Deuteronomy 1 (BOICB)

1 Ndị a bụ okwu ahụ Mosis gwara Izrel niile mgbe ha nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼọzara nʼAraba, ebe chere ihu nʼobodo Suf, nʼetiti Paran na Tofel na Leban, na Hazerọt, na Dizahab. 2 Site nʼugwu Horeb ruo Kadesh Banea, bụ njem abalị iri na otu ma e soro ụzọ gawara ugwu Sia. 3 Ọ bụ nʼabalị mbụ nke ọnwa iri na otu, nke afọ iri anọ ka Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu banyere ha. 4 Nke mere mgbe ọ lụgbuchara Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, lụgbukwaa Ọg, eze ndị Bashan na Edrei, onye na-achị nʼAshtarọt. 5 Nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala ndị Moab ka Mosis nọ kọwaara ụmụ Izrel iwu ndị a sị ha, 6 ONYENWE ANYỊ Chineke anyị gwara anyị nʼugwu Horeb sị, “Unu anọọla ọtụtụ oge nʼugwu a. 7 Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis. 8 Lee, enyela m unu ala ahụ niile! Baanụ nʼime ya, bichiekwanụ ala ahụ ONYENWE ANYỊ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye nna nna unu bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb na ụmụ ụmụ ha niile ndị ga-esote ha.” 9 Nʼoge ahụ, agwara m unu ụmụ Izrel okwu sị, “Unu bụụrụ m oke ibu arọ, apụghịkwa m ibu unu naanị m. 10 ONYENWE ANYỊ Chineke unu emeela ka unu mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. 11 Ka ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa. 12 Ma olee otu naanị m ga-esi buo ibu unu, doziekwa ise okwu unu na nsogbu unu niile? 13 Họpụtanụ ụfọdụ ndị ikom nwe amamihe, nghọta, na ndị a na-akwanyere ụgwụ, site nʼebo niile unu nʼotu nʼotu, aga m emekwa ha ndịisi unu.” 14 Unu zara sị m, “Ihe ahụ i zubere ime dị mma.” 15 Ya mere, a kpọọrọ m ndịisi nʼebo dị iche iche, ndị ikom maara ihe, na ndị a na-asọpụrụ, mee ka ha bụrụ ndịisi ọchịchị unu, ụfọdụ ha na-elekọta puku mmadụ, ụfọdụ narị mmadụ, ndị ọzọ na-elekọta iri mmadụ ise, ndị ọzọ mmadụ iri, ka ha bụrụ ndị ndu ebo dị iche iche. 16 Adọrọ m ndị ikpe unu a aka na ntị nʼoge ahụ sị ha, “Nụrụnụ ikpe niile metụtara esemokwu dị nʼetiti ụmụnna unu, ma kpeenụ ikpe ọbụla na-eleghị mmadụ anya nʼihu ma ikpe ahụ ọ dị nʼetiti ụmụnna unu ndị Izrel, maọbụ nʼetiti ndị Izrel na ndị ọbịa. 17 Kpeenụ ikpe ziri ezi nye onye ukwu na onye nta. Elekwala ndị unu na-ekpe ikpe anya nʼihu, nʼihi na unu na-ekpe ikpe unu nʼọnọdụ Chineke.” Enyekwara m ha iwu sị ha wetaranụ m ikpe niile siri unu ike ka m leba ha anya. 18 Nʼoge ahụ, agwara m unu ihe niile unu na-aghaghị ime. 19 Emesịa, dịka iwu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị nyere si dị, anyị hapụrụ ugwu Horeb, chee ihu gawa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Ụzọ anyị si gafee ọzara ukwu ahụ dị egwu nke unu ji anya unu hụ tutu anyị erute Kadesh Banea. 20 Mgbe ahụ agwara m unu okwu sị, “Unu erutela nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait, ala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị na-enye anyị. 21 Lee, ONYENWE ANYỊ Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.” 22 Ma unu niile bịakwutere m sị m, “Ka anyị zipụ ndị nnyocha ka ha gaa mata ezi ụzọ e si abanye nʼala ahụ. Anyị ga-ekpebikwa obodo ndị anyị ga-ebu ụzọ banye.” 