Exodus 10 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, “Jekwuru Fero nʼihi na emeela m ka obi ya, na obi ndị na-ejere ya ozi sie ike, ka m nwee ike rụọ ọrụ ịrịbama ndị a dị iche iche nʼetiti ha. 2 Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ ONYENWE ANYỊ.” 3 Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe ONYENWE ANYỊ Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe. 4 Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt. 5 Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu. 6 Ha ga-ejupụta nʼụlọ gị, na nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ihe dị otu a bụ ụdị ihe na-emetụbeghị na mbụ, nke nna gị maọbụ nna nna gị ha na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe ha bidoro ibi nʼala a tutu ruo ugbu a.’ ” Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị hapụ Fero pụọ. 7 Ndị na-ejere Fero ozi bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga-anọgide na-abụrụ anyị ihe ọnwụnwa? Hapụ ndị a ka ha laa, ka ha nwee ike ife ONYENWE ANYỊ Chineke ha ofufe. Ọ bụ na ị ghọtabeghị na e bibiela Ijipt?” 8 Mgbe ahụ, a kpọghachiri Mosis na Erọn azụ nʼihu Fero. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, gaa feenụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu ofufe.” Fero jụkwara ha sị, “Olee ndị nʼetiti unu ga-eso unu jee?” 9 Mosis zaghachiri sị, “Anyị niile na-aga, ụmụntakịrị na ndị okenye, ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom, igwe ehi anyị na igwe ewu na atụrụ anyị; nʼihi na anyị na-aga ime mmemme dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ.” 10 Fero sịrị, “Ka ONYENWE ANYỊ nọnyere unu. Ma agaghị m ekwe ka unu na ndị inyom unu, na ụmụntakịrị unu gaa. O doro anya na unu na-atụ atụmatụ ọjọọ nʼime obi unu. 11 Ọ gaghị adị otu a! Jeenụ naanị unu bụ ndị ikom gaa fee ONYENWE ANYỊ unu ofufe, nʼihi na nke a bụ ihe unu na-arịọ.” Mgbe ahụ a chụpụrụ Mosis na Erọn site nʼihu Fero. 12 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị nʼala Ijipt ka igurube jupụta na ya, kpuchie ebe niile, richapụ ihe niile na-eto eto dị nʼala ahụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ hapụrụ.” 