Leviticus 2 (BOICB)

1 “ ‘Mgbe onye ọbụla wetaara ONYENWE ANYỊ onyinye mkpụrụ ọka, onyinye ya ga-abụ nke ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma. Ha ga-awụkwasị ya mmanụ oliv, tinyekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ya, 2 ọ ga-ebutere ya ụmụ Erọn ndị nchụaja. Onye nchụaja ga-ekpoju ụtụ ọka na mmanụ ahụ nʼaka, tinyekwara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile ahụ, kpọọ ihe ndị a ọkụ dịka oke ncheta nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ ga-abụkwa onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye ONYENWE ANYỊ. 3 Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu ONYENWE ANYỊ. 4 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha eghere nʼite e ji eghe ihe, ọ ga-abụ nke e ji ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma mee. Ọ ga-abụ ogbe achịcha agwara mmanụ oliv nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, maọbụ achịcha mbadamba e tere mmanụ nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 5 Ọ bụrụ na onyinye mmadụ wetara bụ achịcha e ghere eghe, achịcha ahụ aghaghị ịbụ nke e mere site nʼezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, nke a gwakọtara mmanụ, nke na-enweghị ihe na-eko achịcha nʼime ya. 6 Nyawasịa ya, wụkwasị ya mmanụ nʼelu, ọ bụkwa onyinye mkpụrụ ọka. 7 Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka gị bụ ihe e siri nʼite, ọ ghaghị ịbụ ezi ụtụ ọka a kwọrọ nke ọma, e tinyetụrụ mmanụ oliv. 8 Ị ga-ebute onyinye mkpụrụ ọka ahụ bunye ya onye nchụaja. Ọ ga-eche ya nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼebe ịchụ aja. 9 Onye nchụaja ga-ekporo ụfọdụ nʼaka dịka oke ncheta nʼime onyinye ọka ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka aja e surere nʼọkụ, nke isisi ya na-atọ ONYENWE ANYỊ ezi ụtọ. 10 Ma nke fọdụrụ nʼonyinye ọka ahụ bụ nke Erọn na ụmụ ya. Ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ nke onyinye nsure ọkụ niile echere nʼihu ONYENWE ANYỊ. 11 “ ‘Unu etinyela ihe na-eko ọka ọbụla nʼonyinye mkpụrụ ọka unu na-enye ONYENWE ANYỊ, nʼihi na unu ekwesighị ịkpọ ihe na-eko achịcha maọbụ mmanụ aṅụ ọkụ nʼonyinye nsure ọkụ unu na-enye ONYENWE ANYỊ. 12 Unu nwere ike nye ONYENWE ANYỊ achịcha e ji ihe na-eko achịcha na mmanụ aṅụ mee nʼoge onyinye owuwe ihe ubi, ma a gaghị eme otu a nʼoge onyinye ọchụchụ aja nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. 13 Unu aghaghị itinye nnu nʼime onyinye mkpụrụ ọka ọbụla unu na-enye. Unu ahapụla ọgbụgba ndụ Chineke unu nʼonyinye mkpụrụ ọka unu. Tinyenụ nnu nʼonyinye unu niile. 14 “ ‘Ọ bụrụ na onyinye mkpụrụ ọka ị na-ewetara ONYENWE ANYỊ bụ mkpụrụ mbụ nke ubi gị, site nʼọka ọhụrụ gị weta ọka a sụrụ asụ, maọbụ nke a hụrụ nʼọkụ. 15 Tinye ya mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ. Ọ ga-abụ onyinye ọka. 16 Onye nchụaja ga-ewere oke ncheta nʼime ọka ahụ a sụrụ asụ, nke a gwara mmanụ na ụda na-esi isi ụtọ, dịka onyinye nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

