Ecclesiastes 8 (BOICB)

1 Onye dị ka onye amamihe?Onye maara nkọwa ihe?Amamihe na-enyekwa ihu ya ihe,na-emekwa ka mgbarụ nke ihu ya gbanwee. 2 Asị m, debe iwu eze, nʼihi iyi ị ṅụrụ nʼihu Chineke. 3 Emela ngwangwa isi nʼihu eze pụọ. Akwagidela ihe ọjọọ nʼihi na ọ ga-eme ihe masịrị ya. 4 Nʼihi na okwu eze nwere ike ọ dịghị onye pụrụ ịjụ ya, Gịnị ka ị na-eme? 5 Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu.Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe. 6 Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa,ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya. 7 Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime,onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime? 8 Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ mgbe ọ chọrọ.Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya.Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha,otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ. 9 Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu. 10 Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu. 11 Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie. 12 Onye ajọ omume nwere ike mee narị mmehie bikwaa ogologo ndụ, ma amara m na ọ ga-adịrị ndị na-atụ egwu Chineke mma karịa, bụ ndị na-atụ egwu nʼihu Chineke. 13 Nʼihi na ndị ajọ omume adịghị atụ egwu Chineke, ọ gaghị adịrị ha na mma, ụbọchị ndụ ha agaghị agbatịkwa ogologo dịka onyinyo. 14 Ọ dị ihe ọzọ na-enweghị isi nʼụwa: ndị ezi omume na-anata ntaramahụhụ dịrị ndị na-emebi iwu. Ndị na-emebi iwu na-anata ụgwọ ọrụ ruru ndị ezi omume. Nʼezie, ihe ndị a niile bụ ihe efu, ha enweghị isi. 15 Ya mere, ana m ekwupụta, na ikpori ezi ndụ dị mma, nʼihi na ọ dịghị ihe ka mma nye mmadụ nʼokpuru anyanwụ, karịa iri, na ịṅụ, na inwe obi ụtọ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe obi ụtọ nʼọrụ ọ na-arụ nʼụbọchị niile nke Chineke nyere ya nʼokpuru anyanwụ. 16 Mgbe m wepụtara obi m ịchọ amamihe na ịghọta ọrụ mmadụ nʼokpuru anyanwụ nke mere na ọ naghị ehi ụra ehihie na abalị, 17 mgbe ahụ ka m chọpụtara ihe Chineke mere. O nweghị onye pụrụ ịghọta ihe na-aga nʼokpuru anyanwụ. Otu ọbụla mmadụ siri gbalịa o nweghị ike ịchọpụta ihe ọ pụtara. Onye maara ihe pụrụ ị sị na a amatala ya, ma nʼezie ọ maghị ya.

