Genesis 30 (BOICB)

1 Rechel hụrụ na ya amụghị nwa ọbụla nye Jekọb, o kworo ekworo megide nwanne ya nwanyị. Ya mere, ọ sịrị Jekọb, “Nye m ụmụ. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m anwụ.” 2 Jekọb were iwe megide Rechel, sị ya, “Abụ m Chineke onye gbochiri gị mkpụrụ nke afọ?” 3 Mgbe ahụ Rechel gwara Jekọb sị ya, “Lee odibo m nwanyị Bilha, bakwuru ya ka ọ mụọ nwa nʼikpere m abụọ, ka mụ onwe m site na ya bụrụkwa onye mụtara ụmụ.” 4 Rechel nyere Jekọb Bilha, odibo nwanyị ya, Jekọb bakwuuru ya. 5 Bilha tụụrụ ime mụọra Jekọb nwa nwoke. 6 Nke a mere ka Rechel kwuo sị, “Chineke ekpepụtala m. Ọ nụla arịrịọ m nye m nwa nwoke.” Nʼihi nke a, Rechel gụrụ nwa ahụ Dan. 7 Bilha, odibo nwanyị Rechel, tụụrụ ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke abụọ. 8 Rechel kwuru sị, “Mgba dị ukwuu ka mụ na nwanne m nwanyị gbara, m merie.” Ọ kpọọ ya Naftalị. 9 Lịa hụrụ na ya akwụsịla ịmụ nwa, ọ kpọọrọ Zilpa, odibo ya nwanyị kpọnye Jekọb ka ọ bụrụ nwunye ya. 10 Zilpa, odibo nwanyị Lịa, mụtara Jekọb nwa nwoke. 11 Mgbe nke a mere, Lịa kwuru sị, “Nke a bụ ihuọma.” Ọ kpọrọ nwa ahụ Gad. 12 Zilpa, odibo nwanyị Lịa mụtaara Jekọb nwa nwoke nke abụọ. 13 Mgbe ahụ Lịa kwuru sị, “Ọṅụ ejula m obi, nʼihi na ụmụ nwanyị ibe m ga-akpọ m onye ihe na-agara nke ọma.” Lịa kpọrọ nwantakịrị nwoke ahụ Asha. 14 Otu ụbọchị, nʼoge a na-aghọ ọka wiiti, Ruben nwa Lịa, gara nʼọhịa hụ ahịhịa a na-akpọ mandreki. Ọ kụtaara nne ya ụfọdụ nʼime ahịhịa a. Mgbe Rechel hụrụ ahịhịa a, ọ rịọrọ Lịa sị ya, “Biko nyetụ m ụfọdụ nʼime mandreki ndị a nwa gị nwoke kụtara.” 15 Ma Lịa zara sị ya, “O zubeere gị na ị napụrụ m di m? Ị chọkwara ịnapụ m mandreki ndị a nwa m nwoke wetaara m?”Rechel zara Lịa sị, “Ọ dị mma, ka gị na ya dinaa nʼabalị a ka ọ bụrụ ihe mgbanwo maka mandreki nwa gị nwoke.” 16 Ya mere, mgbe Jekọb si nʼọhịa na-alọbata nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, Lịa pụrụ izute ya, sị ya, “Ị ga-abakwute m nʼihi na m ejirila m ahịhịa mandreki nwa m nwoke m zụta gị.” Ha dinara nʼabalị ahụ. 17 Chineke nụrụ olu Lịa, ọ tụụrụ ime mụtara Jekọb nwa nwoke nke ise. 18 Lịa sịrị, “Chineke akwụọla m ụgwọ maka odibo m nwanyị m nyere di m.” Ya mere ọ kpọrọ aha ya Isaka. 19 Lịa tụkwaara ime ọzọ mụtara Jekọb nwa nwoke nke isii. 20 Ugbu a Lịa kwuru sị, “Chineke enyela m ezi onyinye dị oke ọnụ. Ugbu a, di m ga-eji nkwanye ugwu leta m nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom isii.” Ọ kpọrọ aha ya Zebụlọn. 21 Emesịa, Lịa mụrụ nwa nwanyị, kpọọ ya Daịna. 22 Chineke chetara Rechel. Ọ nụrụ olu ya, meghee akpanwa ya. 23 Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.” 24 Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka ONYENWE ANYỊ nyekwa m nwa nwoke ọzọ.” 25 Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m. 26 Kpọnye m ndị nwunye m, ndị m ji nʼihi ha gbara gị odibo, ha na ụmụ m, ka m lakwaa. Ị maara otu m siri gbaara gị odibo. Kpọnye m ha ka m duru ha laghachi ebe m si bịa.” 27 Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụrụ na m achọtala amara nʼihu gị biko nọdụ, nʼihi na esi m nʼịgba afa chọpụta na ONYENWE ANYỊ agọziela m nʼihi gị.” 28 Leban sịrị, “Kwuo ego ole ị chọrọ ka m kwụọ gị, aga m akwụ ya.” 29 Jekọb zara sị Leban, “Gị onwe gị maara otu m si gbara gị odibo na ihe mere igwe anụ ụlọ gị ndị m lekọtara. 