Genesis 27 (BOICB)

1 Mgbe Aịzik ghọrọ agadi, nʼoge anya ya na-adịghị ahụzi ụzọ nke ọma, ọ kpọrọ Ịsọ ọkpara ya, sị ya, “Nwa m nwoke.”Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.” 2 Aịzik gwara ya sị, “Ugbu a, emeela m agadi, amakwaghị m ụbọchị ọnwụ m. 3 Ya mere, were ihe ịchụ nta gị, ụta gị na àkụ gị, gaa nʼọhịa, gbutere m anụ. 4 Siere m nri ụtọ otu ahụ o si amasị m, butere m ya ka m rie, ka mụ onwe m gọzie gị tupu m nwụọ.” 5 Ma Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik na-agwa nwa ya Ịsọ okwu. Nke mere na mgbe Ịsọ gawara nʼọhịa ịchụ nta, 6 Ribeka gwara Jekọb nwa ya okwu sị ya, “Lee, anụrụ m ka nna gị na-agwa nwanne gị Ịsọ okwu sị ya, 7 ‘Gaa nʼọhịa gbute anụ, siere m nri ụtọ, ka m nọdụ nʼihu ONYENWE ANYỊ nye gị ngọzị ikpeazụ tupu m nwụọ.’ 8 Ugbu a, nwa m nwoke, gee ntị nke ọma, mee ihe niile m gwara gị. 9 Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya. 10 Ị ga-eburu ya bujere nna gị ka o rie, ka ya onwe ya gọzie gị tupu ọ nwụọ.” 11 Ma Jekọb gwara Ribeka nne ya okwu sị ya, “Nwanne m nwoke Ịsọ bụ onye gbara ajị. Ahụ nke m na-akwọ mụrụmụrụ. 12 Gịnị ga-eme ma nna m metụ m aka nʼahụ? Nʼihi ya, aga m abụ onye na-aghọ ya aghụghọ, aga m esi otu a wetara onwe m ịbụ ọnụ kama ngọzị.” 13 Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.” 14 Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya. 15 Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb. 16 O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ. 17 O bunyere nwa ya nwoke Jekọb nri ahụ na-atọ ụtọ, na achịcha o mere. 18 O jekwuuru nna ya sị ya, “Nna m.”Ọ zara sị, “Ahaa, nwa m, onye ka ị bụ?” 19 Jekọb zara nna ya sị ya, “Abụ m Ịsọ, ọkpara gị. Emeela m ihe ị sị m mee. Biko bilie ka i rie anụ m gbutere nʼọhịa, ka gị onwe gị gọzie m.” 20 Ma Aịzik jụrụ nwa ya nwoke sị, “Olee otu i si chọta ya ngwangwa, nwa m?”Jekọb zara ya sị, “Ọ bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị mere ka ihe gaara m nke ọma.” 21 Mgbe ahụ Aịzik gwara Jekọb sị, “Bịa nso ka m metụ gị aka nwa m nwoke, ka m mata ma ị bụ Ịsọ nʼeziokwu.” 22 Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.” 23 Ọ chọpụtaghị na ọ bụ Jekọb, nʼihi na aka ya dị ajị ajị dịka nke Ịsọ. Ya mere, ọ gọziri ya. 24 Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?”Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.” 25 Mgbe ahụ, Aịzik zara sị ya, “Butere m ụfọdụ nʼime anụ ahụ i gbutere ka m rie, nye gị ngọzị m.”Jekọb butere ya bunye ya. O riri ya. 26 Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.” 27 Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị,“Nʼezie, isisi nwa m nwokedịka isisi ala ubinke ONYENWE ANYỊ gọziri. 