2 Chronicles 34 (BOICB)

1 Josaya gbara afọ asatọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị iri afọ atọ na otu na Jerusalem. 2 O mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 3 Nʼafọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ okorobịa, o bidoro iji obi ya niile na-achọ Chineke nke nna ya Devid. Nʼafọ iri na abụọ nke ọchịchị ya, ọ malitere ime ka Juda na Jerusalem dị ọcha site nʼiwezuga ebe ịchụ aja niile dị elu, na ogidi Ashera niile, na arụsị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ niile. 4 Nʼihu ya o mere ka a kwatuo ebe ịchụ aja Baal nʼike. Ọ kụdara ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị nʼelu ebe ịchụ aja Baal ndị ahụ, tijisie ogidi Ashera niile, na arụsị na oyiyi niile. Ọ kụjasịrị ha niile, kpokọrọ ha ghasaa ha nʼelu ili ndị na-efe ha. 5 Ọ kpọrọ ọkpụkpụ ndị nchụaja ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja arụsị ha, si otu a mee ka Juda na Jerusalem dị ọcha. 6 Nʼobodo ndị Manase, na Ifrem na Simiọn, ruo na Naftalị, na mkpọmkpọ ebe ha niile gburugburu. 7 O titụrụ ebe ịchụ aja nke arụsị niile na ogidi arụsị Ashera, gwepịa arụsị ndị a niile dịka ntụ. Otu a ka o mere nʼala Izrel niile tupu ọ laghachi Jerusalem. 8 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, mgbe o mere ka ala ahụ na ụlọnsọ dị ọcha, o zigara Shefan nwa Azalaya, Maaseia onye na-achị obodo, na Joa nwa Joahaz, onye na-edekọ akụkọ, ka ha wuzie ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke ya. 9 Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem. 10 Mgbe ahụ, ha nyefere ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. Ndị ikom a kwụrụ ndị ọrụ rụziri ma mezie ụlọnsọ ahụ ụgwọ. 11 Ha nyekwara ndị ọkpọ ǹtu na ndị na-ewu ụlọ ego iji zụta nkume a wara awa, osisi iji mee ihe njikọta na osisi ịkwado ụlọ, maka iji rụzie ụlọ a nke ndị eze Juda hapụrụ ka ọ dakasịa. 12 Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche 13 ka e mere ndị nlekọta ndị na-ebu ibu. Ha lekọtakwara ndị niile rụrụ ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ nʼime ndị Livayị ndị a bụ ndị ode akwụkwọ na ndị na-edekọ ihe, na ndị na-eche ọnụ ụzọ nche. 14 Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, Hilkaya onye nchụaja chọtara akwụkwọ Iwu ONYENWE ANYỊ, bụ nke o nyere site nʼaka Mosis. 15 Hilkaya sịrị Shefan ode akwụkwọ, “Achọtala m Akwụkwọ Iwu nʼime ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ.” O nyere ya Shefan. 16 Mgbe ahụ, Shefan buuru akwụkwọ ahụ wegara ya eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị na-eje ozi ha dịka ihe niile i tinyere ha nʼaka si dị. 17 Ha enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ nʼaka ndị nlekọta ọrụ, na ndị ọrụ.” 18 Emesịa, Shefan ode akwụkwọ gwara eze okwu ọzọ sị ya, “O nwere akwụkwọ Hilkaya nyere m.” Shefan wepụtara ya gụọ ya na ntị eze. 19 Mgbe eze nụrụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya. 20 O nyere Hilkaya, Ahikam nwa Shefan, Abdon nwa Maịka, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha, 21 “Gaanụ jụta ONYENWE ANYỊ ase, nʼisi m na nʼisi ndị fọdụrụ nʼIzrel na Juda, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a bụ nke achọtara. Nʼihi na ọnụma ONYENWE ANYỊ dị ukwuu bụ nke a wụkwasịrị anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ edebeghị okwu nke ONYENWE ANYỊ, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime akwụkwọ a banyere anyị.” 22 Ya mere, Hilkaya na ndị ahụ eze zipụrụ ya na ha, jekwuuru Hulda, onye amụma nwanyị, onye bụ nwunye Shalum, nwa Tokhat, nwa Hasra. Onye nlekọta ebe a na-edebe uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ. 23 Ọ sịrị ha, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke Izrel, kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị 24 ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a, bụ nke a gụpụtara nʼihu eze Juda. 25 Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na ihe niile nke aka ha mepụtara, a ga-awụkwasị iwe m nʼebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’ 26 Gwanụ eze Juda, onye ahụ zitere unu ịjụta ase site nʼọnụ ONYENWE ANYỊ sị ya, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel na-ekwu banyere okwu ndị ahụ ị nụrụ. 27 Nʼihi na o wutere gị nʼobi, na i wedakwara onwe gị nʼala nʼihu Chineke, mgbe ị nụrụ ihe o kwuru megide ebe a na ndị bi nʼime ya, nʼihi na i wedara onwe gị nʼala nʼihu m, ma dọwaakwa uwe gị, bekwaa akwa nʼihu m. Mụ onwe m anụla, otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 28 Ugbu a, aga m achịkọta gị nye nna nna gị ha, a ga-eli gị nʼudo. Anya gị agaghị ahụ mbibi nke m ga-eme ka ọ bịakwasị ebe a na ndị bi nʼime ya.’ ”Ha laghachiri inye eze ọsịsa ya. 29 Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị okenye Juda na Jerusalem niile. 30 Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ya na ndị ikom Juda niile, ndị niile bi na Jerusalem, na ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị mmadụ niile, site nʼonye nta ruo na onye ukwu. Ọ gụpụtara na ntị onye ọbụla okwu niile si nʼakwụkwọ ọgbụgba ndụ ahụ, bụ nke achọtara nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 31 Eze guzoro nʼakụkụ ogidi, kwee nkwa nʼihu ONYENWE ANYỊ, ịgbaso ONYENWE ANYỊ, na idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, na iji obi ya niile, na mkpụrụobi ya niile rube isi nʼokwu ọgbụgba ndụ ahụ e dere nʼakwụkwọ ahụ. 32 O mekwara ka ndị niile nọ na Jerusalem na Benjamin kwee Onyenwe anyị otu nkwa ahụ. Ndị niile bi na Jerusalem mezukwara ihe ndị a dịka ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Chineke nna nna ha si dị. 33 Josaya sitere nʼala niile bụ nke ndị Izrel wezuga ihe arụ niile bụ arụsị, o mere ndị niile nọ nʼIzrel nʼoge ahụ ka ha fee ONYENWE ANYỊ bụ Chineke ha. Nʼụbọchị ndụ ya niile, ha esiteghị nʼiso ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke nna nna wezuga onwe ha.

