1 Kings 3 (BOICB)

1 Solomọn na Fero eze Ijipt jikọtara onwe ha nʼotu, ọ lụrụ nwa nwanyị Fero. Ọ kpọbatara ya nʼobodo Devid ruo mgbe o wusiri ụlọeze ya na ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, na mgbidi gbara Jerusalem gburugburu. 2 Nʼoge ahụ, ndị Izrel ka na-achụ aja ha nʼebe dị elu niile, nʼihi na ewubeghị ụlọnsọ ukwu nye aha ONYENWE ANYỊ. 3 Ma Solomọn gosiri ịhụnanya nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ, site na ịgbaso ntụziaka niile nke Devid nna ya nyere ya, ọ bụ naanị na ọ chụrụ ọtụtụ aja dị iche iche, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe dị elu dị iche iche. 4 Eze gara Gibiọn nʼihi ịchụ aja, nʼihi na ebe ahụ bụ ebe kachasị mkpa, dị elu. Solomọn chụrụ otu puku aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 5 Na Gibiọn, ONYENWE ANYỊ mere ka Solomọn hụ ya anya na nrọ nke abalị, Chineke sịrị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.” 6 Solomọn zara sị, “I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa. 7 “Ugbu a, ONYENWE ANYỊ bụ Chineke m, i meela ohu gị eze nʼọnọdụ nna m, bụ Devid. Ma abụ m naanị nwantakịrị na-amaghị otu esi apụ ma na-abatakwa. 8 Ohu gị nọ nʼebe a, nʼetiti ndị gị ị họpụtara, ndị bara ụba nke ukwuu, ndị a na-adịghị agụta ọnụ nʼihi nʼọnụọgụgụ ha babigara ụba oke. 9 Ya mere, nye ohu gị uche nghọta nke m ga-eji chịa ndị gị, na ịghọta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe. Nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?” 10 Ọ masịrị Onyenwe anyị na Solomọn rịọrọ nke a. 11 Ya mere, Chineke zara sị ya, “Nʼihi na ị rịọrọ amamihe na nghọta ị ga-eji chịa ndị m, ma ị rịọghị m ka m nye gị ndụ ogologo, maọbụ akụnụba, maọbụ ọnwụ nye ndị iro gị. 12 Aga m eme dịka ihe ị rịọrọ si dị. Aga m enye gị obi maara ihe na uche ịghọta ihe ziri ezi, nke ga-abụ na ọ dịghị onye ọbụla dịka gị, ọ dịghịkwa onye ọbụla ga-adị ka gị. 13 Ọzọkwa, aga m enyekwa gị ihe ndị ahụ ị na-arịọghị m, akụnụba, na nsọpụrụ, ka ọ ga-abụ nʼụbọchị niile nke ndụ gị, ị gaghị enwe onye ọbụla ga-adị ka gị nʼetiti ndị eze niile. 14 Ọ bụrụkwa na i jee ije nʼụzọ m niile, debe iwu m, meekwa ihe m gwara gị, dịka nna gị Devid mere, aga m enye gị ogologo ndụ.” 15 Mgbe ahụ, Solomọn si nʼụra teta, ghọtakwa na ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ.