Daniel 3 (BOICB)

1 Eze Nebukadneza kpụrụ oyiyi ọlaedo nke ịdị elu ya ga-adị iri mita atọ, obosara ya ga-adị ka mita atọ. Emesịa, o debe ya nʼobosara ala Dura, nke dị nʼotu mpaghara Babilọn. 2 Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere. 3 Ya mere, ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile na ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, zukọtara maka ido oyiyi ahụ nke eze, bụ Nebukadneza guzobere nsọ. Ha niile guzooro ọtọ nʼihu oyiyi ahụ bụ nke eze Nebukadneza guzobere. 4 Onye nkwusa kwuru okwu nʼolu ike, “Mmadụ niile si na mba niile na asụsụ niile dị iche iche bịa, ka a na-enye iwu nke a, 5 mgbe ọbụla unu nụrụ ụda ọja, une, ụbọ akwara, maọbụ ụda ihe egwu ọbụla, unu ga-ada nʼala kpọọ isiala nye ihe a Nebukadneza eze ji ọlaedo kpụọ. 6 Onye ọbụla juru ịkpọ isiala ka a ga-atụba ngwangwa nʼime ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.” 7 Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere. 8 Nʼoge a, ụfọdụ nʼime ndị Kaldịa pụtara nʼihu boo ndị Juu ebubo. 9 Ha gwara eze, bụ Nebukadneza, “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 10 Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ, 11 na onye ọbụla jụrụ ịkpọ isiala ka a ga-atụba nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. 12 Ugbu a, e nwere ụfọdụ ndị Juu, ndị aha ha bụ Shedrak, na Mishak na Abednego, ndị i mere ka ha bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn; ha aṅaghị ntị nʼiwu eze nyere, jụkwa ịkpọ isiala nye oyiyi a i ji ọlaedo kpụọ.” 13 Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze, 14 Nebukadneza sịrị ha, “Ọ bụ eziokwu, Shedrak, na Mishak, na Abednego, na unu adịghị efe chi m maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ m guzobere? 15 Mgbe unu nụrụ ụda opi, ọja, une na ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ, ọ bụrụ na unu adaa nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ahụ a kpụrụ akpụ, ihe niile ga-adị mma. Kama ọ bụrụ na unu ajụ ịkpọ isiala, a ga-atụnye unu ngwangwa nʼime ọkụ na-enwu ajọ onwunwu. Kedụ chi ahụ nke pụrụ ịnapụta unu site nʼaka m?” 16 Shedrak, na Mishak, na Abednego, gwara eze, “O Nebukadneza, ọ dịghị mkpa na anyị ga-azara ọnụ anyị nʼihu gị banyere okwu a. 17 Ọ bụrụ Chineke anyị na-efe nwere ike ịzọpụta anyị site nʼọkụ na-enwusi ike nʼaka gị, ya zọpụta anyị. 18 Ma ọ bụrụkwa na ọ zọpụtaghị anyị, mata nke ọma, o eze, na anyị agaghị efe chi gị ndị a maọbụ kpọọ isiala nye oyiyi a ị kpụrụ akpụ nke ị guzobere.” 