1 Kings 10 (BOICB)

1 Mgbe eze nwanyị Sheba nụrụ akụkọ Solomọn, na ịdị na mma nke dị nʼetiti ya na ONYENWE ANYỊ, ọ bịara ka o were ọtụtụ ajụjụ siri ike nwalee Solomọn. 2 Ọ bịarutere Jerusalem, ya na ọtụtụ ndị ozi nʼebe ha bara ụba, ndị so ya, tinyere ọtụtụ ịnyịnya kamel ndị bu ụda dị iche iche, ọtụtụ ọlaedo na nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. Ọ bịakwutere Solomọn, ya na ya kparịtara ụka banyere ihe niile nke dị ya nʼobi. 3 Solomọn zara ya ajụjụ ya niile; ọ dịkwaghị ihe siiri eze ike ịkọwara ya. 4 Mgbe eze nwanyị Sheba hụrụ amamihe niile nke Solomọn, hụkwa ụlọeze o wuru, 5 na ihe oriri a na-adọkwasị nʼelu tebul ya, usoro ọnọdụ nke ndịisi ọchịchị ya, na ndị guzo na-ejere ya ozi nʼuwe ha yi, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ ya, na aja nsure ọkụ niile ọ na-achụ nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, ọ dịkwaghị ihe ọzọ ọ maara ọ ga-eme, maọbụ kwuo. 6 Ọ sịrị eze, “Akụkọ niile m nọ nʼala m nụ banyere ihe niile ị rụpụtara na amamihe gị bụ eziokwu. 7 Ma ekwenyeghị m akụkọ ndị a tutu ruo mgbe m bịara jiri anya m abụọ hụ ha. Nʼezie, ihe m nụrụ erughị ọkara; nʼamamihe nakwa nʼịba ụba gị, ị tụkwasịla ihe nʼakụkọ m nụrụ. 8 Lee, ụdị ọṅụ ndị gị na-enwe. Lee, ụdị ọṅụ nke ndị ozi na-enwe, bụ ndị na-eguzo nʼihu gị mgbe niile na-anụ okwu amamihe gị. 9 Ngọzị dịrị ONYENWE ANYỊ Chineke gị, onye nwere mmasị nʼebe ị nọ, o debere gị nʼocheeze Izrel. Nʼihi ịhụnanya nke ONYENWE ANYỊ na-adị ruo mgbe ebighị ebi nʼebe Izrel nọ, o meele gị eze, ka ị debe ikpe ziri ezi na ezi omume.” 10 O nyere Solomọn onyinye ọlaedo ịdị arọ ya dị puku kilogram anọ, nyekwa ya ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dị iche iche, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa. O nwebeghị oge ọzọ ewebatara ọtụtụ ụda na-esi isi ụtọ dịka ndị ahụ eze nwanyị Sheba nyere eze Solomọn. 11 (Ọzọkwa, ọtụtụ ụgbọ mmiri nke eze Hiram bubatara ọlaedo site nʼỌfịa bulatara Solomọn. Ha sitekwara nʼebe ahụ bute osisi almụg nʼebe ọ bara ụba, na ọtụtụ nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche. 12 Eze ji osisi almụg ndị a wuo ogidi ndabere dị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ na nke ụlọeze. O jikwa ya meere ndị na-abụ abụ ụbọ akwara na une. Ọ dịbeghị mgbe ọbụla ahụrụ maọbụ tụbata osisi almụg ha otu a site nʼụbọchị ahụ ruo taa.) 13 Eze Solomọn nyekwara eze nwanyị Sheba ihe niile ọ chọrọ na ihe niile bụ nke ọ rịọrọ, na-agụnyeghị onyinye niile Solomọn nyere ya dịka eze ọ bụ. Emesịa, ọ hapụrụ laghachi nʼala nke aka ya, ya na ndị na-ejere ya ozi. 14 Ọtụtụ ịdị arọ nke ọlaedo Solomọn na-enweta kwa afọ bụ puku kilogram iri abụọ na atọ, 15 na-agụnyeghị uru nke na-esi nʼaka ndị na-atụ mgbereahịa na ndị na-azụ ahịa na nke sitekwara nʼaka ndị eze Arebịa niile, nakwa nʼaka ndịisi na-achị obodo niile nke ala ahụ. 16 Eze Solomọn kpụrụ narị ọta ọlaedo ukwu abụọ site nʼọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo nke ịdị arọ ya ruru kilogram isii na ụma itoolu ka eji kpụọ ọta ọbụla. 17 Ọ kpụkwara narị ọta nta atọ, nke sitere na ọlaedo etipịara etipịa. Ọ bụ ọlaedo ịdị arọ ya ruru kilogram atọ na ọkara ka eji kpụọ ọta ọbụla. Eze debere ha nʼụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn. 18 Eze mekwara ocheeze dị ukwu nke e ji ọdụ enyi na ọlaedo a nụchara anụcha machie. 19 Ocheeze ahụ nwere ihe nrigo isii, o nwere elu dị gburugburu nʼazụ ya. E nwere ebe ntụkwasị aka nʼakụkụ abụọ ya, nke nwere oyiyi ọdụm abụọ guzo nʼakụkụ nke ọbụla nʼime ha. 20 Ọdụm iri na abụọ na-eguzo nʼelu ihe nrigo isii ahụ, otu nʼakụkụ isi abụọ nke ihe nrigo ọbụla. Ọ dịkwaghị alaeze ọzọ dị nke e mere ihe dị otu a nye. 21 Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn. 22 Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nʼoke osimiri, tinyere ụgbọ nke Hiram. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ mmiri ndị a na-alọta, buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata. 23 Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nwekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa. 24 Ụwa niile na-abịa ịchọ ihu Solomọn ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya. 25 Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ. 26 Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ. 27 Eze mere ka ọlaọcha baa ụba dịka nkume efu na Jerusalem. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche. 28 A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ. 29 Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii, jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.

