Leviticus 16 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu mgbe ụmụ ndị ikom Erọn abụọ ndị ahụ bịara nʼihu ONYENWE ANYỊ nwụsịrị. 2 ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, “Gwa nwanne gị nwoke Erọn si ya ka ọ ghara ịbata mgbe ọbụla ọ chọrọ, nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ nke dị nʼazụ akwa mgbochi, nke dị nʼihu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-anwụ. Nʼihi na aga m apụta ìhè nʼime igwe ojii dị nʼelu ebe mkpuchi ahụ. 3 “Otu a ka Erọn ga-esi na-abata nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-eweta nwa oke ehi nʼihi aja mmehie, na ebule ọ ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, 4 Ọ ga-eyikwasị onwe ya uwe mwụda ọcha, ya na uwe ime ahụ dị ọcha. Ọ ga-eke gburugburu ukwu ya ihe ike nʼukwu akwa ọcha, keekwa akwa ọcha nʼisi ya. Ndị a bụ uwe dị nsọ, nʼihi ya, ọ ga-ebu ụzọ saa ahụ tupu ọ na-eyi ha. 5 Ọ ga-esi nʼaka ọgbakọ ụmụ Izrel nata mkpi abụọ nʼihi aja mmehie, na otu ebule nʼihi aja nsure ọkụ. 6 “Erọn ga-eweta oke ehi nke ya, maka aja mmehie iji kpuchie mmehie nke ya na nke ezinaụlọ ya. 7 Emesịa, ọ ga-ewere mkpi abụọ ndị ahụ chee ha nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 8 Ọ ga-efe nza nʼisi mkpi abụọ ahụ, ịchọpụta nke dịrị ONYENWE ANYỊ nke ọzọ abụrụ nke ọ ga-ahapụ. 9 Mkpi ahụ nza mara ga-abụ nke ONYENWE ANYỊ, ya ka Erọn ga-egbu dịka aja mmehie. 10 Ma mkpi ahụ nke nza mara dịka ewu na-ewere ọnọdụ iburu mmehie ka a ga-eche na ndụ nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihi iji ya mee mmemme mkpuchi mmehie, a ga-ahapụ ya ka o buru mmehie niile kpafuo nʼọzara. 11 “Erọn ga-eweta oke ehi maka aja mmehie nke ya onwe ya, iji kpuchie mmehie ya na nke ezinaụlọ ya. Ọ ga-egbu oke ehi ahụ maka aja mmehie nke ya onwe ya. 12 Ọ ga-esite nʼebe ịchụ aja dị nʼihu ONYENWE ANYỊ were ihe ịgụ ọkụ jupụtara nʼicheku ọkụ. Ọ ga-ewerekwa ụda na-esi isi ụtọ ruru mkpoju aka abụọ, were ha bata nʼime akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi ahụ. 13 Nʼebe ahụ ọ ga-awụnye ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ nʼelu icheku ọkụ ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ, ka anwụrụ ọkụ nke ụda ndị a kpuchie ebe mkpuchi mmehie ahụ dị nʼelu Ihe Ama ahụ ka ọ ghara ịnwụ. 14 Ọ ga-ewebatakwa ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ, jiri mkpịsịaka ya fesa ya nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, fesakwa ya ugboro asaa nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ. 15 “Emesịa, ọ ga-esi nʼebe ahụ pụọ gaa gbuo mkpi aja mmehie ụmụ Izrel, werekwa ọbara ya bata nʼazụ akwa mgbochi fesa ya nʼelu ebe mkpuchi mmehie ahụ, na nʼihu ya, dịka o jiri ọbara nwa oke ehi ahụ mee. 16 Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ mmehie ya, nʼihi mmehie na nnupu isi ụmụ Izrel, ihe ọbụla mmehie ndị ahụ bụ. Ọ ga-achụkwa ụdị aja a nʼihi ụlọ nzute ahụ, nʼihi na ọ dị nʼetiti ebe obibi rụrụ arụ nke ụmụ Izrel. 