Ezekiel 6 (BOICB)
1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, chee iru gị nʼugwu niile nke nʼIzrel, buo amụma megide ha, 3 sị, ‘Unu ugwu niile nke Izrel, nụrụnụ okwu nke Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị nye ugwu ukwu na ugwu nta niile, na iyi mmiri niile, na ndagwurugwu niile. Mụ, ọ bụladị mụ onwe m, ga-eme ka agha bịakwasị unu, aga m ebibikwa ebe dị iche iche unu na-achụ aja. 4 A ga-etikpọ ebe ịchụ aja unu, tipịa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Aga m atụsa ndị unu e gburu egbu nʼihu arụsị unu. 5 Aga m atọgbọ ozu ndị Izrel nʼihu arụsị ha. Aga m aghasakwa ọkpụkpụ unu gburugburu ebe ịchụ aja unu. 6 Ebe ọbụla unu bi, a ga-etikpọ obodo ndị ahụ, tipịakwa ebe ịchụ aja niile, si otu a mee ka ebe ịchụ aja unu ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu. A ga-etipịakwa arụsị unu, kụjiekwa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Ihe niile unu ji aka unu mepụta ka a ga-ekpochapụkwa. 7 Ndị e gburu egbu ga-ada nʼetiti unu, unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 8 “ ‘Ma aga m eme ka ụfọdụ nʼime ndị m fọdụ. Ndị ahụ fọdụrụ ga-esi nʼihu mma agha gbapụ, gbasasịa nʼala niile, na mba niile nke ụwa. 9 Mgbe ha nọ dịka ndị a dọtara nʼagha na mba ọzọ, ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ga-echeta m. Ha ga-echeta otu ha si jiri obi nke ịkwa iko jupụtara nʼime ya, nke si nʼebe m nọ wezuga onwe ya, na anya nke na-agbaso arụsị ha, mee ka obi jọọ m njọ. Ha ga-akpọ onwe ha asị nʼihi ihe ọjọọ ndị ahụ ha mere, ya na ọchụchụ aja rụrụ arụ ha chụrụ. 10 Ha ga-amata na m bụ ONYENWE ANYỊ, matakwa na mgbe m gwara ha na ihe ndị a niile gaje ịbịakwasị ha, na ọ bụghị okwu efu ka m kwuru. 11 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị, kụkọọ ọbọ aka gị abụọ ọnụ, zọkwaa ụkwụ gị nʼala, ma tisikwaa mkpu akwa ike site nʼobi mwute, nʼihi ihe ọjọọ niile na omume rụrụ arụ ndị Izrel mere. Nʼihi na ha ga ịla nʼiyi site nʼoke ụnwụ, na site nʼagha, na site nʼọrịa na-efe efe. 12 Ndị nọ nʼebe dị anya ga-anwụ site nʼọrịa na-efe efe, ndị nọ nso ga-anwụ site na mma agha, ndị fọdụrụ ndụ ga-anwụ site nʼagụụ. Aga m eme ka ha nụrụ ụfụ oke iwe m. 13 Unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ, mgbe ozu ndị e gburu egbu ga-atọgbọsị nʼetiti arụsị niile, na nʼebe ịchụ aja niile, na nʼugwu nta niile, na nʼugwu ukwu niile, na nʼokpuru osisi ọbụla, na nʼokpuru osisi ook niile, ebe ha na-anọ na-esure ụda na-esi isi ụtọ nye arụsị ha. 14 E, aga m esetipụ aka m megide ha, mee ka ala ha laa nʼiyi, nʼebe niile ha bi, site nʼọzara ruo na Ribla. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ.’ ”
In Other Versions
Ezekiel 6 in the ANGEFD
Ezekiel 6 in the ANTPNG2D
Ezekiel 6 in the AS21
Ezekiel 6 in the BAGH
Ezekiel 6 in the BBPNG
Ezekiel 6 in the BBT1E
Ezekiel 6 in the BDS
Ezekiel 6 in the BEV
Ezekiel 6 in the BHAD
Ezekiel 6 in the BIB
Ezekiel 6 in the BLPT
Ezekiel 6 in the BNT
Ezekiel 6 in the BNTABOOT
Ezekiel 6 in the BNTLV
Ezekiel 6 in the BOATCB
Ezekiel 6 in the BOATCB2
Ezekiel 6 in the BOBCV
Ezekiel 6 in the BOCNT
Ezekiel 6 in the BOECS
Ezekiel 6 in the BOGWICC
Ezekiel 6 in the BOHCB
Ezekiel 6 in the BOHCV
Ezekiel 6 in the BOHLNT
