Esther 4 (BOICB)

1 Mgbe Mọdekai nụrụ ihe mere, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya, pụọ baa nʼime obodo, na-eti mkpu akwa. 2 Ọ bịaruru nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọeze guzo nʼebe ahụ, nʼihi na ọ dịghị onye a na-ekwe ka o yiri akwa mkpe banye nʼogige ụlọeze. 3 Nʼalaeze ahụ ndị Juu niile, nọ nʼiru ụjụ na ibu ọnụ na ịkwa akwa na iti aka nʼobi nʼihi iwu eze ahụ. Ọtụtụ yikwa akwa mkpe ha, dinarakwa na ntụ. 4 Mgbe ụmụ agbọghọ na ndị onozi Esta gwara ya ihe banyere Mọdekai, o wutere ya nke ukwuu. O zigaara Mọdekai uwe, ka o nwee ike gbanwee uwe mkpe ahụ o yi, ma ọ naraghị ha. 5 Mgbe ahụ, Esta ziri ka a kpọọ Hatak, otu nʼime ndị onozi eze, onye nke ọ bụ ọrụ ya ijere Esta ozi, gwa ya ka o jekwuru Mọdekai jụọ ya ihe kpatara nke a, na ihe mere o ji na-eme otu a. 6 Hatak jere nʼama obodo ahụ ebe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ụlọeze. 7 Mọdekai kọọrọ ya ihe niile, na otu Heman si kwee nkwa ịkwụnye ego nʼụlọakụ eze ka e were laa ndị Juu nʼiyi. 8 O nyekwara ya akwụkwọ iwu eze ebe e dere maka ịla ha nʼiyi, bụ nke akpọsara na Susa, ka o gosi ya Esta, kọwaakwa ya nye ya. Ọ gwara ya ka o nye ya iwu ka ọ bakwuru eze rịọ ya arịrịọ amara, rịọkwa ya ebere nʼihi ndị ya. 9 Hatak lọghachiri zie Esta ihe niile Mọdekai kwuru. 10 Ma Esta gwara Hatak ka o jeghachi gwa Mọdekai sị, 11 “Ụwa niile maara nke ọma na onye ọbụla, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị, banyere nʼime ime ụlọeze mgbe eze na-akpọghị ya, ga-anwụ, karịakwa ma eze o setịpụrụ mkpara ọlaedo ya gosi onye ahụ na ọ nabatara ọbịbịa ya. Ugbu a, o meela ihe dị ka otu ọnwa kemgbe eze na-ezibeghị ozi ka a kpọọ m.” 12 Mgbe ha gwara Mọdekai ihe Esta zara, 13 o zighachiri ọsịsa a, “Echela nʼihi na i bi nʼụlọeze na naanị gị ga-afọdụ ndụ nʼetiti ndị Juu niile. 14 Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?” 15 Mgbe ahụ, Esta zara Mọdekai sị; 16 “Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!” 17 Mọdekai pụrụ, gaa mee dịka Esta gwara ya.

