Leviticus 23 (BOICB)

1 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka nye ONYENWE ANYỊ, nke unu ga-ekwusa dịka mkpọkọta dị nsọ. 3 “ ‘Ụbọchị isii ka unu ga-eji rụọ ọrụ. Ma ụbọchị nke asaa, bụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, nʼebe ọbụla unu bi. Ọ bụ ụbọchị izuike nye ONYENWE ANYỊ. 4 “ ‘Ndị a bụ mmemme ONYENWE ANYỊ a kara aka, mkpọkọta dị nsọ nke unu ga-ekwusa nʼoge a kara aka. 5 Nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ, nʼoge uhuruchi, mgbe anwụ dara, ka Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYỊ ga-adị. 6 Mmemme achịcha na-ekoghị eko ONYENWE ANYỊ ka unu ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa ahụ. Abalị asaa ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 7 Nʼụbọchị mbụ nke mmemme a, unu ga-enwe mkpọkọta dị nsọ, ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-arụ ọrụ ọbụla. 8 Unu ga-eweta aja e sitere nʼọkụ chụọ nye ONYENWE ANYỊ. Nʼụbọchị nke asaa nweenụ mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ.’ ” 9 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị ya, 10 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala ahụ m na-aga inye unu, ghọta mkpụrụ ihe ubi nke mbụ unu, unu ga-ewetara onye nchụaja otu ukwu ọka site nʼọka unu ghọtara nʼubi unu. 11 Ọ ga-anara unu ukwu ọka ahụ fufee ya nʼihu ONYENWE ANYỊ, ka a nabata ya. Ọ bụ nʼụbọchị ahụ ga-esote ụbọchị izuike ka onye nchụaja ga-efufe ya. 12 Nʼotu ụbọchị ahụ e fufere ukwu ọka ahụ, unu ga-ewere nwa ebule na-enweghị ntụpọ, nke gbara naanị otu afọ, chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ. 13 Aja mkpụrụ ọka ga-eso aja nsure ọkụ a. Ọ ga-eji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ a gwara mmanụ oliv, ka ọ bụrụ ihe e surere nʼọkụ na-esi ezi isi ọma nye ONYENWE ANYỊ. A ga-enyekwa iko mmanya atọ dịka onyinye ihe ọṅụṅụ 14 Unu agaghị eri achịcha, maọbụ ọka e ghere eghe, maọbụ ọka ọhụrụ tutu ruo mgbe unu buru ụzọ weta onyinye nye Chineke unu. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide ruo ọgbọ niile. 15 “ ‘Site nʼụbọchị ahụ sotere ụbọchị izuike, bụ ụbọchị ahụ unu wetara ukwu ọka nke onyinye mfufe, gụpụta izu asaa zuru ezu. 16 Gụpụtakwa iri ụbọchị ise site nʼụbọchị izuike ahụ mezuru izu asaa ahụ ma wetara ONYENWE ANYỊ onyinye ọka ọhụrụ. 17 Site nʼebe ọbụla unu bi, unu ga-ewetara ONYENWE ANYỊ ogbe achịcha abụọ nke unu ji iko ọka a kwọrọ nke ọma iri na abụọ, nke e ji ihe na-eko achịcha mee, ya bụ yiist, dịka aja mfufe nke mkpụrụ mbụ nye ONYENWE ANYỊ. 18 Tinyere achịcha a, unu ga-eweta ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, na otu nwa oke ehi, na ebule abụọ. Ha ga-abụ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ, ya na aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ, aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye ONYENWE ANYỊ. 19 Unu ga-ejikwa otu mkpi chụọ aja mmehie. Werekwa ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja udo. 20 Onye nchụaja ga-efufe ụmụ atụrụ abụọ ndị a, na achịcha ndị si na mkpụrụ mbụ ahụ nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka aja mfufe. Ha bụ aja dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ. Ọ bụkwa ndị nchụaja ga-ewere ha dịka nri ha. 21 Nʼotu ụbọchị ahụ unu ga-akpọsakwa mkpọkọta dị nsọ, unu arụkwala ọrụ nke ụbọchị ahụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ ga-adịgide ebighị ebi site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile, nʼebe ọbụla unu bi. 22 “ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ niile nke ubi unu. Hapụrụnụ ha ụmụ ogbenye, na ndị ọbịa. Hapụkwara ha mkpụrụ ubi niile dara nʼala. Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu.’ ” 23 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 24 “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Ụbọchị mbụ nke ọnwa nke asaa ga-abụ ụbọchị izuike, ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nke a ga-eji opi na-ada oke ụda cheta. 25 Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, kama unu ga-achụ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ.’ ” 26 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 27 “Ụbọchị nke iri nke ọnwa asaa a bụ ụbọchị Mkpuchi Mmehie. Ọ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ nye unu. Unu ga-ata onwe unu ahụhụ bịa wetara ONYENWE ANYỊ onyinye site nʼọkụ. 28 Unu arụla ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ nʼihi na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịchụ aja mkpuchi mmehie unu nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke unu. 29 Onye ọbụla na-ejighị ụbọchị ahụ weda onwe ya nʼala ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya. 30 Aga m ebibikwa onye ọbụla rụrụ ọrụ nʼụbọchị ahụ. 31 Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla. Nʼebe ọbụla unu bi, ụkpụrụ a ga-adịgide nye unu niile site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 32 Ọ ga-abụ ụbọchị izuike zuruoke nye unu, unu ga-ewedakwa onwe unu nʼala. Nʼụbọchị nke itoolu nke ọnwa ahụ, site nʼuhuruchi ruo nʼuhuruchi nke na-esote ya, unu ga-edebe izuike unu.” 33 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, 34 “Gwa ụmụ Izrel, ‘Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa nke asaa, ka unu ga-amalite mmemme Ụlọ Ikwu ONYENWE ANYỊ. A ga-eme ya ụbọchị asaa. 35 Nʼụbọchị nke mbụ bụ ụbọchị mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ nʼụbọchị ahụ. 36 Nʼụbọchị ọbụla nʼime ụbọchị asaa ndị a niile ka a ga-ewetara ONYENWE ANYỊ onyinye site nʼọkụ. Nʼụbọchị nke asatọ ka mkpọkọta dị nsọ ga-adị. A ga-achụ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ, nʼụbọchị a. Ọ bụ mkpokọta mmechi, nʼihi ya, a gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ. 37 (“ ‘Ndị a bụ mmemme a kara aka, mgbe a ga-ekwusa mkpọkọta dị nsọ maka iwetara ONYENWE ANYỊ onyinye nri, ya bụ, onyinye aja nsure ọkụ, na onyinye mkpụrụ ọka, na aja dị iche iche, na onyinye ihe ọṅụṅụ dịka e sị hazie na ọ ga na-adị kwa ụbọchị. 38 Unu ga-enye onyinye ndị a, tinyere onyinye a na-enye ONYENWE ANYỊ nʼụbọchị izuike, na tinyere onyinye ndị ọzọ unu na-enye na ihe ndị ọzọ unu kwere na nkwa, na onyinye afọ ofufu niile unu na-enye ONYENWE ANYỊ.) 39 “ ‘Ya mere, malite nʼụbọchị nke iri na ise nke ọnwa asaa, mgbe unu webatasịrị ihe ubi unu, meerenụ ONYENWE ANYỊ mmemme ụbọchị asaa, ụbọchị nke mbụ, na ụbọchị nke asatọ ga-abụ ụbọchị izuike. 40 Nʼụbọchị nke mbụ, unu ga-ewere ụfọdụ mkpụrụ osisi dị mma nke si nʼosisi unu na-amị mkpụrụ, gbutekwa igu nkwụ, na alaka osisi nwere ahịhịa ndụ, na osisi pọpla, jiri ha mee mmemme obi ụtọ nʼihu ONYENWE ANYỊ Chineke unu ụbọchị asaa. 41 Mmemme ụbọchị asaa a ga-adị nye ONYENWE ANYỊ nʼafọ niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ unu niile. Ọ bụkwa nʼọnwa nke asaa ka unu ga-eme mmemme a. 42 Nʼoge mmemme a, ụmụ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ e ji alaka osisi na ahịhịa wuo ụbọchị asaa. Ụmụ afọ Izrel niile ga-ebi nʼụlọ dị otu a. 43 Nke a ga-echetara ọgbọ ụmụ Izrel niile na mgbe m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, unu biri nʼụlọ e ji osisi na ahịhịa wuo nʼọzara. Abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu.’ ” 44 Mosis gwara ụmụ Izrel ihe gbasara mmemme niile a kara aka nye ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

