Judges 18 (BOICB)

1 Nʼoge ahụ kwa, ụmụ Izrel enweghị eze ọbụla na-achị ha.Ebo Dan na-achọkwara onwe ha ebe obibi nke ga-abụ ala nke aka ha, nʼihi na ruo ugbu a, ha enwebeghị ike chụpụ ndị bi nʼala ahụ e kenyere ha dịka ihe nketa nke ha. 2 Nʼihi nke a, ebo Dan sitere nʼikwu ise dị nʼebo ha họpụta mmadụ ise. Ndị a bụ dimkpa, na dike nʼagha, bụrụkwa ndị si nʼobodo Zora na Eshtaol. Ha zipụrụ mmadụ ise ndị a ka ha gaa nyochaa ala ahụ ha na-achọ ibi nʼime ya.Mgbe ndị ahụ jeruru obodo ugwu ugwu Ifrem, ha gara nọdụ ọdụ abalị nʼụlọ Maịka. 3 Mgbe ha nọ nso ụlọ Maịka, ha nụrụ asụsụ nwokorobịa onye Livayị ahụ bụ onye nchụaja. Ha kpọpụtara ya nʼotu akụkụ jụọ ya ajụjụ sị, “Onye kpọtara gị ebe a? Gịnị ka ị na-eme nʼebe a? Gịnị mere i ji bịa nʼebe a?” 4 Nwokorobịa ahụ kọwara ha ihe Maịka meere ya. Ọ gwara ha, “O nyere m ọrụ, abụkwa m onye nchụaja ya.” 5 Ha sịrị ya, “Ọ dị mma! Biko, jụta Chineke ase, chọpụta ma ije anyị a ọ ga-agakwa nke ọma.” 6 Onye nchụaja ahụ zara sị ha, “Gaa nʼudo. Ije unu nwere ngọzị ONYENWE ANYỊ.” 7 Ya mere, ndị ikom ise ndị ahụ biliri ije bịaruo nʼobodo Laish, ebe ha hụrụ na ndị ahụ na-ebi nʼudo, na-enweghị nsogbu ọbụla. Ha dịka ndị obodo Saịdọn, ndị onwe ha juru afọ, ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha bụ ndị bara ụba, ebe ọ dịghị ihe ọbụla kọrọ ụkọ nʼala ahụ. Ọzọ, ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo ndị Saịdọn. Ọ dịkwaghị ihe ha na mmadụ ọbụla nwekọrọ. 8 Mgbe ndị nnyocha ahụ laghachiri nʼobodo Zora na Eshtaol, ndị ebo Dan ibe ha jụrụ ha, sị, “Unu si aṅaa jee? Gịnị ka unu chọpụtara?” 9 Ha zara sị, “Bịanụ, ka anyị gaa buso ha agha. Anyị ahụla ala ahụ, ọ dịkwa mma nke ukwu. Gịnị ka unu na-agbara nkịtị? Unu egbula oge ịba nʼebe ahụ nweta ya. 10 Mgbe unu ruru ebe ahụ, unu ga-ahụ ndị na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla, na ala sara mbara nke Chineke na-etinye unu nʼaka. Ala nke ihe ọbụla na-adịghị akọ nʼime ya.” 11 Ya mere, narị ndị agha isii ndị si nʼebo Dan biliri gaa ibuso obodo ahụ agha. Ha sikwa Zora na Eshtaol pụọ. 12 Mgbe ha na-aga, ha rutere Kiriat Jearim, nke dị na Juda, maa ụlọ ikwu ha nʼebe ahụ. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ebe ahụ dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Kiriat Jearim Mahane Dan ruo taa. 13 Emesịa, ha pụrụ nʼala ugwu ugwu Ifrem, bịarute nʼụlọ Maịka. 