28 Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe,na mmanụ nke ala,ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ 29 Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi,ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị.Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ,ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị.Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ,ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.” 30 Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata. 31 Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.” 32 Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?”Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.” 33 Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.” 34 Mgbe Ịsọ nụrụ okwu ndị a si nʼọnụ nna ya, o jiri oke olu kwaa akwa nke obi ilu gwa nna ya sị ya, “Gọzie m, mụ onwe m, nna m.” 35 Ma ọ zara sị ya, “Nwanne gị ejirila ụzọ aghụghọ bịa nara ngọzị gị.” 36 Ịsọ kwuru sị, “E meziri kpọọ ya Jekọb, onye aghụghọ. Lee, ọ ghọgbuola m ugboro abụọ. Nke mbụ, ọ naara m ọnọdụ ịbụ ọkpara m, ugbu a ọ narakwala m ngọzị m.” Ọ jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na i nweghị ngọzị ọ bụla fọdụrụ nke ị ga-agọzi m?” 37 Aịzik zara sị ya, “Emeela m ya ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ị nọ, mee ụmụnna ya niile ndị na-ejere ya ozi. Enyela m ya mkpụrụ ubi niile na mmanya ọhụrụ. Gịnị ọzọ ka m nwere ike imere gị, nwa m nwoke?” 38 Ịsọ jụrụ nna ya sị, “Nna m, ọ bụ naanị otu ngọzị ka i nwere? Gọziekwa m nna m!” Ịsọ kwara akwa nʼoke olu. 39 Nna ya Aịzik zara sị ya,“Ebe obibi gị ga-adịpụ adịpụ,site nʼebe akụnụba nke ala dị,site nʼebe igirigi nke eluigwe dị. 40 Nriju afọ gị ga-abụ site na mma agha,ị ga-ejekwara nwanne gị ozi.Ma mgbe i mesịrị nwere onwe gị,ị ga-atọpụ agbụ ya,site nʼolu gị.” 41 Ịsọ buru iro nʼobi megide Jekọb nʼihi ngọzị ahụ nna ya nyere ya. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Oge a ga-eru ụjụ nʼihi nna m na-abịa nso, nʼoge ahụ aga m egbu nwanne m Jekọb.” 42 Mgbe a gwara Ribeka ihe nwa ya nwoke nke okenye bụ Ịsọ kwuru, o ziri kpọọ nwa ya nwoke nke nta bụ Jekọb sị ya, “Lee, Ịsọ nwanne gị na-akasị onwe ya obi site nʼechiche ọ na-eche igbu gị. 43 Nʼihi nke a, nwa m nwoke, mee ihe m gwara gị, gbapụ ọsọ ngwangwa, gbakwuru nwanne m Leban na Haran, 44 Nọdụ nʼebe ahụ ruo mgbe iwe nwanne gị ga-adajụ. 45 Mgbe nwanne gị kwụsịrị iwe iwe megide gị, mgbe o chefuru ihe i mere ya, aga m ezitere gị ozi ka ị lọta. Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbara aka unu abụọ nʼotu ụbọchị.” 46 Mgbe ahụ Ribeka gara gwa Aịzik sị, “Ike ịdị ndụ agwụla m nʼihi ndị inyom Het ndị a. Ọ bụrụ na Jekọb esite nʼetiti ndị inyom ala a, site nʼetiti ndị inyom Het ndị a lụọ nwunye, mara na ọnwụ ga-akara m ịdị ndụ mma.”

