Nehemiah 12 (BOICB)

1 Ndị a bụ ndị nchụaja na ndị Livayị ndị so Zerubabel nwa Shealtiel na Jeshua lọta. Seraya, Jeremaya, Ezra, 2 Amaraya, Maluk, Hatush, 3 Shekanaya, Rehum, Meremot, 4 Ido, Gineton, Abija 5 Mijamin, Maadaya, Bilga, 6 Shemaya, Joiarib, Jedaya, 7 Salu, Amok, Hilkaya na Jedaya. Ndị a niile bụ ndị ndu ndị nchụaja na ndị na-enyere ndị ndụ aka nʼụbọchị Jeshua. 8 Ndị Livayị so ha bụ ndị a: Jeshua, Binui, Kadmiel, Sherebaya, Juda nakwa Matanaya, onye ya na ndị otu ya na-elekọta ofufe ekele. 9 Bakbukaya, na Unni, ndị otu ha nọ na ncherita ihu nʼofufe ahụ. 10 Jeshua mụrụ Joiakim,Joiakim mụrụ Eliashib,Eliashib mụrụ Joiada, 11 Joiada mụrụ Jonatan,ebe Jonatan mụrụ Jadua. 12 Ndị a bụ ndịisi ikwu ndị nchụaja nʼoge ndụ Joiakim. Meraia bụ onyeisi ụmụ Seraya,Hananaya bụ onyeisi ụmụ Jeremaya, 13 Meshulam bụ onyeisi ụmụ Ezra,Jehohanan, onyeisi ụmụ Amaraya; 14 Jonatan, onyeisi ụmụ Maluk;Josef bụ onyeisi ụmụ Shekanaya; 15 nke Harim, Adna,nke Meremot, Helkai; 16 Zekaraya, onyeisi ụmụ Ido;Meshulam, onyeisi ụmụ Gineton 17 Zikri, onyeisi ụmụ Abija;Piltai, onyeisi ụmụ Modaya na Miniamin 18 Shamua, onyeisi ụmụ Bilga,Jehonatan, onyeisi ụmụ Shemaya; 19 Matenai, onyeisi ụmụ Joiarib;Uzi, onyeisi ụmụ Jedaya; 20 Kalai, onyeisi ụmụ Salu;Eba, onyeisi ụmụ Amok, 21 Hashabaya, onyeisi ụmụ Hilkaya;Netanel, onyeisi ndị Jedaya. 22 E dekọtara aha ndịisi ezinaụlọ ndị Livayị niile nʼụbọchị Eliashib, Joiada, Johanan na Jadua, nakwa nke ndị nchụaja nʼakwụkwọ nʼoge ọchịchị Daraiọs bụ eze Peshịa. 23 E dekwara aha ndịisi ndị Livayị niile nʼakwụkwọ tutu ruo nʼoge Johanan nwa Eliashib dị ndụ. 24 Ndị a bụ ndịisi ndị Livayị nʼoge ahụ: Hashabaya, Sherebaya, Jeshua, nwa Kadmiel na ndị otu ha. Ha kere onwe ha ụzọ abụọ. Ụzọ abụọ ndị a na-eguzokwa na-eche ibe ha ihu mgbe ọbụla ha na-abụku Chineke abụ otuto na ekele. Otu ụzọ na-amalite nke ọzọ azaghachi, dịka Devid onye nke Chineke si nye ya nʼiwu. 25 Ndị nche na-eche ọnụ ụzọ ụlọ ịchịkọba ihe nke ụlọnsọ bụ ndị a: Matanaya, Bakbukaya, Ọbadaya, Meshulam, Talmon na Akub. 26 Ha jere ozi ha nʼoge Joiakim nwa Jeshua, nwa Jozadak, dị ndụ, na nʼoge Nehemaya bụ onyeisi ọchịchị, na nʼoge Ezra bụkwa onye nchụaja, na onye nkuzi okwu Chineke. 27 Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke. 28 Ndị ọbụ abụ sitekwara nʼobodo niile dị gburugburu Jerusalem bịa, ọ bụladị site nʼobodo niile ndị Netofa, 29 na Bet-Gilgal, na akụkụ Geba na Azmavet, nʼihi na ha ewuorola onwe ha obodo nta dị iche iche gburugburu Jerusalem. 30 Mgbe ndị nchụaja na ndị Livayị dochara onwe ha ọcha, ha dokwara ndị Izrel niile, na ọnụ ụzọ ama niile, na mgbidi ahụ ọcha. 31 E mere m ka ndị ndu Juda niile rigoro nʼelu mgbidi ahụ. Nʼebe ahụ ka m kenyere otu ndị ọbụ abụ abụọ inye ekele. Otu ụzọ gara akụkụ aka nri nke elu mgbidi ahụ ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Ikpofu Ahịhịa. 