Nehemiah 7 (BOICB)

1 Mgbe e wuzichara mgbidi ahụ, na mgbe m guzobesịrị ibo nʼọnụ ụzọ ya niile nʼọnọdụ ha, họpụtakwa ndị ọbụ abụ na ndị nche, na ndị Livayị. 2 Enyefere m ọrụ ilekọta Jerusalem nʼaka nwanne m nwoke bụ Hanani, ya na Hananaya onye bụ onyeisi ụlọ ukwu ahụ e wusiri ike, nʼihi na ọ bụ nwoke na-ekwu eziokwu, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke karịa ọtụtụ ndị ọzọ. 3 Agwara m ha, “Na-emeghenụ ọnụ ụzọ ama naanị mgbe chi bọziri nke ọma. Kpọchiekwa ha mgbe ndị nche ka nọ na nche. Họpụtakwanụ ndị bi na Jerusalem ka ha bụrụ ndị nche. Ụfọdụ ga-eche nʼebe a họpụtara ha, ụfọdụ ga-eche nʼakụkụ ụlọ nke aka ha.” 4 Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị. 5 Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya: 6 Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya. 7 Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a: 8 Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172), 9 nke Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372), 10 nke Ara, narị isii na iri ise na abụọ (652), 11 nke Pahat-Moab site nʼụmụ Jeshua na Joab, puku abụọ, na narị asatọ na iri na asatọ (2,818), 12 nke Elam, otu puku, na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254), 13 nke Zatu, narị asatọ na iri anọ na ise (845), 14 nke Zakai, narị asaa na iri isii (760), 15 nke Binui, narị isii na iri anọ na asatọ (648), 16 nke Bebai, narị isii na iri abụọ na asatọ (628), 17 nke Azgad, puku abụọ, na narị atọ na iri abụọ na abụọ (2,322), 18 nke Adonikam, narị isii na iri isii na asaa (667), 19 nke Bigvai, puku abụọ, na iri isii na asaa (2,067), 20 nke Adin, narị isii na iri ise na ise (655), 21 nke Atea (site na Hezekaya), iri itoolu na asatọ (98), 22 nke Hashum, narị atọ na iri atọ na asatọ (328), 23 nke Bezai, narị atọ na iri abụọ na anọ (324), 24 nke Harif, otu narị na iri na abụọ (112), 25 nke Gibiọn, iri itoolu na ise (95). 26 Ndị ikom Betlehem na Netofa, otu narị na iri asatọ na asatọ (188), 27 ndị Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128), 28 ndị Bet-Azmavet, iri anọ na abụọ (42), 29 ndị Kiriat Jearim, Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743), 30 ndị Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621), 31 ndị Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122), 32 ndị Betel na Ai, otu narị na iri abụọ na atọ (123), 33 ndị Nebo nke ọzọ, iri ise na abụọ (52), 34 ndị agbụrụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254), 35 ndị Harim, narị atọ na iri abụọ (320), 36 ndị Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345), 37 ndị Lod, Hadid, na Ono, narị asaa na iri abụọ na otu (721), 38 ndị Senaa, puku atọ, na narị itoolu na iri atọ (3,930). 39 Ndị nchụaja:ndị agbụrụ Jedaya site nʼezinaụlọ Jeshua, narị itoolu na iri asaa na atọ (973), 40 ndị Imea, otu puku, na iri ise na abụọ (1,052), 41 ndị Pashua, otu puku, na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247), 42 ndị Harim, otu puku, na iri na asaa (1,017). 43 Ndị Livayị:ndị agbụrụ Jeshua site na Kadmiel nke ụmụ Hodavaya, iri asaa na anọ (74). 44 Ndị ọbụ abụ:ndị agbụrụ Asaf, otu narị, na iri anọ na asatọ (148). 45 Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu:ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai otu narị, na iri atọ na asatọ (138). 46 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ:ndị agbụrụ Ziha, Hasufa na ndị Tabaot, 47 Keros, Sia, Padon, 48 Lebana, Hagaba, Shalmai, 49 Hanan, Gidel, Gaha, 50 Reaya, Rezin, Nekoda, 51 Gazam, Ụza, Pasea, 52 Besai, Meunim, Nefusim, 53 Bakbuk, Hakufa, Hahua, 54 Bazlut, Mehida, Hasha, 55 Bakos, Sisera, Tema, 56 Nezaya na Hatifa. 57 Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi,ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Soferat, Perida, 58 Jaala, Dakon, Gidel, 59 Shefataya, Hatil,Pokeret-Hazebaim na Amọn. 60 Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392). 61 Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel. 62 Ndị agbụrụ:Delaya, ndị Tobaya na ndị Nekoda, narị isii na iri anọ na abụọ (642). 63 Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja:Ndị agbụrụ:Hobaya, Hakoz na Bazilai (nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead a kpọọ ya aha nʼaha ha). 64 Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha nʼihi ya e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha. 65 Nʼihi nke a, onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe aja dịkarịsịrị nsọ, tutu ruo mgbe a ga-enwe onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase. 66 Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ na iri isii (42,360), 67 nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa, na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ dị narị abụọ, na iri anọ na ise (245). 68 Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ịnyịnya muul narị abụọ na iri anọ na ise (245), 69 ịnyịnya kamel dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa na iri abụọ (6,720). 70 Ma ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye maka ọrụ ahụ. Onyeisi ọchịchị tinyere nʼụlọakụ otu puku darik ọlaedo (1,000), iri efere ọlaedo ise (50) na uwe ndị nchụaja narị ise na iri atọ (530). 71 Ụfọdụ ndịisi ezinaụlọ tinyere nʼụlọakụ maka ije ozi ahụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na ọtụtụ minas ọlaọcha puku abụọ na narị abụọ (2,200). 72 Nkpọkọta ọnụọgụgụ nke ndị mmadụ fọdụrụ nyere bụ, darik ọlaedo puku iri abụọ (20,000), na minas ọlaọcha puku abụọ (2,000), na uwe ndị nchụaja iri isii na asaa (67). 73 Ndị nchụaja, na ndị Livayị, na ndị nche ọnụ ụzọ, ndị ọbụ abụ na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ na ndị Izrel niile fọdụrụ, gara birikwa nʼobodo nke ha.Mgbe ọnwa asaa ruru, nʼoge a ndị Izrel niile e birila nʼobodo nke aka ha,