14 Mmadụ ise ndị ahụ gara nnyochapụta ala (ya bụ ala Laish) ahụ gwara ụmụnna ha sị, “Unu maara na nʼime otu ụlọ ndị a na e nwere efọọd, nʼụfọdụ arụsị ezinaụlọ ndị dị iche iche, na oyiyi a kpụrụ akpụ nke eji ọla wuo? Ugbu a, maranụ ihe unu ga-eme.” 15 Ya mere, ha gara nʼebe ahụ, banye nʼụlọ nwokorobịa Livayị ahụ, ebe o bi nʼụlọ Maịka, jụọ ya maka ọdịmma ya. 16 Narị ndị ikom Dan, ndị jikere ibu agha, guzo nʼọnụ ụzọ ama. 17 Mgbe ahụ, ndị nnyocha ise ahụ banyere nʼime ụlọ ahụ buru arụsị ọla ahụ, na efọọd ahụ, na arụsị ezinaụlọ ndị ahụ, ma onye nchụaja ahụ na narị ndị agha isii ndị ji ngwa agha guzo nʼọnụ ụzọ ama. 18 Mgbe ndị ikom ahụ banyere nʼụlọ Maịka buru arụsị ọla ahụ, efọọd ahụ na arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ, onye nchụaja ahụ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-eme?” 19 Ha zara sị ya, “Mechie ọnụ gị! Ekwukwala okwu ọbụla. Soro anyị bịa bụrụ nna anyị na onye nchụaja anyị. Ọ ga-abara gị uru karịa ịbụ onye nchụaja nye otu ebo na otu agbụrụ nʼIzrel, karịa ịbụ onye nchụaja nke naanị otu nwoke nʼime ezinaụlọ ya.” 20 Mgbe ahụ, obi tọrọ nwokorobịa onye nchụaja ahụ ụtọ isoro ha gaa. O buuru efọọd ahụ, arụsị ezinaụlọ ndị ọzọ ahụ na oyiyi ahụ a pịrị apị soro ndị ahụ gawa. 21 Ha malitekwara ije ha, ụmụntakịrị ha, na igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha ka ha tinyere nʼihu ha. 22 Mgbe ha gamitụrụ nke nta site nʼụlọ Maịka, ndị ikom ndị bi nso ụlọ Maịka kpọkọtara onwe ha chụso ndị Dan, gafee ha. 23 Maịka na ndị so ya na-etikwa mkpu na-akpọku ha sị ha kwụsị ije ha. Ma ndị ebo Dan jụrụ Maịka ajụjụ sị ya, “Gịnị na-eme gị iji kpọpụta ndị gị ka ha bịa lụso anyị agha?” 24 Ọ zaghachiri, “Unu chịịrị chi ndị m mere, kpọrọ onye nchụaja m pụọ. Gịnị ọzọ ka m nwekwara? Olee otu unu si ajụ, ‘Gịnị na-eme gị?’ ” 25 Ndị ikom Dan zara sị ya, “Lezie anya kpachara anya banyere ụdị okwu ị na-ekwu. Nʼihi na i kwuo ụdị okwu a gaa nʼihu, ụfọdụ ndị ikom isi na-anụ ọkụ ga-abịa lụso gị agha gbuo gị na ndị ezinaụlọ gị.” 26 Ya mere, ndị ebo Dan gbara ya nkịtị na-aga ebe ha na-aga. Mgbe Maịka hụrụ na ha dị ọtụtụ karịa ya, ọ hapụrụ ha, tụgharịa laghachi nʼụlọ ya. 27 Ụmụ Dan chịịrị arụsị ahụ niile Maịka mere, durukwa onye nchụaja ya gawa nʼobodo Laish, obodo nọ nʼudo, nke na-adịghị atụ anya ihe egwu ọbụla. Ha busoro ndị obodo ahụ agha, suo obodo ahụ ọkụ. 28 Ọ dịghị onye ọbụla nwere ike bịa inyere ndị obodo ahụ aka nʼihi ha bi nʼebe dị anya site nʼobodo Saịdọn. O nwekwaghị obodo ọbụla ha na ha na-emekọrịta. Obodo a dị na ndagwurugwu dị nso na Bet-Rehob.Emesịa, ndị ebo Dan wughachiri obodo ahụ ọzọ, biri nʼime ya. 29 Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ aha obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna ha ochie, onye bụ nwa Izrel. Ma tupu ebo Dan ebibie ya, aha obodo a nʼoge gara aga bụ Laish. 30 Nʼebe ahụ ndị Dan guzobeere onwe ha arụsị, Jonatan, nwa Geshọm, nwa Mosis, na ụmụ ya ndị ikom niile ghọọrọ ndị nchụaja nye ebo Dan ruo nʼoge a dọtara ala ahụ nʼagha. 31 Ndị ebo Dan nọgidere na-efe arụsị ndị ahụ Maịka mere oge ahụ niile ụlọ nzute Chineke dị na Shaịlo.

