Esther 9 (BOICB)

1 Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Ada, bụ ụbọchị a gaara emezu iwu ahụ eze nyere. Nʼụbọchị a, ndị iro ndị Juu lere anya na ha ga-ekpochapụ ha. Ma ugbu a, a tụgharịala iwu ahụ, mee ya ka ọ bụrụ ihe megidere ndị ahụ kpọrọ ndị Juu asị. 2 Ndị Juu chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze Sekses, maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche. 3 Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai. 4 Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile. 5 Nke a mere, na ndị Juu ji mma agha gbuo, ma bibie ndị iro ha niile. Ha mesoro ndị kpọrọ ha asị mmeso ọbụla masịrị ha. 6 Nʼime obodo ahụ e wusiri ike bụ Susa, ndị Juu gburu narị ndị ikom ise laa ha nʼiyi. 7 Ha gbukwara Pashandata, Dalfon, Aspata, 8 Porata, Adalia, Aridata, 9 Pamashta, Arisai Aridai na Vaizata, 10 ha bụkwa ụmụ ndị ikom iri Heman nwa Hamedata, onye iro ndị Juu mụtara. Ma ha emetụghị akụnụba ha aka. 11 Nʼụbọchị ahụ, a gwara eze ọnụọgụgụ ndị e gburu nʼobodo Susa. 12 Eze sịrị Esta bụ nwunye eze, “Ndị Juu egbuola narị mmadụ ise nʼobodo Susa, gbukwaa ụmụ ndị ikom Heman iri. Ebe ha mere otu a nʼebe a, onye ma ihe ha mere nʼobodo dị iche iche nʼalaeze m? Ugbu a, gịnị ọzọ bụ arịrịọ gị? A ga-emezuru gị ya. Gịnị ọzọ bụ ihe ị chọrọ? A ga-emekwa ya.” 13 Esta sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka ndị Juu bi na Susa meekwa ihe ha mere taa echi, ka a kwụbakwa ụmụ ndị ikom iri Heman nʼelu osisi.” 14 Ya mere, eze kwenyere, a kụkwara ya dịka ekwe na Susa, a kwụbara ụmụ iri Heman nʼelu osisi. 15 Ndị Juu bi na Susa chịkọtakwara onwe ha ọnụ nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa Ada, gbuo narị mmadụ atọ ọzọ nʼobodo Susa. Ma ha emetụghị akụnụba ndị ahụ aka. 16 Ma ndị Juu ndị ọzọ bi nʼobodo ndị ọzọ dị iche iche eze na-achị, jikọtakwara onwe ha ọnụ ịzọ ndụ ha, site otu a nwere onwe ha pụọ nʼaka ndị iro ha. Ha gburu iri puku mmadụ asaa na ise bụ ndị kpọrọ ha asị, ma ha emetụghị akụnụba ha aka. 17 E mere ihe ndị a nʼabalị iri na atọ nke ọnwa Ada, ha zukwara ike nʼụbọchị so ya bụ abalị iri na anọ. Ha mere ụbọchị ahụ, ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ. 18 Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ. 