Genesis 42 (BOICB)

1 Ugbu a, Jekọb nụrụ na ọka dị nʼIjipt. Ọ sịrị ụmụ ya, “Kedụ ihe anyị jiri nọrọ na-elerịta onwe anyị anya” 2 Ọ sịrị, “Lee anụrụ m na ọka dị nʼIjipt. Gbadatanụ nʼebe ahụ zụtara anyị ọka ka anyị dị ndụ ghara ịnwụ.” 3 Ụmụnne Josef iri ndị ahụ gbadara Ijipt ịzụta ọka. 4 Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin nwanne nta Josef soro ha gaa, nʼihi na ọ tụrụ egwu na ihe ndaba ọjọọ nwere ike ịbịakwasị ya. 5 Otu a, ụmụ Izrel so nʼọtụtụ ndị ọzọ ndị jekwara ịzụrụ nri nʼIjipt, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Kenan. 6 Nʼoge a, Josef na-achị ala Ijipt, bụrụkwa onye iresi ndị obodo ọka dị nʼaka. Ya mere, mgbe ụmụnne Josef rutere, ha bịara hulata kpọọ isiala nye Josef. 7 Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ndị ha bụ. Ma ọ kpara agwa dịka onye na-amaghị ha, gwa ha okwu nʼolu ike, sị ha, “Ebee ka unu si bịa?”Ha zara, “Anyị si ala Kenan bịa. Anyị bịara ịzụrụ nri.” 8 Josef matara ụmụnne ya, ma ha onwe ha amataghị onye ọ bụ. 9 Josef chetakwara nrọ ndị ahụ ọ rọrọ banyere ha. Ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu bụ ndị nnyocha. Ịchọpụta adịghị ike ala anyị mere unu ji bịa.” 10 Ha zara sị, “Nna anyị ukwu, anyị bụ ndị ohu gị bịara ịzụrụ nri. 11 Anyị niile bụ ụmụ otu nna. Ndị ohu gị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Anyị abụghị ndị nnyopụta.” 12 Ma Josef gwara ha sị, “Mba! Unu bịara ịchọpụta akụkụ obodo anyị nke a na-echezighị nke ọma.” 13 Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ. Ọ bụkwa otu nna mụrụ anyị niile. Nna anyị na nwanne anyị nta, onye ikpeazụ ọ mụrụ nọ na Kenan ugbu a. Ma otu onye nʼime anyị anwụọla.” 14 Josef sịrị, “Ihe unu na-akọ na-egosi na unu bụ ndị nnyopụta, dịka m gwara unu. 15 Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a. 16 Zipụnụ otu onye nʼime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu nwoke. Ma aga m etinye ndị fọdụrụ nʼụlọ mkpọrọ, tutu m chọpụta ma ihe unu kwuru ọ bụ eziokwu maọbụ ụgha. Ọ bụrụ ụgha nʼezie, dịka Fero na-adị ndụ, unu bụ ndị nnyopụta.” 17 O tinyere ha niile nʼụlọ mkpọrọ, hapụ ha nʼebe ahụ abalị atọ. 18 Josef gwara ha, nʼụbọchị nke atọ, “Nke a bụ ihe unu ga-eme ma dị ndụ, nʼihi na abụ m onye na-atụ egwu Chineke. 19 Ọ bụrụ na unu bụ ndị ezi mmadụ, ka otu onye nʼime unu nọdụ nʼebe a, nʼụlọ mkpọrọ, ka ndị fọdụrụ buru ọka bulaara ndị ezinaụlọ unu nọ nʼagụụ. 