Jeremiah 7 (BOICB)

1 Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ bịakwute Jeremaya. 2 “Guzo nʼọnụ ụzọ ama nke ụlọ ONYENWE ANYỊ kwusaa ozi a nʼebe ahụ,“ ‘Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ, unu ndị Juda niile, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a niile na-abata ife ONYENWE ANYỊ ofufe. 3 Ihe ndị a bụ ihe ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel na-ekwu. Mezienụ ụzọ unu na omume unu niile, m ga-ekwe ka unu biri nʼebe a. 4 Unu atụkwasịla uche unu nʼokwu aghụghọ niile a na-agwa unu na-asị, “Nke a bụ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ!” 5 Ọ bụrụ na unu emee ka ụzọ unu na omume unu guzozie, ọ bụrụ na unu emesoo ibe unu mmeso nʼụzọ ikpe ziri ezi, 6 ọ bụrụ na unu ahapụ imegbu ndị ọbịa, na ndị na-enweghị nna, maọbụ nwanyị di ya nwụrụ; ọ bụrụ na unu ajụ iwufu ọbara onye aka ya dị ọcha nʼebe a, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaso chi ndị ọzọ nke na-ewetara unu nsogbu, 7 mgbe ahụ, aga m ekwere ka unu biri nʼebe a, nʼala a m nyere nna nna unu ha, ruo mgbe ebighị ebi. 8 Ma lee, ihe unu na-eme ugbu a bụ ịtụkwasị uche unu nʼokwu aghụghọ nke na-enweghị isi. 9 “ ‘Unu ga-aga nʼihu na-ezu ohi, na-egbu mmadụ ibe unu, na-akwa iko, ma na-eji chi ndị ọzọ na-aṅụ iyi? Unu ga-anọgide na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye Baal, ma na-agbaso chi ndị ọzọ unu na-amaghị? 10 Unu ga-emecha bịa guzo nʼihu m nʼụlọnsọ a, nke a kpọkwasịrị aha m, na-asị, “Anyị nọ na nchekwa,” ọ bụ ịnọ na nchekwa maka ime ihe arụ niile ndị a? 11 Ọ pụtara na ụlọ a, nke a kpọkwasịrị aha m aghọọla ogige nye ndị ohi? Ma anọkwa m ya na-ele unu anya, ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. 12 “ ‘Otu ọ dị, biko, Jeruonụ ebe ahụ dị na Shaịlo, ebe ahụ m buru ụzọ mee ka ọ bụrụ ebe a kpọkwasịrị aha m, ka unu chọpụta ihe m mere ya nʼihi ajọ omume ndị m, ụmụ Izrel. 13 Mgbe unu nọ na-eme ihe ndị a niile, ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara, agwara m unu okwu mgbe mgbe, ma unu jụrụ ige ntị. Akpọrọ m unu oku, ma unu jụrụ ịza. 14 Nʼihi ya, ihe ahụ m mere na Shaịlo ka m ga-emekwa ọzọ megide ụlọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. E, aga m eme ya megide ụlọnsọ ukwu ahụ unu na-atụkwasị obi unu nʼime ya, ụlọnsọ ukwu ahụ m nyere unu na nna nna unu ha. 15 A ga-esite nʼihu m wezuga unu, tufuo unu, dịka m wezugara ma tufukwaa ụmụnna unu, bụ ndị Ifrem.’ 16 “Ya mere, unu ekperela m ekpere nʼihi ndị a; unu atụfula oge unu ịrịọ m arịrịọ nʼihi ha. Agaghị m ege ntị nʼekpere na arịrịọ unu. 17 Ọ bụ na unu adịghị ahụ ihe na-eme nʼobodo niile nke Juda, na ihe ha na-eme nʼokporoụzọ niile nke Jerusalem? 18 Ụmụ na-achịkọta nkụ nke nna ha ji emenye ọkụ, ebe nne ha na-eghe achịcha ha na-eche nʼihu Eze nwanyị mbara Eluigwe. Ha na-awụpụrụ chi ndị ọzọ mmanya nʼihi ịkpasu m iwe. 19 Ọ bụ m ka ha na-akpasu iwe? Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. Ọ bụghị onwe ha ka ha na-emesi ike, ka ihe ihere mee ha? 20 “ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị: Iwe m na ọnụma m ka a ga-awụkwasị nʼebe a, nʼelu ndị mmadụ, na anụmanụ, na osisi dị nʼọhịa, na mkpụrụ nke ala ubi. Ọ ga-ere ọkụ ma agaghị emenyụ ya. 21 “ ‘Ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Gaanụ nʼihu, tụkwasịnụ aja nsure ọkụ unu nʼelu aja unu ndị ọzọ niile. Riekwanụ anụ ndị a nʼonwe unu. 22 Nʼihi na mgbe m si nʼala Ijipt kpọpụta nna nna unu ha, gwa ha okwu, e nyeghị ha naanị iwu maọbụ gwa ha okwu banyere ịchụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. 23 Ma iwu m nyere ha bụ nke a, ruberenụ m isi, aga m abụ Chineke unu, unu ga-abụkwa ndị nke m. Bienụ ndụ nʼiwu niile m nyere unu, ka ihe gaara unu nke ọma. 24 Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe ndị ahụ m nyere nʼiwu. Kama ha gbasoro ọchịchọ ọjọọ nke obi rụrụ arụ ha. Kama ịga nʼihu, ha daghachiri azụ. 25 Site na mgbe nna nna unu ha hapụrụ ala Ijipt, esepụbeghị m aka izitere unu ndị amụma bụ ndị ohu m. 26 Ma ha jụrụ ige ntị, jụkwa ilezi anya ime ihe m nyere nʼiwu. Ha bụ ndị ntị ike, ndị nọgidere na-eme ihe ọjọọ karịrị nke nna nna ha mere.’ 27 “Mgbe ị gwara ha ihe ndị a niile, ha agaghị ege ntị. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ ha oku ha agaghị aza. 28 Ya mere, ihe ndị a ka ị ga-agwa ha, ‘Nke a bụ mba na-enwebeghị oge ha ji rubere ONYENWE ANYỊ Chineke ha isi. O nwebekwaghị oge ọbụla ha ji nabata ịdọ aka na ntị ya. Eziokwu ọbụla adịghịkwa; okwu ọnụ ha bụ naanị ụgha ụgha. 29 “ ‘Kpụchaanụ agịrị isi unu, tufuo ya, nọọnụ nʼebe dị elu nke tọgbọrọ nʼefu bulie abụ akwa, nʼihi na ONYENWE ANYỊ esitela nʼoke ọnụma ya jụ ọgbọ a. Ọ gbakụtala ha azụ bụ ọgbọ nke a iwe ya na-adakwasị. 30 “ ‘ONYENWE ANYỊ kwupụtara sị, ndị Juda emeela ihe ọjọọ dị iche iche nʼihu m. Ha akpụọla arụsị rụrụ arụ nke ha tinyere nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ha emerụọla ya. 31 Ha ewuolara onwe ha ebe ịchụ aja dị elu na Tofet, nke dị na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ebe ahụ ka ha na-anọ na-esure ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ọkụ. Ihe dị otu a abụkwaghị ụdị ihe m nyere ha nʼiwu ka ha mee. O nwekwaghị oge ihe dị otu a batara m nʼobi. 32 Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe ndị mmadụ na-agaghị akpọkwa ebe ahụ Tofet maọbụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Kama ha ga-akpọ ya ndagwurugwu ogbugbu mmadụ, nʼihi na ha ga-eli ọtụtụ ndị ha na Tofet ruo mgbe ha na-agaghị ahụkwa ebe ha ga-eli ndị fọdụrụ. 33 Mgbe ahụ, ozu ndị mmadụ ndị a ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha. 34 Mgbe ahụ, aga m eme ka ụzụ ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye nʼobodo niile nke Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem kwụsị. Ala ahụ ga-aghọkwa ebe tọgbọrọ nʼefu.

