1 Samuel 9 (BOICB)

1 E nwere otu nwoke si Benjamin aha ya bụ Kish nwa Abiel, nwa Zeroa, nwa Bekorat, nwa Afia, onye Benjamin, burukwa oke mmadụ a maa ama. 2 O nwere nwa nwoke aha ya bụ Sọl, onye bụ okorobịa nọ nʼuju ya. O nweghị nwoke ọzọ e ji atụnyere ya nʼIzrel niile. O toro ogologo karịa onye ọbụla site nʼubu ruo nʼisi. 3 Otu ụbọchị, ụfọdụ nʼime ịnyịnya ibu Kish nna Sọl nwere kpafuru. Nʼihi ya, Kish kpọrọ Sọl gwa ya okwu sị, “Duru otu odibo ka gị na ya soro ga chọgharịa ịnyịnya ibu ndị a.” 4 Ha chọrọ ịnyịnya ndị ahụ gaa nʼala ugwu ugwu Ifrem, na nʼakụkụ Shalisha, ma ha ahụghị ha. Ha chọkwara ha gaa nʼakụkụ Shaalim, ma ha ahụghị ha nʼebe ahụ. Emesịa, ha chọrọ ịnyịnya ibu ndị ahụ gaa nʼala niile nke ndị Benjamin, ma ha ahụghị ha ebe ọbụla. 5 Nʼikpeazụ, mgbe ha chọọrọ ha rute nʼala Zuf, Sọl gwara onyeozi ahụ ya na ya so, sị, “Ka anyị laghachi, nʼihi na ọ bụrụ na nna m elee anya anyị ma ọ hụghị anyị, ọ ga-amalite iche echiche banyere anyị karịa ịnyịnya ibu ndị a.” 6 Ma odibo ahụ zara ya sị, “Lee, e nwere otu onye nke Chineke bi nʼobodo a; ọ bụkwa onye mmadụ niile na-asọpụrụ nʼihi na ihe ọbụla o kwuru na-emezu. Ka anyị gaa hụ ya, ma eleghị anya ọ ga-agwa anyị ụzọ anyị ga-esi.” 7 Sọl sịrị odibo ya, “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ? Nri dị na-akpa anyị agwụla, ọ dịkwaghị onyinye anyị nwere nke anyị ga-enye onye nke Chineke. Gịnị ka anyị nwere?” 8 Onyeozi ahụ zara ya ọzọ sị, “Lee, enwere m otu mkpụrụ shekel ọlaọcha. Aga m enye ya onye Chineke a ka ọ gwa anyị ụzọ anyị ga-esi.” 9 (Na mgbe gara aga nʼIzrel, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju Chineke ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ). 10 Sọl sịrị odibo ya, “Ọ dị mma, Bịa ka anyị gaa.” Ha biliri gawa nʼobodo ebe onye Chineke ahụ nọ. 11 Mgbe ha na-arịgo ugwu ịbanye obodo ahụ, ha zutere ụfọdụ ụmụ agbọghọ ka ha na-apụta iseta mmiri, jụọ ha ajụjụ sị, “Onye ọhụ ụzọ ahụ ọ nọ nʼebe a?” 12 Ụmụ agbọghọ ahụ zara ha sị, “E, ọ nọ ya. Lee ya ka ọ na-aga nʼihu unu. Unu jesie ike unu ga-ahụ ya. Ugbu a ka ọ batara obodo anyị, nʼihi na ọ na-aga iso ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼebe dị elu. 13 Ngwangwa unu banye nʼobodo, unu ga-ahụ ya tupu o gaa nʼebe dị elu iri ihe. Nʼihi na ndị mmadụ agaghị ebido iri ihe tutu ruo mgbe o rutere, nʼihi na ọ ghaghị ịgọzi ihe aja ahụ tupu ndị a kpọrọ oku ebido iri ihe. Gbagoonụ unu ga-ahụ ya nʼoge dịka nke a.” 14 Ya mere, ha mere ngwangwa, baa nʼime obodo ahụ. Dịka ha na-abata nʼime obodo, lee Samuel ka ọ na-abịakwute ha; ọ na-aga nʼebe ahụ dị elu. 15 Ma nʼụbọchị bọrọ tupu ụbọchị Sọl na-abịa, ONYENWE ANYỊ kpughere nke a nye Samuel. 