1 Samuel 20 (BOICB)

1 Devid sitere na Naịọt nʼime Rema gbapụ ọsọ, chọta Jonatan, sị ya, “Ọ bụ gịnị ka m mere? Gịnị bụkwa ihe ọjọọ m mere? Olee ụzọ m si mejọọ nna gị, mere o ji na-achọsi ike ka ọ napụ m ndụ m?” 2 Jonatan sịrị ya, “Nke a abụghị eziokwu. Ị gaghị anwụ! Ihe dị otu a adịghị nna m nʼobi, nʼihi na ọ na-agwa m ihe ọbụla ọ na-ezube ime, ọ bụladị ihe ukwu maọbụ ihe ntakịrị. Amakwaara m na ọ gaghị ezonarị m ihe dị otu a. Mba, ọ bụghị eziokwu.” 3 Devid ṅụrụ iyi sị, “Nna gị maara nke ọma na m anatala amara nʼebe ị nọ, nʼihi ya, o kwuola nʼime onwe ya sị, ‘Agaghị m agwa Jonatan, ka ọ ghara iwute ya.’ Ma eji m ONYENWE ANYỊ na mkpụrụobi gị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụ naanị otu nzọ ụkwụ dị ugbu a nʼetiti mụ na ọnwụ.” 4 Jonatan sịrị Devid, “Ihe ọbụla ị chọrọ ka m mee, aga m emere gị ya.” 5 Devid sịrị ya, “Lee echi ga-abụ mmemme ọnwa ọhụrụ, e kwesiri m iso eze rie nri. Ma hapụ m ka m ga zoo onwe m nʼọhịa tutu ruo uhuruchi nke nwanne echi. 6 Ọ bụrụ na nna gị ajụọ ase m, sị ya, ‘Devid rịọsiri m arịrịọ ike ka m hapụ ya ka ọ gbaga Betlehem, bụ obodo ya, nʼihi a na-achụ aja nke dịrị agbụrụ ya kwa afọ.’ 7 Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ọ dị mma,’ mgbe ahụ, udo ga-adịrị ohu gị. Ma ọ bụrụ na o wee iwe nke ukwuu, mara nʼezie na o zubere ime m ihe ọjọọ. 8 Ma gị onwe gị, meere ohu gị ebere, nʼihi na i meela ka o sooro gị baa nʼọgbụgba ndụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Ọ bụrụ na ikpe mara m, gị onwe gị gbuo m. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji nyefee m nʼaka nna gị?” 9 Jonatan sịrị, “Agaghị m eme ya, lee, a sịkwa na m maara na nna m na-achọ igbu gị, ọ bụ na m agaghị agwa gị?” 10 Devid jụrụ ya, “Onye ga-agwa m ma ọ bụrụ na nna gị aza gị okwu ike ike?” 11 Jonatan sịrị ya, “Bịa ka anyị pụọ gaa nʼọhịa.” Ya mere, ha abụọ pụrụ jee nʼọhịa. 12 Jonatan gwara Devid sị, “Eji m aha ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel na-ekwe nkwa na-asị gị, nʼoge ugbu a echi, maọbụ nwanne echi, aga m akpanyere nna m ụka banyere gị, meekwa ka ị mata ihe ọ na-eche banyere gị. Ọ bụrụ na obi dị ya mma nʼebe ị nọ, aga m eme ka ị mata. 13 Ma ọ bụrụ na nna m na-achọ imerụ gị ahụ, ka ONYENWE ANYỊ mesoo Jonatan mmeso, otu ọbụla o si dị njọ, ma ọ bụrụ na m abịaghị gwa gị, zilaga gị ka ị laa nʼudo. Ka ONYENWE ANYỊ nọnyere gị dịka o si nọnyere nna m. 14 Chetakwa, i ghaghị igosi m ịhụnanya na obi ebere ONYENWE ANYỊ, ma ọ bụrụ na m anwụọ. 