Psalms 149 (BOICB)
1 Toonu ONYENWE ANYỊ! Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ ọhụrụ.Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. 2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze ha. 3 Ka ha jiri ite egwu too aha yaka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. 4 Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ ONYENWE ANYỊ ụtọ.Ọ na-eji nzọpụta kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. 5 Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. 6 Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,ka mma agha ihu abụọ dịrịkwa nʼaka ha, 7 iji bọọrọ mba niile ọbọtaakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ, 8 iji mkpọrọ igwe kee ndị eze hana ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe, 9 imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. Toonu ONYENWE ANYỊ.