Ezekiel 48 (BOICB)

1 “Nke a bụ aha ebo niile, na ala ha ga-eketa: “Dan otu oke. Site na nsọtụ ugwu, nʼakụkụ ụzọ Hetlon ruo mbata Hamat. Haza Enan na oke ala ugwu Damaskọs, nke dị nʼakụkụ Hamat ga-abụ akụkụ oke ala ha site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 2 Asha ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Dan, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 3 Naftalị ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Asha, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 4 Manase nwere otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Naftalị, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 5 Ifrem ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Manase, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 6 Ruben ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ifrem, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 7 Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala Ruben, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 8 “Ala nke ya na oke ala ndị Juda ga-agbatị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ka ị ga-enye dịka onyinye pụrụ iche. Obosara ya ga-abụ ihe dị kilomita iri na atọ. Ogologo ya site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ ga-aha ka ala otu ebo ketara. Ụlọnsọ ukwu ahụ ga-adịkwa nʼetiti ya. 9 “Ogologo ebe a ewepụtara iche nye ONYENWE ANYỊ ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita ise na ọkara. 10 Nke a ga-abụ ala dị nsọ e debere iche nye ndị nchụaja. Nʼakụkụ ugwu, ịdị ogologo ala ahụ ga-abụ kilomita iri na atọ. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ogologo ya bụ kilomita ise na ọkara. Ogologo nke akụkụ ndịda na nke ugwu bụ otu. Otu a kwa, ogologo nke akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ otu. Ebe nsọ ONYENWE ANYỊ ga-adị nʼetiti ya. 11 Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere. 12 Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị Livayị nwekọrọ oke ala. 13 “Nʼakụkụ ala ndị nchụaja, a ga-ekenye ndị Livayị ala nke ha. Ha ga-eketa ala nke ogologo ya bụ kilomita iri na atọ, nke obosara ya bụ kilomita ise na ọkara. 14 O nweghị akụkụ ala nsọ a a ga-ere ere, maọbụ nye ya ndị ọzọ, nʼihi na ihe dị nsọ ka ọ bụ nye ONYENWE ANYỊ. 15 “Ala nke fọdụrụ, nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dị kilomita ise na ọkara ga-abụ ala ọha. A ga-ewu ebe obibi nʼelu ya, wukwaa ebe ịzụ anụ ụlọ. Obodo ga-adị nʼetiti ya, 16 nke ogologo akụkụ ugwu ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ndịda ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ọwụwa anyanwụ ruru kilomita abụọ na ụma anọ, na akụkụ ọdịda anyanwụ rukwara kilomita abụọ na ụma. 17 Ogologo nke ala ebe ịta nri nke ga-agba obodo ahụ gburugburu ga-aha nʼotu. Ọ ga-adị narị mita na iri mita atọ na ise nʼugwu, na ndịda narị mita na iri mita atọ na ise, nʼọwụwa anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise, nʼakụkụ nʼọdịda anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise. 18 Ma nke ga-afọdụ na ya, nʼakụkụ oke ala ahụ dị nsọ nke gara ogologo ya niile, ga-abụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ kilomita ise na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụkwa kilomita ise na ọkara. Ihe omume ya ga-abụ nri nye ndị ọrụ nke obodo ahụ. 19 Ndị ọrụ si nʼobodo, bụ ndị na-akọ ya ga-abụkwa ndị sị nʼebo niile nke Izrel. 20 Ala ahụ niile, ma ala ahụ e doro nsọ, ma ala ndị obodo, ga-adị kilomita iri na atọ nʼakụkụ ya ọbụla. 21 “Ala niile fọdụrụ nʼakụkụ abụọ nke ala ahụ dị nsọ, na ala ndị obodo ga-abụ nke nwa eze. Ọ ga-agbatị ruo ọwụwa anyanwụ site nʼọtụtụ kilomita iri na atọ nke oke ahụ dọ nsọ ruo nʼoke ala ọwụwa anyanwụ, sitekwa na kilomita iri na atọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo oke ala ọdịda anyanwụ. Akụkụ abụọ ndị a nke gbatịrị ruo nʼoke ala ndị obodo ga-abụ nke onye ọchịchị, ebe nsọ ahụ na ụlọ ukwu ahụ ga-adị nʼetiti ha. 22 Ya mere, oke ala nke ndị Livayị na ala ndị obodo ga-adị nʼetiti ala nke nwa eze nwee. Oke ala nke nwa eze ahụ ga-adị nʼetiti oke ala Juda na oke ala Benjamin. 23 “Ala e nyere ebo fọdụrụ dị otu a: “Benjamin ga-enwe otu oke, nke sitere nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. 24 Simiọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Benjamin ga-enwekọ otu oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 25 Isaka ga-enwe otu oke; ha na ndị Simiọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 26 Zebụlọn ga-enwe otu oke; ha na ndị Isaka ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 27 Gad ga-enwe otu oke; ha na ndị Zebụlọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. 28 Ma oke ala Gad nke chere ihu nʼakụkụ ndịda ga-esi na Tama ruo nʼiyi Meriba Kadesh, sorokwa ọdọ mmiri Ijipt ruo nʼosimiri Mediterenịa. 29 “Nke a bụ ala unu ga-ekenye ebo Izrel niile dịka oke ha. Ha ga-abụkwara ha ihe nketa.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 30 “Ndị a ga-abụ ọnụ ụzọ ama e si apụ nʼobodo ahụ. “Nʼakụkụ nke ugwu, nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, 31 ọnụ ụzọ ama obodo ahụ ga-abụ aha ebo niile nke Izrel. Ọnụ ụzọ ama atọ nʼakụkụ ugwu ga-abụ ọnụ ụzọ ama Ruben, ọnụ ụzọ ama Juda, na ọnụ ụzọ ama Livayị. 32 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama Josef, ọnụ ụzọ ama Benjamin, na ọnụ ụzọ ama Dan. 33 Nʼakụkụ ndịda, nke ogologo ya bụkwa kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Simiọn, ọnụ ụzọ ama Isaka, na ọnụ ụzọ ama Zebụlọn. 34 Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama Gad, ọnụ ụzọ ama Asha, na ọnụ ụzọ ama Naftalị. 35 “Gburugburu obodo ahụ bụ kilomita iri. “Aha a ga-akpọ obodo ahụ site nʼoge ahụ gawa, ga-abụ, ‘ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe ahụ.’ ”