In Other Versions

Genesis 27 in the ANGEFD

Genesis 27 in the ANTPNG2D

Genesis 27 in the AS21

Genesis 27 in the BAGH

Genesis 27 in the BBPNG

Genesis 27 in the BBT1E

Genesis 27 in the BDS

Genesis 27 in the BEV

Genesis 27 in the BHAD

Genesis 27 in the BIB

Genesis 27 in the BLPT

Genesis 27 in the BNT

Genesis 27 in the BNTABOOT

Genesis 27 in the BNTLV

Genesis 27 in the BOATCB

Genesis 27 in the BOATCB2

Genesis 27 in the BOBCV

Genesis 27 in the BOCNT

Genesis 27 in the BOECS

Genesis 27 in the BOGWICC

Genesis 27 in the BOHCB

Genesis 27 in the BOHCV

Genesis 27 in the BOHLNT

Genesis 27 in the BOHNTLTAL

Genesis 27 in the BOILNTAP

Genesis 27 in the BOITCV

Genesis 27 in the BOKCV

Genesis 27 in the BOKCV2

Genesis 27 in the BOKHWOG

Genesis 27 in the BOKSSV

Genesis 27 in the BOLCB

Genesis 27 in the BOLCB2

Genesis 27 in the BOMCV

Genesis 27 in the BONAV

Genesis 27 in the BONCB

Genesis 27 in the BONLT

Genesis 27 in the BONUT2

Genesis 27 in the BOPLNT

Genesis 27 in the BOSCB

Genesis 27 in the BOSNC

Genesis 27 in the BOTLNT

Genesis 27 in the BOVCB

Genesis 27 in the BOYCB

Genesis 27 in the BPBB

Genesis 27 in the BPH

Genesis 27 in the BSB

Genesis 27 in the CCB

Genesis 27 in the CUV

Genesis 27 in the CUVS

Genesis 27 in the DBT

Genesis 27 in the DGDNT

Genesis 27 in the DHNT

Genesis 27 in the DNT

Genesis 27 in the ELBE

Genesis 27 in the EMTV

Genesis 27 in the ESV

Genesis 27 in the FBV

Genesis 27 in the FEB

Genesis 27 in the GGMNT

Genesis 27 in the GNT

Genesis 27 in the HARY

Genesis 27 in the HNT

Genesis 27 in the IRVA

Genesis 27 in the IRVB

Genesis 27 in the IRVG

Genesis 27 in the IRVH

Genesis 27 in the IRVK

Genesis 27 in the IRVM

Genesis 27 in the IRVM2

Genesis 27 in the IRVO

Genesis 27 in the IRVP

Genesis 27 in the IRVT

Genesis 27 in the IRVT2

Genesis 27 in the IRVU

Genesis 27 in the ISVN

Genesis 27 in the JSNT

Genesis 27 in the KAPI

Genesis 27 in the KBT1ETNIK

Genesis 27 in the KBV

Genesis 27 in the KJV

Genesis 27 in the KNFD

Genesis 27 in the LBA

Genesis 27 in the LBLA

Genesis 27 in the LNT

Genesis 27 in the LSV

Genesis 27 in the MAAL

Genesis 27 in the MBV

Genesis 27 in the MBV2

Genesis 27 in the MHNT

Genesis 27 in the MKNFD

Genesis 27 in the MNG

Genesis 27 in the MNT

Genesis 27 in the MNT2

Genesis 27 in the MRS1T

Genesis 27 in the NAA

Genesis 27 in the NASB

Genesis 27 in the NBLA

Genesis 27 in the NBS

Genesis 27 in the NBVTP

Genesis 27 in the NET2

Genesis 27 in the NIV11

Genesis 27 in the NNT

Genesis 27 in the NNT2

Genesis 27 in the NNT3

Genesis 27 in the PDDPT

Genesis 27 in the PFNT

Genesis 27 in the RMNT

Genesis 27 in the SBIAS

Genesis 27 in the SBIBS

Genesis 27 in the SBIBS2

Genesis 27 in the SBICS

Genesis 27 in the SBIDS

Genesis 27 in the SBIGS

Genesis 27 in the SBIHS

Genesis 27 in the SBIIS

Genesis 27 in the SBIIS2

Genesis 27 in the SBIIS3

Genesis 27 in the SBIKS

Genesis 27 in the SBIKS2

Genesis 27 in the SBIMS

Genesis 27 in the SBIOS

Genesis 27 in the SBIPS

Genesis 27 in the SBISS

Genesis 27 in the SBITS

Genesis 27 in the SBITS2

Genesis 27 in the SBITS3

Genesis 27 in the SBITS4

Genesis 27 in the SBIUS

Genesis 27 in the SBIVS

Genesis 27 in the SBT

Genesis 27 in the SBT1E

Genesis 27 in the SCHL

Genesis 27 in the SNT

Genesis 27 in the SUSU

Genesis 27 in the SUSU2

Genesis 27 in the SYNO

Genesis 27 in the TBIAOTANT

Genesis 27 in the TBT1E

Genesis 27 in the TBT1E2

Genesis 27 in the TFTIP

Genesis 27 in the TFTU

Genesis 27 in the TGNTATF3T

Genesis 27 in the THAI

Genesis 27 in the TNFD

Genesis 27 in the TNT

Genesis 27 in the TNTIK

Genesis 27 in the TNTIL

Genesis 27 in the TNTIN

Genesis 27 in the TNTIP

Genesis 27 in the TNTIZ

Genesis 27 in the TOMA

Genesis 27 in the TTENT

Genesis 27 in the UBG

Genesis 27 in the UGV

Genesis 27 in the UGV2

Genesis 27 in the UGV3

Genesis 27 in the VBL

Genesis 27 in the VDCC

Genesis 27 in the YALU

Genesis 27 in the YAPE

Genesis 27 in the YBVTP

Genesis 27 in the ZBP