19 Mgbe ahụ, Nebukadneza jupụtara nʼoke iwe megide Shedrak, na Mishak, na Abednego, nke bụ nʼihu ya gbarụrụ nʼebe ha nọ. O nyere iwu sị ka e mee ụlọ ọkụ ahụ ka ọ dị ọkụ ugboro asaa karịa ka o kwesiri. 20 Ọ nyere ụfọdụ ndị kacha sie ike nʼetiti ndị agha ya iwu ka e kee Shedrak, na Mishak, na Abednego eriri nʼụkwụ na aka, tụbakwa ha nʼọkụ ahụ na-enwu enwu. 21 Ya mere, ha kere ndị ikom ahụ agbụ ebe ha ka yi uwe ụkwụ ha, na akwa nkụkụ isi ha, na uwe mwụda ha, na uwe ha niile, tụba ha nʼetiti ọkụ ahụ na-enwu ajọ onwunwu. 22 Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego. 23 Ya mere, Shedrak, na Mishak, na Abednego ndị e kesịrị agbụ ike, dabara nʼime ọkụ ahụ na-enwusi ike. 24 Nʼọnọdụ iju anya, Eze Nebukadneza wuliri nʼụkwụ ya, jụọ ndị ndụmọdụ sị, “Ọ bụghị ndị ikom atọ anyị kere agbụ ka anyị tụbara nʼime ọkụ?”Ha zara eze, “Ọ bụ ezie, eze.” 25 Ọ sịrị, “Ma ana m ahụ mmadụ anọ ndị a na-ekeghị agbụ, ka ha na-agagharị nʼime ọkụ ahụ. Leekwa na ọkụ ahụ anaghị ere ha. Onye ahụ mere ha mmadụ anọ yiri nwa nke ndị bụ chi.” 26 Mgbe ahụ Nebukadneza, bịara nso nʼọnụ ụzọ oke ọkụ ahụ sị, “Shedrak, Mishak na Abednego, ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe niile elu, pụtanụ! Bịanụ nʼebe a!”Ya mere, Shedrak, Mishak na Abednego, sitere nʼoke ọkụ ahụ pụta. 27 Ụmụ ndị eze niile, ndịisi niile, ndị ahụ niile na-achị achị na ndị ndụmọdụ eze niile, zukọtara gburugburu ndị ikom atọ ahụ, ha hụkwara na ọkụ emerụghị ha ahụ, na o rechapụghịkwa agịrị isi dị ha nʼisi, uwe ha ereghịkwa ọkụ, isisi anwụrụ ọkụ adịghịkwa nʼahụ ha. 28 Mgbe ahụ, Nebukadneza sịrị, “Otuto dịrị Chineke nke Shedrak, Mishak na Abednego nʼihi na o zitere mmụọ ozi ya ịzọpụta ndị ohu ya tụkwasịrị ya obi, mgbe ha jụrụ ime ihe eze nyere nʼiwu, kama ha jiri aka ha họrọ ịnwụ, kama ife chi ọzọ nke na-abụghị Chineke nke ha. 29 Ya mere, ana m enye iwu a taa, na-asị na onye ọbụla, maọbụ mba ọbụla, maọbụ asụsụ ọbụla, onye kwuru okwu ọjọọ megide Chineke Shedrak, Mishak na Abednego, a ga-etikpọkwa ụlọ onye ahụ, mee ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe. Nʼihi na o nweghị chi ọzọ nke pụrụ ịzọpụta nʼụzọ dị otu a.” 30 Mgbe ahụ, eze nyere Shedrak, Mishak na Abednego ọkwa ọzọ dị elu karịa nke ha nwere na mbụ nʼala Babilọn.