20 Ma kpọtaranụ m nwanne unu nke nta nʼebe a, nke a ga-egosi na okwu unu bụ eziokwu, na unu agaghịkwa anwụ.” Ha mere otu a. 21 Ha gwarịtara onwe ha okwu sị, “Nʼezie, ọ bụ nʼihi nwanne anyị nwoke ka ahụhụ ndị a ji abịakwasị anyị. Anyị hụrụ obi mgbawa ya, mgbe ọ na-arịọ ka anyị chebe ndụ ya, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ nke a mere mmekpa ahụ ndị a ji bịakwasị anyị ugbu a.” 22 Ruben zara sị ha, “Ọ bụ na mụ agwaghị unu sị unu hapụ imejọ nwantakịrị ahụ, ma unu egeghị ntị? Ugbu a, anyị na-asa ajụjụ banyere ọbara ya.” 23 Ha amataghị na Josef na-anụ ihe ha na-ekwu, nʼihi na onye nsụgharị okwu nọ nʼetiti ha. 24 O sitere nʼebe ha nọ tụgharịa gaa kwaa akwa. Ọ lọghachikwutere ha ọzọ gwakwa ha okwu. O si nʼetiti ha kpọpụta Simiọn kee ya agbụ ka ha na-ele ya anya. 25 Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka nʼakpa ha, tinyekwara onye ọbụla ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Ọ nyere iwu ka e nye ha ihe ha ga-eri nʼụzọ. Mgbe e mesịrị ihe ndị a, 26 ha bokwasịrị ịnyịnya ibu akpa ọka ha nʼotu nʼotu. Ha hapụrụ Ijipt lawa. 27 Mgbe ha ruru ebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, otu nʼime ha meghere akpa ya ka o nye ịnyịnya ibu ya ọka, ọ hụrụ ego ya nʼọnụ akpa ya. 28 Ọ gwara ụmụnne ya sị, “Lee, e tighachiri ego m kwụrụ. Lee ya nʼakpa ọka m.”Ike gwụrụ onye ọbụla nʼime ha. Site nʼahụ ịma jijiji ha lerịtara onwe ha anya sị, “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?” 29 Mgbe ha lakwutere nna ha Jekọb nʼala Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile dakwasịrị ha. Ha gwara ya sị, 30 “Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha. 31 Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo. 32 Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’ 33 “Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu. 34 Ma kpọtara m nwanne unu nke nta. Mgbe ahụ ka m ga-ama ihe unu bụ. Ma unu bụ ndị nnyopụta maọbụ ndị ezi mmadụ. Mgbe ahụ, aga m ahapụrụ unu nwanne unu. Unu ga na-azụkwa ahịa nʼala a.’ ” 35 Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu. 36 Ya mere, nna ha Jekọb gwara ha sị, “Unu agbawala m aka ụmụ. Josef anọghị, Simiọn anọkwaghị. Ma unu na-achọ iwezuga Benjamin. Naanị m ka ihe niile ndị a na-emegide!” 37 Mgbe ahụ, Ruben gwara nna ya sị, “I nwere ike gbuo ụmụ m ndị ikom abụọ ma ọ bụrụ na m akpọghachighị Benjamin. Tifee ya nʼaka m, aga m akpọghachikwara gị ya.” 38 Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.”