In Other Versions

Nehemiah 7 in the ANGEFD

Nehemiah 7 in the ANTPNG2D

Nehemiah 7 in the AS21

Nehemiah 7 in the BAGH

Nehemiah 7 in the BBPNG

Nehemiah 7 in the BBT1E

Nehemiah 7 in the BDS

Nehemiah 7 in the BEV

Nehemiah 7 in the BHAD

Nehemiah 7 in the BIB

Nehemiah 7 in the BLPT

Nehemiah 7 in the BNT

Nehemiah 7 in the BNTABOOT

Nehemiah 7 in the BNTLV

Nehemiah 7 in the BOATCB

Nehemiah 7 in the BOATCB2

Nehemiah 7 in the BOBCV

Nehemiah 7 in the BOCNT

Nehemiah 7 in the BOECS

Nehemiah 7 in the BOGWICC

Nehemiah 7 in the BOHCB

Nehemiah 7 in the BOHCV

Nehemiah 7 in the BOHLNT

Nehemiah 7 in the BOHNTLTAL

Nehemiah 7 in the BOILNTAP

Nehemiah 7 in the BOITCV

Nehemiah 7 in the BOKCV

Nehemiah 7 in the BOKCV2

Nehemiah 7 in the BOKHWOG

Nehemiah 7 in the BOKSSV

Nehemiah 7 in the BOLCB

Nehemiah 7 in the BOLCB2

Nehemiah 7 in the BOMCV

Nehemiah 7 in the BONAV

Nehemiah 7 in the BONCB

Nehemiah 7 in the BONLT

Nehemiah 7 in the BONUT2

Nehemiah 7 in the BOPLNT

Nehemiah 7 in the BOSCB

Nehemiah 7 in the BOSNC

Nehemiah 7 in the BOTLNT

Nehemiah 7 in the BOVCB

Nehemiah 7 in the BOYCB

Nehemiah 7 in the BPBB

Nehemiah 7 in the BPH

Nehemiah 7 in the BSB

Nehemiah 7 in the CCB

Nehemiah 7 in the CUV

Nehemiah 7 in the CUVS

Nehemiah 7 in the DBT

Nehemiah 7 in the DGDNT

Nehemiah 7 in the DHNT

Nehemiah 7 in the DNT

Nehemiah 7 in the ELBE

Nehemiah 7 in the EMTV

Nehemiah 7 in the ESV

Nehemiah 7 in the FBV

Nehemiah 7 in the FEB

Nehemiah 7 in the GGMNT

Nehemiah 7 in the GNT

Nehemiah 7 in the HARY

Nehemiah 7 in the HNT

Nehemiah 7 in the IRVA

Nehemiah 7 in the IRVB

Nehemiah 7 in the IRVG

Nehemiah 7 in the IRVH

Nehemiah 7 in the IRVK

Nehemiah 7 in the IRVM

Nehemiah 7 in the IRVM2

Nehemiah 7 in the IRVO

Nehemiah 7 in the IRVP

Nehemiah 7 in the IRVT

Nehemiah 7 in the IRVT2

Nehemiah 7 in the IRVU

Nehemiah 7 in the ISVN

Nehemiah 7 in the JSNT

Nehemiah 7 in the KAPI

Nehemiah 7 in the KBT1ETNIK

Nehemiah 7 in the KBV

Nehemiah 7 in the KJV