Leviticus 23 in the ANGEFD

Leviticus 23 in the ANTPNG2D

Leviticus 23 in the AS21

Leviticus 23 in the BAGH

Leviticus 23 in the BBPNG

Leviticus 23 in the BBT1E

Leviticus 23 in the BDS

Leviticus 23 in the BEV

Leviticus 23 in the BHAD

Leviticus 23 in the BIB

Leviticus 23 in the BLPT

Leviticus 23 in the BNT

Leviticus 23 in the BNTABOOT

Leviticus 23 in the BNTLV

Leviticus 23 in the BOATCB

Leviticus 23 in the BOATCB2

Leviticus 23 in the BOBCV

Leviticus 23 in the BOCNT

Leviticus 23 in the BOECS

Leviticus 23 in the BOGWICC

Leviticus 23 in the BOHCB

Leviticus 23 in the BOHCV

Leviticus 23 in the BOHLNT

Leviticus 23 in the BOHNTLTAL

Leviticus 23 in the BOILNTAP

Leviticus 23 in the BOITCV

Leviticus 23 in the BOKCV

Leviticus 23 in the BOKCV2

Leviticus 23 in the BOKHWOG

Leviticus 23 in the BOKSSV

Leviticus 23 in the BOLCB

Leviticus 23 in the BOLCB2

Leviticus 23 in the BOMCV

Leviticus 23 in the BONAV

Leviticus 23 in the BONCB

Leviticus 23 in the BONLT

Leviticus 23 in the BONUT2

Leviticus 23 in the BOPLNT

Leviticus 23 in the BOSCB

Leviticus 23 in the BOSNC

Leviticus 23 in the BOTLNT

Leviticus 23 in the BOVCB

Leviticus 23 in the BOYCB

Leviticus 23 in the BPBB

Leviticus 23 in the BPH

Leviticus 23 in the BSB

Leviticus 23 in the CCB

Leviticus 23 in the CUV

Leviticus 23 in the CUVS

Leviticus 23 in the DBT

Leviticus 23 in the DGDNT

Leviticus 23 in the DHNT

Leviticus 23 in the DNT

Leviticus 23 in the ELBE

Leviticus 23 in the EMTV

Leviticus 23 in the ESV

Leviticus 23 in the FBV

Leviticus 23 in the FEB

Leviticus 23 in the GGMNT

Leviticus 23 in the GNT

Leviticus 23 in the HARY

Leviticus 23 in the HNT

Leviticus 23 in the IRVA

Leviticus 23 in the IRVB

Leviticus 23 in the IRVG

Leviticus 23 in the IRVH

Leviticus 23 in the IRVK

Leviticus 23 in the IRVM

Leviticus 23 in the IRVM2

Leviticus 23 in the IRVO

Leviticus 23 in the IRVP

Leviticus 23 in the IRVT

Leviticus 23 in the IRVT2

Leviticus 23 in the IRVU

Leviticus 23 in the ISVN

Leviticus 23 in the JSNT

Leviticus 23 in the KAPI

Leviticus 23 in the KBT1ETNIK

Leviticus 23 in the KBV

Leviticus 23 in the KJV

Leviticus 23 in the KNFD

Leviticus 23 in the LBA

Leviticus 23 in the LBLA

Leviticus 23 in the LNT

Leviticus 23 in the LSV

Leviticus 23 in the MAAL

Leviticus 23 in the MBV

Leviticus 23 in the MBV2

Leviticus 23 in the MHNT

Leviticus 23 in the MKNFD

Leviticus 23 in the MNG

Leviticus 23 in the MNT

Leviticus 23 in the MNT2

Leviticus 23 in the MRS1T

Leviticus 23 in the NAA

Leviticus 23 in the NASB

Leviticus 23 in the NBLA

Leviticus 23 in the NBS

Leviticus 23 in the NBVTP

Leviticus 23 in the NET2

Leviticus 23 in the NIV11

Leviticus 23 in the NNT

Leviticus 23 in the NNT2

Leviticus 23 in the NNT3

Leviticus 23 in the PDDPT

Leviticus 23 in the PFNT

Leviticus 23 in the RMNT

Leviticus 23 in the SBIAS

Leviticus 23 in the SBIBS

Leviticus 23 in the SBIBS2

Leviticus 23 in the SBICS

Leviticus 23 in the SBIDS

Leviticus 23 in the SBIGS

Leviticus 23 in the SBIHS

Leviticus 23 in the SBIIS

Leviticus 23 in the SBIIS2

Leviticus 23 in the SBIIS3

Leviticus 23 in the SBIKS

Leviticus 23 in the SBIKS2

Leviticus 23 in the SBIMS

Leviticus 23 in the SBIOS

Leviticus 23 in the SBIPS

Leviticus 23 in the SBISS

Leviticus 23 in the SBITS

Leviticus 23 in the SBITS2

Leviticus 23 in the SBITS3

Leviticus 23 in the SBITS4

Leviticus 23 in the SBIUS

Leviticus 23 in the SBIVS

Leviticus 23 in the SBT

Leviticus 23 in the SBT1E

Leviticus 23 in the SCHL

Leviticus 23 in the SNT

Leviticus 23 in the SUSU

Leviticus 23 in the SUSU2

Leviticus 23 in the SYNO

Leviticus 23 in the TBIAOTANT

Leviticus 23 in the TBT1E

Leviticus 23 in the TBT1E2

Leviticus 23 in the TFTIP

Leviticus 23 in the TFTU

Leviticus 23 in the TGNTATF3T

Leviticus 23 in the THAI

Leviticus 23 in the TNFD

Leviticus 23 in the TNT

Leviticus 23 in the TNTIK

Leviticus 23 in the TNTIL

Leviticus 23 in the TNTIN

Leviticus 23 in the TNTIP

Leviticus 23 in the TNTIZ

Leviticus 23 in the TOMA

Leviticus 23 in the TTENT

Leviticus 23 in the UBG

Leviticus 23 in the UGV

Leviticus 23 in the UGV2

Leviticus 23 in the UGV3

Leviticus 23 in the VBL

Leviticus 23 in the VDCC

Leviticus 23 in the YALU

Leviticus 23 in the YAPE

Leviticus 23 in the YBVTP

Leviticus 23 in the ZBP