Ọ lọtara na Jerusalem bata guzo nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, chụọ aja nsure ọkụ na aja udo. Emesịa, o meere ndị na-ejere ya ozi oke oriri. 16 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ nwanyị akwụna abụọ bịakwutere eze, guzo nʼihu ya. 17 Otu nʼime ha gwara ya sị, “Onyenwe m, mụ na nwanyị a bi nʼotu ụlọ. Anyị abụọ dịkwa ime. Ma eburu m ya ụzọ mụọ nwa nke m. 18 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị ka m mụsịrị nwa, ya onwe ya mụkwara nwa nke ya. Naanị anyị abụọ bi, o nweghị onye ọzọ binyere anyị. 19 “Ma nʼotu abalị, nwa ya nwụrụ mgbe o dinakwasịrị ya nʼoge ọ na-arahụ ụra. 20 Mgbe o biliri nʼetiti abalị, chọpụtara na nwa ya anwụọla, o kuuru ya nibe ya nʼakụkụ m, kurukwanụ nwa nke m dị ndụ nibe nʼakụkụ ya onwe ya. 21 Nʼisi ụtụtụ, mgbe m tetara nʼụra chọọ inye nwa m ara, achọpụtara m na ọ nwụọla. Ma mgbe m leziri ya anya nke ọma ka chi bọrọ, ahụrụ m na nwa mụ na ya dina abụghị nwa nke m mụrụ.” 22 Mgbe ahụ, nwanyị nke ọzọ kwuru sị, “Mba, nwantakịrị ahụ dị ndụ bụ nwa m, ma nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Nwanyị nke mbụ zara sị,“Mba, ọ bụghị eziokwu; nwa nke nwụrụ anwụ bụ nke gị, ma nke dị ndụ bụ nke m.” Otu a ka ha si na-arụrịta ụka nʼihu eze. 23 Eze kwuru sị, “Onye nke a na-asị, ‘Nwa m bụ nke dị ndụ, ma nke gị bụ nke nwụrụ anwụ,’ mgbe onye nke ọzọ na-asị, ‘Mba! Nwa gị bụ nke nwụrụ anwụ, ma nke m bụ nke dị ndụ.’ ” 24 Mgbe ahụ, eze sịrị, “Wetara m mma agha.” Ya mere, ha wetaara eze mma agha. 25 Eze nyere iwu sị, “Kpọwaa nwa ahụ dị ndụ ụzọ abụọ, were otu ọkara nye otu onye, werekwa nke ọzọ nye onye nke ọzọ.” 26 Nwanyị ahụ nwa ya dị ndụ jupụtara nʼọmịiko nʼebe nwa ya nọ, ọ gwara eze sị, “Biko, onyenwe m, kunye ya nwantakịrị ahụ dị ndụ. Egbukwala ya.”Ma onye nke ọzọ sịrị, “Kpọwaa ya abụọ. Nwa a agaghị abụ nke gị, ọ gaghị abụkwa nke m.” 27 Mgbe ahụ, eze kpebiri ikpe sị, “Kuru nwantakịrị a dị ndụ kunye ya nwanyị ahụ chọrọ ka ọ dị ndụ. Egbula ya, nʼihi na nwanyị ahụ bụ nne ya.” 28 Mgbe ndị Izrel niile nụrụ otu eze si kpebie ikpe a, ha sitere nʼịtụ egwu nye eze nsọpụrụ, nʼihi na ha hụrụ na o si nʼaka Chineke nweta amamihe ikpe ikpe ziri ezi.