Leviticus 2 in the ANGEFD

Leviticus 2 in the ANTPNG2D

Leviticus 2 in the AS21

Leviticus 2 in the BAGH

Leviticus 2 in the BBPNG

Leviticus 2 in the BBT1E

Leviticus 2 in the BDS

Leviticus 2 in the BEV

Leviticus 2 in the BHAD

Leviticus 2 in the BIB

Leviticus 2 in the BLPT

Leviticus 2 in the BNT

Leviticus 2 in the BNTABOOT

Leviticus 2 in the BNTLV

Leviticus 2 in the BOATCB

Leviticus 2 in the BOATCB2

Leviticus 2 in the BOBCV

Leviticus 2 in the BOCNT

Leviticus 2 in the BOECS

Leviticus 2 in the BOGWICC

Leviticus 2 in the BOHCB

Leviticus 2 in the BOHCV

Leviticus 2 in the BOHLNT

Leviticus 2 in the BOHNTLTAL

Leviticus 2 in the BOILNTAP

Leviticus 2 in the BOITCV

Leviticus 2 in the BOKCV

Leviticus 2 in the BOKCV2

Leviticus 2 in the BOKHWOG

Leviticus 2 in the BOKSSV

Leviticus 2 in the BOLCB

Leviticus 2 in the BOLCB2

Leviticus 2 in the BOMCV

Leviticus 2 in the BONAV

Leviticus 2 in the BONCB

Leviticus 2 in the BONLT

Leviticus 2 in the BONUT2

Leviticus 2 in the BOPLNT

Leviticus 2 in the BOSCB

Leviticus 2 in the BOSNC

Leviticus 2 in the BOTLNT

Leviticus 2 in the BOVCB

Leviticus 2 in the BOYCB

Leviticus 2 in the BPBB

Leviticus 2 in the BPH

Leviticus 2 in the BSB

Leviticus 2 in the CCB

Leviticus 2 in the CUV

Leviticus 2 in the CUVS

Leviticus 2 in the DBT

Leviticus 2 in the DGDNT

Leviticus 2 in the DHNT

Leviticus 2 in the DNT

Leviticus 2 in the ELBE

Leviticus 2 in the EMTV

Leviticus 2 in the ESV

Leviticus 2 in the FBV

Leviticus 2 in the FEB

Leviticus 2 in the GGMNT

Leviticus 2 in the GNT

Leviticus 2 in the HARY

Leviticus 2 in the HNT

Leviticus 2 in the IRVA

Leviticus 2 in the IRVB

Leviticus 2 in the IRVG

Leviticus 2 in the IRVH

Leviticus 2 in the IRVK

Leviticus 2 in the IRVM

Leviticus 2 in the IRVM2

Leviticus 2 in the IRVO

Leviticus 2 in the IRVP

Leviticus 2 in the IRVT

Leviticus 2 in the IRVT2

Leviticus 2 in the IRVU

Leviticus 2 in the ISVN

Leviticus 2 in the JSNT

Leviticus 2 in the KAPI

Leviticus 2 in the KBT1ETNIK

Leviticus 2 in the KBV

Leviticus 2 in the KJV

Leviticus 2 in the KNFD

Leviticus 2 in the LBA

Leviticus 2 in the LBLA

Leviticus 2 in the LNT

Leviticus 2 in the LSV

Leviticus 2 in the MAAL

Leviticus 2 in the MBV

Leviticus 2 in the MBV2

Leviticus 2 in the MHNT

Leviticus 2 in the MKNFD

Leviticus 2 in the MNG

Leviticus 2 in the MNT

Leviticus 2 in the MNT2

Leviticus 2 in the MRS1T

Leviticus 2 in the NAA

Leviticus 2 in the NASB

Leviticus 2 in the NBLA

Leviticus 2 in the NBS

Leviticus 2 in the NBVTP

Leviticus 2 in the NET2

Leviticus 2 in the NIV11

Leviticus 2 in the NNT

Leviticus 2 in the NNT2

Leviticus 2 in the NNT3

Leviticus 2 in the PDDPT

Leviticus 2 in the PFNT

Leviticus 2 in the RMNT

Leviticus 2 in the SBIAS

Leviticus 2 in the SBIBS

Leviticus 2 in the SBIBS2

Leviticus 2 in the SBICS

Leviticus 2 in the SBIDS

Leviticus 2 in the SBIGS

Leviticus 2 in the SBIHS

Leviticus 2 in the SBIIS

Leviticus 2 in the SBIIS2

Leviticus 2 in the SBIIS3

Leviticus 2 in the SBIKS

Leviticus 2 in the SBIKS2

Leviticus 2 in the SBIMS

Leviticus 2 in the SBIOS

Leviticus 2 in the SBIPS

Leviticus 2 in the SBISS

Leviticus 2 in the SBITS

Leviticus 2 in the SBITS2

Leviticus 2 in the SBITS3

Leviticus 2 in the SBITS4

Leviticus 2 in the SBIUS

Leviticus 2 in the SBIVS

Leviticus 2 in the SBT

Leviticus 2 in the SBT1E

Leviticus 2 in the SCHL

Leviticus 2 in the SNT

Leviticus 2 in the SUSU

Leviticus 2 in the SUSU2

Leviticus 2 in the SYNO

Leviticus 2 in the TBIAOTANT

Leviticus 2 in the TBT1E

Leviticus 2 in the TBT1E2

Leviticus 2 in the TFTIP

Leviticus 2 in the TFTU

Leviticus 2 in the TGNTATF3T

Leviticus 2 in the THAI

Leviticus 2 in the TNFD

Leviticus 2 in the TNT

Leviticus 2 in the TNTIK

Leviticus 2 in the TNTIL

Leviticus 2 in the TNTIN

Leviticus 2 in the TNTIP

Leviticus 2 in the TNTIZ

Leviticus 2 in the TOMA

Leviticus 2 in the TTENT

Leviticus 2 in the UBG

Leviticus 2 in the UGV

Leviticus 2 in the UGV2

Leviticus 2 in the UGV3

Leviticus 2 in the VBL

Leviticus 2 in the VDCC

Leviticus 2 in the YALU

Leviticus 2 in the YAPE

Leviticus 2 in the YBVTP

Leviticus 2 in the ZBP