23 Ntụpụta unu juru m afọ, nʼihi ya, esitere m nʼetiti unu họpụta mmadụ iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla. 24 Ndị a pụrụ, gbagoo ala ugwu ugwu ahụ tutu bịaruo na Ndagwurugwu Eshkọl. Ha legharịrị anya nʼala ahụ. 25 Ha ghọtara ụfọdụ nʼime mkpụrụ osisi mịrị nʼala ahụ, bulatara anyị. Ha wetakwaara anyị ozi, sị, “Ala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị na-aga inye anyị dị mma.” 26 Ma unu jụrụ ịga nʼala ahụ, si otu a nupu isi megide iwu ONYENWE ANYỊ Chineke unu nyere. 27 Unu nọ nʼụlọ ikwu unu tamuo ntamu na-asị, “Nʼezie ONYENWE ANYỊ ahụghị anyị nʼanya. Lee ka o si site nʼala Ijipt dupụta anyị were anyị nyefee nʼaka ndị Amọrait ka ha laa anyị nʼiyi! 28 Ebee ka anyị nwere ike ịga ugbu a? Ụmụnna anyị gara nyochaa ala ahụ emenyela anyị egwu. Ha sịrị, ‘Na ndị bi nʼala ahụ toro ogologo karịa anyị bụrụkwa ndị dị ike. Ha sịkwara na mgbidi e ji gbaa obodo ha gburugburu topuru ruo nʼeluigwe! Anyị hụkwara ụmụ Anak nʼebe ahụ.’ ” 29 Ma agwara m unu sị, “Ka ụjọ ghara ịtụ unu, unu atụla ndị ahụ egwu. 30 ONYENWE ANYỊ Chineke unu, onye na-aga nʼihu unu, ga-alụrụ unu ọgụ, dịka o si lụọra unu ọgụ nʼihu anya unu, nʼala Ijipt, 31 nakwa nʼime ọzara, ebe unu nọ hụ otu ONYENWE ANYỊ Chineke unu si bulie unu elu dịka nna si ebuli nwa ya elu, nʼụzọ niile unu gbasoro tutu unu erute ebe a.” 32 Ma agbanyeghị nke a, unu ekwenyeghị na ONYENWE ANYỊ Chineke unu, 33 bụ onye gara nʼihu unu nʼije unu niile, ịchọpụtara unu ebe unu ga-ama ụlọ ikwu unu, onye jikwa ọkụ duo unu nʼabalị, jiri igwe ojii duo unu nʼehihie, iji zi unu ụzọ unu ga-agbaso. 34 Ma otu o si dị, mgbe ONYENWE ANYỊ nụrụ ntamu unu, iwe dị ukwuu were ya, nʼihi ntamu unu, ọ ṅụrụ iyi sị, 35 “O nweghị otu onye nʼime ọgbọ ọjọọ a ga-anọ ndụ hụ ala ọma ahụ m ṅụrụ iyi inye nna nna unu, 36 karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide ONYENWE ANYỊ.” 37 Ọ bụkwa nʼihi unu ka ONYENWE ANYỊ ji weso m iwe, na-asị, “Gị onwe gị kwa, ị gaghị aba nʼebe ahụ! 38 Kama Joshua, nwa Nun, onye na-enyere gị aka, ga-edu ha banye nʼebe ahụ. Gbaa ya ume nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị Izrel inweta ala ahụ dịka ihe nketa ha. 39 Ọ bụkwa ụmụntakịrị ahụ na-amaghị ihe dị iche site nʼihe ọma na ihe ọjọọ ka m ga-enye ala ahụ. Ha ga-abanye nʼime ya, nweta ya dịka ihe nketa. 40 Ma unu onwe unu, bilienụ, chigharịa gawa nʼime ọzara. Cheenụ ihu unu nʼOsimiri Uhie.” 41 Mgbe ahụ, unu kwupụtara mmehie unu sị, “Anyị emehiela megide ONYENWE ANYỊ. Anyị ga-agbago nʼala ahụ gaa lụọ ọgụ, dịka ONYENWE ANYỊ Chineke anyị nyere anyị nʼiwu.” Ya mere, onye ọbụla nʼime unu yikwasịrị ihe agha ya na-eche na ọ dị mfe ịgbago nʼobodo ndị ahụ dị nʼugwu. 42 Ma ONYENWE ANYỊ sịrị m, “Gwa ha, ‘Unu arịgokwala, gaa buo agha, nʼihi na agaghị m anọnyere unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu.’ ” 43 Ya mere, agwara m unu, ma unu aṅaghị ntị. Unu nupuru isi nʼiwu ONYENWE ANYỊ, jiri nganga juru unu obi bilie, rigoo nʼobodo ahụ dị nʼugwu. 44 Ndị Amọrị bụ ndị bi nʼugwu ahụ pụtara, ha chụsasịrị unu dịka aṅụ si eme, tidaa unu nʼala site na Sia ruo Homa. 45 Emesịa, unu lọghachiri bịa kwaa akwa nʼihu ONYENWE ANYỊ, ma o geghị ntị nye olu akwa unu, ọ ṅakwaghị unu ntị. 46 Nʼihi ya, unu nọrọ ọtụtụ oge na Kadesh.