13 Ya mere, Mosis setịpụrụ mkpanaka ya nʼelu ala Ijipt, ONYENWE ANYỊ mere ka ifufe nke si nʼebe anyanwụ si awa fee nʼụbọchị ahụ niile na abalị ahụ niile. Nʼụtụtụ ya, ifufe ahụ si nʼebe anyanwụ si awa bubatara igurube ndị ahụ. 14 Ha niile kpuchichara ala Ijipt niile, site nʼotu akụkụ ruo nʼakụkụ nke ọzọ. Nke a bụ mbata igurube kachasị ibe ya njọ nʼIjipt. Ijipt agaghị enwekwa nke dịka ya ọzọ. 15 Ha kpuchiri ala niile ruo mgbe ọchịchịrị gbachiri ya. Ha richapụrụ ihe niile na-eto nʼubi, na mkpụrụ niile na-amị nʼosisi, bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ukwu ahụ hapụrụ. Nʼikpeazụ, ọ dịghị ahịhịa ndụ fọdụrụ nʼala ma nʼelu osisi nʼIjipt niile. 16 Na-atụfughị oge, Fero ziri ozi ka a kpọọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Emehiela m megide unu na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu. 17 Biko gbagharakwa m mmehie nke a, ma rịọọ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu ka o wepụrụ m ọnwụ nke a. Ekwere m nkwa na agaghị m ajụkwa ọzọ ka unu laa.” 18 Mosis hapụrụ Fero pụọ gaa kpeere ONYENWE ANYỊ ekpere. 19 Ngwangwa, ONYENWE ANYỊ zitere ikuku nke si nʼebe anyanwụ na-ada bịa, nke bupụrụ igurube ndị ahụ site nʼala Ijipt, buba ha nʼOsimiri Uhie. Ọ dịkwaghị otu igurube fọdụrụ nʼala Ijipt niile. 20 Ma ONYENWE ANYỊ mere ka obi Fero sie ike, o kweghị ka ụmụ Izrel gaa fee Chineke ofufe. 21 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị abụọ nʼeluigwe ka ọchịchịrị gbaa nʼala Ijipt niile.” 22 Mosis setịpụrụ aka ya nʼeluigwe. Oke ọchịchịrị gbara abalị atọ nʼala Ijipt niile. 23 Ndị Ijipt ahụghị ihu ibe ha. Ha ahapụghịkwa ebe obibi ha abalị atọ ahụ. Ma ụmụ Izrel nwere ìhè nʼebe niile ha bi. 24 Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Mosis sị ya, “Gaanụ fee ONYENWE ANYỊ unu ofufe. Unu na ndị inyom na ụmụ unu nwere ike ịga, ma unu ga-ahapụ igwe ehi unu na igwe anụ ụlọ unu gaa.” 25 Mosis zara, “Ị ghaghị ịhapụ anyị ka anyị were ihe aja na aja nsure ọkụ, nke anyị chee nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị. 26 Igwe anụ ụlọ anyị ga-esoro anyị. O nweghị ihe ọ bụla anyị ga-ahapụ nʼihi na anyị ga-eji ụfọdụ nʼime ha fee ONYENWE ANYỊ Chineke anyị ofufe. Ọ bụkwa naanị mgbe anyị ruru nʼebe ahụ ka anyị nwere ike ịmata ihe anyị ga-eji fee ONYENWE ANYỊ anyị ofufe.” 27 Ma ONYENWE ANYỊ mere ka obi Fero sie ike. O kweghị ka ha laa. 28 Fero gwara Mosis sị, “Si nʼihu m pụọ. Lezie anya hụ na ị bịaghị nʼihu m ọzọ. Ụbọchị ọbụla ị nwara bịa nʼihu m, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ.” 29 Mosis zaghachiri Fero sị, “Ihe i kwuru dị mma, agaghị m abịakwa nʼihu gị ọzọ.”