16 “Dịka mgbe a echi, aga m ezitere gị otu nwoke sị nʼala Benjamin. Ị ga-ete ya mmanụ nke ga-eme ya ka ọ bụrụ onyendu Izrel ndị m. Ọ ga-azọpụta ha site nʼaka ndị Filistia, nʼihi na ahụla m ahụhụ nke ha nọ nʼime ya; anụkwala m ịkwa akwa ha.” 17 Mgbe Samuel hụrụ Sọl, ONYENWE ANYỊ gwara ya sị, “Lee nwoke ahụ m gwara gị ihe banyere ya! Ọ bụ ya ga-achị ndị m.” 18 Ma Sọl bịaruru Samuel nso jụọ ya sị, “Biko, zi m ebe ụlọ onye ọhụ ụzọ dị.” 19 Samuel zara sị ya, “Mụ onwe m bụ ọhụ ụzọ ahụ. Gaanụ nʼihu m rigoruo nʼebe dị elu, nʼihi na mụ na unu ga-eso rikọọ nri taa. Nʼụtụtụ echi aga m agwa gị ihe dị gị nʼobi. Aga m ezilagakwa gị. 20 Enyela obi gị nsogbu maka ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu nʼabalị atọ gara aga, nʼihi na a chọtala ha. Ma, onye ka mmadụ ahụ bụ, onye ndị Izrel niile na-achọsi ike? Ọ bụghị gị na ezinaụlọ nna gị.” 21 Ma Sọl zara sị, “Ọ bụghị onye Benjamin ka m bụ, onye sitere nʼebo kachasị nta nʼIzrel; ọ bụghị agbụrụ m dịkarịsịrị nta nʼetiti agbụrụ niile ọzọ dị nʼebo Benjamin? Gịnị mere i ji agwa m ụdị okwu dị otu a?” 22 Mgbe ahụ, Samuel duuru Sọl na onyeozi ya kpọbata ha nʼime ụlọ ukwu, nye ha ọnọdụ nʼisi oche nʼetiti iri mmadụ atọ ọ kpọrọ oriri. 23 Samuel gwara onyeisi ndị na-esi nri okwu sị, “Weta anụ ahụ m nyere gị, nke ahụ m sị gị ka ị debe iche.” 24 Onye na-esi nri weere ụkwụ anụ ahụ na ihe ndị so ya debe ya nʼihu Sọl. Samuel sịrị, “Lee, ihe ndị e wepụrụ ka e debere gị. Rie, nʼihi na e debere gị ya maka oge akara aka, site nʼoge ahụ m kwuru si, ‘Akpọrọ m ndị mmadụ oku nri.’ ” Sọl sooro Samuel rie nri nʼụbọchị ahụ. 25 Mgbe ha sitere nʼebe ahụ dị elu rịdata nʼobodo. Samuel kpanyere Sọl ụka nʼelu ụlọ ya. 26 Nʼisi ụtụtụ mgbe ha biliri, Samuel kpọrọ Sọl nʼụlọ elu sị, “Jikere, ka m zilaga gị.” Mgbe Sọl kwadoro, ya na Samuel sooro pụọ nʼezi. 27 Ka ha na-arịda na-abịaru nsọtụ obodo ahụ, Samuel sịrị Sọl, “Gwa onyeozi ahụ ka ọ gafee nʼihu anyị.” Onyeozi ahụ mekwara otu a, ma, “Gị onwe gị chere ntakịrị oge nʼebe a ka m mee ka ị nụrụ ozi sitere nʼaka Chineke.”