30 Nʼihi na ole na ole ka i nwere mgbe m bịara, ma ugbu a, ha abaala ụba nke ukwuu. ONYENWE ANYỊ esitela nʼụkwụ m gọzie gị. Ugbu a, kedụ mgbe m ga-arụkwanụ ọrụ nke mụ onwe m maka ezinaụlọ m?” 31 Leban jụrụ Jekọb sị, “Kedụ ihe m ga-enye gị?”Jekọb gwara ya sị, “Enyela m ihe ọbụla, kama o nwere otu ihe m chọrọ ka i mee. Ọ bụrụ na i mee ya, aga m alaghachi ilekọta igwe anụ ụlọ gị. 32 Kwere ka m jegharịa nʼetiti igwe anụ ụlọ gị, ka m họpụta site nʼetiti igwe atụrụ gị ndị niile tụrụ agwa agwa, na ụmụ atụrụ niile dị oji, na ewu niile tụrụ agwa agwa. Atụrụ na ewu ndị a niile m ga-ahọpụta ga-abụ ụgwọ ọrụ m. 33 Ezi omume m ga-azara nʼọdịnihu, mgbe ọbụla ị bịara nyochaa ụgwọ ọrụ ị kwụrụ m. Ewu ọbụla na-atụghị agwa agwa, maọbụ atụrụ ọbụla na-ejighị oji ị chọpụtara nʼetiti igwe ewu na atụrụ nke m ka a ga-agụ dị ka ihe e zuru nʼohi.” 34 Leban zara sị ya, “Ọ dị mma. Ya dịrị dịka i kwuru.” 35 Nʼotu ụbọchị ahụ, ọ họpụtachara mkpi niile tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nne ewu niile ndị nwere tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nke ọbụla nwere ajị ọcha nʼahụ ya. Ọ họpụtakwara atụrụ ojii niile, nyefee ha nʼaka ụmụ ya ka ha lekọtaa ha. 36 Leban jere ije abalị atọ nke kewapụrụ ha site nʼebe Jekọb nọ. Ma Jekọb nọgidere na-elekọta igwe anụ ụlọ Leban ndị ọzọ. 37 Mgbe ahụ Jekọb gara gbute ngalaba osisi pọpla, na osisi alụmọnd, na osisi plenụ, kpechapụ ahụ agbụgbọ osisi ndị a, si otu a mee ka ime ime ngalaba osisi ndị a dị ọcha pụta ìhè. 38 Ọ tọgbọrọ osisi ndị a o kpechapụtara nʼebe ewu na atụrụ ndị a na-aṅụ mmiri, ka ha cherịta ịhụ ebe igwe anụ ụlọ ndị a nọ mgbe ọbụla ha na-aṅụ mmiri. Nke a mere mgbe igwe anụ ụlọ ndị a na-enwe ekpomọkụ nke ịgba ibe ha, nʼoge ha bịara ịṅụ mmiri, 39 ọ bụ nʼihu ngalaba osisi ndị a ka ha na-anọ na-agba onwe ha. Mgbe anụ ụlọ ndị a mụrụ ụmụ, ahụ ụmụ ha na-atụ agwa agwa maọbụ nwe ntụpọ. 40 Jekọb na-edo ụmụ igwe ewu na atụrụ ndị a nʼotu akụkụ, ma ọ na-eme ka anụ ụlọ ndị ọzọ chee ihu ha nʼanụ ụlọ Leban ndị tụrụ agwa agwa, maọbụ na-eji oji. Nʼụzọ dị otu a, ọ kewapụtaara onwe ya anụ ụlọ nke ya. O tinyekọtaghị ha nʼanụ ụlọ Leban. 41 Mgbe ọbụla nne anụ ụlọ ndị ahụ siri ike nọ nʼọnọdụ ịtụrụ ime, Jekọb na-edobe ngalaba osisi ndị ahụ nʼakụkụ ebe ha na-aṅụ mmiri nʼihu ha, ka ha nọrọ nʼebe ahụ gbaa onwe ha. 42 Ma ọ bụrụ na anụ ụlọ ndị ahụ adịghị ike, Jekọb anaghị edebe osisi ndị a nʼihu ha. Ya mere, igwe ewu na atụrụ ndị na-esighị ike gaara Leban. Ma ndị siri ike gaara Jekọb. 43 Site nʼụzọ dị otu a, Jekọb ghọrọ onye nwere akụ hie nne. O nwekwara ọtụtụ igwe anụ ụlọ na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi nwoke na nwanyị, na ọtụtụ ịnyịnya kamel, na ọtụtụ ịnyịnya ibu ndị ọzọ.