In Other Versions

Esther 4 in the ANGEFD

Esther 4 in the ANTPNG2D

Esther 4 in the AS21

Esther 4 in the BAGH

Esther 4 in the BBPNG

Esther 4 in the BBT1E

Esther 4 in the BDS

Esther 4 in the BEV

Esther 4 in the BHAD

Esther 4 in the BIB

Esther 4 in the BLPT

Esther 4 in the BNT

Esther 4 in the BNTABOOT

Esther 4 in the BNTLV

Esther 4 in the BOATCB

Esther 4 in the BOATCB2

Esther 4 in the BOBCV

Esther 4 in the BOCNT

Esther 4 in the BOECS

Esther 4 in the BOGWICC

Esther 4 in the BOHCB

Esther 4 in the BOHCV

Esther 4 in the BOHLNT

Esther 4 in the BOHNTLTAL

Esther 4 in the BOILNTAP

Esther 4 in the BOITCV

Esther 4 in the BOKCV

Esther 4 in the BOKCV2

Esther 4 in the BOKHWOG

Esther 4 in the BOKSSV

Esther 4 in the BOLCB

Esther 4 in the BOLCB2

Esther 4 in the BOMCV

Esther 4 in the BONAV

Esther 4 in the BONCB

Esther 4 in the BONLT

Esther 4 in the BONUT2

Esther 4 in the BOPLNT

Esther 4 in the BOSCB

Esther 4 in the BOSNC

Esther 4 in the BOTLNT

Esther 4 in the BOVCB

Esther 4 in the BOYCB

Esther 4 in the BPBB

Esther 4 in the BPH

Esther 4 in the BSB

Esther 4 in the CCB

Esther 4 in the CUV

Esther 4 in the CUVS

Esther 4 in the DBT

Esther 4 in the DGDNT

Esther 4 in the DHNT

Esther 4 in the DNT

Esther 4 in the ELBE

Esther 4 in the EMTV

Esther 4 in the ESV

Esther 4 in the FBV

Esther 4 in the FEB

Esther 4 in the GGMNT

Esther 4 in the GNT

Esther 4 in the HARY

Esther 4 in the HNT

Esther 4 in the IRVA

Esther 4 in the IRVB

Esther 4 in the IRVG

Esther 4 in the IRVH

Esther 4 in the IRVK

Esther 4 in the IRVM

Esther 4 in the IRVM2

Esther 4 in the IRVO

Esther 4 in the IRVP

Esther 4 in the IRVT

Esther 4 in the IRVT2

Esther 4 in the IRVU

Esther 4 in the ISVN

Esther 4 in the JSNT

Esther 4 in the KAPI

Esther 4 in the KBT1ETNIK

Esther 4 in the KBV

Esther 4 in the KJV

Esther 4 in the KNFD

Esther 4 in the LBA

Esther 4 in the LBLA

Esther 4 in the LNT

Esther 4 in the LSV

Esther 4 in the MAAL

Esther 4 in the MBV

Esther 4 in the MBV2

Esther 4 in the MHNT

Esther 4 in the MKNFD

Esther 4 in the MNG

Esther 4 in the MNT

Esther 4 in the MNT2

Esther 4 in the MRS1T

Esther 4 in the NAA

Esther 4 in the NASB

Esther 4 in the NBLA

Esther 4 in the NBS

Esther 4 in the NBVTP

Esther 4 in the NET2

Esther 4 in the NIV11

Esther 4 in the NNT

Esther 4 in the NNT2

Esther 4 in the NNT3

Esther 4 in the PDDPT

Esther 4 in the PFNT

Esther 4 in the RMNT

Esther 4 in the SBIAS

Esther 4 in the SBIBS

Esther 4 in the SBIBS2

Esther 4 in the SBICS

Esther 4 in the SBIDS

Esther 4 in the SBIGS

Esther 4 in the SBIHS

Esther 4 in the SBIIS

Esther 4 in the SBIIS2

Esther 4 in the SBIIS3

Esther 4 in the SBIKS

Esther 4 in the SBIKS2

Esther 4 in the SBIMS

Esther 4 in the SBIOS

Esther 4 in the SBIPS

Esther 4 in the SBISS

Esther 4 in the SBITS

Esther 4 in the SBITS2

Esther 4 in the SBITS3

Esther 4 in the SBITS4

Esther 4 in the SBIUS

Esther 4 in the SBIVS

Esther 4 in the SBT

Esther 4 in the SBT1E

Esther 4 in the SCHL

Esther 4 in the SNT

Esther 4 in the SUSU

Esther 4 in the SUSU2

Esther 4 in the SYNO

Esther 4 in the TBIAOTANT

Esther 4 in the TBT1E

Esther 4 in the TBT1E2

Esther 4 in the TFTIP

Esther 4 in the TFTU

Esther 4 in the TGNTATF3T

Esther 4 in the THAI

Esther 4 in the TNFD

Esther 4 in the TNT

Esther 4 in the TNTIK

Esther 4 in the TNTIL

Esther 4 in the TNTIN

Esther 4 in the TNTIP

Esther 4 in the TNTIZ

Esther 4 in the TOMA

Esther 4 in the TTENT

Esther 4 in the UBG

Esther 4 in the UGV

Esther 4 in the UGV2

Esther 4 in the UGV3

Esther 4 in the VBL

Esther 4 in the VDCC

Esther 4 in the YALU

Esther 4 in the YAPE

Esther 4 in the YBVTP

Esther 4 in the ZBP