In Other Versions

2 Chronicles 34 in the ANGEFD

2 Chronicles 34 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 34 in the AS21

2 Chronicles 34 in the BAGH

2 Chronicles 34 in the BBPNG

2 Chronicles 34 in the BBT1E

2 Chronicles 34 in the BDS

2 Chronicles 34 in the BEV

2 Chronicles 34 in the BHAD

2 Chronicles 34 in the BIB

2 Chronicles 34 in the BLPT

2 Chronicles 34 in the BNT

2 Chronicles 34 in the BNTABOOT

2 Chronicles 34 in the BNTLV

2 Chronicles 34 in the BOATCB

2 Chronicles 34 in the BOATCB2

2 Chronicles 34 in the BOBCV

2 Chronicles 34 in the BOCNT

2 Chronicles 34 in the BOECS

2 Chronicles 34 in the BOGWICC

2 Chronicles 34 in the BOHCB

2 Chronicles 34 in the BOHCV

2 Chronicles 34 in the BOHLNT

2 Chronicles 34 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 34 in the BOILNTAP

2 Chronicles 34 in the BOITCV

2 Chronicles 34 in the BOKCV

2 Chronicles 34 in the BOKCV2

2 Chronicles 34 in the BOKHWOG

2 Chronicles 34 in the BOKSSV

2 Chronicles 34 in the BOLCB

2 Chronicles 34 in the BOLCB2

2 Chronicles 34 in the BOMCV

2 Chronicles 34 in the BONAV

2 Chronicles 34 in the BONCB

2 Chronicles 34 in the BONLT

2 Chronicles 34 in the BONUT2

2 Chronicles 34 in the BOPLNT

2 Chronicles 34 in the BOSCB

2 Chronicles 34 in the BOSNC

2 Chronicles 34 in the BOTLNT

2 Chronicles 34 in the BOVCB

2 Chronicles 34 in the BOYCB

2 Chronicles 34 in the BPBB

2 Chronicles 34 in the BPH

2 Chronicles 34 in the BSB

2 Chronicles 34 in the CCB

2 Chronicles 34 in the CUV

2 Chronicles 34 in the CUVS

2 Chronicles 34 in the DBT

2 Chronicles 34 in the DGDNT

2 Chronicles 34 in the DHNT

2 Chronicles 34 in the DNT

2 Chronicles 34 in the ELBE

2 Chronicles 34 in the EMTV

2 Chronicles 34 in the ESV

2 Chronicles 34 in the FBV

2 Chronicles 34 in the FEB

2 Chronicles 34 in the GGMNT

2 Chronicles 34 in the GNT

2 Chronicles 34 in the HARY

2 Chronicles 34 in the HNT

2 Chronicles 34 in the IRVA

2 Chronicles 34 in the IRVB

2 Chronicles 34 in the IRVG

2 Chronicles 34 in the IRVH

2 Chronicles 34 in the IRVK

2 Chronicles 34 in the IRVM

2 Chronicles 34 in the IRVM2

2 Chronicles 34 in the IRVO

2 Chronicles 34 in the IRVP

2 Chronicles 34 in the IRVT

2 Chronicles 34 in the IRVT2

2 Chronicles 34 in the IRVU

2 Chronicles 34 in the ISVN

2 Chronicles 34 in the JSNT

2 Chronicles 34 in the KAPI

2 Chronicles 34 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 34 in the KBV

2 Chronicles 34 in the KJV

