Deuteronomy 4 (BOICB)

1 Ugbu a, O Izrel, gee ntị nʼụkpụrụ na iwu niile m na-aga ikuziri unu ka unu na-eme ma ọ bụrụ na unu chọrọ ịdị ndụ banye, ma nwetakwa ala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna unu ha na-enye unu. 2 Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 3 Unu ji anya unu hụ ihe ONYENWE ANYỊ mere na Baal-Peoa. ONYENWE ANYỊ Chineke unu sitere nʼetiti unu bibie ndị niile gbasoro Baal nke Peoa. 4 Ma unu niile nọgidesịrị ike soro ONYENWE ANYỊ Chineke unu bụ ndị dị ndụ taa. 5 Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile ONYENWE ANYỊ Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta. 6 Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.” 7 Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka ONYENWE ANYỊ Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere? 8 Olee mba ukwu ọzọ dịkwa nke nwere ụkpụrụ na iwu ziri ezi dịka iwu ndị a m na-enye unu taa? 9 Naanị kpachapụnụ anya unu, ma cheenụ onwe unu nche mgbe niile, ka unu ghara ichefu ihe ndị a niile unu ji anya unu hụ, ka ha gharakwa isi nʼobi unu pụọ ụbọchị niile nke ndụ unu. Kama kuziere ha ụmụ unu, na ụmụ ụmụ ndị ga-esote ha. 10 Cheta ụbọchị ahụ unu bịara guzo nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke unu nʼugwu Horeb, nʼụbọchị ahụ ọ gwara m okwu sị m, “Kpọkọtaa ụmụ Izrel ka ha bịa nʼihu m, nụrụ okwu m, ka ha nwee ike mụta ịtụ m egwu ụbọchị niile nke ha ga-ebi nʼala ahụ, ka ha nweekwa ike ikuziri ụmụ ha.” 11 Ọ bụ nʼala ugwu ahụ ka unu bịara nso, guzo, mgbe ọkụ si nʼugwu ahụ na-ere, na-alali elu iru eluigwe, ya na igwe ojii nakwa oke ọchịchịrị. 12 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ sitere nʼọkụ ahụ gwa unu okwu. Unu nụrụ ụda olu ya, ma unu ahụghị oyiyi ọbụla anya, naanị ụda olu. 13 O nyere unu ọgbụgba ndụ ya, nke unu na-aghaghị idebe. Ha dị iwu iri. O dere ha na mbadamba nkume abụọ. 14 E, ọ bụ nʼoge ahụ ka ONYENWE ANYỊ nyere m iwu sị m nye unu ụkpụrụ na iwu unu ga-agbaso mgbe unu banyere nʼala ahụ dị nʼofe Jọdan, nke unu na-aga inweta. 15 Unu maara na unu ahụghị ụdịdị ONYENWE ANYỊ anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya 16 ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị, 17 maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe, 18 maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri. 19 Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a ONYENWE ANYỊ Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe. 20 Ma banyere unu, Onyenwe anyị kpọọrọ unu, kpọpụta unu site nʼime ọkụ na-agbaze igwe, site nʼIjipt pụta, ka unu bụrụ ihe nketa ya, dịka unu dị ugbu a. 21 ONYENWE ANYỊ wesoro m iwe nʼihi unu, ọ ṅụrụ iyi na m agaghị agafe osimiri Jọdan ịbanye nʼala ọma ahụ nke ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa gị. 22 Aghaghị m ịnwụ nʼala a. Agaghị m agafe Jọdan. Ma unu ga-agafe gaa nweta ala ọma ahụ. 23 Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na ONYENWE ANYỊ Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu ONYENWE ANYỊ Chineke unu nyere megidere. 