Numbers 29 (BOICB)

1 “ ‘Ụbọchị unu ga-egbu opi ike ga-adị nʼabalị mbụ nke ọnwa asaa nʼafọ ọbụla. Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke mmadụ niile. Unu agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ. 2 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị ONYENWE ANYỊ ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ. 3 Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule, 4 na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla. 5 Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu. 6 Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ ONYENWE ANYỊ, aja nwere isisi dị ụtọ. 7 “ ‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ. 8 Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụrụ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ, nke isisi ya na-atọ ya ụtọ. A ga-eji otu nwa oke ehi, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja a. 9 Aja mkpụrụ ọka ga-eso ya. A ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ aja nwa oke ehi ahụ. Jiri lita ụtụ ọka anọ na ọkara chụọ aja ebule, 10 jirikwa lita ụtụ ọka abụọ chụọ aja nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla. 11 Tinyekwa otu mkpi a ga-eji chụọ aja mmehie. A ga-atụkwasị nke a nʼaja mkpuchi mmehie a na-achụ, tinyere aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ niile. 12 “ ‘Nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, a ga-enwe mkpọkọta dị nsọ nke ụmụ Izrel niile. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmalite mmemme abalị asaa nʼihu ONYENWE ANYỊ. 13 Cheenụ onyinye a na-enye site nʼọkụ nʼihu ONYENWE ANYỊ nke isisi ya na-atọ ya ụtọ, jirinụ oke ehi iri na atọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị na-enweghị ntụpọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, chụọ aja nsure ọkụ. 14 A ga-atụkwasịkwa aja mkpụrụ ọka nke e ji lita ụtụ ọka isii na ọkara gwakọta ya na mmanụ, nʼisi otu nʼime oke ehi iri na atọ ndị ahụ niile. Lita anọ na ọkara nʼisi otu ebule nʼime ebule abụọ ndị ahụ, 15 ma lita abụọ nʼisi otu nʼime nwa atụrụ ọbụla. 16 Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha. 17 “ ‘Nʼụbọchị abụọ nke mmemme a, a ga-eji oke ehi iri na abụọ, ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja. 18 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha, bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 19 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha. 20 “ ‘Nʼụbọchị nke atọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri na otu, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja. 21 Ihe ga-eso aja oke ehi na ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 22 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha. 23 “ ‘Nʼụbọchị nke anọ nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi iri, ebule abụọ, ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja. 24 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 25 Tinyekwa otu mkpi maka ịchụ aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, tinyere aja mkpụrụ ọka, na aja onyinye ihe ọṅụṅụ so ha. 26 “ ‘Nʼụbọchị nke ise nke mmemme a, ị ga-ewere ụmụ oke ehi itoolu, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ aja. 27 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 28 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha. 29 “ ‘Nʼụbọchị nke isii nke mmemme ahụ, ị ga-ewere ụmụ oke ehi asatọ, na ebule abụọ, na ụmụ ebule iri na anọ ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja. 30 Ihe ga-eso aja oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 31 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha. 32 “ ‘Nʼụbọchị nke asaa nke mmemme ahụ, were ụmụ oke ehi asaa, ebule abụọ na ụmụ ebule iri na anọ, ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ aja. 33 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ nʼọnụọgụgụ ha bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 34 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie, ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha. 35 “ ‘Nʼụbọchị nke asatọ ndị Izrel niile ga-enwe oke nzukọ. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ. 36 Chụọ aja nsure ọkụ, nke isisi ya dị ONYENWE ANYỊ ezi ụtọ. Ị ga-eji otu nwa oke ehi, otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, chụọ ya. 37 Ihe ga-eso aja oke ehi, ebule na ụmụ atụrụ ndị ahụ bụ aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dịka e si nye ya nʼiwu. 38 Tinyekwa otu mkpi maka aja mmehie ya na aja nsure ọkụ a na-achụ nʼoge ha, na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ so ha. 39 “ ‘Tinyere onyinye a na-enye dịka nkwa e kwere si dị, na onyinye afọ ofufu unu, unu ga-akwadoro ONYENWE ANYỊ onyinye ndị a nʼoge mmemme a kara aka unu: aja nsure ọkụ unu, onyinye mkpụrụ ọka na onyinye ihe ọṅụṅụ na aja udo.’ ” 40 Ya mere Mosis gwara ụmụ Izrel ihe niile ONYENWE ANYỊ nyere ya nʼiwu ịgwa ha.