In Other Versions

Ezekiel 48 in the ANGEFD

Ezekiel 48 in the ANTPNG2D

Ezekiel 48 in the AS21

Ezekiel 48 in the BAGH

Ezekiel 48 in the BBPNG

Ezekiel 48 in the BBT1E

Ezekiel 48 in the BDS

Ezekiel 48 in the BEV

Ezekiel 48 in the BHAD

Ezekiel 48 in the BIB

Ezekiel 48 in the BLPT

Ezekiel 48 in the BNT

Ezekiel 48 in the BNTABOOT

Ezekiel 48 in the BNTLV

Ezekiel 48 in the BOATCB

Ezekiel 48 in the BOATCB2

Ezekiel 48 in the BOBCV

Ezekiel 48 in the BOCNT

Ezekiel 48 in the BOECS

Ezekiel 48 in the BOGWICC

Ezekiel 48 in the BOHCB

Ezekiel 48 in the BOHCV

Ezekiel 48 in the BOHLNT

Ezekiel 48 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 48 in the BOILNTAP

Ezekiel 48 in the BOITCV

Ezekiel 48 in the BOKCV

Ezekiel 48 in the BOKCV2

Ezekiel 48 in the BOKHWOG

Ezekiel 48 in the BOKSSV

Ezekiel 48 in the BOLCB

Ezekiel 48 in the BOLCB2

Ezekiel 48 in the BOMCV

Ezekiel 48 in the BONAV

Ezekiel 48 in the BONCB

Ezekiel 48 in the BONLT

Ezekiel 48 in the BONUT2

Ezekiel 48 in the BOPLNT

Ezekiel 48 in the BOSCB

Ezekiel 48 in the BOSNC

Ezekiel 48 in the BOTLNT

Ezekiel 48 in the BOVCB

Ezekiel 48 in the BOYCB

Ezekiel 48 in the BPBB

Ezekiel 48 in the BPH

Ezekiel 48 in the BSB

Ezekiel 48 in the CCB

Ezekiel 48 in the CUV

Ezekiel 48 in the CUVS

Ezekiel 48 in the DBT

Ezekiel 48 in the DGDNT

Ezekiel 48 in the DHNT

Ezekiel 48 in the DNT

Ezekiel 48 in the ELBE

Ezekiel 48 in the EMTV

Ezekiel 48 in the ESV

Ezekiel 48 in the FBV

Ezekiel 48 in the FEB

Ezekiel 48 in the GGMNT

Ezekiel 48 in the GNT

Ezekiel 48 in the HARY

Ezekiel 48 in the HNT

Ezekiel 48 in the IRVA

Ezekiel 48 in the IRVB

Ezekiel 48 in the IRVG

Ezekiel 48 in the IRVH

Ezekiel 48 in the IRVK

Ezekiel 48 in the IRVM

Ezekiel 48 in the IRVM2

Ezekiel 48 in the IRVO

Ezekiel 48 in the IRVP

Ezekiel 48 in the IRVT

Ezekiel 48 in the IRVT2

Ezekiel 48 in the IRVU

Ezekiel 48 in the ISVN

Ezekiel 48 in the JSNT

Ezekiel 48 in the KAPI

Ezekiel 48 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 48 in the KBV