15 E wezugakwala ịhụnanya gị na obi ebere gị site nʼebe ezinaụlọ m dị, ọ bụladị mgbe ONYENWE ANYỊ bipụchara ndị iro Devid niile site nʼelu ụwa.” 16 Jonatan na ụlọ Devid gbara ndụ. O kwuru sị, “Ka ONYENWE ANYỊ kpee ndị iro Devid niile ikpe.” 17 Jonatan mere ka Devid site nʼịhụnanya ọ hụrụ ya ṅụọra ya iyi. Nʼihi na Jonatan hụrụ Devid nʼanya dịka ọ hụrụ onwe ya. 18 Mgbe ahụ, Jonatan sịrị Devid, “Echi bụ mmemme ọnwa ọhụrụ. A ga-ele anya gị, nʼihi na ọnọdụ gị ga-atọgbọrọ nʼefu. 19 Nwanne echi ya, nʼoge uhuruchi, gaa nʼebe ahụ i zoro onwe gị mgbe nsogbu a malitere, chere nʼebe ahụ, nʼakụkụ nkume Ezel. 20 Aga m abịa gbaa àkụ atọ nʼakụkụ ya dịka a ga-asị na o nwere ihe m chọrọ iji ụta m gbata. 21 Emesịa, aga m ezipu otu nwantakịrị sị ya, ‘Gaa chọta àkụ ndị ahụ.’ Ọ bụrụ na ị nụ ka m na-agwa ya okwu sị, ‘Lee àkụ ndị a dị nʼakụkụ azụ gị, chita ha ebe a,’ mgbe ahụ, pụta nʼihi, dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, udo dịrị gị, egwu ọbụla adịghị. 22 Ma ọ bụrụ na m agwa nwantakịrị ahụ okwu sị ya, ‘Lee, àkụ ahụ dị nʼihu gị,’ ọ pụtara na ị ghaghị isi nʼebe a pụọ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ ezipụla gị. 23 Ma ihe banyere okwu ahụ anyị kwuru, cheta na ONYENWE ANYỊ bụ onye akaebe, nʼetiti mụ na gị ruo mgbe ebighị ebi.” 24 Ya mere, Devid gara zoo onwe ya nʼọhịa. Mgbe oge mmemme ọnwa ọhụrụ ruru, eze Sọl nọdụrụ ala iri nri. 25 Ọ nọdụrụ ọdụ nʼakụkụ aja ụlọ, bụ ebe ọ dị mbụ anọ, na ncherita ihu Jonatan. Abna nọdụrụ nʼakụkụ Sọl, ma oche Devid na-anọ enweghị onye nọ ya. 26 Sọl ekwughị ihe ọbụla banyere ya nʼụbọchị ahụ, nʼihi na o chere na ọ dị ihe ndaba mere, nke tinyere Devid nʼọnọdụ adịghị ọcha. Sọl kwuru nʼobi ya sị, “E, ọ ghaghị ịbụ ihe kpatara ya.” 27 Ma nʼechi ya, bụ abalị nke abụọ nke ọnwa ọhụrụ, ọnọdụ Devid tọgbọrọ nʼefu ọzọ. Mgbe ahụ, Sọl sịrị nwa ya Jonatan, “Gịnị mere nwa Jesi abịaghị iso rie nri, ma ụnyaahụ ma taa?” 28 Jonatan zara sị, “Devid rịọrọ sị m nye ya ike ka ọ gaa Betlehem. 