Judges 16 (BOICB)

1 Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị. 2 A gwara ndị Gaza sị, “Samsin nọ nʼobodo a.” Nʼihi ya, ha gbara ebe ahụ gburugburu ma nọdụ na-eche nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ abalị niile. Ọ dịghị ihe ha mere nʼabalị ahụ nʼihi na ha zubere sị, “Mgbe chi bọrọ, anyị ga-egbu ya.” 3 Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu. 4 Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek. 5 Ndị eze ndị Filistia, bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.” 6 Nʼihi nke a, Delaịla gwara Samsin okwu sị ya, “Gwa m ebe ike gị si abịa. Gwakwa m otu mmadụ pụrụ isi kee gị agbụ, merie gị.” 7 Mgbe ahụ, Samsin zara sị ya, “Ọ bụrụ na mmadụ e jiri akwara eriri asaa dị ọhụrụ, ndị a na-amịkpọghị amịkpọ kee m, m ga-abụkwa onye na-adịghị ike dịka mmadụ ọbụla ọzọ.” 8 Ngwangwa, ndịisi ndị Filistia wetara ya eriri asaa dị ọhụrụ ndị a na-amịbeghị nʼanwụ, o weere ha kee Samsin. 9 Ma o mere ka ụfọdụ ndị ikom Filistia zoo onwe ha nʼotu akụkụ ụlọ ya. O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị!” Otu mgbe ahụ kwa, Samsin biliri dọbisie eriri ahụ dịka ọ bụ eriri e ji ogho mee nke bịara ọkụ nso. Ya mere, a chọpụtaghị ebe ike Samsin si abịa. 10 Emesịa, Delaịla gwara Samsin sị ya, “Lee, ị kwaala m emo, ghaara m ụgha. Biko, gwa m ụzọ a ga-esi kee gị agbụ.” 11 Samsin zara sị ya, “Lee, ọ bụrụ na e jiri ụdọ ọhụrụ nke a na-ejibeghị kee ihe mgbe ọbụla, kee m, aga m adịkwa dịka ndị ọzọ.” 12 Ya mere, Delaịla chịkọtara ụdọ ọhụrụ jiri ya kee ya nke ọma. Ma ụfọdụ ndị ikom Filistia zokwara onwe ha nʼime ime ụlọ ahụ. Ọzọkwa, Delaịla tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin biliri dọbisie eriri ahụ e ji kee ya ka a ga-asị na ọ bụ ogho ka e ji mee ha. 13 Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya sị, “Lee, ị na-eme ka abụ m onye nzuzu, ghaara m ụgha. Gwa m eziokwu, otu a ga-esi kee gị agbụ.”Samsin zara sị ya, “Lee, e kewara agịrị isi dị m nʼisi ụzọ asaa, i were ụzọ nkekọta asaa e kekọtara agịrị isi m, kpanyekọtaa ha nʼihe i ji ekwe akwa, were ntu osisi i ji akpachi akwa kpachie ya, mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.” Mgbe Samsin rahụrụ ụra, Delaịla weere agịrị isi Samsin kpanyekọtaa ya nʼihe o ji ekwe akwa. 14 O jikwa ǹtu osisi o ji akpachi akwa, kpachikọtasie agịrị isi Samsin ike.Ọzọ, Delaịla sịrị ya, “Samsin, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin bilitere nʼike fokọrọ ǹtu osisi ahụ, na ihe eji akpa akwa, na akwa akpara akpa. 15 Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya okwu sị, “Olee ka i si kwuo na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọ bụ na i nweghị ike ịgwa m ihe dị gị nʼobi? Lee, ugbo atọ ndị a, i mere m ka m dịka onye nzuzu, ma ị gwabeghị m ebe ike gị dị ruo ugbu a.” 16 Delaịla sikwara otu a nyegide Samsin nsogbu tutu ruo mgbe Samsin na-enweghịkwa ike ịnagide nsogbu ya. 17 Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.” 18 Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha. 19 Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya. 20 O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.”Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na ONYENWE ANYỊ ahapụla ya. 21 Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya. 22 Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ. 23 Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn, aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.” 24 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị,“Chi anyị enyela onye iro anyịnʼaka anyị,onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefugbukwaa ọtụtụ ndị anyị.” 25 Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu.Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị. 26 Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.” 27 Nʼoge a, mmadụ ejupụtala nʼime ụlọ ahụ, nwoke na nwanyị; ndịisi ọchịchị ndị Filistia nọkwa nʼebe ahụ. Ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru puku atọ, nwoke na nwanyị, nọ nʼelu ụlọ ahụ na-ele Samsin, ebe ọ na-emere ha ihe ọchị. 28 Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ ONYENWE ANYỊ arịrịọ sị, “O! Onyenwe m ONYENWE ANYỊ, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ.” 29 Mgbe ahụ, Samsin jidesiri ogidi abụọ dị nʼetiti ụlọ ahụ aka ike, aka nri ya nʼotu, aka ekpe ya na nke ọzọ. 30 Samsin kpere ekpere sị, “Ka m soro ndị Filistia nwụọ!” O ji ike ya niile nuo ogidi ahụ aka. Otu mgbe ahụ kwa, ụlọ arụsị ahụ dara, dakwasị ndịisi ọchịchị Filistia ndị ahụ, na ndị niile nọ nʼime ụlọ ahụ. Ya mere, ndị niile so Samsin nwụọ nʼoge ahụ dị ọtụtụ karịa ndị Samsin gburu mgbe ọ dị ndụ. 31 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụnna ndị ikom Samsin, na ndị ezinaụlọ nna ya bịara nʼebe ahụ, buru ozu ya. Ha liri ya nʼagbata Zora na Eshtaol, ebe e liri nna ya Manoa. Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ.