Ezekiel 48 in the KJV

Ezekiel 48 in the KNFD

Ezekiel 48 in the LBA

Ezekiel 48 in the LBLA

Ezekiel 48 in the LNT

Ezekiel 48 in the LSV

Ezekiel 48 in the MAAL

Ezekiel 48 in the MBV

Ezekiel 48 in the MBV2

Ezekiel 48 in the MHNT

Ezekiel 48 in the MKNFD

Ezekiel 48 in the MNG

Ezekiel 48 in the MNT

Ezekiel 48 in the MNT2

Ezekiel 48 in the MRS1T

Ezekiel 48 in the NAA

Ezekiel 48 in the NASB

Ezekiel 48 in the NBLA

Ezekiel 48 in the NBS

Ezekiel 48 in the NBVTP

Ezekiel 48 in the NET2

Ezekiel 48 in the NIV11

Ezekiel 48 in the NNT

Ezekiel 48 in the NNT2

Ezekiel 48 in the NNT3

Ezekiel 48 in the PDDPT

Ezekiel 48 in the PFNT

Ezekiel 48 in the RMNT

Ezekiel 48 in the SBIAS

Ezekiel 48 in the SBIBS

Ezekiel 48 in the SBIBS2

Ezekiel 48 in the SBICS

Ezekiel 48 in the SBIDS

Ezekiel 48 in the SBIGS

Ezekiel 48 in the SBIHS

Ezekiel 48 in the SBIIS

Ezekiel 48 in the SBIIS2

Ezekiel 48 in the SBIIS3

Ezekiel 48 in the SBIKS

Ezekiel 48 in the SBIKS2

Ezekiel 48 in the SBIMS

Ezekiel 48 in the SBIOS

Ezekiel 48 in the SBIPS

Ezekiel 48 in the SBISS

Ezekiel 48 in the SBITS

Ezekiel 48 in the SBITS2

Ezekiel 48 in the SBITS3

Ezekiel 48 in the SBITS4

Ezekiel 48 in the SBIUS

Ezekiel 48 in the SBIVS

Ezekiel 48 in the SBT

Ezekiel 48 in the SBT1E

Ezekiel 48 in the SCHL

Ezekiel 48 in the SNT

Ezekiel 48 in the SUSU

Ezekiel 48 in the SUSU2

Ezekiel 48 in the SYNO

Ezekiel 48 in the TBIAOTANT

Ezekiel 48 in the TBT1E

Ezekiel 48 in the TBT1E2

Ezekiel 48 in the TFTIP

Ezekiel 48 in the TFTU

Ezekiel 48 in the TGNTATF3T

Ezekiel 48 in the THAI

Ezekiel 48 in the TNFD

Ezekiel 48 in the TNT

Ezekiel 48 in the TNTIK

Ezekiel 48 in the TNTIL

Ezekiel 48 in the TNTIN

Ezekiel 48 in the TNTIP

Ezekiel 48 in the TNTIZ

Ezekiel 48 in the TOMA

Ezekiel 48 in the TTENT

Ezekiel 48 in the UBG

Ezekiel 48 in the UGV

Ezekiel 48 in the UGV2

Ezekiel 48 in the UGV3

Ezekiel 48 in the VBL

Ezekiel 48 in the VDCC

Ezekiel 48 in the YALU

Ezekiel 48 in the YAPE

Ezekiel 48 in the YBVTP

Ezekiel 48 in the ZBP