Numbers 14 (BOICB)

1 Nʼabalị ahụ, ọgbakọ Izrel niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile. 2 Ndị Izrel niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala Ijipt maọbụ nʼọzara a. 3 Gịnị mere ONYENWE ANYỊ ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼIjipt?” 4 Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼIjipt.” 5 Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị Izrel niile zukọtara nʼebe ahụ. 6 Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha. 7 Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma. 8 Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ ONYENWE ANYỊ ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. 9 Unu enupukwala isi megide ONYENWE ANYỊ. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. ONYENWE ANYỊ nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.” 10 Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị Izrel nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo Joshua na Kaleb. Nʼoge a, ebube ONYENWE ANYỊ pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị Izrel niile. 11 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha. 12 Aga m eji nrịa nrịa nke na-efe efe tigbuo ha. Napụ ha ihe ha nwere. Ma aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu, nke ga-adị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.” 13 Ma Mosis rịọrọ ONYENWE ANYỊ sị ya, “Gịnị ka ndị Ijipt ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha. 14 Ha agwakwala ndị bi nʼobodo ndị a ihe banyere ya. Ndị obodo ndị a anụla ihe banyere gị ONYENWE ANYỊ, matakwa na ị nọnyeere Izrel, na gị bụ ONYENWE ANYỊ na ndị Izrel na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Ha anụkwala na ogidi igwe ojii gị ONYENWE ANYỊ na-eguzo nʼelu, nʼisi anyị. Ha matakwara na ị na-edu anyị nʼime ogidi igwe ojii nʼehihie, na nʼime ogidi na-enwu ọkụ nʼabalị. 15 Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị, 16 ‘ONYENWE ANYỊ enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’ 17 “Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo. 18 ONYENWE ANYỊ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ. 19 Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ Ijipt ruo ugbu a.” 20 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ zaghachiri Mosis sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ. 21 Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube ONYENWE ANYỊ. 22 Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime Ijipt, na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a, 23 o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya. 24 Ma ohu m nwoke Kaleb bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya. 25 Ma ugbu a, ebe ndị Izrel na-atụ ndị Amalek na ndị Kenan bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje Osimiri Uhie ahụ ihu.” 26 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis na Erọn okwu sị, 27 “Ruo ole mgbe ka ọgbakọ ọjọọ a ga-anọgide na-atamu ntamu megide m? Nʼihi na anụla m ntamu niile nke ndị Izrel a. 28 Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m. 29 Unu niile ga-anwụpịa nʼime ọzara a! Onye ọbụla nʼime unu niile gbarala iri afọ abụọ maọbụ karịa, nke tamuru ntamu megide m. 30 O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abanye nʼala ahụ, m sitere nʼaka m welie elu ṅụọ iyi ime ka ọ bụrụ ebe obibi unu, karịa Kaleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun. 31 Ma ebe unu tụrụ egwu sị na ụmụ unu na-aga ibu ndị ohu nye ndị bi nʼala ahụ. Lee na aga m edubata ha nʼime ala ahụ. Ha ga-eketakwa ala ahụ unu jụrụ, nke unu ledara anya. 32 Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a. 33 Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara. 34 Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya. 35 Mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ” 36 Ya mere ndị ahụ Mosis zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ Izrel tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara. 37 Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu ONYENWE ANYỊ. 38 Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune fọdụrụ ndụ. 39 Mgbe Mosis gwara ụmụ Izrel okwu niile si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ, ha ruru ụjụ dị ilu. 40 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri nʼoge bulie ije ịga nʼala ugwu ugwu ahụ. Ha sịrị, “Anyị emehiela. Ugbu a anyị ejikerela ije nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ kwere anyị nkwa.” 41 Ma Mosis zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu ONYENWE ANYỊ nyere? Nke a agaghị aga nke ọma. 42 Unu arịgokwala, nʼihi na ONYENWE ANYỊ anọghị nʼetiti unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu. 43 Nʼihi na ndị Amalek na ndị Kenan nọ na-eche unu nʼebe ahụ! Ebe ọ bụ na unu esitela nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ wezuga onwe unu, ọ gaghị anọnyere unu, unu ga-adakwa nʼihu mma agha.” 44 Nʼagbanyeghịkwa nke a, na ha enweghị nkwado. Ha rigooro ruo ebe kachasị elu nʼobodo ahụ dị nʼugwu, ọ bụ ezie na Mosis maọbụ igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ esighị nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ pụọ. 45 Mgbe ahụ, ndị Amalek na ndị Kenan bụ ndị bi nʼobodo ugwu ahụ, rịdatara lụso ha ọgụ. Tidaa ha nʼala ruo Homa.

