 sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume. 4 Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda. 5 Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’ 6 “Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa. 7 Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba, ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya.” 8 Ọzọkwa, okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 9 “Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:“ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha,a mụọla ya, hichakwaa ya. 10 Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị,hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma.“ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya. 11 “ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ,ka e jidekwa ya nʼaka.A mụọla ya, hichazie ya.E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi. 12 Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike,nʼihi na ọ bụ megide ndị mọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile.A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha,ha na ndị m.Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị. 13 “ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ 14 “Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,ka mma agha gbuo ugboro abụọe, ọ bụladị ugboro atọ.Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,nke e debere maka oke ogbugbunke ga-abịachibido ha gburugburu. 15 Ka obi ha gbazee site nʼegwu,ka ndị na-ada ada hie nne,nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niilemaka oke ogbugbu.Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma,etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu. 16 Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla,ma ọ nọ gị nʼaka nrima ọ nọ gị nʼaka ekpe. 17 Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m,ime ka iwe m jụrụ.Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola.” 18 Okwu nke ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 19 “Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ. 20 Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike. 21 Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ, nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ. 22 Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha. 23 Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọ ha mere, dọkpụrụ ha nʼike. 24 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha. 25 “ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula, 26 ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu. 27 Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’ 28 “Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha:“ ‘Lee mma agha, lee mma agha,nke a mịpụtara maka oke ogbugbu.E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa,ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe. 29 Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu,na a jụtakwala ase ụgha banyere unu,a ga-etinye ya nʼolundị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu,bụ ndị ụbọchị ha rurula,ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara. 30 “ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya.Nʼebe ahụ e kere ununʼala nna nna unu ha,Aga m ekpe unu ikpe. 31 Aga m awụkwasị unu ọnụma m,kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m.Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike,ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi. 32 Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ.A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu.Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ,nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ ekwuola.’ ”