Judges 9 (BOICB)

1 Otu ụbọchị, Abimelek nwa Jerub-Baal jekwuuru ụmụnne nne ya ndị ikom bi na Shekem, na ndị ikwu nne ya niile sị ha, 2 “Jekwurunụ ndị Shekem jụọ ha, ‘Kedụ nke kara unu mma: ọ bụ ka ụmụ iri ndị ikom asaa Jerub-Baal mụrụ chịa unu, ka ọ bụ ka otu onye chịa unu?’ Chetakwanụ na mụ na unu bụ otu anụ ahụ na ọbara.” 3 Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị Shekem ihe Abimelek kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.” 4 Ha sitere nʼụlọ arụsị Baal-Berit nye ya iri shekel ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya. 5 Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ. 6 Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel. 7 Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị. 8 Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’ 9 “Ma osisi oliv jụrụ ha ajụjụ sị, ‘O kwesiri ka m hapụ iwepụta mmanụ m a nke a na-esite na ya sọpụrụ Chineke na ụmụ mmadụ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ 10 “Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi fiig ka ọ bụrụ eze ha. 11 “Ma osisi fiig sịrị, ‘Ọ bụrụ na m ekwere na m ga-abụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ 12 “Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi vaịnị ma ọ ga-ekwenye ịbụ eze ha. 13 “Ma osisi vaịnị ahụ zara sị ha, ‘Ọ bụrụ na m ekwere ịbụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi e ji eme mmanya nke na-enye Chineke na ụmụ mmadụ obi ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ 14 “Nʼikpeazụ, osisi niile jekwuuru ogwu ọhịa, ‘Bịa ka ị bụrụ eze anyị.’ 15 “Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na Lebanọn!’ 16 “Ugbu a, omume unu o ziri ezi ma sitekwa nʼezi obi na unu mere Abimelek eze? Mmeso unu mesoro Jerub-Baal na ezinaụlọ ya o ziri ezi? Unu omesoro ya dịka o kwesiri ya? 17 Chetakwanụ na nna m lụrụ ọgụ maka unu, kpọọ ndụ ya ihe efu, nʼihi ịnapụta unu site nʼaka ndị Midia. 18 Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu. 19 Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ. 20 Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.” 21 Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya. 22 Mgbe ọ gasịrị afọ atọ Abimelek bidoro ịchị Izrel, 23 Chineke kpaliri iro dị ukwuu nʼetiti Abimelek na ndị nwe obodo Shekem, nke bụ na ha mere omume ihu abụọ megide Abimelek. 24 Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ Jerub-Baal asaa ahụ nʼisi Abimelek, na ndị Shekem ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya. 25 Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme. 26 Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ. 27 Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara Abimelek. 28 Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe? 29 A sịkwarị na ndị a nọ nʼokpuru ọchịchị m, mgbe ahụ, m ga-ewezuga Abimelek. Aga m asị ya, ‘Kpọpụta ndị agha gị niile.’ ” 30 Mgbe Zebul onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe Gaal nwa Ebed kwuru, o were nnọọ oke iwe. 31 O zigara Abimelek ndị ozi na nzuzo ka ha sị ya, “Gaal nwa Ebed na ndị ikwu ya abịala obodo Shekem. Ha akpaliela obi ndị obodo a niile ka ha megide gị. 32 Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa. 33 Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe Gaal na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.” 34 Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ. 35 Gaal nwa Ebed pụrụ guzo nʼọnụ ama obodo ahụ mgbe Abimelek na ndị ya sitere nʼebe ha zoro onwe ha pụta. 36 Mgbe Gaal hụrụ ha, ọ kpọrọ Zebul si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.”Zebul zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.” 37 Gaal kwukwara okwu sị, “Lee ndị mmadụ si nʼetiti ala ahụ na-arịdata, ndị ọzọ sikwa nʼakụkụ ụzọ ebe osisi iju ase dị.” 38 Mgbe ahụ, Zebul sịrị ya, “Olee uru ọ bara na ị turu ọnụ, gị onye na-asị, ‘Onye bụ Abimelek na anyị ga-efe ya ofufe?’ Ọ bụ ndị a abụghị ndị ahụ ị kọchara? Pụkwuru ha gaa lụso ha ọgụ.” 39 Ya mere, Gaal duuru ndị nwe Shekem pụọ ịlụso Abimelek ọgụ. 40 Ma Abimelek chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ. 41 Abimelek nọgidere nʼAruma nʼoge ahụ. Ma Zebul chụpụrụ Gaal na ndị ikwu ya site na Shekem. 42 Nʼechi ya, ndị Shekem pụtara baa nʼọhịa. E mere ka Abimelek mara nke a. 43 Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha. 44 Abimelek na usuu ndị agha so ya mapụtara, gbara ọsọ were ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Emesịa, ụzọ abụọ nʼime ụzọ atọ nke ndị agha na-eso ya chere ihu nʼọhịa gbuo ndị ahụ niile nọ nʼebe ahụ. 45 Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile. 46 Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit. 47 Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ, 48 ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.” 49 Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro Abimelek. Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu Shekem, nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ. 50 Ọzọ, Abimelek gara obodo Tebez lụso ya agha, merie ya. 51 Ma e nwere nʼime obodo ahụ, otu ụlọ elu e wusiri ike, ebe ndị obodo ahụ niile, nwoke na nwanyị, gbabanyere. Ha kpọchidoro onwe ha ụzọ, rigoro nʼelu ụlọ ahụ. 52 Abimelek gara nʼụlọ elu ahụ ibuso ya agha. Ma mgbe ọ na-abịaru ọnụ ụzọ ama ụlọ elu ahụ isunye ya ọkụ, 53 otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya. 54 Ngwangwa, Abimelek kpọrọ onye na-ebu ihe agha ya sị ya, “Sepụta mma agha gị jiri ya gbuo m, ka ndị mmadụ ghara ị sị banyere m, ‘Ọ bụ nwanyị gburu ya.’ ” Ya mere nwokorobịa ahụ were mma agha ya dụgbuo ya, ọ nwụkwara. 55 Mgbe ndị Izrel hụrụ na Abimelek anwụọla, ha niile lara nʼụlọ ha. 56 Otu a ka Chineke si kwụghachi Abimelek ihe ọjọọ o mere megide nna ya site nʼigbu iri ụmụnna ya asaa. 57 Chineke mekwara ka ndị Shekem nata ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ ha. Ọbụbụ ọnụ Jotam nwa Jerub-Baal mezukwara nʼisi ha.

