1 Samuel 4 (BOICB)

1 Okwu Samuel rutere ndị Izrel niile ntị.Mgbe Izrel pụrụ izute ndị Filistia nʼagha, ha mara ụlọ ikwu ha na Ebeneza, ma ndị Filistia mara nke ha nʼAfek. 2 Nʼagha a lụrụ nʼụbọchị ahụ, ndị Filistia doro onwe ha nʼusoro izute ndị Izrel, dịka agha na-agbasa, ndị Filistia lụgburu ụmụ Izrel, gbukwaa puku mmadụ anọ nʼime ha. 3 Mgbe ndị agha Izrel fọdụrụ laghachiri nʼụlọ ikwu ha, ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị mere ONYENWE ANYỊ ji kwe ka ndị Filistia merie anyị taa. Ka anyị gaa Shaịlo buputa igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, ka o soro anyị jee agha, ka ọ napụta anyị site nʼaka ndị iro anyị.” 4 Ya mere, ha zigara ndị mmadụ ka ha gaa Shaịlo. Ha sitere nʼebe ahụ bute igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, onye ahụ na-anọkwasị nʼoche ebere nʼetiti cherubim. Ụmụ ndị ikom Elayị abụọ, bụ Hofni na Finehaz, nọnyeere igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ. 5 Mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ nʼebe ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha, ndị Izrel tiri mkpu mere ka ala maa jijiji. 6 Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, “Gịnị na-eme? Ọ bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?”Mgbe a gwara ha na ọ bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ erutela, 7 ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, “Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga. 8 Ahụhụ dịrị anyị! Onye ga-anapụta anyị site nʼaka chi ndị a dị ike? Nʼihi na ọ bụ chi ndị a ji ihe otiti dị iche iche tie ndị Ijipt mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara. 9 Unu dị ike, unu ndị Filistia, bụrụkwanụ ndị ikom, ma ọ bụghị otu a, unu ga-aghọ ohu ndị Hibru dịka ha bụụrụ unu ndị ohu. Bụrụnụ ndị ikom, lụọ agha!” 10 Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha. 11 Ndị Filistia dọtara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼagha, ma gbukwaa Hofni na Finehaz ụmụ Elayị. 12 Ma otu nwoke onye Benjamin gbapụrụ ọsọ site nʼọgbọ agha ahụ, gbara ruo Shaịlo nʼotu ụbọchị ahụ, o yi uwe dọwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi. 13 Mgbe o rutere, Elayị nọ nʼoche ya nʼakụkụ ụzọ, na-eche, nʼihi na obi ya na-ama jijiji, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Mgbe nwoke ahụ batara nʼime obodo, kọọ ihe mere, mkpu akwa dara nʼobodo ahụ niile. 14 Elayị nụrụ iti mkpu ahụ jụọ sị, “Gịnị bụ isi ụzụ a?”Onyeozi ahụ mere ngwangwa bata gwa Elayị okwu. 15 Elayị agbaala iri afọ itoolu na afọ asatọ nʼoge a, nke mere na ọ naghị ahụkwa ụzọ. 16 Nwoke ahụ gwara Elayị sị, “Esi m nʼihu agha gbalata. Anọ m nʼebe ahụ taa hụ ka agha si gaa.”Elayị jụrụ sị, “Nwa m, ọ bụ gịnị mere?” 17 Onyeozi ahụ zara sị, “Izrel sitere nʼihu ndị Filistia gbaa ọsọ. E tigbukwara ọtụtụ nʼime ndị agha ha. Ọzọ, ụmụ gị abụọ, Hofni na Finehaz nwụrụ. E burukwara igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” 18 Mgbe onyeozi ahụ kwutere maka igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Elayị sitere nʼoche ya dalaa azụ nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dajie olu ya, nwụọ! Nʼihi na o meela nnọọ agadi. Ọ bụkwa onye buru ibu. Ya onwe ya kpekwara ụmụ Izrel ikpe iri afọ anọ. 19 Nwunye nwa ya, bụ nwunye Finehaz, dị ime, nọọkwa nso oge ịmụ nwa ya. Mgbe ọ nụrụ maka obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nụkwa maka ọnwụ nna di ya na di ya, ọ mụpụtara nwa ya nʼike. Ma ọ nwụrụ nʼihi ihe mgbu nke afọ ime. 20 Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị. 21 Ọ gụrụ nwantakịrị aha, kpọọ ya Ịkabọdụ, kwuo sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ,” nʼihi obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, na nʼihi ọnwụ nna di ya na di ya. 22 O kwuru sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ, nʼihi na e buuru igbe Chineke.”