In Other Versions

Deuteronomy 1 in the ANGEFD

Deuteronomy 1 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 1 in the AS21

Deuteronomy 1 in the BAGH

Deuteronomy 1 in the BBPNG

Deuteronomy 1 in the BBT1E

Deuteronomy 1 in the BDS

Deuteronomy 1 in the BEV

Deuteronomy 1 in the BHAD

Deuteronomy 1 in the BIB

Deuteronomy 1 in the BLPT

Deuteronomy 1 in the BNT

Deuteronomy 1 in the BNTABOOT

Deuteronomy 1 in the BNTLV

Deuteronomy 1 in the BOATCB

Deuteronomy 1 in the BOATCB2

Deuteronomy 1 in the BOBCV

Deuteronomy 1 in the BOCNT

Deuteronomy 1 in the BOECS

Deuteronomy 1 in the BOGWICC

Deuteronomy 1 in the BOHCB

Deuteronomy 1 in the BOHCV

Deuteronomy 1 in the BOHLNT

Deuteronomy 1 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 1 in the BOILNTAP

Deuteronomy 1 in the BOITCV

Deuteronomy 1 in the BOKCV

Deuteronomy 1 in the BOKCV2

Deuteronomy 1 in the BOKHWOG

Deuteronomy 1 in the BOKSSV

Deuteronomy 1 in the BOLCB

Deuteronomy 1 in the BOLCB2

Deuteronomy 1 in the BOMCV

Deuteronomy 1 in the BONAV

Deuteronomy 1 in the BONCB

Deuteronomy 1 in the BONLT

Deuteronomy 1 in the BONUT2

Deuteronomy 1 in the BOPLNT

Deuteronomy 1 in the BOSCB

Deuteronomy 1 in the BOSNC

Deuteronomy 1 in the BOTLNT

Deuteronomy 1 in the BOVCB

Deuteronomy 1 in the BOYCB

Deuteronomy 1 in the BPBB

Deuteronomy 1 in the BPH

Deuteronomy 1 in the BSB

Deuteronomy 1 in the CCB

Deuteronomy 1 in the CUV

Deuteronomy 1 in the CUVS

Deuteronomy 1 in the DBT

Deuteronomy 1 in the DGDNT

Deuteronomy 1 in the DHNT

Deuteronomy 1 in the DNT

Deuteronomy 1 in the ELBE

Deuteronomy 1 in the EMTV

Deuteronomy 1 in the ESV

Deuteronomy 1 in the FBV

Deuteronomy 1 in the FEB

Deuteronomy 1 in the GGMNT

Deuteronomy 1 in the GNT

Deuteronomy 1 in the HARY

Deuteronomy 1 in the HNT

Deuteronomy 1 in the IRVA

Deuteronomy 1 in the IRVB

Deuteronomy 1 in the IRVG

Deuteronomy 1 in the IRVH

Deuteronomy 1 in the IRVK

Deuteronomy 1 in the IRVM

Deuteronomy 1 in the IRVM2

Deuteronomy 1 in the IRVO

Deuteronomy 1 in the IRVP

Deuteronomy 1 in the IRVT

Deuteronomy 1 in the IRVT2

Deuteronomy 1 in the IRVU

Deuteronomy 1 in the ISVN

Deuteronomy 1 in the JSNT

Deuteronomy 1 in the KAPI

Deuteronomy 1 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 1 in the KBV

Deuteronomy 1 in the KJV