19 Ọ bụ nke a mere ndị Juu niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye. 20 Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya, 21 ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla. 22 Nke a bụ iji gosi mgbe ndị Juu nweere onwe ha site nʼaka ndị iro ha, na iji cheta mgbe iru ụjụ ha ghọrọ ọṅụ, na mgbe ịkwa akwa ha ghọrọ ụbọchị mmemme ọṅụ. O deere ha ka ha debe ụbọchị ndị a dịka ụbọchị mmemme ọṅụ na oriri na ọṅụṅụ, na inyerịta onwe ha onyinye ihe oriri na inye ụmụ ogbenye onyinye dị iche iche. 23 Ya mere, ndị Juu kwenyere ịga nʼihu ime mmemme a nke ha malitere ime, dịka Mọdekai si deere ha ya, 24 nʼihi na Heman nwa Hamedata, onye Agag, onye iro ndị Juu niile, kpebiri ịla ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ ọ tụpụtara site nʼife nza. 25 Mgbe izu ọjọọ a ruru eze ntị, o nyere iwu nke e debanyere nʼakwụkwọ sị, ka echiche ọjọọ nke Heman megide ndị Juu tụgharịa nʼisi ya, ọ kwukwara ka akwụgbuo ya na ụmụ ndị ikom niile nʼelu osisi. 26 Ya mere, a kpọrọ ụbọchị ndị ahụ Purim nke sitere na mkpụrụ okwu Pur. Nʼihi ihe niile e dere nʼakwụkwọ ahụ na nke ha hụkwara na nke mekwaara ha. 27 Ndị Juu niile kwekọrịtara idebe mmemme a, na imekwa ka ụmụ ha, na ndị niile kwenyere iso ha, na-emekwa ya. Ha kpebiri na ha ga-edebe ụbọchị abụọ ndị ahụ kwa afọ, nʼụzọ nakwa oge e zubere ka ọ bụrụ. 28 Aga na-echeta ụbọchị ndị a, na-eme kwa ya nʼọgbọ niile ọbụla, nʼezinaụlọ ọbụla, nʼala ọbụla a na-achị nakwa obodo ọbụla. Ndị Juu aghaghị idebe mmemme ụbọchị Purim, ma ọ bụkwanụ ncheta ụbọchị ndị a apụọ nʼobi ọgbọ ha niile. 29 Nʼoge a, Esta nwunye eze, nwa Abihail, na Mọdekai onye Juu jikọtara aka dee akwụkwọ ọzọ nke e ji mesie akwụkwọ ahụ Mọdekai dere ike, maka ịmalite mmemme Purim. 30 Mọdekai zipụrụ akwụkwọ ozi nke okwu udo na eziokwu dị nʼime ya, nye ndị Juu niile bi nʼime mpaghara alaeze Sekses, nke dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). 31 E ji akwụkwọ a mesie okwu ahụ ike na a ga-edebe ụbọchị ndị ahụ kwa afọ maka mmemme Purim dịka Mọdekai onye Juu na Esta nwunye eze nyere nʼiwu. Ndị Juu niile na ụmụ ụmụ ha ga-eme mmemme a nʼoge a kara aka, dịka ha si edebe iwu ndị ọzọ metụtara oge ibu ọnụ na oge iru ụjụ. 32 Iwu a Esta nyere mesịrị ụkpụrụ mmemme Purim ike. E dekwara ya nʼakwụkwọ.