29 Ọ sịrị m, ‘Kwere ka m gaa nʼihi na ndị ezinaụlọ anyị nwere aja mmemme ha na-eme nʼobodo. Nwanne m nwoke nyere m iwu sị m na m aghaghị ịbịa. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼebe ị nọ, biko kwere ka m gaa hụ ụmụnne m.’ Ọ bụ nke a mere ọ bịaghị na tebul eze.” 30 Iwe were Sọl nke ukwuu. Ọ gwara Jonatan okwu nʼiwe sị ya, “Gị nwa nke nwanyị na-enupu isi, nke uche ya gbagọrọ agbagọ. Ị na-eche na m amaghị na i dịnyere nwa Jesi si otu a wetara onwe gị na nne gị ihe ihere? 31 Nʼihi na ụbọchị niile nwa Jesi dị ndụ nʼụwa a, ọnọdụ gị na alaeze gị agaghị eguzosi ike. Ugbu a, pụọ, zipụ ozi kpọtara m ya ka m gbuo ya!” 32 Jonatan jụrụ nna ya Sọl sị, “Gịnị ka o mere? Nʼihi gịnị ka a ga-eji mee ka ọ nwụọ?” 33 Ma Sọl tụrụ ùbe o ji nʼaka ya ka o jiri ya tugbuo Jonatan, ma Jonatan zere ya. Nke a mere ka Jonatan mata nʼezie na nna ya na-achọ igbu Devid. 34 Jonatan si na tebul ahụ bilie nʼoke iwe pụọ, o righịkwa nri nʼụbọchị nke abụọ nke mmemme ahụ, nʼihi na omume ihere nna ya mesoro Devid wutere ya hie nne. 35 Nʼụtụtụ echi ya, dịka ha kara aka, Jonatan gara nʼọhịa, ya na nwantakịrị nwoke so gaa. 36 Ọ sịrị nwantakịrị nwoke ahụ, “Gbara ọsọ gaa chọta àkụ ndị ahụ niile m na-agba.” Mgbe nwantakịrị ahụ na-agba ọsọ na-aga, Jonatan gbapụrụ àkụ, gbafee ya nʼihu nwantakịrị ahụ. 37 Mgbe nwokorobịa ahụ na-ejeru nso ebe àkụ ahụ Jonatan gbara dị, Jonatan kpọkuru ya sị ya, “Àkụ ahụ dị nʼihu gị.” 38 Mgbe ahụ, o tiri mkpu sị, “Mee ngwangwa! Gawa ọsịịsọ! Eguzokwala!” Nwokorobịa ahụ chịkọtara àkụ ndị ahụ niile gbaghachikwute nna ya ukwu. 39 Ma nwantakịrị nwoke ahụ aghọtaghị ihe Jonatan mere; ma Jonatan na Devid maara ihe gara. 40 Jonatan nyere nwokorobịa ahụ ụta ya na àkụ ndị ahụ ka ọ chighachi ha nʼobodo. 41 Mgbe nwokorobịa ahụ lara, Devid biliri site nʼakụkụ ndịda nkume ahụ ebe o zoro onwe kpuo ihu ya nʼala, kpọọ isiala ugboro atọ, nʼihu Jonatan. Ha suritere onwe ha ọnụ, bekọkwaa akwa. Ma Devid kwara akwa karịa. 42 Nʼikpeazụ, Jonatan gwara Devid okwu sị, “Gaa nʼudo, nʼihi na anyị ejirila aha ONYENWE ANYỊ ṅụọ iyi ịbụ enyi nʼetiti onwe anyị, na-asị, ‘ONYENWE ANYỊ bụ onye akaebe nʼebe mụ na gị, na nʼebe ụmụ ụmụ m, na ụmụ ụmụ gị nọ ruo mgbe ebighị ebi.’ ” Ha kewara. Devid malitere ịpụ, ma Jonatan tụgharịrị baa nʼobodo.