Deuteronomy 1 in the KNFD

Deuteronomy 1 in the LBA

Deuteronomy 1 in the LBLA

Deuteronomy 1 in the LNT

Deuteronomy 1 in the LSV

Deuteronomy 1 in the MAAL

Deuteronomy 1 in the MBV

Deuteronomy 1 in the MBV2

Deuteronomy 1 in the MHNT

Deuteronomy 1 in the MKNFD

Deuteronomy 1 in the MNG

Deuteronomy 1 in the MNT

Deuteronomy 1 in the MNT2

Deuteronomy 1 in the MRS1T

Deuteronomy 1 in the NAA

Deuteronomy 1 in the NASB

Deuteronomy 1 in the NBLA

Deuteronomy 1 in the NBS

Deuteronomy 1 in the NBVTP

Deuteronomy 1 in the NET2

Deuteronomy 1 in the NIV11

Deuteronomy 1 in the NNT

Deuteronomy 1 in the NNT2

Deuteronomy 1 in the NNT3

Deuteronomy 1 in the PDDPT

Deuteronomy 1 in the PFNT

Deuteronomy 1 in the RMNT

Deuteronomy 1 in the SBIAS

Deuteronomy 1 in the SBIBS

Deuteronomy 1 in the SBIBS2

Deuteronomy 1 in the SBICS

Deuteronomy 1 in the SBIDS

Deuteronomy 1 in the SBIGS

Deuteronomy 1 in the SBIHS

Deuteronomy 1 in the SBIIS

Deuteronomy 1 in the SBIIS2

Deuteronomy 1 in the SBIIS3

Deuteronomy 1 in the SBIKS

Deuteronomy 1 in the SBIKS2

Deuteronomy 1 in the SBIMS

Deuteronomy 1 in the SBIOS

Deuteronomy 1 in the SBIPS

Deuteronomy 1 in the SBISS

Deuteronomy 1 in the SBITS

Deuteronomy 1 in the SBITS2

Deuteronomy 1 in the SBITS3

Deuteronomy 1 in the SBITS4

Deuteronomy 1 in the SBIUS

Deuteronomy 1 in the SBIVS

Deuteronomy 1 in the SBT

Deuteronomy 1 in the SBT1E

Deuteronomy 1 in the SCHL

Deuteronomy 1 in the SNT

Deuteronomy 1 in the SUSU

Deuteronomy 1 in the SUSU2

Deuteronomy 1 in the SYNO

Deuteronomy 1 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 1 in the TBT1E

Deuteronomy 1 in the TBT1E2

Deuteronomy 1 in the TFTIP

Deuteronomy 1 in the TFTU

Deuteronomy 1 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 1 in the THAI

Deuteronomy 1 in the TNFD

Deuteronomy 1 in the TNT

Deuteronomy 1 in the TNTIK

Deuteronomy 1 in the TNTIL

Deuteronomy 1 in the TNTIN

Deuteronomy 1 in the TNTIP

Deuteronomy 1 in the TNTIZ

Deuteronomy 1 in the TOMA

Deuteronomy 1 in the TTENT

Deuteronomy 1 in the UBG

Deuteronomy 1 in the UGV

Deuteronomy 1 in the UGV2

Deuteronomy 1 in the UGV3

Deuteronomy 1 in the VBL

Deuteronomy 1 in the VDCC

Deuteronomy 1 in the YALU

Deuteronomy 1 in the YAPE

Deuteronomy 1 in the YBVTP

Deuteronomy 1 in the ZBP