In Other Versions

Jeremiah 7 in the ANGEFD

Jeremiah 7 in the ANTPNG2D

Jeremiah 7 in the AS21

Jeremiah 7 in the BAGH

Jeremiah 7 in the BBPNG

Jeremiah 7 in the BBT1E

Jeremiah 7 in the BDS

Jeremiah 7 in the BEV

Jeremiah 7 in the BHAD

Jeremiah 7 in the BIB

Jeremiah 7 in the BLPT

Jeremiah 7 in the BNT

Jeremiah 7 in the BNTABOOT

Jeremiah 7 in the BNTLV

Jeremiah 7 in the BOATCB

Jeremiah 7 in the BOATCB2

Jeremiah 7 in the BOBCV

Jeremiah 7 in the BOCNT

Jeremiah 7 in the BOECS

Jeremiah 7 in the BOGWICC

Jeremiah 7 in the BOHCB

Jeremiah 7 in the BOHCV

Jeremiah 7 in the BOHLNT

Jeremiah 7 in the BOHNTLTAL

Jeremiah 7 in the BOILNTAP

Jeremiah 7 in the BOITCV

Jeremiah 7 in the BOKCV

Jeremiah 7 in the BOKCV2

Jeremiah 7 in the BOKHWOG

Jeremiah 7 in the BOKSSV

Jeremiah 7 in the BOLCB

Jeremiah 7 in the BOLCB2

Jeremiah 7 in the BOMCV

Jeremiah 7 in the BONAV

Jeremiah 7 in the BONCB

Jeremiah 7 in the BONLT

Jeremiah 7 in the BONUT2

Jeremiah 7 in the BOPLNT

Jeremiah 7 in the BOSCB

Jeremiah 7 in the BOSNC

Jeremiah 7 in the BOTLNT

Jeremiah 7 in the BOVCB

Jeremiah 7 in the BOYCB

Jeremiah 7 in the BPBB

Jeremiah 7 in the BPH

Jeremiah 7 in the BSB

Jeremiah 7 in the CCB

Jeremiah 7 in the CUV

Jeremiah 7 in the CUVS

Jeremiah 7 in the DBT

Jeremiah 7 in the DGDNT

Jeremiah 7 in the DHNT

Jeremiah 7 in the DNT

Jeremiah 7 in the ELBE

Jeremiah 7 in the EMTV

Jeremiah 7 in the ESV

Jeremiah 7 in the FBV

Jeremiah 7 in the FEB

Jeremiah 7 in the GGMNT

Jeremiah 7 in the GNT

Jeremiah 7 in the HARY

Jeremiah 7 in the HNT

Jeremiah 7 in the IRVA

Jeremiah 7 in the IRVB

Jeremiah 7 in the IRVG

Jeremiah 7 in the IRVH

Jeremiah 7 in the IRVK

Jeremiah 7 in the IRVM

Jeremiah 7 in the IRVM2

Jeremiah 7 in the IRVO

Jeremiah 7 in the IRVP

Jeremiah 7 in the IRVT

Jeremiah 7 in the IRVT2

Jeremiah 7 in the IRVU

Jeremiah 7 in the ISVN

Jeremiah 7 in the JSNT

Jeremiah 7 in the KAPI

Jeremiah 7 in the KBT1ETNIK

Jeremiah 7 in the KBV

Jeremiah 7 in the KJV

Jeremiah 7 in the KNFD

Jeremiah 7 in the LBA

Jeremiah 7 in the LBLA

Jeremiah 7 in the LNT

Jeremiah 7 in the LSV

Jeremiah 7 in the MAAL

Jeremiah 7 in the MBV

Jeremiah 7 in the MBV2

Jeremiah 7 in the MHNT

Jeremiah 7 in the MKNFD

Jeremiah 7 in the MNG

Jeremiah 7 in the MNT

Jeremiah 7 in the MNT2

Jeremiah 7 in the MRS1T

Jeremiah 7 in the NAA

Jeremiah 7 in the NASB

Jeremiah 7 in the NBLA

Jeremiah 7 in the NBS

Jeremiah 7 in the NBVTP

Jeremiah 7 in the NET2

Jeremiah 7 in the NIV11

Jeremiah 7 in the NNT

Jeremiah 7 in the NNT2

Jeremiah 7 in the NNT3

Jeremiah 7 in the PDDPT

Jeremiah 7 in the PFNT

Jeremiah 7 in the RMNT

Jeremiah 7 in the SBIAS

Jeremiah 7 in the SBIBS

Jeremiah 7 in the SBIBS2

Jeremiah 7 in the SBICS

Jeremiah 7 in the SBIDS

Jeremiah 7 in the SBIGS

Jeremiah 7 in the SBIHS

Jeremiah 7 in the SBIIS

Jeremiah 7 in the SBIIS2

Jeremiah 7 in the SBIIS3

Jeremiah 7 in the SBIKS

Jeremiah 7 in the SBIKS2

Jeremiah 7 in the SBIMS

Jeremiah 7 in the SBIOS

Jeremiah 7 in the SBIPS

Jeremiah 7 in the SBISS

Jeremiah 7 in the SBITS

Jeremiah 7 in the SBITS2

Jeremiah 7 in the SBITS3

Jeremiah 7 in the SBITS4

Jeremiah 7 in the SBIUS

Jeremiah 7 in the SBIVS

Jeremiah 7 in the SBT

Jeremiah 7 in the SBT1E

Jeremiah 7 in the SCHL

Jeremiah 7 in the SNT

Jeremiah 7 in the SUSU

Jeremiah 7 in the SUSU2

Jeremiah 7 in the SYNO

Jeremiah 7 in the TBIAOTANT

Jeremiah 7 in the TBT1E

Jeremiah 7 in the TBT1E2

Jeremiah 7 in the TFTIP

Jeremiah 7 in the TFTU

Jeremiah 7 in the TGNTATF3T

Jeremiah 7 in the THAI

Jeremiah 7 in the TNFD

Jeremiah 7 in the TNT

Jeremiah 7 in the TNTIK

Jeremiah 7 in the TNTIL

Jeremiah 7 in the TNTIN

Jeremiah 7 in the TNTIP

Jeremiah 7 in the TNTIZ

Jeremiah 7 in the TOMA

Jeremiah 7 in the TTENT

Jeremiah 7 in the UBG

Jeremiah 7 in the UGV

Jeremiah 7 in the UGV2

Jeremiah 7 in the UGV3

Jeremiah 7 in the VBL

Jeremiah 7 in the VDCC

Jeremiah 7 in the YALU

Jeremiah 7 in the YAPE

Jeremiah 7 in the YBVTP

Jeremiah 7 in the ZBP