In Other Versions

1 Samuel 20 in the ANGEFD

1 Samuel 20 in the ANTPNG2D

1 Samuel 20 in the AS21

1 Samuel 20 in the BAGH

1 Samuel 20 in the BBPNG

1 Samuel 20 in the BBT1E

1 Samuel 20 in the BDS

1 Samuel 20 in the BEV

1 Samuel 20 in the BHAD

1 Samuel 20 in the BIB

1 Samuel 20 in the BLPT

1 Samuel 20 in the BNT

1 Samuel 20 in the BNTABOOT

1 Samuel 20 in the BNTLV

1 Samuel 20 in the BOATCB

1 Samuel 20 in the BOATCB2

1 Samuel 20 in the BOBCV

1 Samuel 20 in the BOCNT

1 Samuel 20 in the BOECS

1 Samuel 20 in the BOGWICC

1 Samuel 20 in the BOHCB

1 Samuel 20 in the BOHCV

1 Samuel 20 in the BOHLNT

1 Samuel 20 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 20 in the BOILNTAP

1 Samuel 20 in the BOITCV

1 Samuel 20 in the BOKCV

1 Samuel 20 in the BOKCV2

1 Samuel 20 in the BOKHWOG

1 Samuel 20 in the BOKSSV

1 Samuel 20 in the BOLCB

1 Samuel 20 in the BOLCB2

1 Samuel 20 in the BOMCV

1 Samuel 20 in the BONAV

1 Samuel 20 in the BONCB

1 Samuel 20 in the BONLT

1 Samuel 20 in the BONUT2

1 Samuel 20 in the BOPLNT

1 Samuel 20 in the BOSCB

1 Samuel 20 in the BOSNC

1 Samuel 20 in the BOTLNT

1 Samuel 20 in the BOVCB

1 Samuel 20 in the BOYCB

1 Samuel 20 in the BPBB

1 Samuel 20 in the BPH

1 Samuel 20 in the BSB

1 Samuel 20 in the CCB

1 Samuel 20 in the CUV

1 Samuel 20 in the CUVS

1 Samuel 20 in the DBT

1 Samuel 20 in the DGDNT

1 Samuel 20 in the DHNT

1 Samuel 20 in the DNT

1 Samuel 20 in the ELBE

1 Samuel 20 in the EMTV

1 Samuel 20 in the ESV

1 Samuel 20 in the FBV

1 Samuel 20 in the FEB

1 Samuel 20 in the GGMNT

1 Samuel 20 in the GNT

1 Samuel 20 in the HARY

1 Samuel 20 in the HNT

1 Samuel 20 in the IRVA

1 Samuel 20 in the IRVB

1 Samuel 20 in the IRVG

1 Samuel 20 in the IRVH

1 Samuel 20 in the IRVK

1 Samuel 20 in the IRVM

1 Samuel 20 in the IRVM2

1 Samuel 20 in the IRVO

1 Samuel 20 in the IRVP

1 Samuel 20 in the IRVT

1 Samuel 20 in the IRVT2

1 Samuel 20 in the IRVU

1 Samuel 20 in the ISVN

1 Samuel 20 in the JSNT

1 Samuel 20 in the KAPI

1 Samuel 20 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 20 in the KBV

1 Samuel 20 in the KJV

1 Samuel 20 in the KNFD

1 Samuel 20 in the LBA

1 Samuel 20 in the LBLA

1 Samuel 20 in the LNT

1 Samuel 20 in the LSV

1 Samuel 20 in the MAAL

1 Samuel 20 in the MBV

1 Samuel 20 in the MBV2

1 Samuel 20 in the MHNT

1 Samuel 20 in the MKNFD

1 Samuel 20 in the MNG

1 Samuel 20 in the MNT

1 Samuel 20 in the MNT2

1 Samuel 20 in the MRS1T

1 Samuel 20 in the NAA

1 Samuel 20 in the NASB

1 Samuel 20 in the NBLA

1 Samuel 20 in the NBS

1 Samuel 20 in the NBVTP

1 Samuel 20 in the NET2

1 Samuel 20 in the NIV11

1 Samuel 20 in the NNT

1 Samuel 20 in the NNT2

1 Samuel 20 in the NNT3

1 Samuel 20 in the PDDPT

1 Samuel 20 in the PFNT

1 Samuel 20 in the RMNT

1 Samuel 20 in the SBIAS

1 Samuel 20 in the SBIBS

1 Samuel 20 in the SBIBS2

1 Samuel 20 in the SBICS

1 Samuel 20 in the SBIDS

1 Samuel 20 in the SBIGS

1 Samuel 20 in the SBIHS

1 Samuel 20 in the SBIIS

1 Samuel 20 in the SBIIS2

1 Samuel 20 in the SBIIS3

1 Samuel 20 in the SBIKS

1 Samuel 20 in the SBIKS2

1 Samuel 20 in the SBIMS

1 Samuel 20 in the SBIOS

1 Samuel 20 in the SBIPS

1 Samuel 20 in the SBISS

1 Samuel 20 in the SBITS

1 Samuel 20 in the SBITS2

1 Samuel 20 in the SBITS3

1 Samuel 20 in the SBITS4

1 Samuel 20 in the SBIUS

1 Samuel 20 in the SBIVS

1 Samuel 20 in the SBT

1 Samuel 20 in the SBT1E

1 Samuel 20 in the SCHL

1 Samuel 20 in the SNT

1 Samuel 20 in the SUSU

1 Samuel 20 in the SUSU2

1 Samuel 20 in the SYNO

1 Samuel 20 in the TBIAOTANT

1 Samuel 20 in the TBT1E

1 Samuel 20 in the TBT1E2

1 Samuel 20 in the TFTIP

1 Samuel 20 in the TFTU

1 Samuel 20 in the TGNTATF3T

1 Samuel 20 in the THAI

1 Samuel 20 in the TNFD

1 Samuel 20 in the TNT

1 Samuel 20 in the TNTIK

1 Samuel 20 in the TNTIL

1 Samuel 20 in the TNTIN

1 Samuel 20 in the TNTIP

1 Samuel 20 in the TNTIZ

1 Samuel 20 in the TOMA

1 Samuel 20 in the TTENT

1 Samuel 20 in the UBG

1 Samuel 20 in the UGV

1 Samuel 20 in the UGV2

1 Samuel 20 in the UGV3

1 Samuel 20 in the VBL

1 Samuel 20 in the VDCC

1 Samuel 20 in the YALU

1 Samuel 20 in the YAPE

1 Samuel 20 in the YBVTP

1 Samuel 20 in the ZBP