Acts 26 (BOICB)

1 Agripa gwara Pọl, “Ị nwere ike i kwuru ọnụ gị.”Mgbe ahụ, Pọl gbasara aka ya abụọ bido ikwu okwu ịgọrọ onwe ya, 2 “Ana m agụ onwe m dịka onye nwere ihuọma, eze Agripa, inwe ohere ọma dị otu a, ịzara ọnụ m nʼihu gị nʼihe niile metụtara ebubo ndị Juu na-ebo m. 3 Nke ka nke, amatara m na omenaala ndị Juu na ịrụ ụka metụtara iwu ha doro gị anya. Biko ana m arịọ gị ka i jiri ndidi gee m ntị. 4 “Ndị Juu niile maara ibi ndụ m site na nwata m. Ha makwa site na mbụ, otu m si bie ndụ m niile nʼobodo nke m, nakwa nʼime Jerusalem. 5 Ha matara kemgbe ogologo oge, ha ga-agbakwa ama, ma ọ bụrụ na ha chọrọ ikwu eziokwu, na site na mbụ e biri m ndụ dịka otu onye so nʼime otu ahụ nke iwu ya dị ike karịchasịa nʼime okpukpe ndị Juu, nke bụ otu ndị Farisii. 6 Ma ugbu a, a na-ekpe m ikpe nʼihi na enwere m olileanya na nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị ochie ha. 7 Nkwa nke ebo iri na abụọ niile na-ele anya ịnata mgbe ha na-efe ofufe ehihie na abalị. Eze Agripa, ọ bụ nʼihi olileanya a, gị onye a na-asọpụrụ, ka ndị Juu ji na-ebo m ebubo. 8 Gịnị mere unu jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka ndị nwụrụ anwụ site nʼọnwụ bilie? 9 “Na mbụ, anara m eche na apụrụ m imeso aha Jisọs onye Nazaret mmeso ọjọọ niile. 10 Otu a ka m mere na Jerusalem. Ọ bụghị naanị na m natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja jiri ya kpọchie ọtụtụ ndị nsọ nʼụlọ mkpọrọ, ewelikwara m aka elu nʼoge a na-ama ha ikpe ọnwụ. 11 Ọtụtụ mgbe ka m hụrụ na a tara ha ahụhụ nʼụlọ nzukọ niile. Agbalịrị m ịkwagide ha ka ha kwuo arụ ma kwutọkwa okwukwe ha. Nʼihi na iwe m dị ọkụ megide ha, esogburu m ha nʼobodo dị iche iche nke na-abụghị obodo ndị Juu. 12 “Nʼihi nke a, a gara m Damaskọs site nʼikike na nkwenye nke ndịisi nchụaja. Anatakwara m ike nʼaka ndịisi nchụaja. 13 Nʼoge ehihie, eze Agripa, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nʼụzọ, gị onye a na-asọpụrụ, ka m hụrụ ìhè nke na-acha karịa anyanwụ ka o si nʼeluigwe chaa m na ndị mụ na ha so gburugburu. 14 Anyị niile dara nʼala. Ma anụrụ m olu gwara m okwu nʼasụsụ Hibru, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-akpagbu m? Ị na-emerụ onwe gị ahụ site nʼịkpọ ụkwụ na ndụdụ e ji achị ehi.’ 15 “Asịrị m, ‘Ị bụ onye, Onyenwe anyị?’