In Other Versions

Genesis 42 in the ANGEFD

Genesis 42 in the ANTPNG2D

Genesis 42 in the AS21

Genesis 42 in the BAGH

Genesis 42 in the BBPNG

Genesis 42 in the BBT1E

Genesis 42 in the BDS

Genesis 42 in the BEV

Genesis 42 in the BHAD

Genesis 42 in the BIB

Genesis 42 in the BLPT

Genesis 42 in the BNT

Genesis 42 in the BNTABOOT

Genesis 42 in the BNTLV

Genesis 42 in the BOATCB

Genesis 42 in the BOATCB2

Genesis 42 in the BOBCV

Genesis 42 in the BOCNT

Genesis 42 in the BOECS

Genesis 42 in the BOGWICC

Genesis 42 in the BOHCB

Genesis 42 in the BOHCV

Genesis 42 in the BOHLNT

Genesis 42 in the BOHNTLTAL

Genesis 42 in the BOILNTAP

Genesis 42 in the BOITCV

Genesis 42 in the BOKCV

Genesis 42 in the BOKCV2

Genesis 42 in the BOKHWOG

Genesis 42 in the BOKSSV

Genesis 42 in the BOLCB

Genesis 42 in the BOLCB2

Genesis 42 in the BOMCV

Genesis 42 in the BONAV

Genesis 42 in the BONCB

Genesis 42 in the BONLT

Genesis 42 in the BONUT2

Genesis 42 in the BOPLNT

Genesis 42 in the BOSCB

Genesis 42 in the BOSNC

Genesis 42 in the BOTLNT

Genesis 42 in the BOVCB

Genesis 42 in the BOYCB

Genesis 42 in the BPBB

Genesis 42 in the BPH

Genesis 42 in the BSB

Genesis 42 in the CCB

Genesis 42 in the CUV

Genesis 42 in the CUVS

Genesis 42 in the DBT

Genesis 42 in the DGDNT

Genesis 42 in the DHNT

Genesis 42 in the DNT

Genesis 42 in the ELBE

Genesis 42 in the EMTV

Genesis 42 in the ESV

Genesis 42 in the FBV

Genesis 42 in the FEB

Genesis 42 in the GGMNT

Genesis 42 in the GNT

Genesis 42 in the HARY

Genesis 42 in the HNT

Genesis 42 in the IRVA

Genesis 42 in the IRVB

Genesis 42 in the IRVG

Genesis 42 in the IRVH

Genesis 42 in the IRVK

Genesis 42 in the IRVM

Genesis 42 in the IRVM2

Genesis 42 in the IRVO

Genesis 42 in the IRVP

Genesis 42 in the IRVT

Genesis 42 in the IRVT2

Genesis 42 in the IRVU

Genesis 42 in the ISVN

Genesis 42 in the JSNT

Genesis 42 in the KAPI

Genesis 42 in the KBT1ETNIK

Genesis 42 in the KBV

Genesis 42 in the KJV

Genesis 42 in the KNFD

Genesis 42 in the LBA

Genesis 42 in the LBLA

Genesis 42 in the LNT

Genesis 42 in the LSV

Genesis 42 in the MAAL

Genesis 42 in the MBV

Genesis 42 in the MBV2

Genesis 42 in the MHNT

Genesis 42 in the MKNFD

Genesis 42 in the MNG

Genesis 42 in the MNT

Genesis 42 in the MNT2

Genesis 42 in the MRS1T

Genesis 42 in the NAA

Genesis 42 in the NASB

Genesis 42 in the NBLA

Genesis 42 in the NBS

Genesis 42 in the NBVTP

Genesis 42 in the NET2

Genesis 42 in the NIV11

Genesis 42 in the NNT

Genesis 42 in the NNT2

Genesis 42 in the NNT3

Genesis 42 in the PDDPT

Genesis 42 in the PFNT

Genesis 42 in the RMNT

Genesis 42 in the SBIAS

Genesis 42 in the SBIBS

Genesis 42 in the SBIBS2

Genesis 42 in the SBICS

Genesis 42 in the SBIDS

Genesis 42 in the SBIGS

Genesis 42 in the SBIHS

Genesis 42 in the SBIIS

Genesis 42 in the SBIIS2

Genesis 42 in the SBIIS3

Genesis 42 in the SBIKS

Genesis 42 in the SBIKS2

Genesis 42 in the SBIMS

Genesis 42 in the SBIOS

Genesis 42 in the SBIPS

Genesis 42 in the SBISS

Genesis 42 in the SBITS

Genesis 42 in the SBITS2

Genesis 42 in the SBITS3

Genesis 42 in the SBITS4

Genesis 42 in the SBIUS

Genesis 42 in the SBIVS

Genesis 42 in the SBT

Genesis 42 in the SBT1E

Genesis 42 in the SCHL

Genesis 42 in the SNT

Genesis 42 in the SUSU

Genesis 42 in the SUSU2

Genesis 42 in the SYNO

Genesis 42 in the TBIAOTANT

Genesis 42 in the TBT1E

Genesis 42 in the TBT1E2

Genesis 42 in the TFTIP

Genesis 42 in the TFTU

Genesis 42 in the TGNTATF3T

Genesis 42 in the THAI

Genesis 42 in the TNFD

Genesis 42 in the TNT

Genesis 42 in the TNTIK

Genesis 42 in the TNTIL

Genesis 42 in the TNTIN

Genesis 42 in the TNTIP

Genesis 42 in the TNTIZ

Genesis 42 in the TOMA

Genesis 42 in the TTENT

Genesis 42 in the UBG

Genesis 42 in the UGV

Genesis 42 in the UGV2

Genesis 42 in the UGV3

Genesis 42 in the VBL

Genesis 42 in the VDCC

Genesis 42 in the YALU

Genesis 42 in the YAPE

Genesis 42 in the YBVTP

Genesis 42 in the ZBP