Ezekiel 6 in the BOHNTLTAL
Ezekiel 6 in the BOILNTAP
Ezekiel 6 in the BOITCV
Ezekiel 6 in the BOKCV
Ezekiel 6 in the BOKCV2
Ezekiel 6 in the BOKHWOG
Ezekiel 6 in the BOKSSV
Ezekiel 6 in the BOLCB
Ezekiel 6 in the BOLCB2
Ezekiel 6 in the BOMCV
Ezekiel 6 in the BONAV
Ezekiel 6 in the BONCB
Ezekiel 6 in the BONLT
Ezekiel 6 in the BONUT2
Ezekiel 6 in the BOPLNT
Ezekiel 6 in the BOSCB
Ezekiel 6 in the BOSNC
Ezekiel 6 in the BOTLNT
Ezekiel 6 in the BOVCB
Ezekiel 6 in the BOYCB
Ezekiel 6 in the BPBB
Ezekiel 6 in the BPH
Ezekiel 6 in the BSB
Ezekiel 6 in the CCB
Ezekiel 6 in the CUV
Ezekiel 6 in the CUVS
Ezekiel 6 in the DBT
Ezekiel 6 in the DGDNT
Ezekiel 6 in the DHNT
Ezekiel 6 in the DNT
Ezekiel 6 in the ELBE
Ezekiel 6 in the EMTV
Ezekiel 6 in the ESV
Ezekiel 6 in the FBV
Ezekiel 6 in the FEB
Ezekiel 6 in the GGMNT
Ezekiel 6 in the GNT
Ezekiel 6 in the HARY
Ezekiel 6 in the HNT
Ezekiel 6 in the IRVA
Ezekiel 6 in the IRVB
Ezekiel 6 in the IRVG
Ezekiel 6 in the IRVH
Ezekiel 6 in the IRVK
Ezekiel 6 in the IRVM
Ezekiel 6 in the IRVM2
Ezekiel 6 in the IRVO
Ezekiel 6 in the IRVP
Ezekiel 6 in the IRVT
Ezekiel 6 in the IRVT2
Ezekiel 6 in the IRVU
Ezekiel 6 in the ISVN
Ezekiel 6 in the JSNT
Ezekiel 6 in the KAPI
Ezekiel 6 in the KBT1ETNIK
Ezekiel 6 in the KBV
Ezekiel 6 in the KJV
Ezekiel 6 in the KNFD
Ezekiel 6 in the LBA
Ezekiel 6 in the LBLA
Ezekiel 6 in the LNT
Ezekiel 6 in the LSV
Ezekiel 6 in the MAAL
Ezekiel 6 in the MBV
Ezekiel 6 in the MBV2
Ezekiel 6 in the MHNT
Ezekiel 6 in the MKNFD
Ezekiel 6 in the MNG
Ezekiel 6 in the MNT
Ezekiel 6 in the MNT2
Ezekiel 6 in the MRS1T
Ezekiel 6 in the NAA
Ezekiel 6 in the NASB
Ezekiel 6 in the NBLA
Ezekiel 6 in the NBS
Ezekiel 6 in the NBVTP
Ezekiel 6 in the NET2
Ezekiel 6 in the NIV11
Ezekiel 6 in the NNT
Ezekiel 6 in the NNT2
Ezekiel 6 in the NNT3
Ezekiel 6 in the PDDPT
Ezekiel 6 in the PFNT
Ezekiel 6 in the RMNT
Ezekiel 6 in the SBIAS
Ezekiel 6 in the SBIBS
Ezekiel 6 in the SBIBS2
Ezekiel 6 in the SBICS
Ezekiel 6 in the SBIDS
Ezekiel 6 in the SBIGS
Ezekiel 6 in the SBIHS
Ezekiel 6 in the SBIIS
Ezekiel 6 in the SBIIS2
Ezekiel 6 in the SBIIS3
Ezekiel 6 in the SBIKS
Ezekiel 6 in the SBIKS2
Ezekiel 6 in the SBIMS
Ezekiel 6 in the SBIOS
Ezekiel 6 in the SBIPS
Ezekiel 6 in the SBISS
Ezekiel 6 in the SBITS
Ezekiel 6 in the SBITS2
Ezekiel 6 in the SBITS3
Ezekiel 6 in the SBITS4
Ezekiel 6 in the SBIUS
Ezekiel 6 in the SBIVS
Ezekiel 6 in the SBT
Ezekiel 6 in the SBT1E
Ezekiel 6 in the SCHL
Ezekiel 6 in the SNT
Ezekiel 6 in the SUSU
Ezekiel 6 in the SUSU2
Ezekiel 6 in the SYNO
Ezekiel 6 in the TBIAOTANT
Ezekiel 6 in the TBT1E
Ezekiel 6 in the TBT1E2
Ezekiel 6 in the TFTIP
Ezekiel 6 in the TFTU
Ezekiel 6 in the TGNTATF3T
Ezekiel 6 in the THAI
Ezekiel 6 in the TNFD
Ezekiel 6 in the TNT
Ezekiel 6 in the TNTIK
Ezekiel 6 in the TNTIL
Ezekiel 6 in the TNTIN
Ezekiel 6 in the TNTIP
Ezekiel 6 in the TNTIZ
Ezekiel 6 in the TOMA
Ezekiel 6 in the TTENT
Ezekiel 6 in the UBG
Ezekiel 6 in the UGV
Ezekiel 6 in the UGV2
Ezekiel 6 in the UGV3
Ezekiel 6 in the VBL
Ezekiel 6 in the VDCC
Ezekiel 6 in the YALU
Ezekiel 6 in the YAPE
Ezekiel 6 in the YBVTP
Ezekiel 6 in the ZBP