24 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo. 25 Mgbe ị ga-amụ ụmụ, nwekwa ụmụ ụmụ, mgbe unu birila ọtụtụ oge nʼala ahụ, ọ bụrụ na unu emerụọ onwe unu site nʼimere onwe unu ụdị arụsị ọbụla, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ma kpasuo ya iwe 26 ana m akpọku eluigwe na ụwa ka ha bụrụ ndị akaebe mụ na unu taa, na a ga-ala unu nʼiyi ngwangwa nʼala ahụ bụ nke unu na-agafe Jọdan inweta. Unu agaghị ebi ogologo oge nʼebe ahụ, nʼihi na a ga-ekpochapụ unu. 27 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka unu gbasasịa nʼetiti mba ndị ọzọ. Ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole ga-afọdụ ndụ nʼetiti mba ndị ahụ ONYENWE ANYỊ ga-achụga unu. 28 Nʼebe ahụ, unu ga-efe chi ndị bụ ọrụ aka mmadụ nke e ji osisi tụọ na nke e ji nkume pịa, nke na-adịghị ahụ ụzọ, nke na-adịghị anụ ihe, nke na-apụghị iri nri ma ọ bụkwanụ ịnụ isisi. 29 Ma ọ bụrụ na unu anọrọ nʼebe ahụ chọọ ONYENWE ANYỊ Chineke unu, unu ga-achọtakwa ya, mgbe unu ji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile chọọ ya. 30 Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute ONYENWE ANYỊ Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu. 31 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike. 32 Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla. 33 O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị? 34 O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke ONYENWE ANYỊ Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ? 35 O gosiri unu ihe ndị a ka unu mara na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nʼezie, na ọ dịkwaghị onye ọzọ ma ọ bụghị ya. 36 O sitere nʼeluigwe mee ka unu nụ olu ya maka ịdọ unu aka na ntị. Nʼụwa, o mere ka unu hụ oke ogidi ọkụ ahụ o wuru, unu nụkwara olu ya nʼetiti ọkụ ahụ. 37 Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a. 38 Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa. 39 Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya. 40 Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ Chineke na-enye unu ruo mgbe niile. 41 Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan, 42 ebe onye ọbụla gburu mmadụ ga-agbaba ọsọ ndụ, ma ọ bụrụ na ha gburu onye agbataobi ha na-amaghị ama, na-akpọghị ya asị na mgbe gara aga. Ọ ga-agbaba nʼotu ime obodo ndị a ichebe ndụ ya. 43 Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase. 44 Nke a bụ iwu Mosis chere nʼihu ụmụ Izrel. 45 Ndị a bụ ihe ama, na ụkpụrụ, na iwu Mosis nyere ụmụ Izrel nke ha aghaghị idebe mgbe ha si nʼIjipt pụta 46 na ndagwurugwu Bet-Peoa nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, bụ onye Mosis na ndị Izrel meriri nʼagha mgbe ha si nʼIjipt pụta. 47 Ndị Izrel nwetaara onwe ha ala ya na ala Ọg, eze Bashan. Eze abụọ ndị a bụ eze ndị Amọrait ndị ala ha dị nʼọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan. 48 Ala a sitere nʼAroea, nʼọnụ mmiri Anọn ruo nʼugwu Siriọn (ya bụ ugwu Hemon), 49 ruo nʼala Araba niile, nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, ruokwa nʼOsimiri Nnu, nʼala ala ugwu Pisga.