In Other Versions

Judges 9 in the ANGEFD

Judges 9 in the ANTPNG2D

Judges 9 in the AS21

Judges 9 in the BAGH

Judges 9 in the BBPNG

Judges 9 in the BBT1E

Judges 9 in the BDS

Judges 9 in the BEV

Judges 9 in the BHAD

Judges 9 in the BIB

Judges 9 in the BLPT

Judges 9 in the BNT

Judges 9 in the BNTABOOT

Judges 9 in the BNTLV

Judges 9 in the BOATCB

Judges 9 in the BOATCB2

Judges 9 in the BOBCV

Judges 9 in the BOCNT

Judges 9 in the BOECS

Judges 9 in the BOGWICC

Judges 9 in the BOHCB

Judges 9 in the BOHCV

Judges 9 in the BOHLNT

Judges 9 in the BOHNTLTAL

Judges 9 in the BOILNTAP

Judges 9 in the BOITCV

Judges 9 in the BOKCV

Judges 9 in the BOKCV2

Judges 9 in the BOKHWOG

Judges 9 in the BOKSSV

Judges 9 in the BOLCB

Judges 9 in the BOLCB2

Judges 9 in the BOMCV

Judges 9 in the BONAV

Judges 9 in the BONCB

Judges 9 in the BONLT

Judges 9 in the BONUT2

Judges 9 in the BOPLNT

Judges 9 in the BOSCB

Judges 9 in the BOSNC

Judges 9 in the BOTLNT

Judges 9 in the BOVCB

Judges 9 in the BOYCB

Judges 9 in the BPBB

Judges 9 in the BPH

Judges 9 in the BSB

Judges 9 in the CCB

Judges 9 in the CUV

Judges 9 in the CUVS

Judges 9 in the DBT

Judges 9 in the DGDNT

Judges 9 in the DHNT

Judges 9 in the DNT

Judges 9 in the ELBE

Judges 9 in the EMTV

Judges 9 in the ESV

Judges 9 in the FBV

Judges 9 in the FEB

Judges 9 in the GGMNT

Judges 9 in the GNT

Judges 9 in the HARY

Judges 9 in the HNT

Judges 9 in the IRVA

Judges 9 in the IRVB

Judges 9 in the IRVG

Judges 9 in the IRVH

Judges 9 in the IRVK

Judges 9 in the IRVM

Judges 9 in the IRVM2

Judges 9 in the IRVO

Judges 9 in the IRVP

Judges 9 in the IRVT

Judges 9 in the IRVT2

Judges 9 in the IRVU

Judges 9 in the ISVN

Judges 9 in the JSNT

Judges 9 in the KAPI

Judges 9 in the KBT1ETNIK

Judges 9 in the KBV

Judges 9 in the KJV

Judges 9 in the KNFD

Judges 9 in the LBA

Judges 9 in the LBLA

Judges 9 in the LNT

Judges 9 in the LSV

Judges 9 in the MAAL

Judges 9 in the MBV

Judges 9 in the MBV2

Judges 9 in the MHNT

Judges 9 in the MKNFD

Judges 9 in the MNG

Judges 9 in the MNT

Judges 9 in the MNT2

Judges 9 in the MRS1T

Judges 9 in the NAA

Judges 9 in the NASB

Judges 9 in the NBLA

Judges 9 in the NBS

Judges 9 in the NBVTP

Judges 9 in the NET2

Judges 9 in the NIV11

Judges 9 in the NNT

Judges 9 in the NNT2

Judges 9 in the NNT3

Judges 9 in the PDDPT

Judges 9 in the PFNT

Judges 9 in the RMNT

Judges 9 in the SBIAS

Judges 9 in the SBIBS

Judges 9 in the SBIBS2

Judges 9 in the SBICS

Judges 9 in the SBIDS

Judges 9 in the SBIGS

Judges 9 in the SBIHS

Judges 9 in the SBIIS

Judges 9 in the SBIIS2

Judges 9 in the SBIIS3

Judges 9 in the SBIKS

Judges 9 in the SBIKS2

Judges 9 in the SBIMS

Judges 9 in the SBIOS

Judges 9 in the SBIPS

Judges 9 in the SBISS

Judges 9 in the SBITS

Judges 9 in the SBITS2

Judges 9 in the SBITS3

Judges 9 in the SBITS4

Judges 9 in the SBIUS

Judges 9 in the SBIVS

Judges 9 in the SBT

Judges 9 in the SBT1E

Judges 9 in the SCHL

Judges 9 in the SNT

Judges 9 in the SUSU

Judges 9 in the SUSU2

Judges 9 in the SYNO

Judges 9 in the TBIAOTANT

Judges 9 in the TBT1E

Judges 9 in the TBT1E2

Judges 9 in the TFTIP

Judges 9 in the TFTU

Judges 9 in the TGNTATF3T

Judges 9 in the THAI

Judges 9 in the TNFD

Judges 9 in the TNT

Judges 9 in the TNTIK

Judges 9 in the TNTIL

Judges 9 in the TNTIN

Judges 9 in the TNTIP

Judges 9 in the TNTIZ

Judges 9 in the TOMA

Judges 9 in the TTENT

Judges 9 in the UBG

Judges 9 in the UGV

Judges 9 in the UGV2

Judges 9 in the UGV3

Judges 9 in the VBL

Judges 9 in the VDCC

Judges 9 in the YALU

Judges 9 in the YAPE

Judges 9 in the YBVTP

Judges 9 in the ZBP