Nehemiah 7 in the KNFD

Nehemiah 7 in the LBA

Nehemiah 7 in the LBLA

Nehemiah 7 in the LNT

Nehemiah 7 in the LSV

Nehemiah 7 in the MAAL

Nehemiah 7 in the MBV

Nehemiah 7 in the MBV2

Nehemiah 7 in the MHNT

Nehemiah 7 in the MKNFD

Nehemiah 7 in the MNG

Nehemiah 7 in the MNT

Nehemiah 7 in the MNT2

Nehemiah 7 in the MRS1T

Nehemiah 7 in the NAA

Nehemiah 7 in the NASB

Nehemiah 7 in the NBLA

Nehemiah 7 in the NBS

Nehemiah 7 in the NBVTP

Nehemiah 7 in the NET2

Nehemiah 7 in the NIV11

Nehemiah 7 in the NNT

Nehemiah 7 in the NNT2

Nehemiah 7 in the NNT3

Nehemiah 7 in the PDDPT

Nehemiah 7 in the PFNT

Nehemiah 7 in the RMNT

Nehemiah 7 in the SBIAS

Nehemiah 7 in the SBIBS

Nehemiah 7 in the SBIBS2

Nehemiah 7 in the SBICS

Nehemiah 7 in the SBIDS

Nehemiah 7 in the SBIGS

Nehemiah 7 in the SBIHS

Nehemiah 7 in the SBIIS

Nehemiah 7 in the SBIIS2

Nehemiah 7 in the SBIIS3

Nehemiah 7 in the SBIKS

Nehemiah 7 in the SBIKS2

Nehemiah 7 in the SBIMS

Nehemiah 7 in the SBIOS

Nehemiah 7 in the SBIPS

Nehemiah 7 in the SBISS

Nehemiah 7 in the SBITS

Nehemiah 7 in the SBITS2

Nehemiah 7 in the SBITS3

Nehemiah 7 in the SBITS4

Nehemiah 7 in the SBIUS

Nehemiah 7 in the SBIVS

Nehemiah 7 in the SBT

Nehemiah 7 in the SBT1E

Nehemiah 7 in the SCHL

Nehemiah 7 in the SNT

Nehemiah 7 in the SUSU

Nehemiah 7 in the SUSU2

Nehemiah 7 in the SYNO

Nehemiah 7 in the TBIAOTANT

Nehemiah 7 in the TBT1E

Nehemiah 7 in the TBT1E2

Nehemiah 7 in the TFTIP

Nehemiah 7 in the TFTU

Nehemiah 7 in the TGNTATF3T

Nehemiah 7 in the THAI

Nehemiah 7 in the TNFD

Nehemiah 7 in the TNT

Nehemiah 7 in the TNTIK

Nehemiah 7 in the TNTIL

Nehemiah 7 in the TNTIN

Nehemiah 7 in the TNTIP

Nehemiah 7 in the TNTIZ

Nehemiah 7 in the TOMA

Nehemiah 7 in the TTENT

Nehemiah 7 in the UBG

Nehemiah 7 in the UGV

Nehemiah 7 in the UGV2

Nehemiah 7 in the UGV3

Nehemiah 7 in the VBL

Nehemiah 7 in the VDCC

Nehemiah 7 in the YALU

Nehemiah 7 in the YAPE

Nehemiah 7 in the YBVTP

Nehemiah 7 in the ZBP