In Other Versions

Deuteronomy 4 in the ANGEFD

Deuteronomy 4 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 4 in the AS21

Deuteronomy 4 in the BAGH

Deuteronomy 4 in the BBPNG

Deuteronomy 4 in the BBT1E

Deuteronomy 4 in the BDS

Deuteronomy 4 in the BEV

Deuteronomy 4 in the BHAD

Deuteronomy 4 in the BIB

Deuteronomy 4 in the BLPT

Deuteronomy 4 in the BNT

Deuteronomy 4 in the BNTABOOT

Deuteronomy 4 in the BNTLV

Deuteronomy 4 in the BOATCB

Deuteronomy 4 in the BOATCB2

Deuteronomy 4 in the BOBCV

Deuteronomy 4 in the BOCNT

Deuteronomy 4 in the BOECS

Deuteronomy 4 in the BOGWICC

Deuteronomy 4 in the BOHCB

Deuteronomy 4 in the BOHCV

Deuteronomy 4 in the BOHLNT

Deuteronomy 4 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 4 in the BOILNTAP

Deuteronomy 4 in the BOITCV

Deuteronomy 4 in the BOKCV

Deuteronomy 4 in the BOKCV2

Deuteronomy 4 in the BOKHWOG

Deuteronomy 4 in the BOKSSV

Deuteronomy 4 in the BOLCB

Deuteronomy 4 in the BOLCB2

Deuteronomy 4 in the BOMCV

Deuteronomy 4 in the BONAV

Deuteronomy 4 in the BONCB

Deuteronomy 4 in the BONLT

Deuteronomy 4 in the BONUT2

Deuteronomy 4 in the BOPLNT

Deuteronomy 4 in the BOSCB

Deuteronomy 4 in the BOSNC

Deuteronomy 4 in the BOTLNT

Deuteronomy 4 in the BOVCB

Deuteronomy 4 in the BOYCB

Deuteronomy 4 in the BPBB

Deuteronomy 4 in the BPH

Deuteronomy 4 in the BSB

Deuteronomy 4 in the CCB

Deuteronomy 4 in the CUV

Deuteronomy 4 in the CUVS

Deuteronomy 4 in the DBT

Deuteronomy 4 in the DGDNT

Deuteronomy 4 in the DHNT

Deuteronomy 4 in the DNT

Deuteronomy 4 in the ELBE

Deuteronomy 4 in the EMTV

Deuteronomy 4 in the ESV

Deuteronomy 4 in the FBV

Deuteronomy 4 in the FEB

Deuteronomy 4 in the GGMNT

Deuteronomy 4 in the GNT

Deuteronomy 4 in the HARY

Deuteronomy 4 in the HNT

Deuteronomy 4 in the IRVA

Deuteronomy 4 in the IRVB

Deuteronomy 4 in the IRVG

Deuteronomy 4 in the IRVH

Deuteronomy 4 in the IRVK

Deuteronomy 4 in the IRVM

Deuteronomy 4 in the IRVM2

Deuteronomy 4 in the IRVO

Deuteronomy 4 in the IRVP

Deuteronomy 4 in the IRVT

Deuteronomy 4 in the IRVT2

Deuteronomy 4 in the IRVU

Deuteronomy 4 in the ISVN

Deuteronomy 4 in the JSNT

Deuteronomy 4 in the KAPI

Deuteronomy 4 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 4 in the KBV

Deuteronomy 4 in the KJV

Deuteronomy 4 in the KNFD

Deuteronomy 4 in the LBA

Deuteronomy 4 in the LBLA

Deuteronomy 4 in the LNT

Deuteronomy 4 in the LSV

Deuteronomy 4 in the MAAL

Deuteronomy 4 in the MBV

Deuteronomy 4 in the MBV2

Deuteronomy 4 in the MHNT

Deuteronomy 4 in the MKNFD

Deuteronomy 4 in the MNG

Deuteronomy 4 in the MNT

Deuteronomy 4 in the MNT2

Deuteronomy 4 in the MRS1T

Deuteronomy 4 in the NAA

Deuteronomy 4 in the NASB

Deuteronomy 4 in the NBLA

Deuteronomy 4 in the NBS

Deuteronomy 4 in the NBVTP

Deuteronomy 4 in the NET2

Deuteronomy 4 in the NIV11

Deuteronomy 4 in the NNT

Deuteronomy 4 in the NNT2

Deuteronomy 4 in the NNT3

Deuteronomy 4 in the PDDPT

Deuteronomy 4 in the PFNT

Deuteronomy 4 in the RMNT

Deuteronomy 4 in the SBIAS

Deuteronomy 4 in the SBIBS

Deuteronomy 4 in the SBIBS2

Deuteronomy 4 in the SBICS

Deuteronomy 4 in the SBIDS

Deuteronomy 4 in the SBIGS

Deuteronomy 4 in the SBIHS

Deuteronomy 4 in the SBIIS

Deuteronomy 4 in the SBIIS2

Deuteronomy 4 in the SBIIS3

Deuteronomy 4 in the SBIKS

Deuteronomy 4 in the SBIKS2

Deuteronomy 4 in the SBIMS

Deuteronomy 4 in the SBIOS

Deuteronomy 4 in the SBIPS

Deuteronomy 4 in the SBISS

Deuteronomy 4 in the SBITS

Deuteronomy 4 in the SBITS2

Deuteronomy 4 in the SBITS3

Deuteronomy 4 in the SBITS4

Deuteronomy 4 in the SBIUS

Deuteronomy 4 in the SBIVS

Deuteronomy 4 in the SBT

Deuteronomy 4 in the SBT1E

Deuteronomy 4 in the SCHL

Deuteronomy 4 in the SNT

Deuteronomy 4 in the SUSU

Deuteronomy 4 in the SUSU2

Deuteronomy 4 in the SYNO

Deuteronomy 4 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 4 in the TBT1E

Deuteronomy 4 in the TBT1E2

Deuteronomy 4 in the TFTIP

Deuteronomy 4 in the TFTU

Deuteronomy 4 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 4 in the THAI

Deuteronomy 4 in the TNFD

Deuteronomy 4 in the TNT

Deuteronomy 4 in the TNTIK

Deuteronomy 4 in the TNTIL

Deuteronomy 4 in the TNTIN

Deuteronomy 4 in the TNTIP

Deuteronomy 4 in the TNTIZ

Deuteronomy 4 in the TOMA

Deuteronomy 4 in the TTENT

Deuteronomy 4 in the UBG

Deuteronomy 4 in the UGV

Deuteronomy 4 in the UGV2

Deuteronomy 4 in the UGV3

Deuteronomy 4 in the VBL

Deuteronomy 4 in the VDCC

Deuteronomy 4 in the YALU

Deuteronomy 4 in the YAPE

Deuteronomy 4 in the YBVTP

Deuteronomy 4 in the ZBP