In Other Versions

1 Kings 10 in the ANGEFD

1 Kings 10 in the ANTPNG2D

1 Kings 10 in the AS21

1 Kings 10 in the BAGH

1 Kings 10 in the BBPNG

1 Kings 10 in the BBT1E

1 Kings 10 in the BDS

1 Kings 10 in the BEV

1 Kings 10 in the BHAD

1 Kings 10 in the BIB

1 Kings 10 in the BLPT

1 Kings 10 in the BNT

1 Kings 10 in the BNTABOOT

1 Kings 10 in the BNTLV

1 Kings 10 in the BOATCB

1 Kings 10 in the BOATCB2

1 Kings 10 in the BOBCV

1 Kings 10 in the BOCNT

1 Kings 10 in the BOECS

1 Kings 10 in the BOGWICC

1 Kings 10 in the BOHCB

1 Kings 10 in the BOHCV

1 Kings 10 in the BOHLNT

1 Kings 10 in the BOHNTLTAL

1 Kings 10 in the BOILNTAP

1 Kings 10 in the BOITCV

1 Kings 10 in the BOKCV

1 Kings 10 in the BOKCV2

1 Kings 10 in the BOKHWOG

1 Kings 10 in the BOKSSV

1 Kings 10 in the BOLCB

1 Kings 10 in the BOLCB2

1 Kings 10 in the BOMCV

1 Kings 10 in the BONAV

1 Kings 10 in the BONCB

1 Kings 10 in the BONLT

1 Kings 10 in the BONUT2

1 Kings 10 in the BOPLNT

1 Kings 10 in the BOSCB

1 Kings 10 in the BOSNC

1 Kings 10 in the BOTLNT

1 Kings 10 in the BOVCB

1 Kings 10 in the BOYCB

1 Kings 10 in the BPBB

1 Kings 10 in the BPH

1 Kings 10 in the BSB

1 Kings 10 in the CCB

1 Kings 10 in the CUV

1 Kings 10 in the CUVS

1 Kings 10 in the DBT

1 Kings 10 in the DGDNT

1 Kings 10 in the DHNT

1 Kings 10 in the DNT

1 Kings 10 in the ELBE

1 Kings 10 in the EMTV

1 Kings 10 in the ESV

1 Kings 10 in the FBV

1 Kings 10 in the FEB

1 Kings 10 in the GGMNT

1 Kings 10 in the GNT

1 Kings 10 in the HARY

1 Kings 10 in the HNT

1 Kings 10 in the IRVA

1 Kings 10 in the IRVB

1 Kings 10 in the IRVG

1 Kings 10 in the IRVH

1 Kings 10 in the IRVK

1 Kings 10 in the IRVM

1 Kings 10 in the IRVM2

1 Kings 10 in the IRVO

1 Kings 10 in the IRVP

1 Kings 10 in the IRVT

1 Kings 10 in the IRVT2

1 Kings 10 in the IRVU

1 Kings 10 in the ISVN

1 Kings 10 in the JSNT

1 Kings 10 in the KAPI

1 Kings 10 in the KBT1ETNIK

1 Kings 10 in the KBV

1 Kings 10 in the KJV

