Jeremiah 25 (BOICB)

1 Okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juda niile, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị eze Jehoiakim, nwa Josaya na Juda. Ọ bụkwa nʼafọ nke mbụ nke ọchịchị eze Nebukadneza na Babilọn. 2 Ya mere, ihe ndị a ka Jeremaya, bụ onye amụma gwara ndị Juda na ndị niile bi na Jerusalem: 3 Kemgbe afọ iri abụọ na atọ, sitekwa nʼafọ iri na atọ nke ọchịchị eze Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda ruo taa, ka okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, a gwara m unu okwu, mgbe na mgbe, ma unu jụrụ ige ntị nʼihe m gwara unu. 4 Ọ bụkwa ezie na ONYENWE ANYỊ eziterela unu ndị ohu ya bụ ndị amụma site nʼoge ruo nʼoge ma unu ajụla ige ntị. Unu jụkwara ịṅa ntị nʼihe ha na-ekwu. 5 Ozi ha ziri unu bụ nke a, “Unu niile nʼotu nʼotu sitenụ nʼụzọ ọjọọ unu na ndụ ọjọọ unu tụgharịa, ka unu nwee ike ibigide nʼala a ONYENWE ANYỊ nyere unu na nna nna unu ha ruo mgbe ebighị ebi. 6 Unu agbasola maọbụ fee, maọbụ kpọọ isiala nye chi ndị ọzọ; unu ejila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, ka m ghara imerụ unu ahụ. 7 “Ma unu jụrụ ige m ntị,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Unu ejirila arụsị unu ji aka unu mee kpasuo m iwe, si otu a wetara onwe unu mmerụ ahụ.” 8 Ya mere, ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile na-asị, “Ebe ọ bụ na unu ajụla ige ntị nʼokwu m. 9 Aga m akpọku ndị ahụ si nʼugwu, ha na ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, “Aga m eme ka ha bịa megide ala a, na ndị bi nʼime ya. Ha ga-emegidekwa mba niile gbara ala a gburugburu. Aga m ebibi ha niile kpamkpam, mee ha ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe a na-elelị. Ha ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi. 10 Aga m emekwa ka olu obi ụtọ na ọṅụ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị na-akwọ ọka, na ìhè nke oriọna na-enye, hapụkwa ịdị nʼime ya. 11 Ala a niile ga-aghọ mkpọmkpọ ebe tọgbọrọ nʼefu, mba ndị a niile ga-ejere eze Babilọn ozi iri afọ asaa. 12 “Ma mgbe iri afọ asaa zuru, aga m ata eze Babilọn na mba ya, bụ ala ndị Babilọn, ahụhụ nʼihi ajọ omume ha,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, “Aga m emekwa ka ala ahụ ghọọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi. 13 Aga m emekwa ka ihe niile m buru ụzọ kwuo megide ala ahụ bịakwasị ya, bụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ a, na ihe niile Jeremaya buru nʼamụma megide mba niile dị iche iche. 14 A ga-eme ka ha ghọọ ndị ohu nye mba dị iche iche na nke ndị eze dị ukwuu. Aga m akwụghachikwa ha dịka omume ha si dị, na dịka akaọrụ ha si dịkwa.” 15 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel gwara m, “Nara m iko a dị m nʼaka, nke a gbajuru mmanya ọnụma m, gaa mee ka mba niile m zigara gị ijekwuru ṅụrụ site na mmanya ọnụma m dị nʼime ya. 16 Mgbe ha ṅụrụ ya, ha ga-adagharị, malitekwa ịyị ara nʼihi mma agha, nke m ga-ezite nʼetiti ha.” 17 Ya mere, esi m nʼaka ONYENWE ANYỊ nara iko ahụ, meekwa ka mba ndị ahụ niile o ziri m ka m jekwuru ṅụrụ ihe dị nʼime ya. 18 Jerusalem na obodo Juda niile, na ndị eze ha, na ndịisi ọchịchị ha, si nʼiko ahụ ṅụrụ ihe dị nʼime ya, nʼihi ime ka e bibie ha, ka ha ghọọ ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ihe a bụrụ ọnụ, dịka ha dị taa. 19 Fero, eze Ijipt, na ndị na-ejere ya ozi, na ndịisi ọchịchị ya, na ndị ya niile, 20 na ndị mba ọzọ niile bi nʼebe ahụ;na ndị eze Uz;na ndị eze ndị Filistia niile, bụ nke ndị Ashkelọn, na Gaza, na Ekrọn, na ndị fọdụrụ nʼime Ashdọd. 