32 Hoshaya na ọkara ndị ndu Juda na-eso ha nʼazụ, 33 ha na Azaraya, Ezra, Meshulam, 34 Juda, Benjamin, Shemaya, Jeremaya 35 na ndị nchụaja ndị a ndị na-afụ opi, tinyere Zekaraya nwa Jonatan, nwa Shemaya. Ndị bụ nna nna Zekaraya bụ Matanaya, Mikaya na Zakua, ndị ikwu Asaf. 36 Ndị otu ya, bụ Shemaya, Azarel, Milalai, Gilalai, Maai, Netanel, Juda na Hanani. Ha niile ji ngwa egwu ha, ụdị ngwa egwu ndị ahụ Devid onye nke Chineke nyere nʼiwu na ndị ọbụ abụ ga-eji. Ezra, bụ ode akwụkwọ nọ nʼihu na-edu ha. 37 Mgbe ha rutere nʼỌnụ Ụzọ ama Isi Iyi, ha rigooro nʼelu nkwasa nrigo ụlọ elu e si abata nʼobodo Devid, si ebe ahụ gafee ụlọeze Devid, gaakwa lọghachi nʼỌnụ Ụzọ Ama Mmiri, nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. 38 Ndị ọbụ abụ nke ọzọ bụ ndị na-enye ekele gara ụzọ aka ekpe. Mụ onwe m sooro ha nʼelu mgbidi ahụ, tinyere ọkara ndị mmadụ ahụ, gafee Ụlọ elu Ite Ọkụ jeruo Mgbidi Sara Mbara. 39 Anyị sitekwara nʼebe ahụ gafee Ọnụ Ụzọ Ama Ifrem, Ọnụ Ụzọ ama Jeshana, Ọnụ Ụzọ Ama Azụ, Ọnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Hananel, ruokwa nʼỌnụ Ụzọ Ama Ụlọ Elu Narị na ruo nʼỌnụ Ụzọ Ama Atụrụ, kwụsị nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndị Nche. 40 Ya mere, ụzọ ndị mmadụ abụọ na-abụ abụ ekele nye Chineke zukọtara bata nʼụlọnsọ ukwu. Esokwa m ha bata, mụ na ọkara ndị ndu, 41 tinyere ndị nchụaja ndị a: Eliakịm, Maaseia, Miniamin, Mikaya, Elioenai, Zekaraya na Hananaya. Ndị a niile ji opi ha. 42 Ndị ọzọ sokwa bata bụ ndị a: Maaseia, Shemaya, Elieza, Uzi, Jehohanan, Malkija, Elam na Eza. Onyendu ndị ọbụ abụ ahụ niile bụ Jezrahaya. 43 Ha chụrụ ọtụtụ aja nʼụbọchị ahụ nʼihi na Chineke nyere ha oke ọṅụ. Ụmụnta na ndị inyom sokwa ṅụrịa ọṅụ. Ha nụkwara ụda ọṅụ ndị Jerusalem site nʼebe dị anya. 44 Nʼoge ahụ ka a họpụtara ndị ikom na-elekọta ụlọ ịchịkọba ihe, ebe a na-achịkọba onyinye mkpụrụ mbụ, na onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri. A na-esite nʼobodo gbara Jerusalem gburugburu na-ewebata nʼụlọ ịchịkọba ihe onyinye niile e nyere nʼiwu maka ọdịmma ndị nchụaja na ndị Livayị. E si otu a na-ewebata ya nʼihi na ọrụ ndị nchụaja na ndị Livayị na-arụ na-atọ ndị Juda ụtọ nke ukwuu. 45 Nʼihi na ha na-arụ ọrụ Chineke ahụ ha ketara ịrụ, ya na ọrụ ido ndị mmadụ na ihe ọbụla nsọ. Otu a kwa ka ndị ọbụ abụ, na ndị na-eche nche sị arụkwa ọrụ a dịka iwu Devid na Solomọn nwa ya nyere si dị. 46 Ọ bụ nʼoge Devid na Asaf ka e bidoro inwe ndị ndu abụ ito na ikele Chineke. 47 Ya mere, nʼoge Zerubabel na Nehemaya, ndị Izrel niile na-ewebata onyinye e ji akwagide ọrụ ndị ọbụ abụ, na ndị nche, na ndị Livayị. Ha kewapụtakwara oke ruru ndị Livayị ndị ọzọ iche, ndị Livayị nʼonwe ha kwa, kewapụtara oke ruru ụmụ Erọn nʼime ihe e nyere ha dịka e si nye ya nʼiwu.