1 Kings 10 in the KNFD

1 Kings 10 in the LBA

1 Kings 10 in the LBLA

1 Kings 10 in the LNT

1 Kings 10 in the LSV

1 Kings 10 in the MAAL

1 Kings 10 in the MBV

1 Kings 10 in the MBV2

1 Kings 10 in the MHNT

1 Kings 10 in the MKNFD

1 Kings 10 in the MNG

1 Kings 10 in the MNT

1 Kings 10 in the MNT2

1 Kings 10 in the MRS1T

1 Kings 10 in the NAA

1 Kings 10 in the NASB

1 Kings 10 in the NBLA

1 Kings 10 in the NBS

1 Kings 10 in the NBVTP

1 Kings 10 in the NET2

1 Kings 10 in the NIV11

1 Kings 10 in the NNT

1 Kings 10 in the NNT2

1 Kings 10 in the NNT3

1 Kings 10 in the PDDPT

1 Kings 10 in the PFNT

1 Kings 10 in the RMNT

1 Kings 10 in the SBIAS

1 Kings 10 in the SBIBS

1 Kings 10 in the SBIBS2

1 Kings 10 in the SBICS

1 Kings 10 in the SBIDS

1 Kings 10 in the SBIGS

1 Kings 10 in the SBIHS

1 Kings 10 in the SBIIS

1 Kings 10 in the SBIIS2

1 Kings 10 in the SBIIS3

1 Kings 10 in the SBIKS

1 Kings 10 in the SBIKS2

1 Kings 10 in the SBIMS

1 Kings 10 in the SBIOS

1 Kings 10 in the SBIPS

1 Kings 10 in the SBISS

1 Kings 10 in the SBITS

1 Kings 10 in the SBITS2

1 Kings 10 in the SBITS3

1 Kings 10 in the SBITS4

1 Kings 10 in the SBIUS

1 Kings 10 in the SBIVS

1 Kings 10 in the SBT

1 Kings 10 in the SBT1E

1 Kings 10 in the SCHL

1 Kings 10 in the SNT

1 Kings 10 in the SUSU

1 Kings 10 in the SUSU2

1 Kings 10 in the SYNO

1 Kings 10 in the TBIAOTANT

1 Kings 10 in the TBT1E

1 Kings 10 in the TBT1E2

1 Kings 10 in the TFTIP

1 Kings 10 in the TFTU

1 Kings 10 in the TGNTATF3T

1 Kings 10 in the THAI

1 Kings 10 in the TNFD

1 Kings 10 in the TNT

1 Kings 10 in the TNTIK

1 Kings 10 in the TNTIL

1 Kings 10 in the TNTIN

1 Kings 10 in the TNTIP

1 Kings 10 in the TNTIZ

1 Kings 10 in the TOMA

1 Kings 10 in the TTENT

1 Kings 10 in the UBG

1 Kings 10 in the UGV

1 Kings 10 in the UGV2

1 Kings 10 in the UGV3

1 Kings 10 in the VBL

1 Kings 10 in the VDCC

1 Kings 10 in the YALU

1 Kings 10 in the YAPE

1 Kings 10 in the YBVTP

1 Kings 10 in the ZBP