“Onyenwe anyị kwuru, ‘Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu. 16 Ugbu a, bilie, kwụrụ ọtọ! Nʼihi na-emere m ka ị hụ m anya, ka m họpụta gị ka ị bụrụ onyeozi m na onye akaebe m. Ị ga-emekwa ka ụwa niile mara ihe banyere nzute a i zutere m taa, na ọtụtụ mgbe ọzọ m ga-ezute gị. 17 Aga m azọpụta gị site nʼaka ndị nke gị na sitekwa nʼaka ndị mba ọzọ, ndị m na-eziga gị ka i jekwuru. 18 Imeghe anya ha mee ka ha si nʼọchịchịrị lọghachi banye nʼìhè, sikwa nʼike nke ekwensu lọghachikwute Chineke. Ka ha site nʼokwukwe ha nwere nʼebe m nọ nata mgbaghara mmehie ha, ketakwa oke ahụ dị ngọzị nʼetiti ndị e doro nsọ.’ 19 “Ya mere, eze Agripa, enupughị m isi nʼọhụ nke eluigwe ahụ. 20 Ebidoro m izisa oziọma a na Damaskọs. Emekwara m otu a na Jerusalem na nʼime Judịa niile na nʼetiti ndị mba ọzọ. Ana m ekwusa mkpa ọ dị ka mmadụ niile nwee nchegharị lọghachikwute Chineke. Ka ha gosikwa nchegharị ha site nʼezi ọrụ nke ha na-arụ. 21 Ọ bụ nʼihi nke a ka ndị Juu jiri nwụchie m nʼụlọnsọ ukwu ahụ ma chọsiekwa ụzọ ike ịnapụ m ndụ m. 22 Ma Chineke chebere m mee ka m bụrụ onye dị ndụ taa, ịkọrọ mmadụ niile akụkọ a, ndị ukwu na ndị nta. Ihe m na-ekwu bụkwa ihe ndị amụma na Mosis kwuru na ọ ga-emezu, 23 na Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye mbụ ga-esi nʼọnwụ bilie, iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ ìhè.” 24 Mgbe ọ na-agọpụ onwe ya, Festọs tiri mkpu, “Pọl, ị bụ onye isi mebiri! Oke mmụta gị emebiela gị isi.” 25 Ma Pọl sịrị, “Isi emebighị m, ezigbo nna anyị Festọs. Ihe m na-ekwu nʼanya udo bụ naanị eziokwu. 26 Eze nʼonwe ya makwaara ihe ndị a niile, nʼihi ya ejighị m egwu ọbụla agwa ya okwu a. Ekwenyere m na ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe ndị a merenụ nke ezonarịrị ya, nʼihi na o nweghị nke mere na nzuzo. 27 Gị eze Agripa, i kwenyeghị na ndị amụma? Amaara m na i kweere.” 28 Mgbe ahụ Agripa sịrị, “Pọl, ị na-achọ nʼime ntakịrị oge a ịkwagide m ka m bụrụ onye kwere na Kraịst?” 29 Ma Pọl sịrị, “Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na Chineke ga-ekwe, mee ka gị na ndị niile nọ nʼebe a bụrụ ihe mụ onwe m bụ nʼime Kraịst ma ewezuga agbụ ndị a.” 30 Mgbe ahụ eze biliri ọtọ, ya na Festọs na Benaisi nwunye ya na ndị ọzọ niile ya na ha nọ nʼoche. 31 Mgbe ha na-apụ, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Nwoke a emeghị ihe ọbụla kwesiri ọnwụ maọbụ ịga mkpọrọ.” 32 Agripa gwara Festọs, “A gaara a hapụ nwoke a ma ọ bụrụ na o nyefeghị Siza ikpe ya.”