In Other Versions

Ecclesiastes 8 in the ANGEFD

Ecclesiastes 8 in the ANTPNG2D

Ecclesiastes 8 in the AS21

Ecclesiastes 8 in the BAGH

Ecclesiastes 8 in the BBPNG

Ecclesiastes 8 in the BBT1E

Ecclesiastes 8 in the BDS

Ecclesiastes 8 in the BEV

Ecclesiastes 8 in the BHAD

Ecclesiastes 8 in the BIB

Ecclesiastes 8 in the BLPT

Ecclesiastes 8 in the BNT

Ecclesiastes 8 in the BNTABOOT

Ecclesiastes 8 in the BNTLV

Ecclesiastes 8 in the BOATCB

Ecclesiastes 8 in the BOATCB2

Ecclesiastes 8 in the BOBCV

Ecclesiastes 8 in the BOCNT

Ecclesiastes 8 in the BOECS

Ecclesiastes 8 in the BOGWICC

Ecclesiastes 8 in the BOHCB

Ecclesiastes 8 in the BOHCV

Ecclesiastes 8 in the BOHLNT

Ecclesiastes 8 in the BOHNTLTAL

Ecclesiastes 8 in the BOILNTAP

Ecclesiastes 8 in the BOITCV

Ecclesiastes 8 in the BOKCV

Ecclesiastes 8 in the BOKCV2

Ecclesiastes 8 in the BOKHWOG

Ecclesiastes 8 in the BOKSSV

Ecclesiastes 8 in the BOLCB

Ecclesiastes 8 in the BOLCB2

Ecclesiastes 8 in the BOMCV

Ecclesiastes 8 in the BONAV

Ecclesiastes 8 in the BONCB

Ecclesiastes 8 in the BONLT

Ecclesiastes 8 in the BONUT2

Ecclesiastes 8 in the BOPLNT

Ecclesiastes 8 in the BOSCB

Ecclesiastes 8 in the BOSNC

Ecclesiastes 8 in the BOTLNT

Ecclesiastes 8 in the BOVCB

Ecclesiastes 8 in the BOYCB

Ecclesiastes 8 in the BPBB

Ecclesiastes 8 in the BPH

Ecclesiastes 8 in the BSB

Ecclesiastes 8 in the CCB

Ecclesiastes 8 in the CUV

Ecclesiastes 8 in the CUVS

Ecclesiastes 8 in the DBT

Ecclesiastes 8 in the DGDNT

Ecclesiastes 8 in the DHNT

Ecclesiastes 8 in the DNT

Ecclesiastes 8 in the ELBE

Ecclesiastes 8 in the EMTV

Ecclesiastes 8 in the ESV

Ecclesiastes 8 in the FBV

Ecclesiastes 8 in the FEB

Ecclesiastes 8 in the GGMNT

Ecclesiastes 8 in the GNT

Ecclesiastes 8 in the HARY

Ecclesiastes 8 in the HNT

Ecclesiastes 8 in the IRVA

Ecclesiastes 8 in the IRVB

Ecclesiastes 8 in the IRVG

Ecclesiastes 8 in the IRVH

Ecclesiastes 8 in the IRVK

Ecclesiastes 8 in the IRVM

Ecclesiastes 8 in the IRVM2

Ecclesiastes 8 in the IRVO

Ecclesiastes 8 in the IRVP

Ecclesiastes 8 in the IRVT

Ecclesiastes 8 in the IRVT2

Ecclesiastes 8 in the IRVU

Ecclesiastes 8 in the ISVN

Ecclesiastes 8 in the JSNT

Ecclesiastes 8 in the KAPI

Ecclesiastes 8 in the KBT1ETNIK

Ecclesiastes 8 in the KBV

Ecclesiastes 8 in the KJV

Ecclesiastes 8 in the KNFD

Ecclesiastes 8 in the LBA

Ecclesiastes 8 in the LBLA

Ecclesiastes 8 in the LNT

Ecclesiastes 8 in the LSV

Ecclesiastes 8 in the MAAL

Ecclesiastes 8 in the MBV

Ecclesiastes 8 in the MBV2

Ecclesiastes 8 in the MHNT

Ecclesiastes 8 in the MKNFD

Ecclesiastes 8 in the MNG

Ecclesiastes 8 in the MNT

Ecclesiastes 8 in the MNT2

Ecclesiastes 8 in the MRS1T

Ecclesiastes 8 in the NAA

Ecclesiastes 8 in the NASB

Ecclesiastes 8 in the NBLA

Ecclesiastes 8 in the NBS

Ecclesiastes 8 in the NBVTP

Ecclesiastes 8 in the NET2

Ecclesiastes 8 in the NIV11

Ecclesiastes 8 in the NNT

Ecclesiastes 8 in the NNT2

Ecclesiastes 8 in the NNT3

Ecclesiastes 8 in the PDDPT

Ecclesiastes 8 in the PFNT

Ecclesiastes 8 in the RMNT

Ecclesiastes 8 in the SBIAS

Ecclesiastes 8 in the SBIBS

Ecclesiastes 8 in the SBIBS2

Ecclesiastes 8 in the SBICS

Ecclesiastes 8 in the SBIDS

Ecclesiastes 8 in the SBIGS

Ecclesiastes 8 in the SBIHS

Ecclesiastes 8 in the SBIIS

Ecclesiastes 8 in the SBIIS2

Ecclesiastes 8 in the SBIIS3

Ecclesiastes 8 in the SBIKS

Ecclesiastes 8 in the SBIKS2

Ecclesiastes 8 in the SBIMS

Ecclesiastes 8 in the SBIOS

Ecclesiastes 8 in the SBIPS

Ecclesiastes 8 in the SBISS

Ecclesiastes 8 in the SBITS

Ecclesiastes 8 in the SBITS2

Ecclesiastes 8 in the SBITS3

Ecclesiastes 8 in the SBITS4

Ecclesiastes 8 in the SBIUS

Ecclesiastes 8 in the SBIVS

Ecclesiastes 8 in the SBT

Ecclesiastes 8 in the SBT1E

Ecclesiastes 8 in the SCHL

Ecclesiastes 8 in the SNT

Ecclesiastes 8 in the SUSU

Ecclesiastes 8 in the SUSU2

Ecclesiastes 8 in the SYNO

Ecclesiastes 8 in the TBIAOTANT

Ecclesiastes 8 in the TBT1E

Ecclesiastes 8 in the TBT1E2

Ecclesiastes 8 in the TFTIP

Ecclesiastes 8 in the TFTU

Ecclesiastes 8 in the TGNTATF3T

Ecclesiastes 8 in the THAI

Ecclesiastes 8 in the TNFD

Ecclesiastes 8 in the TNT

Ecclesiastes 8 in the TNTIK

Ecclesiastes 8 in the TNTIL

Ecclesiastes 8 in the TNTIN

Ecclesiastes 8 in the TNTIP

Ecclesiastes 8 in the TNTIZ

Ecclesiastes 8 in the TOMA

Ecclesiastes 8 in the TTENT

Ecclesiastes 8 in the UBG

Ecclesiastes 8 in the UGV

Ecclesiastes 8 in the UGV2

Ecclesiastes 8 in the UGV3

Ecclesiastes 8 in the VBL

Ecclesiastes 8 in the VDCC

Ecclesiastes 8 in the YALU

Ecclesiastes 8 in the YAPE

Ecclesiastes 8 in the YBVTP

Ecclesiastes 8 in the ZBP