21 Ndị eze Edọm, na Moab, na ndị Amọn; 22 na ndị eze Taịa na Saịdọn,na ndị eze obodo ha dị nʼakụkụ osimiri, nke dị nʼofe nke ọzọ; 23 na ala Dedan, na Tema, na Buz, na ndị niile bi nʼebe dị anya. 24 Na ndị eze Arebịa, na ndị eze mba niile ndị ahụ bi nʼọzara; 25 na ndị eze Zimri, na Elam, na Midia; 26 na ndị eze ala dị nʼugwu, na mba dị nso, na mba dị anya, ha niile nʼotu nʼotu, na alaeze niile dị nʼụwa.Mgbe eze ndị a niile ṅụtụrụ site nʼihe dị nʼiko ahụ, eze Sheshak ga-esitekwa na ya ṅụrụ. 27 “Mgbe ahụ, gwakwa ha sị, ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ṅụọnụ, ṅụbiganụ oke; gbọọkwanụ agbọọ, daanụ nʼala ebe unu na-agaghị esi bilitekwa ọzọ, nʼihi mma agha m ga-ezite nʼetiti unu.’ 28 Ọ bụrụ na ha ajụ ịnara gị iko a site na ya ṅụtụ ihe dị ya nʼime, gwa ha sị, ‘Unu ga-aṅụrịrị ya, nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. 29 Lee, ana m amalite ime ka mbibi bịakwasị obodo ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma unu ga-esi aṅaa gbanarị ahụhụ? Unu agaghị agbanarị ahụhụ, nʼihi na ana m enye iwu ka e webata mma agha nʼetiti ndị niile bi nʼụwa. Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’ 30 “Ugbu a buo amụma ndị a niile megide ha, sị ha,“ ‘ONYENWE ANYỊ ga-esi nʼelu bigbọọ;ọ ga-esitekwa nʼebe obibi ya dị nsọ mee ka olu ya daa ụda.Ọ ga-ebigbọsị ike megide ala yaỌ ga-eti mkpu dịka ndị ahụ na-azọcha mkpụrụ vaịnị;ọ ga-eti mkpu megide ndị niile bi nʼụwa. 31 Ụda mkpọtụ ahụ ga-eru na nsọtụ niile nke ụwa,nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-ebo mba niile nke ụwa ebubo.Ọ ga-eme ka ikpe ọmụma rute mmadụ niile,meekwa ka e jiri mma agha bibie ndị ajọ omume.’ ”Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 32 Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,“Lee, mbibi na-agbasasite nʼotu mba na-eru na mba ọzọ;oke ifufe na-abịakwasite na nsọtụ niile nke ụwa.” 33 Nʼoge ahụ, ndị ahụ ONYENWE ANYỊ ga-egbu ga-atọgbọrọ nʼebe niile, site nʼotu nsọtụ nke ụwa ruo na nke ọzọ. A gaghị eli ha, o nwekwaghị onye ga-akwa ha. Kama ha ga-atọgbọrọ nʼala dịka unyi. 34 Kwasienụ akwa ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu akwa;tụrụọnụ onwe unu nʼala, unu ndị ndu nke igwe ewu na atụrụ.Nʼihi na oge a ga-egbu unu eruola,unu ga-adakwa tiwasịa dịka ite aja. 35 Ndị ọzụzụ atụrụ agaghị enwe ebe ha ga-agbaga ọsọ;ndị ndu igwe ewu na atụrụ agaghị enwekwa ebe ha ga-ezo onwe ha. 36 Geenụ ntị ka unu nụrụ ịkwa akwa ndị ọzụzụ atụrụ,geenụ ntị nụrụ mkpu akwa ndị ndu igwe ewu na atụrụ,nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-ebibi ebe ịta nri ha. 37 Ebe mmakpu ọma niile nke anụ ụlọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe,nʼihi oke iwe nke ONYENWE ANYỊ. 38 Ọ ga-apụkwute ha, dịka ọdụm si esi nʼebe ndina ya na-apụta ịchụ anụ ọhịa.Ọ ga-eme ka ala ha ghọọ mkpọmkpọ ebe,nʼihi mma agha nke onye mmegbu,na nʼihi oke iwe ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