In Other Versions

Judges 16 in the ANGEFD

Judges 16 in the ANTPNG2D

Judges 16 in the AS21

Judges 16 in the BAGH

Judges 16 in the BBPNG

Judges 16 in the BBT1E

Judges 16 in the BDS

Judges 16 in the BEV

Judges 16 in the BHAD

Judges 16 in the BIB

Judges 16 in the BLPT

Judges 16 in the BNT

Judges 16 in the BNTABOOT

Judges 16 in the BNTLV

Judges 16 in the BOATCB

Judges 16 in the BOATCB2

Judges 16 in the BOBCV

Judges 16 in the BOCNT

Judges 16 in the BOECS

Judges 16 in the BOGWICC

Judges 16 in the BOHCB

Judges 16 in the BOHCV

Judges 16 in the BOHLNT

Judges 16 in the BOHNTLTAL

Judges 16 in the BOILNTAP

Judges 16 in the BOITCV

Judges 16 in the BOKCV

Judges 16 in the BOKCV2

Judges 16 in the BOKHWOG

Judges 16 in the BOKSSV

Judges 16 in the BOLCB

Judges 16 in the BOLCB2

Judges 16 in the BOMCV

Judges 16 in the BONAV

Judges 16 in the BONCB

Judges 16 in the BONLT

Judges 16 in the BONUT2

Judges 16 in the BOPLNT

Judges 16 in the BOSCB

Judges 16 in the BOSNC

Judges 16 in the BOTLNT

Judges 16 in the BOVCB

Judges 16 in the BOYCB

Judges 16 in the BPBB

Judges 16 in the BPH

Judges 16 in the BSB

Judges 16 in the CCB

Judges 16 in the CUV

Judges 16 in the CUVS

Judges 16 in the DBT

Judges 16 in the DGDNT

Judges 16 in the DHNT

Judges 16 in the DNT

Judges 16 in the ELBE

Judges 16 in the EMTV

Judges 16 in the ESV

Judges 16 in the FBV

Judges 16 in the FEB

Judges 16 in the GGMNT

Judges 16 in the GNT

Judges 16 in the HARY

Judges 16 in the HNT

Judges 16 in the IRVA

Judges 16 in the IRVB

Judges 16 in the IRVG

Judges 16 in the IRVH

Judges 16 in the IRVK

Judges 16 in the IRVM

Judges 16 in the IRVM2

Judges 16 in the IRVO

Judges 16 in the IRVP

Judges 16 in the IRVT

Judges 16 in the IRVT2

Judges 16 in the IRVU

Judges 16 in the ISVN

Judges 16 in the JSNT

Judges 16 in the KAPI

Judges 16 in the KBT1ETNIK

Judges 16 in the KBV

Judges 16 in the KJV

Judges 16 in the KNFD

Judges 16 in the LBA

Judges 16 in the LBLA

Judges 16 in the LNT

Judges 16 in the LSV

Judges 16 in the MAAL

Judges 16 in the MBV

Judges 16 in the MBV2

Judges 16 in the MHNT

Judges 16 in the MKNFD

Judges 16 in the MNG

Judges 16 in the MNT

Judges 16 in the MNT2

Judges 16 in the MRS1T

Judges 16 in the NAA

Judges 16 in the NASB

Judges 16 in the NBLA

Judges 16 in the NBS

Judges 16 in the NBVTP

Judges 16 in the NET2

Judges 16 in the NIV11

Judges 16 in the NNT

Judges 16 in the NNT2

Judges 16 in the NNT3

Judges 16 in the PDDPT

Judges 16 in the PFNT

Judges 16 in the RMNT

Judges 16 in the SBIAS

Judges 16 in the SBIBS

Judges 16 in the SBIBS2

Judges 16 in the SBICS

Judges 16 in the SBIDS

Judges 16 in the SBIGS

Judges 16 in the SBIHS

Judges 16 in the SBIIS

Judges 16 in the SBIIS2

Judges 16 in the SBIIS3

Judges 16 in the SBIKS

Judges 16 in the SBIKS2

Judges 16 in the SBIMS

Judges 16 in the SBIOS

Judges 16 in the SBIPS

Judges 16 in the SBISS

Judges 16 in the SBITS

Judges 16 in the SBITS2

Judges 16 in the SBITS3

Judges 16 in the SBITS4

Judges 16 in the SBIUS

Judges 16 in the SBIVS

Judges 16 in the SBT

Judges 16 in the SBT1E

Judges 16 in the SCHL

Judges 16 in the SNT

Judges 16 in the SUSU

Judges 16 in the SUSU2

Judges 16 in the SYNO

Judges 16 in the TBIAOTANT

Judges 16 in the TBT1E

Judges 16 in the TBT1E2

Judges 16 in the TFTIP

Judges 16 in the TFTU

Judges 16 in the TGNTATF3T

Judges 16 in the THAI

Judges 16 in the TNFD

Judges 16 in the TNT

Judges 16 in the TNTIK

Judges 16 in the TNTIL

Judges 16 in the TNTIN

Judges 16 in the TNTIP

Judges 16 in the TNTIZ

Judges 16 in the TOMA

Judges 16 in the TTENT

Judges 16 in the UBG

Judges 16 in the UGV

Judges 16 in the UGV2

Judges 16 in the UGV3

Judges 16 in the VBL

Judges 16 in the VDCC

Judges 16 in the YALU

Judges 16 in the YAPE

Judges 16 in the YBVTP

Judges 16 in the ZBP