In Other Versions

Numbers 14 in the ANGEFD

Numbers 14 in the ANTPNG2D

Numbers 14 in the AS21

Numbers 14 in the BAGH

Numbers 14 in the BBPNG

Numbers 14 in the BBT1E

Numbers 14 in the BDS

Numbers 14 in the BEV

Numbers 14 in the BHAD

Numbers 14 in the BIB

Numbers 14 in the BLPT

Numbers 14 in the BNT

Numbers 14 in the BNTABOOT

Numbers 14 in the BNTLV

Numbers 14 in the BOATCB

Numbers 14 in the BOATCB2

Numbers 14 in the BOBCV

Numbers 14 in the BOCNT

Numbers 14 in the BOECS

Numbers 14 in the BOGWICC

Numbers 14 in the BOHCB

Numbers 14 in the BOHCV

Numbers 14 in the BOHLNT

Numbers 14 in the BOHNTLTAL

Numbers 14 in the BOILNTAP

Numbers 14 in the BOITCV

Numbers 14 in the BOKCV

Numbers 14 in the BOKCV2

Numbers 14 in the BOKHWOG

Numbers 14 in the BOKSSV

Numbers 14 in the BOLCB

Numbers 14 in the BOLCB2

Numbers 14 in the BOMCV

Numbers 14 in the BONAV

Numbers 14 in the BONCB

Numbers 14 in the BONLT

Numbers 14 in the BONUT2

Numbers 14 in the BOPLNT

Numbers 14 in the BOSCB

Numbers 14 in the BOSNC

Numbers 14 in the BOTLNT

Numbers 14 in the BOVCB

Numbers 14 in the BOYCB

Numbers 14 in the BPBB

Numbers 14 in the BPH

Numbers 14 in the BSB

Numbers 14 in the CCB

Numbers 14 in the CUV

Numbers 14 in the CUVS

Numbers 14 in the DBT

Numbers 14 in the DGDNT

Numbers 14 in the DHNT

Numbers 14 in the DNT

Numbers 14 in the ELBE

Numbers 14 in the EMTV

Numbers 14 in the ESV

Numbers 14 in the FBV

Numbers 14 in the FEB

Numbers 14 in the GGMNT

Numbers 14 in the GNT

Numbers 14 in the HARY

Numbers 14 in the HNT

Numbers 14 in the IRVA

Numbers 14 in the IRVB

Numbers 14 in the IRVG

Numbers 14 in the IRVH

Numbers 14 in the IRVK

Numbers 14 in the IRVM

Numbers 14 in the IRVM2

Numbers 14 in the IRVO

Numbers 14 in the IRVP

Numbers 14 in the IRVT

Numbers 14 in the IRVT2

Numbers 14 in the IRVU

Numbers 14 in the ISVN

Numbers 14 in the JSNT

Numbers 14 in the KAPI

Numbers 14 in the KBT1ETNIK

Numbers 14 in the KBV

Numbers 14 in the KJV

Numbers 14 in the KNFD

Numbers 14 in the LBA

Numbers 14 in the LBLA

Numbers 14 in the LNT

Numbers 14 in the LSV

Numbers 14 in the MAAL

Numbers 14 in the MBV

Numbers 14 in the MBV2

Numbers 14 in the MHNT

Numbers 14 in the MKNFD

Numbers 14 in the MNG

Numbers 14 in the MNT

Numbers 14 in the MNT2

Numbers 14 in the MRS1T

Numbers 14 in the NAA

Numbers 14 in the NASB

Numbers 14 in the NBLA

Numbers 14 in the NBS

Numbers 14 in the NBVTP

Numbers 14 in the NET2

Numbers 14 in the NIV11

Numbers 14 in the NNT

Numbers 14 in the NNT2

Numbers 14 in the NNT3

Numbers 14 in the PDDPT

Numbers 14 in the PFNT

Numbers 14 in the RMNT

Numbers 14 in the SBIAS

Numbers 14 in the SBIBS

Numbers 14 in the SBIBS2

Numbers 14 in the SBICS

Numbers 14 in the SBIDS

Numbers 14 in the SBIGS

Numbers 14 in the SBIHS

Numbers 14 in the SBIIS

Numbers 14 in the SBIIS2

Numbers 14 in the SBIIS3

Numbers 14 in the SBIKS

Numbers 14 in the SBIKS2

Numbers 14 in the SBIMS

Numbers 14 in the SBIOS

Numbers 14 in the SBIPS

Numbers 14 in the SBISS

Numbers 14 in the SBITS

Numbers 14 in the SBITS2

Numbers 14 in the SBITS3

Numbers 14 in the SBITS4

Numbers 14 in the SBIUS

Numbers 14 in the SBIVS

Numbers 14 in the SBT

Numbers 14 in the SBT1E

Numbers 14 in the SCHL

Numbers 14 in the SNT

Numbers 14 in the SUSU

Numbers 14 in the SUSU2

Numbers 14 in the SYNO

Numbers 14 in the TBIAOTANT

Numbers 14 in the TBT1E

Numbers 14 in the TBT1E2

Numbers 14 in the TFTIP

Numbers 14 in the TFTU

Numbers 14 in the TGNTATF3T

Numbers 14 in the THAI

Numbers 14 in the TNFD

Numbers 14 in the TNT

Numbers 14 in the TNTIK

Numbers 14 in the TNTIL

Numbers 14 in the TNTIN

Numbers 14 in the TNTIP

Numbers 14 in the TNTIZ

Numbers 14 in the TOMA

Numbers 14 in the TTENT

Numbers 14 in the UBG

Numbers 14 in the UGV

Numbers 14 in the UGV2

Numbers 14 in the UGV3

Numbers 14 in the VBL

Numbers 14 in the VDCC

Numbers 14 in the YALU

Numbers 14 in the YAPE

Numbers 14 in the YBVTP

Numbers 14 in the ZBP