In Other Versions

Judges 18 in the ANGEFD

Judges 18 in the ANTPNG2D

Judges 18 in the AS21

Judges 18 in the BAGH

Judges 18 in the BBPNG

Judges 18 in the BBT1E

Judges 18 in the BDS

Judges 18 in the BEV

Judges 18 in the BHAD

Judges 18 in the BIB

Judges 18 in the BLPT

Judges 18 in the BNT

Judges 18 in the BNTABOOT

Judges 18 in the BNTLV

Judges 18 in the BOATCB

Judges 18 in the BOATCB2

Judges 18 in the BOBCV

Judges 18 in the BOCNT

Judges 18 in the BOECS

Judges 18 in the BOGWICC

Judges 18 in the BOHCB

Judges 18 in the BOHCV

Judges 18 in the BOHLNT

Judges 18 in the BOHNTLTAL

Judges 18 in the BOILNTAP

Judges 18 in the BOITCV

Judges 18 in the BOKCV

Judges 18 in the BOKCV2

Judges 18 in the BOKHWOG

Judges 18 in the BOKSSV

Judges 18 in the BOLCB

Judges 18 in the BOLCB2

Judges 18 in the BOMCV

Judges 18 in the BONAV

Judges 18 in the BONCB

Judges 18 in the BONLT

Judges 18 in the BONUT2

Judges 18 in the BOPLNT

Judges 18 in the BOSCB

Judges 18 in the BOSNC

Judges 18 in the BOTLNT

Judges 18 in the BOVCB

Judges 18 in the BOYCB

Judges 18 in the BPBB

Judges 18 in the BPH

Judges 18 in the BSB

Judges 18 in the CCB

Judges 18 in the CUV

Judges 18 in the CUVS

Judges 18 in the DBT

Judges 18 in the DGDNT

Judges 18 in the DHNT

Judges 18 in the DNT

Judges 18 in the ELBE

Judges 18 in the EMTV

Judges 18 in the ESV

Judges 18 in the FBV

Judges 18 in the FEB

Judges 18 in the GGMNT

Judges 18 in the GNT

Judges 18 in the HARY

Judges 18 in the HNT

Judges 18 in the IRVA

Judges 18 in the IRVB

Judges 18 in the IRVG

Judges 18 in the IRVH

Judges 18 in the IRVK

Judges 18 in the IRVM

Judges 18 in the IRVM2

Judges 18 in the IRVO

Judges 18 in the IRVP

Judges 18 in the IRVT

Judges 18 in the IRVT2

Judges 18 in the IRVU

Judges 18 in the ISVN

Judges 18 in the JSNT

Judges 18 in the KAPI

Judges 18 in the KBT1ETNIK

Judges 18 in the KBV

Judges 18 in the KJV

Judges 18 in the KNFD

Judges 18 in the LBA

Judges 18 in the LBLA

Judges 18 in the LNT

Judges 18 in the LSV

Judges 18 in the MAAL

Judges 18 in the MBV

Judges 18 in the MBV2

Judges 18 in the MHNT

Judges 18 in the MKNFD

Judges 18 in the MNG

Judges 18 in the MNT

Judges 18 in the MNT2

Judges 18 in the MRS1T

Judges 18 in the NAA

Judges 18 in the NASB

Judges 18 in the NBLA

Judges 18 in the NBS

Judges 18 in the NBVTP

Judges 18 in the NET2

Judges 18 in the NIV11

Judges 18 in the NNT

Judges 18 in the NNT2

Judges 18 in the NNT3

Judges 18 in the PDDPT

Judges 18 in the PFNT

Judges 18 in the RMNT

Judges 18 in the SBIAS

Judges 18 in the SBIBS

Judges 18 in the SBIBS2

Judges 18 in the SBICS

Judges 18 in the SBIDS

Judges 18 in the SBIGS

Judges 18 in the SBIHS

Judges 18 in the SBIIS

Judges 18 in the SBIIS2

Judges 18 in the SBIIS3

Judges 18 in the SBIKS

Judges 18 in the SBIKS2

Judges 18 in the SBIMS

Judges 18 in the SBIOS

Judges 18 in the SBIPS

Judges 18 in the SBISS

Judges 18 in the SBITS

Judges 18 in the SBITS2

Judges 18 in the SBITS3

Judges 18 in the SBITS4

Judges 18 in the SBIUS

Judges 18 in the SBIVS

Judges 18 in the SBT

Judges 18 in the SBT1E

Judges 18 in the SCHL

Judges 18 in the SNT

Judges 18 in the SUSU

Judges 18 in the SUSU2

Judges 18 in the SYNO

Judges 18 in the TBIAOTANT

Judges 18 in the TBT1E

Judges 18 in the TBT1E2

Judges 18 in the TFTIP

Judges 18 in the TFTU

Judges 18 in the TGNTATF3T

Judges 18 in the THAI

Judges 18 in the TNFD

Judges 18 in the TNT

Judges 18 in the TNTIK

Judges 18 in the TNTIL

Judges 18 in the TNTIN

Judges 18 in the TNTIP

Judges 18 in the TNTIZ

Judges 18 in the TOMA

Judges 18 in the TTENT

Judges 18 in the UBG

Judges 18 in the UGV

Judges 18 in the UGV2

Judges 18 in the UGV3

Judges 18 in the VBL

Judges 18 in the VDCC

Judges 18 in the YALU

Judges 18 in the YAPE

Judges 18 in the YBVTP

Judges 18 in the ZBP