17 O nweghị onye ọbụla ọzọ ga-anọ nʼime ụlọ nzute ahụ, site nʼoge Erọn banyere nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ ịchụ aja mkpuchi mmehie tutu ruo mgbe ọ pụtara, mgbe ọ chụchara aja mkpuchi mmehie maka onwe ya na ezinaụlọ ya, na maka ụmụ Izrel niile. 18 “Mgbe o si nʼebe ahụ pụta, gaa nʼebe ịchụ aja dị nʼihu ONYENWE ANYỊ kpuchiere ya mmehie ya. Ọ ga-ewere ụfọdụ ọbara nwa oke ehi ahụ na nke mkpi ahụ tee ya na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja ahụ. 19 Ọ ga-eji mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ ọbara ahụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ ugboro asaa iji hichapụ adịghị ọcha ya nʼihi ịrụ arụ ụmụ Izrel, na ido ya nsọ. 20 “Mgbe Erọn chụchara aja mkpuchi mmehie maka Ebe ahụ Kachasị Nsọ, ụlọ nzute, nakwa ebe ịchụ aja, ọ ga-akpụbata mkpi ahụ e debere ndụ. 21 Ọ ga-ebikwasị aka ya abụọ nʼisi ya, kwupụta ajọ omume na nnupu isi ụmụ Izrel niile, mmehie ha niile, bokwasị ha mkpi ahụ nʼisi. Ọ ga-ezipụ mkpi ahụ pụọ nʼime ọzara site nʼaka onye ahụ a họpụtara ime nke a. 22 Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara. 23 “Mgbe ahụ, Erọn ga-aba nʼime ụlọ nzute ahụ, yipụ uwe akwa ọcha ndị nchụaja ahụ niile o yi nʼahụ ya tupu ọ banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-awụsa ha nʼebe ahụ. 24 Ọ ga-eji mmiri saa ahụ ya nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, yirikwa uwe efu ya. Mgbe ahụ, ọ ga-apụta bịa chụọ aja nsure ọkụ nke onwe ya, na aja nsure ọkụ nke ndị ahụ, maka ikpuchiri onwe ya, na ikpuchikwara ndị ahụ mmehie ha. 25 Ọ ga-akpọkwa abụba anụ e ji chụọ aja mmehie ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. 26 “Mgbe nwoke ahụ kpụgara mkpi ahụ nʼọzara hapụ ya, lọtara, ọ ga-asa ahụ ya na uwe ya tupu ọ laghachi nʼime obodo. 27 Oke ehi nakwa mkpi maka ịchụ aja mmehie ahụ, bụ nke ewebatara ọbara ha nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ, maka ikpuchi mmehie, ka aghaghị ibupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu; a ga-akpọ akpụkpọ ha, anụ ahụ ha na mgbịrị afọ ha niile ọkụ. 28 Onye ga-akpọ ha ọkụ ga-asa uwe ya, saakwa ahụ ya tupu ọ laghachi nʼime obodo. 29 “Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ ebighị ebi. Nʼafọ ọbụla, unu ga-ebu ọnụ, hapụ ịrụ ọrụ ọbụla, nʼụbọchị iri nke ọnwa asaa. Iwu a dịrị nwa afọ ala maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu. 30 Nʼihi na nʼụbọchị a ka a na-ekpuchiri unu mmehie unu, ime ka unu dịrị ọcha. Mgbe ahụ, unu ga-abụ ndị dị ọcha site na mmehie unu niile nʼihu ONYENWE ANYỊ. 31 Ọ bụ ụbọchị izuike nye unu, bụrụkwa ụbọchị unu ga-ebu ọnụ. Iwu a enweghị mgbanwe! 32 Onye nchụaja e tere mmanụ, nke e doro nsọ dịka onye nchụaja ịnọchi nna ya, ga-achụ aja mkpuchi mmehie ndị a, yirikwa akwa ọcha ahụ, bụ uwe nsọ ahụ. 33 Ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ na ụlọ nzute, ebe ịchụ aja na ndị nchụaja, na mkpokọta ndị obodo niile mmehie ha. 34 “Nke a ga-abụ iwu ebighị ebi nye unu. Otu ugboro nʼotu afọ ka a ga-ekpuchi mmehie maka mmehie ndị Izrel niile.”E mezuru ihe ndị a niile dịka ONYENWE ANYỊ si nye ya Mosis nʼiwu.