In Other Versions

Numbers 29 in the ANGEFD

Numbers 29 in the ANTPNG2D

Numbers 29 in the AS21

Numbers 29 in the BAGH

Numbers 29 in the BBPNG

Numbers 29 in the BBT1E

Numbers 29 in the BDS

Numbers 29 in the BEV

Numbers 29 in the BHAD

Numbers 29 in the BIB

Numbers 29 in the BLPT

Numbers 29 in the BNT

Numbers 29 in the BNTABOOT

Numbers 29 in the BNTLV

Numbers 29 in the BOATCB

Numbers 29 in the BOATCB2

Numbers 29 in the BOBCV

Numbers 29 in the BOCNT

Numbers 29 in the BOECS

Numbers 29 in the BOGWICC

Numbers 29 in the BOHCB

Numbers 29 in the BOHCV

Numbers 29 in the BOHLNT

Numbers 29 in the BOHNTLTAL

Numbers 29 in the BOILNTAP

Numbers 29 in the BOITCV

Numbers 29 in the BOKCV

Numbers 29 in the BOKCV2

Numbers 29 in the BOKHWOG

Numbers 29 in the BOKSSV

Numbers 29 in the BOLCB

Numbers 29 in the BOLCB2

Numbers 29 in the BOMCV

Numbers 29 in the BONAV

Numbers 29 in the BONCB

Numbers 29 in the BONLT

Numbers 29 in the BONUT2

Numbers 29 in the BOPLNT

Numbers 29 in the BOSCB

Numbers 29 in the BOSNC

Numbers 29 in the BOTLNT

Numbers 29 in the BOVCB

Numbers 29 in the BOYCB

Numbers 29 in the BPBB

Numbers 29 in the BPH

Numbers 29 in the BSB

Numbers 29 in the CCB

Numbers 29 in the CUV

Numbers 29 in the CUVS

Numbers 29 in the DBT

Numbers 29 in the DGDNT

Numbers 29 in the DHNT

Numbers 29 in the DNT

Numbers 29 in the ELBE

Numbers 29 in the EMTV

Numbers 29 in the ESV

Numbers 29 in the FBV

Numbers 29 in the FEB

Numbers 29 in the GGMNT

Numbers 29 in the GNT

Numbers 29 in the HARY

Numbers 29 in the HNT

Numbers 29 in the IRVA

Numbers 29 in the IRVB

Numbers 29 in the IRVG

Numbers 29 in the IRVH

Numbers 29 in the IRVK

Numbers 29 in the IRVM

Numbers 29 in the IRVM2

Numbers 29 in the IRVO

Numbers 29 in the IRVP

Numbers 29 in the IRVT

Numbers 29 in the IRVT2

Numbers 29 in the IRVU

Numbers 29 in the ISVN

Numbers 29 in the JSNT

Numbers 29 in the KAPI

Numbers 29 in the KBT1ETNIK

Numbers 29 in the KBV

Numbers 29 in the KJV

Numbers 29 in the KNFD

Numbers 29 in the LBA

Numbers 29 in the LBLA

Numbers 29 in the LNT

Numbers 29 in the LSV

Numbers 29 in the MAAL

Numbers 29 in the MBV

Numbers 29 in the MBV2

Numbers 29 in the MHNT

Numbers 29 in the MKNFD

Numbers 29 in the MNG

Numbers 29 in the MNT

Numbers 29 in the MNT2

Numbers 29 in the MRS1T

Numbers 29 in the NAA

Numbers 29 in the NASB

Numbers 29 in the NBLA

Numbers 29 in the NBS

Numbers 29 in the NBVTP

Numbers 29 in the NET2

Numbers 29 in the NIV11

Numbers 29 in the NNT

Numbers 29 in the NNT2

Numbers 29 in the NNT3

Numbers 29 in the PDDPT

Numbers 29 in the PFNT

Numbers 29 in the RMNT

Numbers 29 in the SBIAS

Numbers 29 in the SBIBS

Numbers 29 in the SBIBS2

Numbers 29 in the SBICS

Numbers 29 in the SBIDS

Numbers 29 in the SBIGS

Numbers 29 in the SBIHS

Numbers 29 in the SBIIS

Numbers 29 in the SBIIS2

Numbers 29 in the SBIIS3

Numbers 29 in the SBIKS

Numbers 29 in the SBIKS2

Numbers 29 in the SBIMS

Numbers 29 in the SBIOS

Numbers 29 in the SBIPS

Numbers 29 in the SBISS

Numbers 29 in the SBITS

Numbers 29 in the SBITS2

Numbers 29 in the SBITS3

Numbers 29 in the SBITS4

Numbers 29 in the SBIUS

Numbers 29 in the SBIVS

Numbers 29 in the SBT

Numbers 29 in the SBT1E

Numbers 29 in the SCHL

Numbers 29 in the SNT

Numbers 29 in the SUSU

Numbers 29 in the SUSU2

Numbers 29 in the SYNO

Numbers 29 in the TBIAOTANT

Numbers 29 in the TBT1E

Numbers 29 in the TBT1E2

Numbers 29 in the TFTIP

Numbers 29 in the TFTU

Numbers 29 in the TGNTATF3T

Numbers 29 in the THAI

Numbers 29 in the TNFD

Numbers 29 in the TNT

Numbers 29 in the TNTIK

Numbers 29 in the TNTIL

Numbers 29 in the TNTIN

Numbers 29 in the TNTIP

Numbers 29 in the TNTIZ

Numbers 29 in the TOMA

Numbers 29 in the TTENT

Numbers 29 in the UBG

Numbers 29 in the UGV

Numbers 29 in the UGV2

Numbers 29 in the UGV3

Numbers 29 in the VBL

Numbers 29 in the VDCC

Numbers 29 in the YALU

Numbers 29 in the YAPE

Numbers 29 in the YBVTP

Numbers 29 in the ZBP