In Other Versions

1 Samuel 9 in the ANGEFD

1 Samuel 9 in the ANTPNG2D

1 Samuel 9 in the AS21

1 Samuel 9 in the BAGH

1 Samuel 9 in the BBPNG

1 Samuel 9 in the BBT1E

1 Samuel 9 in the BDS

1 Samuel 9 in the BEV

1 Samuel 9 in the BHAD

1 Samuel 9 in the BIB

1 Samuel 9 in the BLPT

1 Samuel 9 in the BNT

1 Samuel 9 in the BNTABOOT

1 Samuel 9 in the BNTLV

1 Samuel 9 in the BOATCB

1 Samuel 9 in the BOATCB2

1 Samuel 9 in the BOBCV

1 Samuel 9 in the BOCNT

1 Samuel 9 in the BOECS

1 Samuel 9 in the BOGWICC

1 Samuel 9 in the BOHCB

1 Samuel 9 in the BOHCV

1 Samuel 9 in the BOHLNT

1 Samuel 9 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 9 in the BOILNTAP

1 Samuel 9 in the BOITCV

1 Samuel 9 in the BOKCV

1 Samuel 9 in the BOKCV2

1 Samuel 9 in the BOKHWOG

1 Samuel 9 in the BOKSSV

1 Samuel 9 in the BOLCB

1 Samuel 9 in the BOLCB2

1 Samuel 9 in the BOMCV

1 Samuel 9 in the BONAV

1 Samuel 9 in the BONCB

1 Samuel 9 in the BONLT

1 Samuel 9 in the BONUT2

1 Samuel 9 in the BOPLNT

1 Samuel 9 in the BOSCB

1 Samuel 9 in the BOSNC

1 Samuel 9 in the BOTLNT

1 Samuel 9 in the BOVCB

1 Samuel 9 in the BOYCB

1 Samuel 9 in the BPBB

1 Samuel 9 in the BPH

1 Samuel 9 in the BSB

1 Samuel 9 in the CCB

1 Samuel 9 in the CUV

1 Samuel 9 in the CUVS

1 Samuel 9 in the DBT

1 Samuel 9 in the DGDNT

1 Samuel 9 in the DHNT

1 Samuel 9 in the DNT

1 Samuel 9 in the ELBE

1 Samuel 9 in the EMTV

1 Samuel 9 in the ESV

1 Samuel 9 in the FBV

1 Samuel 9 in the FEB

1 Samuel 9 in the GGMNT

1 Samuel 9 in the GNT

1 Samuel 9 in the HARY

1 Samuel 9 in the HNT

1 Samuel 9 in the IRVA

1 Samuel 9 in the IRVB

1 Samuel 9 in the IRVG

1 Samuel 9 in the IRVH

1 Samuel 9 in the IRVK

1 Samuel 9 in the IRVM

1 Samuel 9 in the IRVM2

1 Samuel 9 in the IRVO

1 Samuel 9 in the IRVP

1 Samuel 9 in the IRVT

1 Samuel 9 in the IRVT2

1 Samuel 9 in the IRVU

1 Samuel 9 in the ISVN

1 Samuel 9 in the JSNT

1 Samuel 9 in the KAPI

1 Samuel 9 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 9 in the KBV

1 Samuel 9 in the KJV

1 Samuel 9 in the KNFD

1 Samuel 9 in the LBA

1 Samuel 9 in the LBLA

1 Samuel 9 in the LNT

1 Samuel 9 in the LSV

1 Samuel 9 in the MAAL

1 Samuel 9 in the MBV

1 Samuel 9 in the MBV2

1 Samuel 9 in the MHNT

1 Samuel 9 in the MKNFD

1 Samuel 9 in the MNG

1 Samuel 9 in the MNT

1 Samuel 9 in the MNT2

1 Samuel 9 in the MRS1T

1 Samuel 9 in the NAA

1 Samuel 9 in the NASB

1 Samuel 9 in the NBLA

1 Samuel 9 in the NBS

1 Samuel 9 in the NBVTP

1 Samuel 9 in the NET2

1 Samuel 9 in the NIV11

1 Samuel 9 in the NNT

1 Samuel 9 in the NNT2

1 Samuel 9 in the NNT3

1 Samuel 9 in the PDDPT

1 Samuel 9 in the PFNT

1 Samuel 9 in the RMNT

1 Samuel 9 in the SBIAS

1 Samuel 9 in the SBIBS

1 Samuel 9 in the SBIBS2

1 Samuel 9 in the SBICS

1 Samuel 9 in the SBIDS

1 Samuel 9 in the SBIGS

1 Samuel 9 in the SBIHS

1 Samuel 9 in the SBIIS

1 Samuel 9 in the SBIIS2

1 Samuel 9 in the SBIIS3

1 Samuel 9 in the SBIKS

1 Samuel 9 in the SBIKS2

1 Samuel 9 in the SBIMS

1 Samuel 9 in the SBIOS

1 Samuel 9 in the SBIPS

1 Samuel 9 in the SBISS

1 Samuel 9 in the SBITS

1 Samuel 9 in the SBITS2

1 Samuel 9 in the SBITS3

1 Samuel 9 in the SBITS4

1 Samuel 9 in the SBIUS

1 Samuel 9 in the SBIVS

1 Samuel 9 in the SBT

1 Samuel 9 in the SBT1E

1 Samuel 9 in the SCHL

1 Samuel 9 in the SNT

1 Samuel 9 in the SUSU

1 Samuel 9 in the SUSU2

1 Samuel 9 in the SYNO

1 Samuel 9 in the TBIAOTANT

1 Samuel 9 in the TBT1E

1 Samuel 9 in the TBT1E2

1 Samuel 9 in the TFTIP

1 Samuel 9 in the TFTU

1 Samuel 9 in the TGNTATF3T

1 Samuel 9 in the THAI

1 Samuel 9 in the TNFD

1 Samuel 9 in the TNT

1 Samuel 9 in the TNTIK

1 Samuel 9 in the TNTIL

1 Samuel 9 in the TNTIN

1 Samuel 9 in the TNTIP

1 Samuel 9 in the TNTIZ

1 Samuel 9 in the TOMA

1 Samuel 9 in the TTENT

1 Samuel 9 in the UBG

1 Samuel 9 in the UGV

1 Samuel 9 in the UGV2

1 Samuel 9 in the UGV3

1 Samuel 9 in the VBL

1 Samuel 9 in the VDCC

1 Samuel 9 in the YALU

1 Samuel 9 in the YAPE

1 Samuel 9 in the YBVTP

1 Samuel 9 in the ZBP