Jeremiah 25 in the ANGEFD

Jeremiah 25 in the ANTPNG2D

Jeremiah 25 in the AS21

Jeremiah 25 in the BAGH

Jeremiah 25 in the BBPNG

Jeremiah 25 in the BBT1E

Jeremiah 25 in the BDS

Jeremiah 25 in the BEV

Jeremiah 25 in the BHAD

Jeremiah 25 in the BIB

Jeremiah 25 in the BLPT

Jeremiah 25 in the BNT

Jeremiah 25 in the BNTABOOT

Jeremiah 25 in the BNTLV

Jeremiah 25 in the BOATCB

Jeremiah 25 in the BOATCB2

Jeremiah 25 in the BOBCV

Jeremiah 25 in the BOCNT

Jeremiah 25 in the BOECS

Jeremiah 25 in the BOGWICC

Jeremiah 25 in the BOHCB

Jeremiah 25 in the BOHCV

Jeremiah 25 in the BOHLNT

Jeremiah 25 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 25 in the BOILNTAP

Jeremiah 25 in the BOITCV

Jeremiah 25 in the BOKCV

Jeremiah 25 in the BOKCV2

Jeremiah 25 in the BOKHWOG

Jeremiah 25 in the BOKSSV

Jeremiah 25 in the BOLCB

Jeremiah 25 in the BOLCB2

Jeremiah 25 in the BOMCV

Jeremiah 25 in the BONAV

Jeremiah 25 in the BONCB

Jeremiah 25 in the BONLT

Jeremiah 25 in the BONUT2

Jeremiah 25 in the BOPLNT

Jeremiah 25 in the BOSCB

Jeremiah 25 in the BOSNC

Jeremiah 25 in the BOTLNT

Jeremiah 25 in the BOVCB

Jeremiah 25 in the BOYCB

Jeremiah 25 in the BPBB

Jeremiah 25 in the BPH

Jeremiah 25 in the BSB

Jeremiah 25 in the CCB

Jeremiah 25 in the CUV

Jeremiah 25 in the CUVS

Jeremiah 25 in the DBT

Jeremiah 25 in the DGDNT

Jeremiah 25 in the DHNT

Jeremiah 25 in the DNT

Jeremiah 25 in the ELBE

Jeremiah 25 in the EMTV

Jeremiah 25 in the ESV

Jeremiah 25 in the FBV

Jeremiah 25 in the FEB

Jeremiah 25 in the GGMNT

Jeremiah 25 in the GNT

Jeremiah 25 in the HARY

Jeremiah 25 in the HNT

Jeremiah 25 in the IRVA

Jeremiah 25 in the IRVB

Jeremiah 25 in the IRVG

Jeremiah 25 in the IRVH

Jeremiah 25 in the IRVK

Jeremiah 25 in the IRVM

Jeremiah 25 in the IRVM2

Jeremiah 25 in the IRVO

Jeremiah 25 in the IRVP

Jeremiah 25 in the IRVT

Jeremiah 25 in the IRVT2

Jeremiah 25 in the IRVU

Jeremiah 25 in the ISVN

Jeremiah 25 in the JSNT

Jeremiah 25 in the KAPI

Jeremiah 25 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 25 in the KBV

Jeremiah 25 in the KJV

Jeremiah 25 in the KNFD

Jeremiah 25 in the LBA

Jeremiah 25 in the LBLA

Jeremiah 25 in the LNT

Jeremiah 25 in the LSV

Jeremiah 25 in the MAAL

Jeremiah 25 in the MBV

Jeremiah 25 in the MBV2

Jeremiah 25 in the MHNT

Jeremiah 25 in the MKNFD

Jeremiah 25 in the MNG

Jeremiah 25 in the MNT

Jeremiah 25 in the MNT2

Jeremiah 25 in the MRS1T

Jeremiah 25 in the NAA

Jeremiah 25 in the NASB

Jeremiah 25 in the NBLA

Jeremiah 25 in the NBS

Jeremiah 25 in the NBVTP

Jeremiah 25 in the NET2

Jeremiah 25 in the NIV11

Jeremiah 25 in the NNT

Jeremiah 25 in the NNT2

Jeremiah 25 in the NNT3

Jeremiah 25 in the PDDPT

Jeremiah 25 in the PFNT

Jeremiah 25 in the RMNT

Jeremiah 25 in the SBIAS

Jeremiah 25 in the SBIBS

Jeremiah 25 in the SBIBS2

Jeremiah 25 in the SBICS

Jeremiah 25 in the SBIDS

Jeremiah 25 in the SBIGS

Jeremiah 25 in the SBIHS

Jeremiah 25 in the SBIIS

Jeremiah 25 in the SBIIS2

Jeremiah 25 in the SBIIS3

Jeremiah 25 in the SBIKS

Jeremiah 25 in the SBIKS2

Jeremiah 25 in the SBIMS

Jeremiah 25 in the SBIOS

Jeremiah 25 in the SBIPS

Jeremiah 25 in the SBISS

Jeremiah 25 in the SBITS

Jeremiah 25 in the SBITS2

Jeremiah 25 in the SBITS3

Jeremiah 25 in the SBITS4

Jeremiah 25 in the SBIUS

Jeremiah 25 in the SBIVS

Jeremiah 25 in the SBT

Jeremiah 25 in the SBT1E

Jeremiah 25 in the SCHL

Jeremiah 25 in the SNT

Jeremiah 25 in the SUSU

Jeremiah 25 in the SUSU2

Jeremiah 25 in the SYNO

Jeremiah 25 in the TBIAOTANT

Jeremiah 25 in the TBT1E

Jeremiah 25 in the TBT1E2

Jeremiah 25 in the TFTIP

Jeremiah 25 in the TFTU

Jeremiah 25 in the TGNTATF3T

Jeremiah 25 in the THAI

Jeremiah 25 in the TNFD

Jeremiah 25 in the TNT

Jeremiah 25 in the TNTIK

Jeremiah 25 in the TNTIL

Jeremiah 25 in the TNTIN

Jeremiah 25 in the TNTIP

Jeremiah 25 in the TNTIZ

Jeremiah 25 in the TOMA

Jeremiah 25 in the TTENT

Jeremiah 25 in the UBG

Jeremiah 25 in the UGV

Jeremiah 25 in the UGV2

Jeremiah 25 in the UGV3

Jeremiah 25 in the VBL

Jeremiah 25 in the VDCC

Jeremiah 25 in the YALU

Jeremiah 25 in the YAPE

Jeremiah 25 in the YBVTP

Jeremiah 25 in the ZBP