In Other Versions

Nehemiah 12 in the ANGEFD

Nehemiah 12 in the ANTPNG2D

Nehemiah 12 in the AS21

Nehemiah 12 in the BAGH

Nehemiah 12 in the BBPNG

Nehemiah 12 in the BBT1E

Nehemiah 12 in the BDS

Nehemiah 12 in the BEV

Nehemiah 12 in the BHAD

Nehemiah 12 in the BIB

Nehemiah 12 in the BLPT

Nehemiah 12 in the BNT

Nehemiah 12 in the BNTABOOT

Nehemiah 12 in the BNTLV

Nehemiah 12 in the BOATCB

Nehemiah 12 in the BOATCB2

Nehemiah 12 in the BOBCV

Nehemiah 12 in the BOCNT

Nehemiah 12 in the BOECS

Nehemiah 12 in the BOGWICC

Nehemiah 12 in the BOHCB

Nehemiah 12 in the BOHCV

Nehemiah 12 in the BOHLNT

Nehemiah 12 in the BOHNTLTAL

Nehemiah 12 in the BOILNTAP

Nehemiah 12 in the BOITCV

Nehemiah 12 in the BOKCV

Nehemiah 12 in the BOKCV2

Nehemiah 12 in the BOKHWOG

Nehemiah 12 in the BOKSSV

Nehemiah 12 in the BOLCB

Nehemiah 12 in the BOLCB2

Nehemiah 12 in the BOMCV

Nehemiah 12 in the BONAV

Nehemiah 12 in the BONCB

Nehemiah 12 in the BONLT

Nehemiah 12 in the BONUT2

Nehemiah 12 in the BOPLNT

Nehemiah 12 in the BOSCB

Nehemiah 12 in the BOSNC

Nehemiah 12 in the BOTLNT

Nehemiah 12 in the BOVCB

Nehemiah 12 in the BOYCB

Nehemiah 12 in the BPBB

Nehemiah 12 in the BPH

Nehemiah 12 in the BSB

Nehemiah 12 in the CCB

Nehemiah 12 in the CUV

Nehemiah 12 in the CUVS

Nehemiah 12 in the DBT

Nehemiah 12 in the DGDNT

Nehemiah 12 in the DHNT

Nehemiah 12 in the DNT

Nehemiah 12 in the ELBE

Nehemiah 12 in the EMTV

Nehemiah 12 in the ESV

Nehemiah 12 in the FBV

Nehemiah 12 in the FEB

Nehemiah 12 in the GGMNT

Nehemiah 12 in the GNT

Nehemiah 12 in the HARY

Nehemiah 12 in the HNT

Nehemiah 12 in the IRVA

Nehemiah 12 in the IRVB

Nehemiah 12 in the IRVG

Nehemiah 12 in the IRVH

Nehemiah 12 in the IRVK

Nehemiah 12 in the IRVM

Nehemiah 12 in the IRVM2

Nehemiah 12 in the IRVO

Nehemiah 12 in the IRVP

Nehemiah 12 in the IRVT

Nehemiah 12 in the IRVT2

Nehemiah 12 in the IRVU

Nehemiah 12 in the ISVN

Nehemiah 12 in the JSNT

Nehemiah 12 in the KAPI

Nehemiah 12 in the KBT1ETNIK

Nehemiah 12 in the KBV

Nehemiah 12 in the KJV