In Other Versions

1 Samuel 4 in the ANGEFD

1 Samuel 4 in the ANTPNG2D

1 Samuel 4 in the AS21

1 Samuel 4 in the BAGH

1 Samuel 4 in the BBPNG

1 Samuel 4 in the BBT1E

1 Samuel 4 in the BDS

1 Samuel 4 in the BEV

1 Samuel 4 in the BHAD

1 Samuel 4 in the BIB

1 Samuel 4 in the BLPT

1 Samuel 4 in the BNT

1 Samuel 4 in the BNTABOOT

1 Samuel 4 in the BNTLV

1 Samuel 4 in the BOATCB

1 Samuel 4 in the BOATCB2

1 Samuel 4 in the BOBCV

1 Samuel 4 in the BOCNT

1 Samuel 4 in the BOECS

1 Samuel 4 in the BOGWICC

1 Samuel 4 in the BOHCB

1 Samuel 4 in the BOHCV

1 Samuel 4 in the BOHLNT

1 Samuel 4 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 4 in the BOILNTAP

1 Samuel 4 in the BOITCV

1 Samuel 4 in the BOKCV

1 Samuel 4 in the BOKCV2

1 Samuel 4 in the BOKHWOG

1 Samuel 4 in the BOKSSV

1 Samuel 4 in the BOLCB

1 Samuel 4 in the BOLCB2

1 Samuel 4 in the BOMCV

1 Samuel 4 in the BONAV

1 Samuel 4 in the BONCB

1 Samuel 4 in the BONLT

1 Samuel 4 in the BONUT2

1 Samuel 4 in the BOPLNT

1 Samuel 4 in the BOSCB

1 Samuel 4 in the BOSNC

1 Samuel 4 in the BOTLNT

1 Samuel 4 in the BOVCB

1 Samuel 4 in the BOYCB

1 Samuel 4 in the BPBB

1 Samuel 4 in the BPH

1 Samuel 4 in the BSB

1 Samuel 4 in the CCB

1 Samuel 4 in the CUV

1 Samuel 4 in the CUVS

1 Samuel 4 in the DBT

1 Samuel 4 in the DGDNT

1 Samuel 4 in the DHNT

1 Samuel 4 in the DNT

1 Samuel 4 in the ELBE

1 Samuel 4 in the EMTV

1 Samuel 4 in the ESV

1 Samuel 4 in the FBV

1 Samuel 4 in the FEB

1 Samuel 4 in the GGMNT

1 Samuel 4 in the GNT

1 Samuel 4 in the HARY

1 Samuel 4 in the HNT

1 Samuel 4 in the IRVA

1 Samuel 4 in the IRVB

1 Samuel 4 in the IRVG

1 Samuel 4 in the IRVH

1 Samuel 4 in the IRVK

1 Samuel 4 in the IRVM

1 Samuel 4 in the IRVM2

1 Samuel 4 in the IRVO

1 Samuel 4 in the IRVP

1 Samuel 4 in the IRVT

1 Samuel 4 in the IRVT2

1 Samuel 4 in the IRVU

1 Samuel 4 in the ISVN

1 Samuel 4 in the JSNT

1 Samuel 4 in the KAPI

1 Samuel 4 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 4 in the KBV

1 Samuel 4 in the KJV

1 Samuel 4 in the KNFD

1 Samuel 4 in the LBA

1 Samuel 4 in the LBLA

1 Samuel 4 in the LNT

1 Samuel 4 in the LSV

1 Samuel 4 in the MAAL

1 Samuel 4 in the MBV

1 Samuel 4 in the MBV2

1 Samuel 4 in the MHNT

1 Samuel 4 in the MKNFD

1 Samuel 4 in the MNG

1 Samuel 4 in the MNT

1 Samuel 4 in the MNT2

1 Samuel 4 in the MRS1T

1 Samuel 4 in the NAA

1 Samuel 4 in the NASB

1 Samuel 4 in the NBLA

1 Samuel 4 in the NBS

1 Samuel 4 in the NBVTP

1 Samuel 4 in the NET2

1 Samuel 4 in the NIV11

1 Samuel 4 in the NNT

1 Samuel 4 in the NNT2

1 Samuel 4 in the NNT3

1 Samuel 4 in the PDDPT

1 Samuel 4 in the PFNT

1 Samuel 4 in the RMNT

1 Samuel 4 in the SBIAS

1 Samuel 4 in the SBIBS

1 Samuel 4 in the SBIBS2

1 Samuel 4 in the SBICS

1 Samuel 4 in the SBIDS

1 Samuel 4 in the SBIGS

1 Samuel 4 in the SBIHS

1 Samuel 4 in the SBIIS

1 Samuel 4 in the SBIIS2

1 Samuel 4 in the SBIIS3

1 Samuel 4 in the SBIKS

1 Samuel 4 in the SBIKS2

1 Samuel 4 in the SBIMS

1 Samuel 4 in the SBIOS

1 Samuel 4 in the SBIPS

1 Samuel 4 in the SBISS

1 Samuel 4 in the SBITS

1 Samuel 4 in the SBITS2

1 Samuel 4 in the SBITS3

1 Samuel 4 in the SBITS4

1 Samuel 4 in the SBIUS

1 Samuel 4 in the SBIVS

1 Samuel 4 in the SBT

1 Samuel 4 in the SBT1E

1 Samuel 4 in the SCHL

1 Samuel 4 in the SNT

1 Samuel 4 in the SUSU

1 Samuel 4 in the SUSU2

1 Samuel 4 in the SYNO

1 Samuel 4 in the TBIAOTANT

1 Samuel 4 in the TBT1E

1 Samuel 4 in the TBT1E2

1 Samuel 4 in the TFTIP

1 Samuel 4 in the TFTU

1 Samuel 4 in the TGNTATF3T

1 Samuel 4 in the THAI

1 Samuel 4 in the TNFD

1 Samuel 4 in the TNT

1 Samuel 4 in the TNTIK

1 Samuel 4 in the TNTIL

1 Samuel 4 in the TNTIN

1 Samuel 4 in the TNTIP

1 Samuel 4 in the TNTIZ

1 Samuel 4 in the TOMA

1 Samuel 4 in the TTENT

1 Samuel 4 in the UBG

1 Samuel 4 in the UGV

1 Samuel 4 in the UGV2

1 Samuel 4 in the UGV3

1 Samuel 4 in the VBL

1 Samuel 4 in the VDCC

1 Samuel 4 in the YALU

1 Samuel 4 in the YAPE

1 Samuel 4 in the YBVTP

1 Samuel 4 in the ZBP