In Other Versions

Leviticus 16 in the ANGEFD

Leviticus 16 in the ANTPNG2D

Leviticus 16 in the AS21

Leviticus 16 in the BAGH

Leviticus 16 in the BBPNG

Leviticus 16 in the BBT1E

Leviticus 16 in the BDS

Leviticus 16 in the BEV

Leviticus 16 in the BHAD

Leviticus 16 in the BIB

Leviticus 16 in the BLPT

Leviticus 16 in the BNT

Leviticus 16 in the BNTABOOT

Leviticus 16 in the BNTLV

Leviticus 16 in the BOATCB

Leviticus 16 in the BOATCB2

Leviticus 16 in the BOBCV

Leviticus 16 in the BOCNT

Leviticus 16 in the BOECS

Leviticus 16 in the BOGWICC

Leviticus 16 in the BOHCB

Leviticus 16 in the BOHCV

Leviticus 16 in the BOHLNT

Leviticus 16 in the BOHNTLTAL

Leviticus 16 in the BOILNTAP

Leviticus 16 in the BOITCV

Leviticus 16 in the BOKCV

Leviticus 16 in the BOKCV2

Leviticus 16 in the BOKHWOG

Leviticus 16 in the BOKSSV

Leviticus 16 in the BOLCB

Leviticus 16 in the BOLCB2

Leviticus 16 in the BOMCV

Leviticus 16 in the BONAV

Leviticus 16 in the BONCB

Leviticus 16 in the BONLT

Leviticus 16 in the BONUT2

Leviticus 16 in the BOPLNT

Leviticus 16 in the BOSCB

Leviticus 16 in the BOSNC

Leviticus 16 in the BOTLNT

Leviticus 16 in the BOVCB

Leviticus 16 in the BOYCB

Leviticus 16 in the BPBB

Leviticus 16 in the BPH

Leviticus 16 in the BSB

Leviticus 16 in the CCB

Leviticus 16 in the CUV

Leviticus 16 in the CUVS

Leviticus 16 in the DBT

Leviticus 16 in the DGDNT

Leviticus 16 in the DHNT

Leviticus 16 in the DNT

Leviticus 16 in the ELBE

Leviticus 16 in the EMTV

Leviticus 16 in the ESV

Leviticus 16 in the FBV

Leviticus 16 in the FEB

Leviticus 16 in the GGMNT

Leviticus 16 in the GNT

Leviticus 16 in the HARY

Leviticus 16 in the HNT

Leviticus 16 in the IRVA

Leviticus 16 in the IRVB

Leviticus 16 in the IRVG

Leviticus 16 in the IRVH

Leviticus 16 in the IRVK

Leviticus 16 in the IRVM

Leviticus 16 in the IRVM2

Leviticus 16 in the IRVO

Leviticus 16 in the IRVP

Leviticus 16 in the IRVT

Leviticus 16 in the IRVT2

Leviticus 16 in the IRVU

Leviticus 16 in the ISVN

Leviticus 16 in the JSNT

Leviticus 16 in the KAPI

Leviticus 16 in the KBT1ETNIK

Leviticus 16 in the KBV

Leviticus 16 in the KJV

Leviticus 16 in the KNFD

Leviticus 16 in the LBA

Leviticus 16 in the LBLA

Leviticus 16 in the LNT

Leviticus 16 in the LSV

Leviticus 16 in the MAAL

Leviticus 16 in the MBV

Leviticus 16 in the MBV2

Leviticus 16 in the MHNT

Leviticus 16 in the MKNFD

Leviticus 16 in the MNG

Leviticus 16 in the MNT

Leviticus 16 in the MNT2

Leviticus 16 in the MRS1T

Leviticus 16 in the NAA

Leviticus 16 in the NASB

Leviticus 16 in the NBLA

Leviticus 16 in the NBS

Leviticus 16 in the NBVTP

Leviticus 16 in the NET2

Leviticus 16 in the NIV11

Leviticus 16 in the NNT

Leviticus 16 in the NNT2

Leviticus 16 in the NNT3

Leviticus 16 in the PDDPT

Leviticus 16 in the PFNT

Leviticus 16 in the RMNT

Leviticus 16 in the SBIAS

Leviticus 16 in the SBIBS

Leviticus 16 in the SBIBS2

Leviticus 16 in the SBICS

Leviticus 16 in the SBIDS

Leviticus 16 in the SBIGS

Leviticus 16 in the SBIHS

Leviticus 16 in the SBIIS

Leviticus 16 in the SBIIS2

Leviticus 16 in the SBIIS3

Leviticus 16 in the SBIKS

Leviticus 16 in the SBIKS2

Leviticus 16 in the SBIMS

Leviticus 16 in the SBIOS

Leviticus 16 in the SBIPS

Leviticus 16 in the SBISS

Leviticus 16 in the SBITS

Leviticus 16 in the SBITS2

Leviticus 16 in the SBITS3

Leviticus 16 in the SBITS4

Leviticus 16 in the SBIUS

Leviticus 16 in the SBIVS

Leviticus 16 in the SBT

Leviticus 16 in the SBT1E

Leviticus 16 in the SCHL

Leviticus 16 in the SNT

Leviticus 16 in the SUSU

Leviticus 16 in the SUSU2

Leviticus 16 in the SYNO

Leviticus 16 in the TBIAOTANT

Leviticus 16 in the TBT1E

Leviticus 16 in the TBT1E2

Leviticus 16 in the TFTIP

Leviticus 16 in the TFTU

Leviticus 16 in the TGNTATF3T

Leviticus 16 in the THAI

Leviticus 16 in the TNFD

Leviticus 16 in the TNT

Leviticus 16 in the TNTIK

Leviticus 16 in the TNTIL

Leviticus 16 in the TNTIN

Leviticus 16 in the TNTIP

Leviticus 16 in the TNTIZ

Leviticus 16 in the TOMA

Leviticus 16 in the TTENT

Leviticus 16 in the UBG

Leviticus 16 in the UGV

Leviticus 16 in the UGV2

Leviticus 16 in the UGV3

Leviticus 16 in the VBL

Leviticus 16 in the VDCC

Leviticus 16 in the YALU

Leviticus 16 in the YAPE

Leviticus 16 in the YBVTP

Leviticus 16 in the ZBP