In Other Versions

Acts 26 in the ANGEFD

Acts 26 in the ANTPNG2D

Acts 26 in the AS21

Acts 26 in the BAGH

Acts 26 in the BBPNG

Acts 26 in the BBT1E

Acts 26 in the BDS

Acts 26 in the BEV

Acts 26 in the BHAD

Acts 26 in the BIB

Acts 26 in the BLPT

Acts 26 in the BNT

Acts 26 in the BNTABOOT

Acts 26 in the BNTLV

Acts 26 in the BOATCB

Acts 26 in the BOATCB2

Acts 26 in the BOBCV

Acts 26 in the BOCNT

Acts 26 in the BOECS

Acts 26 in the BOGWICC

Acts 26 in the BOHCB

Acts 26 in the BOHCV

Acts 26 in the BOHLNT

Acts 26 in the BOHNTLTAL

Acts 26 in the BOILNTAP

Acts 26 in the BOITCV

Acts 26 in the BOKCV

Acts 26 in the BOKCV2

Acts 26 in the BOKHWOG

Acts 26 in the BOKSSV

Acts 26 in the BOLCB

Acts 26 in the BOLCB2

Acts 26 in the BOMCV

Acts 26 in the BONAV

Acts 26 in the BONCB

Acts 26 in the BONLT

Acts 26 in the BONUT2

Acts 26 in the BOPLNT

Acts 26 in the BOSCB

Acts 26 in the BOSNC

Acts 26 in the BOTLNT

Acts 26 in the BOVCB

Acts 26 in the BOYCB

Acts 26 in the BPBB

Acts 26 in the BPH

Acts 26 in the BSB

Acts 26 in the CCB

Acts 26 in the CUV

Acts 26 in the CUVS

Acts 26 in the DBT

Acts 26 in the DGDNT

Acts 26 in the DHNT

Acts 26 in the DNT

Acts 26 in the ELBE

Acts 26 in the EMTV

Acts 26 in the ESV

Acts 26 in the FBV

Acts 26 in the FEB

Acts 26 in the GGMNT

Acts 26 in the GNT

Acts 26 in the HARY

Acts 26 in the HNT

Acts 26 in the IRVA

Acts 26 in the IRVB

Acts 26 in the IRVG

Acts 26 in the IRVH

Acts 26 in the IRVK

Acts 26 in the IRVM

Acts 26 in the IRVM2

Acts 26 in the IRVO

Acts 26 in the IRVP

Acts 26 in the IRVT

Acts 26 in the IRVT2

Acts 26 in the IRVU

Acts 26 in the ISVN

Acts 26 in the JSNT

Acts 26 in the KAPI

Acts 26 in the KBT1ETNIK

Acts 26 in the KBV

Acts 26 in the KJV

Acts 26 in the KNFD

Acts 26 in the LBA

Acts 26 in the LBLA

Acts 26 in the LNT

Acts 26 in the LSV

Acts 26 in the MAAL

Acts 26 in the MBV

Acts 26 in the MBV2

Acts 26 in the MHNT

Acts 26 in the MKNFD

Acts 26 in the MNG

Acts 26 in the MNT

Acts 26 in the MNT2

Acts 26 in the MRS1T

Acts 26 in the NAA

Acts 26 in the NASB

Acts 26 in the NBLA

Acts 26 in the NBS

Acts 26 in the NBVTP

Acts 26 in the NET2

Acts 26 in the NIV11

Acts 26 in the NNT

Acts 26 in the NNT2

Acts 26 in the NNT3

Acts 26 in the PDDPT

Acts 26 in the PFNT

Acts 26 in the RMNT

Acts 26 in the SBIAS

Acts 26 in the SBIBS

Acts 26 in the SBIBS2

Acts 26 in the SBICS

Acts 26 in the SBIDS

Acts 26 in the SBIGS

Acts 26 in the SBIHS

Acts 26 in the SBIIS

Acts 26 in the SBIIS2

Acts 26 in the SBIIS3

Acts 26 in the SBIKS

Acts 26 in the SBIKS2

Acts 26 in the SBIMS

Acts 26 in the SBIOS

Acts 26 in the SBIPS

Acts 26 in the SBISS

Acts 26 in the SBITS

Acts 26 in the SBITS2

Acts 26 in the SBITS3

Acts 26 in the SBITS4

Acts 26 in the SBIUS

Acts 26 in the SBIVS

Acts 26 in the SBT

Acts 26 in the SBT1E

Acts 26 in the SCHL

Acts 26 in the SNT

Acts 26 in the SUSU

Acts 26 in the SUSU2

Acts 26 in the SYNO

Acts 26 in the TBIAOTANT

Acts 26 in the TBT1E

Acts 26 in the TBT1E2

Acts 26 in the TFTIP

Acts 26 in the TFTU

Acts 26 in the TGNTATF3T

Acts 26 in the THAI

Acts 26 in the TNFD

Acts 26 in the TNT

Acts 26 in the TNTIK

Acts 26 in the TNTIL

Acts 26 in the TNTIN

Acts 26 in the TNTIP

Acts 26 in the TNTIZ

Acts 26 in the TOMA

Acts 26 in the TTENT

Acts 26 in the UBG

Acts 26 in the UGV

Acts 26 in the UGV2

Acts 26 in the UGV3

Acts 26 in the VBL

Acts 26 in the VDCC

Acts 26 in the YALU

Acts 26 in the YAPE

Acts 26 in the YBVTP

Acts 26 in the ZBP