In Other Versions

Daniel 3 in the ANGEFD

Daniel 3 in the ANTPNG2D

Daniel 3 in the AS21

Daniel 3 in the BAGH

Daniel 3 in the BBPNG

Daniel 3 in the BBT1E

Daniel 3 in the BDS

Daniel 3 in the BEV

Daniel 3 in the BHAD

Daniel 3 in the BIB

Daniel 3 in the BLPT

Daniel 3 in the BNT

Daniel 3 in the BNTABOOT

Daniel 3 in the BNTLV

Daniel 3 in the BOATCB

Daniel 3 in the BOATCB2

Daniel 3 in the BOBCV

Daniel 3 in the BOCNT

Daniel 3 in the BOECS

Daniel 3 in the BOGWICC

Daniel 3 in the BOHCB

Daniel 3 in the BOHCV

Daniel 3 in the BOHLNT

Daniel 3 in the BOHNTLTAL

Daniel 3 in the BOILNTAP

Daniel 3 in the BOITCV

Daniel 3 in the BOKCV

Daniel 3 in the BOKCV2

Daniel 3 in the BOKHWOG

Daniel 3 in the BOKSSV

Daniel 3 in the BOLCB

Daniel 3 in the BOLCB2

Daniel 3 in the BOMCV

Daniel 3 in the BONAV

Daniel 3 in the BONCB

Daniel 3 in the BONLT

Daniel 3 in the BONUT2

Daniel 3 in the BOPLNT

Daniel 3 in the BOSCB

Daniel 3 in the BOSNC

Daniel 3 in the BOTLNT

Daniel 3 in the BOVCB

Daniel 3 in the BOYCB

Daniel 3 in the BPBB

Daniel 3 in the BPH

Daniel 3 in the BSB

Daniel 3 in the CCB

Daniel 3 in the CUV

Daniel 3 in the CUVS

Daniel 3 in the DBT

Daniel 3 in the DGDNT

Daniel 3 in the DHNT

Daniel 3 in the DNT

Daniel 3 in the ELBE

Daniel 3 in the EMTV

Daniel 3 in the ESV

Daniel 3 in the FBV

Daniel 3 in the FEB

Daniel 3 in the GGMNT

Daniel 3 in the GNT

Daniel 3 in the HARY

Daniel 3 in the HNT

Daniel 3 in the IRVA

Daniel 3 in the IRVB

Daniel 3 in the IRVG

Daniel 3 in the IRVH

Daniel 3 in the IRVK

Daniel 3 in the IRVM

Daniel 3 in the IRVM2

Daniel 3 in the IRVO

Daniel 3 in the IRVP

Daniel 3 in the IRVT

Daniel 3 in the IRVT2

Daniel 3 in the IRVU

Daniel 3 in the ISVN

Daniel 3 in the JSNT

Daniel 3 in the KAPI

Daniel 3 in the KBT1ETNIK

Daniel 3 in the KBV

Daniel 3 in the KJV

Daniel 3 in the KNFD

Daniel 3 in the LBA

Daniel 3 in the LBLA

Daniel 3 in the LNT

Daniel 3 in the LSV

Daniel 3 in the MAAL

Daniel 3 in the MBV

Daniel 3 in the MBV2

Daniel 3 in the MHNT

Daniel 3 in the MKNFD

Daniel 3 in the MNG

Daniel 3 in the MNT

Daniel 3 in the MNT2

Daniel 3 in the MRS1T

Daniel 3 in the NAA

Daniel 3 in the NASB

Daniel 3 in the NBLA

Daniel 3 in the NBS

Daniel 3 in the NBVTP

Daniel 3 in the NET2

Daniel 3 in the NIV11

Daniel 3 in the NNT

Daniel 3 in the NNT2

Daniel 3 in the NNT3

Daniel 3 in the PDDPT

Daniel 3 in the PFNT

Daniel 3 in the RMNT

Daniel 3 in the SBIAS

Daniel 3 in the SBIBS

Daniel 3 in the SBIBS2

Daniel 3 in the SBICS

Daniel 3 in the SBIDS

Daniel 3 in the SBIGS

Daniel 3 in the SBIHS

Daniel 3 in the SBIIS

Daniel 3 in the SBIIS2

Daniel 3 in the SBIIS3

Daniel 3 in the SBIKS

Daniel 3 in the SBIKS2

Daniel 3 in the SBIMS

Daniel 3 in the SBIOS

Daniel 3 in the SBIPS

Daniel 3 in the SBISS

Daniel 3 in the SBITS

Daniel 3 in the SBITS2

Daniel 3 in the SBITS3

Daniel 3 in the SBITS4

Daniel 3 in the SBIUS

Daniel 3 in the SBIVS

Daniel 3 in the SBT

Daniel 3 in the SBT1E

Daniel 3 in the SCHL

Daniel 3 in the SNT

Daniel 3 in the SUSU

Daniel 3 in the SUSU2

Daniel 3 in the SYNO

Daniel 3 in the TBIAOTANT

Daniel 3 in the TBT1E

Daniel 3 in the TBT1E2

Daniel 3 in the TFTIP

Daniel 3 in the TFTU

Daniel 3 in the TGNTATF3T

Daniel 3 in the THAI

Daniel 3 in the TNFD

Daniel 3 in the TNT

Daniel 3 in the TNTIK

Daniel 3 in the TNTIL

Daniel 3 in the TNTIN

Daniel 3 in the TNTIP

Daniel 3 in the TNTIZ

Daniel 3 in the TOMA

Daniel 3 in the TTENT

Daniel 3 in the UBG

Daniel 3 in the UGV

Daniel 3 in the UGV2

Daniel 3 in the UGV3

Daniel 3 in the VBL

Daniel 3 in the VDCC

Daniel 3 in the YALU

Daniel 3 in the YAPE

Daniel 3 in the YBVTP

Daniel 3 in the ZBP