In Other Versions

Esther 9 in the ANGEFD

Esther 9 in the ANTPNG2D

Esther 9 in the AS21

Esther 9 in the BAGH

Esther 9 in the BBPNG

Esther 9 in the BBT1E

Esther 9 in the BDS

Esther 9 in the BEV

Esther 9 in the BHAD

Esther 9 in the BIB

Esther 9 in the BLPT

Esther 9 in the BNT

Esther 9 in the BNTABOOT

Esther 9 in the BNTLV

Esther 9 in the BOATCB

Esther 9 in the BOATCB2

Esther 9 in the BOBCV

Esther 9 in the BOCNT

Esther 9 in the BOECS

Esther 9 in the BOGWICC

Esther 9 in the BOHCB

Esther 9 in the BOHCV

Esther 9 in the BOHLNT

Esther 9 in the BOHNTLTAL

Esther 9 in the BOILNTAP

Esther 9 in the BOITCV

Esther 9 in the BOKCV

Esther 9 in the BOKCV2

Esther 9 in the BOKHWOG

Esther 9 in the BOKSSV

Esther 9 in the BOLCB

Esther 9 in the BOLCB2

Esther 9 in the BOMCV

Esther 9 in the BONAV

Esther 9 in the BONCB

Esther 9 in the BONLT

Esther 9 in the BONUT2

Esther 9 in the BOPLNT

Esther 9 in the BOSCB

Esther 9 in the BOSNC

Esther 9 in the BOTLNT

Esther 9 in the BOVCB

Esther 9 in the BOYCB

Esther 9 in the BPBB

Esther 9 in the BPH

Esther 9 in the BSB

Esther 9 in the CCB

Esther 9 in the CUV

Esther 9 in the CUVS

Esther 9 in the DBT

Esther 9 in the DGDNT

Esther 9 in the DHNT

Esther 9 in the DNT

Esther 9 in the ELBE

Esther 9 in the EMTV

Esther 9 in the ESV

Esther 9 in the FBV

Esther 9 in the FEB

Esther 9 in the GGMNT

Esther 9 in the GNT

Esther 9 in the HARY

Esther 9 in the HNT

Esther 9 in the IRVA

Esther 9 in the IRVB

Esther 9 in the IRVG

Esther 9 in the IRVH

Esther 9 in the IRVK

Esther 9 in the IRVM

Esther 9 in the IRVM2

Esther 9 in the IRVO

Esther 9 in the IRVP

Esther 9 in the IRVT

Esther 9 in the IRVT2

Esther 9 in the IRVU

Esther 9 in the ISVN

Esther 9 in the JSNT

Esther 9 in the KAPI

Esther 9 in the KBT1ETNIK

Esther 9 in the KBV

Esther 9 in the KJV

Esther 9 in the KNFD

Esther 9 in the LBA

Esther 9 in the LBLA

Esther 9 in the LNT

Esther 9 in the LSV

Esther 9 in the MAAL

Esther 9 in the MBV

Esther 9 in the MBV2

Esther 9 in the MHNT

Esther 9 in the MKNFD

Esther 9 in the MNG

Esther 9 in the MNT

Esther 9 in the MNT2

Esther 9 in the MRS1T

Esther 9 in the NAA

Esther 9 in the NASB

Esther 9 in the NBLA

Esther 9 in the NBS

Esther 9 in the NBVTP

Esther 9 in the NET2

Esther 9 in the NIV11

Esther 9 in the NNT

Esther 9 in the NNT2

Esther 9 in the NNT3

Esther 9 in the PDDPT

Esther 9 in the PFNT

Esther 9 in the RMNT

Esther 9 in the SBIAS

Esther 9 in the SBIBS

Esther 9 in the SBIBS2

Esther 9 in the SBICS

Esther 9 in the SBIDS

Esther 9 in the SBIGS

Esther 9 in the SBIHS

Esther 9 in the SBIIS

Esther 9 in the SBIIS2

Esther 9 in the SBIIS3

Esther 9 in the SBIKS

Esther 9 in the SBIKS2

Esther 9 in the SBIMS

Esther 9 in the SBIOS

Esther 9 in the SBIPS

Esther 9 in the SBISS

Esther 9 in the SBITS

Esther 9 in the SBITS2

Esther 9 in the SBITS3

Esther 9 in the SBITS4

Esther 9 in the SBIUS

Esther 9 in the SBIVS

Esther 9 in the SBT

Esther 9 in the SBT1E

Esther 9 in the SCHL

Esther 9 in the SNT

Esther 9 in the SUSU

Esther 9 in the SUSU2

Esther 9 in the SYNO

Esther 9 in the TBIAOTANT

Esther 9 in the TBT1E

Esther 9 in the TBT1E2

Esther 9 in the TFTIP

Esther 9 in the TFTU

Esther 9 in the TGNTATF3T

Esther 9 in the THAI

Esther 9 in the TNFD

Esther 9 in the TNT

Esther 9 in the TNTIK

Esther 9 in the TNTIL

Esther 9 in the TNTIN

Esther 9 in the TNTIP

Esther 9 in the TNTIZ

Esther 9 in the TOMA

Esther 9 in the TTENT

Esther 9 in the UBG

Esther 9 in the UGV

Esther 9 in the UGV2

Esther 9 in the UGV3

Esther 9 in the VBL

Esther 9 in the VDCC

Esther 9 in the YALU

Esther 9 in the YAPE

Esther 9 in the YBVTP

Esther 9 in the ZBP