Job 10 (BOICB)

1 “Ike ịdị ndụ agwụla m.Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi,kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị. 2 Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe,kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe. 3 Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m,si otu a leda ọrụ aka gị anya,mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu? 4 Ị nwere anya nke anụ ahụ?Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ? 5 Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ,ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike? 6 Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma mma nyochaa mmehie m? 7 Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m,na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị. 8 “Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m.Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m? 9 Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ.Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ? 10 Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehimee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ? 11 Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ,werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe? 12 I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị,nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m. 13 “Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị,amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche. 14 Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya,ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m. 15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m!A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elunʼihi na ejupụtara m nʼihere,bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m. 16 Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụma werekwa ike gị dị egwu megide m. 17 I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m,mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ;ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri. 18 “Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m?Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m. 19 A sịkwarị na amụpụtaghị mmaọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili! 20 Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole?Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta, 21 tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụebe m na-agaghị esi pụtakwa. 22 Nʼala nke oke ọchịchịrị,ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị,ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”

In Other Versions

Job 10 in the ANGEFD

Job 10 in the ANTPNG2D

Job 10 in the AS21

Job 10 in the BAGH

Job 10 in the BBPNG

Job 10 in the BBT1E

Job 10 in the BDS

Job 10 in the BEV

Job 10 in the BHAD

Job 10 in the BIB

Job 10 in the BLPT

Job 10 in the BNT

Job 10 in the BNTABOOT

Job 10 in the BNTLV

Job 10 in the BOATCB

Job 10 in the BOATCB2

Job 10 in the BOBCV

Job 10 in the BOCNT

Job 10 in the BOECS

Job 10 in the BOGWICC

Job 10 in the BOHCB

Job 10 in the BOHCV

Job 10 in the BOHLNT

Job 10 in the BOHNTLTAL

Job 10 in the BOILNTAP

Job 10 in the BOITCV

Job 10 in the BOKCV

Job 10 in the BOKCV2

Job 10 in the BOKHWOG

Job 10 in the BOKSSV

Job 10 in the BOLCB

Job 10 in the BOLCB2

Job 10 in the BOMCV

Job 10 in the BONAV

Job 10 in the BONCB

Job 10 in the BONLT

Job 10 in the BONUT2

Job 10 in the BOPLNT

Job 10 in the BOSCB

Job 10 in the BOSNC

Job 10 in the BOTLNT

Job 10 in the BOVCB

Job 10 in the BOYCB

Job 10 in the BPBB

Job 10 in the BPH

Job 10 in the BSB

Job 10 in the CCB

Job 10 in the CUV

Job 10 in the CUVS

Job 10 in the DBT

Job 10 in the DGDNT

Job 10 in the DHNT

Job 10 in the DNT

Job 10 in the ELBE

Job 10 in the EMTV

Job 10 in the ESV

Job 10 in the FBV

Job 10 in the FEB

Job 10 in the GGMNT

Job 10 in the GNT

Job 10 in the HARY

Job 10 in the HNT

Job 10 in the IRVA

Job 10 in the IRVB

Job 10 in the IRVG

Job 10 in the IRVH

Job 10 in the IRVK

Job 10 in the IRVM

Job 10 in the IRVM2

Job 10 in the IRVO

Job 10 in the IRVP

Job 10 in the IRVT

Job 10 in the IRVT2

Job 10 in the IRVU

Job 10 in the ISVN

Job 10 in the JSNT

Job 10 in the KAPI

Job 10 in the KBT1ETNIK

Job 10 in the KBV

Job 10 in the KJV

Job 10 in the KNFD

Job 10 in the LBA

Job 10 in the LBLA

Job 10 in the LNT

Job 10 in the LSV

Job 10 in the MAAL

Job 10 in the MBV

Job 10 in the MBV2

Job 10 in the MHNT

Job 10 in the MKNFD

Job 10 in the MNG

Job 10 in the MNT

Job 10 in the MNT2

Job 10 in the MRS1T

Job 10 in the NAA

Job 10 in the NASB

Job 10 in the NBLA

Job 10 in the NBS

Job 10 in the NBVTP

Job 10 in the NET2

Job 10 in the NIV11

Job 10 in the NNT

Job 10 in the NNT2

Job 10 in the NNT3

Job 10 in the PDDPT

Job 10 in the PFNT

Job 10 in the RMNT

Job 10 in the SBIAS

Job 10 in the SBIBS

Job 10 in the SBIBS2

Job 10 in the SBICS

Job 10 in the SBIDS

Job 10 in the SBIGS

Job 10 in the SBIHS

Job 10 in the SBIIS

Job 10 in the SBIIS2

Job 10 in the SBIIS3

Job 10 in the SBIKS

Job 10 in the SBIKS2

Job 10 in the SBIMS

Job 10 in the SBIOS

Job 10 in the SBIPS

Job 10 in the SBISS

Job 10 in the SBITS

Job 10 in the SBITS2

Job 10 in the SBITS3

Job 10 in the SBITS4

Job 10 in the SBIUS

Job 10 in the SBIVS

Job 10 in the SBT

Job 10 in the SBT1E

Job 10 in the SCHL

Job 10 in the SNT

Job 10 in the SUSU

Job 10 in the SUSU2

Job 10 in the SYNO

Job 10 in the TBIAOTANT

Job 10 in the TBT1E

Job 10 in the TBT1E2

Job 10 in the TFTIP

Job 10 in the TFTU

Job 10 in the TGNTATF3T

Job 10 in the THAI

Job 10 in the TNFD

Job 10 in the TNT

Job 10 in the TNTIK

Job 10 in the TNTIL

Job 10 in the TNTIN

Job 10 in the TNTIP

Job 10 in the TNTIZ

Job 10 in the TOMA

Job 10 in the TTENT

Job 10 in the UBG

Job 10 in the UGV

Job 10 in the UGV2

Job 10 in the UGV3

Job 10 in the VBL

Job 10 in the VDCC

Job 10 in the YALU

Job 10 in the YAPE

Job 10 in the YBVTP

Job 10 in the ZBP