In Other Versions

Genesis 30 in the ANGEFD

Genesis 30 in the ANTPNG2D

Genesis 30 in the AS21

Genesis 30 in the BAGH

Genesis 30 in the BBPNG

Genesis 30 in the BBT1E

Genesis 30 in the BDS

Genesis 30 in the BEV

Genesis 30 in the BHAD

Genesis 30 in the BIB

Genesis 30 in the BLPT

Genesis 30 in the BNT

Genesis 30 in the BNTABOOT

Genesis 30 in the BNTLV

Genesis 30 in the BOATCB

Genesis 30 in the BOATCB2

Genesis 30 in the BOBCV

Genesis 30 in the BOCNT

Genesis 30 in the BOECS

Genesis 30 in the BOGWICC

Genesis 30 in the BOHCB

Genesis 30 in the BOHCV

Genesis 30 in the BOHLNT

Genesis 30 in the BOHNTLTAL

Genesis 30 in the BOILNTAP

Genesis 30 in the BOITCV

Genesis 30 in the BOKCV

Genesis 30 in the BOKCV2

Genesis 30 in the BOKHWOG

Genesis 30 in the BOKSSV

Genesis 30 in the BOLCB

Genesis 30 in the BOLCB2

Genesis 30 in the BOMCV

Genesis 30 in the BONAV

Genesis 30 in the BONCB

Genesis 30 in the BONLT

Genesis 30 in the BONUT2

Genesis 30 in the BOPLNT

Genesis 30 in the BOSCB

Genesis 30 in the BOSNC

Genesis 30 in the BOTLNT

Genesis 30 in the BOVCB

Genesis 30 in the BOYCB

Genesis 30 in the BPBB

Genesis 30 in the BPH

Genesis 30 in the BSB

Genesis 30 in the CCB

Genesis 30 in the CUV

Genesis 30 in the CUVS

Genesis 30 in the DBT

Genesis 30 in the DGDNT

Genesis 30 in the DHNT

Genesis 30 in the DNT

Genesis 30 in the ELBE

Genesis 30 in the EMTV

Genesis 30 in the ESV

Genesis 30 in the FBV

Genesis 30 in the FEB

Genesis 30 in the GGMNT

Genesis 30 in the GNT

Genesis 30 in the HARY

Genesis 30 in the HNT

Genesis 30 in the IRVA

Genesis 30 in the IRVB

Genesis 30 in the IRVG

Genesis 30 in the IRVH

Genesis 30 in the IRVK

Genesis 30 in the IRVM

Genesis 30 in the IRVM2

Genesis 30 in the IRVO

Genesis 30 in the IRVP

Genesis 30 in the IRVT

Genesis 30 in the IRVT2

Genesis 30 in the IRVU

Genesis 30 in the ISVN

Genesis 30 in the JSNT

Genesis 30 in the KAPI

Genesis 30 in the KBT1ETNIK

Genesis 30 in the KBV

Genesis 30 in the KJV