Nehemiah 12 in the KNFD

Nehemiah 12 in the LBA

Nehemiah 12 in the LBLA

Nehemiah 12 in the LNT

Nehemiah 12 in the LSV

Nehemiah 12 in the MAAL

Nehemiah 12 in the MBV

Nehemiah 12 in the MBV2

Nehemiah 12 in the MHNT

Nehemiah 12 in the MKNFD

Nehemiah 12 in the MNG

Nehemiah 12 in the MNT

Nehemiah 12 in the MNT2

Nehemiah 12 in the MRS1T

Nehemiah 12 in the NAA

Nehemiah 12 in the NASB

Nehemiah 12 in the NBLA

Nehemiah 12 in the NBS

Nehemiah 12 in the NBVTP

Nehemiah 12 in the NET2

Nehemiah 12 in the NIV11

Nehemiah 12 in the NNT

Nehemiah 12 in the NNT2

Nehemiah 12 in the NNT3

Nehemiah 12 in the PDDPT

Nehemiah 12 in the PFNT

Nehemiah 12 in the RMNT

Nehemiah 12 in the SBIAS

Nehemiah 12 in the SBIBS

Nehemiah 12 in the SBIBS2

Nehemiah 12 in the SBICS

Nehemiah 12 in the SBIDS

Nehemiah 12 in the SBIGS

Nehemiah 12 in the SBIHS

Nehemiah 12 in the SBIIS

Nehemiah 12 in the SBIIS2

Nehemiah 12 in the SBIIS3

Nehemiah 12 in the SBIKS

Nehemiah 12 in the SBIKS2

Nehemiah 12 in the SBIMS

Nehemiah 12 in the SBIOS

Nehemiah 12 in the SBIPS

Nehemiah 12 in the SBISS

Nehemiah 12 in the SBITS

Nehemiah 12 in the SBITS2

Nehemiah 12 in the SBITS3

Nehemiah 12 in the SBITS4

Nehemiah 12 in the SBIUS

Nehemiah 12 in the SBIVS

Nehemiah 12 in the SBT

Nehemiah 12 in the SBT1E

Nehemiah 12 in the SCHL

Nehemiah 12 in the SNT

Nehemiah 12 in the SUSU

Nehemiah 12 in the SUSU2

Nehemiah 12 in the SYNO

Nehemiah 12 in the TBIAOTANT

Nehemiah 12 in the TBT1E

Nehemiah 12 in the TBT1E2

Nehemiah 12 in the TFTIP

Nehemiah 12 in the TFTU

Nehemiah 12 in the TGNTATF3T

Nehemiah 12 in the THAI

Nehemiah 12 in the TNFD

Nehemiah 12 in the TNT

Nehemiah 12 in the TNTIK

Nehemiah 12 in the TNTIL

Nehemiah 12 in the TNTIN

Nehemiah 12 in the TNTIP

Nehemiah 12 in the TNTIZ

Nehemiah 12 in the TOMA

Nehemiah 12 in the TTENT

Nehemiah 12 in the UBG

Nehemiah 12 in the UGV

Nehemiah 12 in the UGV2

Nehemiah 12 in the UGV3

Nehemiah 12 in the VBL

Nehemiah 12 in the VDCC

Nehemiah 12 in the YALU

Nehemiah 12 in the YAPE

Nehemiah 12 in the YBVTP

Nehemiah 12 in the ZBP