2 Chronicles 34 in the KNFD

2 Chronicles 34 in the LBA

2 Chronicles 34 in the LBLA

2 Chronicles 34 in the LNT

2 Chronicles 34 in the LSV

2 Chronicles 34 in the MAAL

2 Chronicles 34 in the MBV

2 Chronicles 34 in the MBV2

2 Chronicles 34 in the MHNT

2 Chronicles 34 in the MKNFD

2 Chronicles 34 in the MNG

2 Chronicles 34 in the MNT

2 Chronicles 34 in the MNT2

2 Chronicles 34 in the MRS1T

2 Chronicles 34 in the NAA

2 Chronicles 34 in the NASB

2 Chronicles 34 in the NBLA

2 Chronicles 34 in the NBS

2 Chronicles 34 in the NBVTP

2 Chronicles 34 in the NET2

2 Chronicles 34 in the NIV11

2 Chronicles 34 in the NNT

2 Chronicles 34 in the NNT2

2 Chronicles 34 in the NNT3

2 Chronicles 34 in the PDDPT

2 Chronicles 34 in the PFNT

2 Chronicles 34 in the RMNT

2 Chronicles 34 in the SBIAS

2 Chronicles 34 in the SBIBS

2 Chronicles 34 in the SBIBS2

2 Chronicles 34 in the SBICS

2 Chronicles 34 in the SBIDS

2 Chronicles 34 in the SBIGS

2 Chronicles 34 in the SBIHS

2 Chronicles 34 in the SBIIS

2 Chronicles 34 in the SBIIS2

2 Chronicles 34 in the SBIIS3

2 Chronicles 34 in the SBIKS

2 Chronicles 34 in the SBIKS2

2 Chronicles 34 in the SBIMS

2 Chronicles 34 in the SBIOS

2 Chronicles 34 in the SBIPS

2 Chronicles 34 in the SBISS

2 Chronicles 34 in the SBITS

2 Chronicles 34 in the SBITS2

2 Chronicles 34 in the SBITS3

2 Chronicles 34 in the SBITS4

2 Chronicles 34 in the SBIUS

2 Chronicles 34 in the SBIVS

2 Chronicles 34 in the SBT

2 Chronicles 34 in the SBT1E

2 Chronicles 34 in the SCHL

2 Chronicles 34 in the SNT

2 Chronicles 34 in the SUSU

2 Chronicles 34 in the SUSU2

2 Chronicles 34 in the SYNO

2 Chronicles 34 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 34 in the TBT1E

2 Chronicles 34 in the TBT1E2

2 Chronicles 34 in the TFTIP

2 Chronicles 34 in the TFTU

2 Chronicles 34 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 34 in the THAI

2 Chronicles 34 in the TNFD

2 Chronicles 34 in the TNT

2 Chronicles 34 in the TNTIK

2 Chronicles 34 in the TNTIL

2 Chronicles 34 in the TNTIN

2 Chronicles 34 in the TNTIP

2 Chronicles 34 in the TNTIZ

2 Chronicles 34 in the TOMA

2 Chronicles 34 in the TTENT

2 Chronicles 34 in the UBG

2 Chronicles 34 in the UGV

2 Chronicles 34 in the UGV2

2 Chronicles 34 in the UGV3

2 Chronicles 34 in the VBL

2 Chronicles 34 in the VDCC

2 Chronicles 34 in the YALU

2 Chronicles 34 in the YAPE

2 Chronicles 34 in the YBVTP

2 Chronicles 34 in the ZBP