Genesis 30 in the KNFD

Genesis 30 in the LBA

Genesis 30 in the LBLA

Genesis 30 in the LNT

Genesis 30 in the LSV

Genesis 30 in the MAAL

Genesis 30 in the MBV

Genesis 30 in the MBV2

Genesis 30 in the MHNT

Genesis 30 in the MKNFD

Genesis 30 in the MNG

Genesis 30 in the MNT

Genesis 30 in the MNT2

Genesis 30 in the MRS1T

Genesis 30 in the NAA

Genesis 30 in the NASB

Genesis 30 in the NBLA

Genesis 30 in the NBS

Genesis 30 in the NBVTP

Genesis 30 in the NET2

Genesis 30 in the NIV11

Genesis 30 in the NNT

Genesis 30 in the NNT2

Genesis 30 in the NNT3

Genesis 30 in the PDDPT

Genesis 30 in the PFNT

Genesis 30 in the RMNT

Genesis 30 in the SBIAS

Genesis 30 in the SBIBS

Genesis 30 in the SBIBS2

Genesis 30 in the SBICS

Genesis 30 in the SBIDS

Genesis 30 in the SBIGS

Genesis 30 in the SBIHS

Genesis 30 in the SBIIS

Genesis 30 in the SBIIS2

Genesis 30 in the SBIIS3

Genesis 30 in the SBIKS

Genesis 30 in the SBIKS2

Genesis 30 in the SBIMS

Genesis 30 in the SBIOS

Genesis 30 in the SBIPS

Genesis 30 in the SBISS

Genesis 30 in the SBITS

Genesis 30 in the SBITS2

Genesis 30 in the SBITS3

Genesis 30 in the SBITS4

Genesis 30 in the SBIUS

Genesis 30 in the SBIVS

Genesis 30 in the SBT

Genesis 30 in the SBT1E

Genesis 30 in the SCHL

Genesis 30 in the SNT

Genesis 30 in the SUSU

Genesis 30 in the SUSU2

Genesis 30 in the SYNO

Genesis 30 in the TBIAOTANT

Genesis 30 in the TBT1E

Genesis 30 in the TBT1E2

Genesis 30 in the TFTIP

Genesis 30 in the TFTU

Genesis 30 in the TGNTATF3T

Genesis 30 in the THAI

Genesis 30 in the TNFD

Genesis 30 in the TNT

Genesis 30 in the TNTIK

Genesis 30 in the TNTIL

Genesis 30 in the TNTIN

Genesis 30 in the TNTIP

Genesis 30 in the TNTIZ

Genesis 30 in the TOMA

Genesis 30 in the TTENT

Genesis 30 in the UBG

Genesis 30 in the UGV

Genesis 30 in the UGV2

Genesis 30 in the UGV3

Genesis 30 in the VBL

Genesis 30 in the VDCC

Genesis 30 in the YALU

Genesis 30 in the YAPE

Genesis 30 in the YBVTP

Genesis 30 in the ZBP