1 Chronicles 27 (BOICB)
1 Nke a bụ usoro ndị Izrel, dịka ọnụọgụgụ ha si dị, ndịisi ezinaụlọ, na ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi ha, bụ ndị na-ejere eze ozi nʼihe niile gbasara nkewa e kewara ndị agha dịka ịrụ ọrụ ha si dị nʼọnwa nʼọnwa nʼime ọnwa niile nke afọ. Nkewa ọbụla nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku ndị agha abụọ na anọ (24,000). 2 Ndị a bụ aha ọchịagha na-achị ndị agha nʼọnwa ọbụla. Onyeisi nkewa nke mbụ, maka ọnwa nke mbụ bụ Jashobeam nwa Zabdiel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 3 O si nʼikwu Perez nke dị nʼebo Juda, ọ bụ onyeisi ndịisi agha nke ọnwa mbụ. 4 Onyeisi nkewa nke abụọ, maka ọnwa nke abụọ bụ Dodayi, nwa Ahohi bụ onyeisi agha nkewa nke abụọ. Miklot bụ onyendu otu a, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa a bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 5 Onyeisi nkewa nke atọ, maka ọnwa nke atọ bụ Benaya nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ọ bụ onyeisi, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 6 Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a. 7 Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ. 8 Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 9 Onyeisi nkewa nke isii, maka ọnwa nke isii bụ Ira nwa Ikesh, onye Tekoa, bụ onyeisi agha nkewa nke isii. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 10 Onyeisi nkewa nke asaa, maka ọnwa nke asaa bụ Helez onye Pelon. Onye sitere nʼikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 11 Onyeisi nkewa nke asatọ, maka ọnwa nke asatọ bụ Sibekai onye Husha. Onye sitere nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 12 Onyeisi nkewa nke itoolu, maka ọnwa nke itoolu bụ Abieza onye Anatot. Onye sitere nʼikwu Benjamin. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 13 Onyeisi nkewa nke iri, maka ọnwa nke iri bụ Maharai onye Netofa, site nʼikwu Zera. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 14 Onyeisi nkewa nke iri na otu, maka ọnwa nke iri na otu bụ Benaya onye Piraton, nke ikwu Ifrem. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 15 Onyeisi nkewa nke iri na abụọ, maka ọnwa nke iri na abụọ bụ Heldai onye Netofa. Onye sitere nʼezinaụlọ Otniel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 16 Ndị a bụ ndị ndu ebo Izrel niile: Elieza nwa Zikri bụ onyendu ndị Ruben;Shefataya nwa Maaka bụ onyendu ndị Simiọn; 17 Hashabaya nwa Kemuel bụ onyendu ndị Livayị;Zadọk bụ onyendu ụmụ Erọn; 18 Elihu nwanne Devid bụ onyendu ndị Juda;Omri nwa Maikel bụ onyendu ndị Isaka; 19 Ishmaya nwa Ọbadaya bụ onyendu ndị Zebụlọn;Jerimot nwa Azriel bụ onyendu ndị Naftalị; 20 Hoshea nwa Azazaya bụ onyendu ndị Ifrem;Juel nwa Pedaya bụ onyendu ọkara ebo Manase; 21 Ido nwa Zekaraya bụ onyendu ọkara ebo Manase nke ọzọ dị na Gilead;Jaasiel nwa Abna bụ onyendu ndị Benjamin; 22 Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile. 23 Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na ONYENWE ANYỊ kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe. 24 Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere. 25 Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze.Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile. 26 Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya. 27 Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile.Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha. 28 Baal-Hanan onye Gedera na-elekọta ubi oliv na osisi sikamọ eze, nke dị nʼoke ala ndị Filistia na Izrel.Joash ka ọ dị nʼaka iweta mmanụ oliv. 29 Shitrai onye Sharọn na-elekọta igwe ehi eze ndị na-ata nri na Sharọn.Shafat nwa Adlai na-elekọta igwe ehi ndị nke dị nʼala ndagwurugwu. 30 Obil onye Ishmel nwe ilekọta ịnyịnya kamel eze.Jehdeia onye Meronot na-elekọta ịnyịnya ibu. 31 Jaziz onye Haga bụ onyeisi na-elekọta igwe atụrụ.Ndị a niile bụ ndịisi na-elekọta akụ niile nke eze Devid nwere. 32 Jonatan nwanne nna Devid bụ onye ndụmọdụ na nwoke nwere ezi nghọta. Ọ bụkwa ode akwụkwọ.Jehiel nwa Hakmoni bụ onye na-elekọta ụmụ eze ndị ikom. 33 Ahitofel bụ onye na-adụ eze ọdụ.Hushaị onye Akai bụ enyi eze. 34 Mgbe Ahitofel nwụrụ, Jehoiada nwa Benaya na Abịata nọchiri anya ya.Joab bụ ọchịagha igwe ndị agha eze.
In Other Versions
1 Chronicles 27 in the ANTPNG2D
1 Chronicles 27 in the BNTABOOT
1 Chronicles 27 in the BOATCB2
1 Chronicles 27 in the BOGWICC
1 Chronicles 27 in the BOHNTLTAL
1 Chronicles 27 in the BOILNTAP
1 Chronicles 27 in the BOKHWOG
1 Chronicles 27 in the KBT1ETNIK
1 Chronicles 27 in the TBIAOTANT