In Other Versions

Exodus 10 in the ANGEFD

Exodus 10 in the ANTPNG2D

Exodus 10 in the AS21

Exodus 10 in the BAGH

Exodus 10 in the BBPNG

Exodus 10 in the BBT1E

Exodus 10 in the BDS

Exodus 10 in the BEV

Exodus 10 in the BHAD

Exodus 10 in the BIB

Exodus 10 in the BLPT

Exodus 10 in the BNT

Exodus 10 in the BNTABOOT

Exodus 10 in the BNTLV

Exodus 10 in the BOATCB

Exodus 10 in the BOATCB2

Exodus 10 in the BOBCV

Exodus 10 in the BOCNT

Exodus 10 in the BOECS

Exodus 10 in the BOGWICC

Exodus 10 in the BOHCB

Exodus 10 in the BOHCV

Exodus 10 in the BOHLNT

Exodus 10 in the BOHNTLTAL

Exodus 10 in the BOILNTAP

Exodus 10 in the BOITCV

Exodus 10 in the BOKCV

Exodus 10 in the BOKCV2

Exodus 10 in the BOKHWOG

Exodus 10 in the BOKSSV

Exodus 10 in the BOLCB

Exodus 10 in the BOLCB2

Exodus 10 in the BOMCV

Exodus 10 in the BONAV

Exodus 10 in the BONCB

Exodus 10 in the BONLT

Exodus 10 in the BONUT2

Exodus 10 in the BOPLNT

Exodus 10 in the BOSCB

Exodus 10 in the BOSNC

Exodus 10 in the BOTLNT

Exodus 10 in the BOVCB

Exodus 10 in the BOYCB

Exodus 10 in the BPBB

Exodus 10 in the BPH

Exodus 10 in the BSB

Exodus 10 in the CCB

Exodus 10 in the CUV

Exodus 10 in the CUVS

Exodus 10 in the DBT

Exodus 10 in the DGDNT

Exodus 10 in the DHNT

Exodus 10 in the DNT

Exodus 10 in the ELBE

Exodus 10 in the EMTV

Exodus 10 in the ESV

Exodus 10 in the FBV

Exodus 10 in the FEB

Exodus 10 in the GGMNT

Exodus 10 in the GNT

Exodus 10 in the HARY

Exodus 10 in the HNT

Exodus 10 in the IRVA

Exodus 10 in the IRVB

Exodus 10 in the IRVG

Exodus 10 in the IRVH

Exodus 10 in the IRVK

Exodus 10 in the IRVM

Exodus 10 in the IRVM2

Exodus 10 in the IRVO

Exodus 10 in the IRVP

Exodus 10 in the IRVT

Exodus 10 in the IRVT2

Exodus 10 in the IRVU

Exodus 10 in the ISVN

Exodus 10 in the JSNT

Exodus 10 in the KAPI

Exodus 10 in the KBT1ETNIK

Exodus 10 in the KBV

Exodus 10 in the KJV

Exodus 10 in the KNFD

Exodus 10 in the LBA

Exodus 10 in the LBLA

Exodus 10 in the LNT

Exodus 10 in the LSV

Exodus 10 in the MAAL

Exodus 10 in the MBV

Exodus 10 in the MBV2

Exodus 10 in the MHNT

Exodus 10 in the MKNFD

Exodus 10 in the MNG

Exodus 10 in the MNT

Exodus 10 in the MNT2

Exodus 10 in the MRS1T

Exodus 10 in the NAA

Exodus 10 in the NASB

Exodus 10 in the NBLA

Exodus 10 in the NBS

Exodus 10 in the NBVTP

Exodus 10 in the NET2

Exodus 10 in the NIV11

Exodus 10 in the NNT

Exodus 10 in the NNT2

Exodus 10 in the NNT3

Exodus 10 in the PDDPT

Exodus 10 in the PFNT

Exodus 10 in the RMNT

Exodus 10 in the SBIAS

Exodus 10 in the SBIBS

Exodus 10 in the SBIBS2

Exodus 10 in the SBICS

Exodus 10 in the SBIDS

Exodus 10 in the SBIGS

Exodus 10 in the SBIHS

Exodus 10 in the SBIIS

Exodus 10 in the SBIIS2

Exodus 10 in the SBIIS3

Exodus 10 in the SBIKS

Exodus 10 in the SBIKS2

Exodus 10 in the SBIMS

Exodus 10 in the SBIOS

Exodus 10 in the SBIPS

Exodus 10 in the SBISS

Exodus 10 in the SBITS

Exodus 10 in the SBITS2

Exodus 10 in the SBITS3

Exodus 10 in the SBITS4

Exodus 10 in the SBIUS

Exodus 10 in the SBIVS

Exodus 10 in the SBT

Exodus 10 in the SBT1E

Exodus 10 in the SCHL

Exodus 10 in the SNT

Exodus 10 in the SUSU

Exodus 10 in the SUSU2

Exodus 10 in the SYNO

Exodus 10 in the TBIAOTANT

Exodus 10 in the TBT1E

Exodus 10 in the TBT1E2

Exodus 10 in the TFTIP

Exodus 10 in the TFTU

Exodus 10 in the TGNTATF3T

Exodus 10 in the THAI

Exodus 10 in the TNFD

Exodus 10 in the TNT

Exodus 10 in the TNTIK

Exodus 10 in the TNTIL

Exodus 10 in the TNTIN

Exodus 10 in the TNTIP

Exodus 10 in the TNTIZ

Exodus 10 in the TOMA

Exodus 10 in the TTENT

Exodus 10 in the UBG

Exodus 10 in the UGV

Exodus 10 in the UGV2

Exodus 10 in the UGV3

Exodus 10 in the VBL

Exodus 10 in the VDCC

Exodus 10 in the YALU

Exodus 10 in the YAPE

Exodus 10 in the YBVTP

Exodus 10 in the ZBP