In Other Versions

1 Kings 3 in the ANGEFD

1 Kings 3 in the ANTPNG2D

1 Kings 3 in the AS21

1 Kings 3 in the BAGH

1 Kings 3 in the BBPNG

1 Kings 3 in the BBT1E

1 Kings 3 in the BDS

1 Kings 3 in the BEV

1 Kings 3 in the BHAD

1 Kings 3 in the BIB

1 Kings 3 in the BLPT

1 Kings 3 in the BNT

1 Kings 3 in the BNTABOOT

1 Kings 3 in the BNTLV

1 Kings 3 in the BOATCB

1 Kings 3 in the BOATCB2

1 Kings 3 in the BOBCV

1 Kings 3 in the BOCNT

1 Kings 3 in the BOECS

1 Kings 3 in the BOGWICC

1 Kings 3 in the BOHCB

1 Kings 3 in the BOHCV

1 Kings 3 in the BOHLNT

1 Kings 3 in the BOHNTLTAL

1 Kings 3 in the BOILNTAP

1 Kings 3 in the BOITCV

1 Kings 3 in the BOKCV

1 Kings 3 in the BOKCV2

1 Kings 3 in the BOKHWOG

1 Kings 3 in the BOKSSV

1 Kings 3 in the BOLCB

1 Kings 3 in the BOLCB2

1 Kings 3 in the BOMCV

1 Kings 3 in the BONAV

1 Kings 3 in the BONCB

1 Kings 3 in the BONLT

1 Kings 3 in the BONUT2

1 Kings 3 in the BOPLNT

1 Kings 3 in the BOSCB

1 Kings 3 in the BOSNC

1 Kings 3 in the BOTLNT

1 Kings 3 in the BOVCB

1 Kings 3 in the BOYCB

1 Kings 3 in the BPBB

1 Kings 3 in the BPH

1 Kings 3 in the BSB

1 Kings 3 in the CCB

1 Kings 3 in the CUV

1 Kings 3 in the CUVS

1 Kings 3 in the DBT

1 Kings 3 in the DGDNT

1 Kings 3 in the DHNT

1 Kings 3 in the DNT

1 Kings 3 in the ELBE

1 Kings 3 in the EMTV

1 Kings 3 in the ESV

1 Kings 3 in the FBV

1 Kings 3 in the FEB

1 Kings 3 in the GGMNT

1 Kings 3 in the GNT

1 Kings 3 in the HARY

1 Kings 3 in the HNT

1 Kings 3 in the IRVA

1 Kings 3 in the IRVB

1 Kings 3 in the IRVG

1 Kings 3 in the IRVH

1 Kings 3 in the IRVK

1 Kings 3 in the IRVM

1 Kings 3 in the IRVM2

1 Kings 3 in the IRVO

1 Kings 3 in the IRVP

1 Kings 3 in the IRVT

1 Kings 3 in the IRVT2

1 Kings 3 in the IRVU

1 Kings 3 in the ISVN

1 Kings 3 in the JSNT

1 Kings 3 in the KAPI

1 Kings 3 in the KBT1ETNIK

1 Kings 3 in the KBV

1 Kings 3 in the KJV

1 Kings 3 in the KNFD

1 Kings 3 in the LBA

1 Kings 3 in the LBLA

1 Kings 3 in the LNT

1 Kings 3 in the LSV

1 Kings 3 in the MAAL

1 Kings 3 in the MBV

1 Kings 3 in the MBV2

1 Kings 3 in the MHNT

1 Kings 3 in the MKNFD

1 Kings 3 in the MNG

1 Kings 3 in the MNT

1 Kings 3 in the MNT2

1 Kings 3 in the MRS1T

1 Kings 3 in the NAA

1 Kings 3 in the NASB

1 Kings 3 in the NBLA

1 Kings 3 in the NBS

1 Kings 3 in the NBVTP

1 Kings 3 in the NET2

1 Kings 3 in the NIV11

1 Kings 3 in the NNT

1 Kings 3 in the NNT2

1 Kings 3 in the NNT3

1 Kings 3 in the PDDPT

1 Kings 3 in the PFNT

1 Kings 3 in the RMNT

1 Kings 3 in the SBIAS

1 Kings 3 in the SBIBS

1 Kings 3 in the SBIBS2

1 Kings 3 in the SBICS

1 Kings 3 in the SBIDS

1 Kings 3 in the SBIGS

1 Kings 3 in the SBIHS

1 Kings 3 in the SBIIS

1 Kings 3 in the SBIIS2

1 Kings 3 in the SBIIS3

1 Kings 3 in the SBIKS

1 Kings 3 in the SBIKS2

1 Kings 3 in the SBIMS

1 Kings 3 in the SBIOS

1 Kings 3 in the SBIPS

1 Kings 3 in the SBISS

1 Kings 3 in the SBITS

1 Kings 3 in the SBITS2

1 Kings 3 in the SBITS3

1 Kings 3 in the SBITS4

1 Kings 3 in the SBIUS

1 Kings 3 in the SBIVS

1 Kings 3 in the SBT

1 Kings 3 in the SBT1E

1 Kings 3 in the SCHL

1 Kings 3 in the SNT

1 Kings 3 in the SUSU

1 Kings 3 in the SUSU2

1 Kings 3 in the SYNO

1 Kings 3 in the TBIAOTANT

1 Kings 3 in the TBT1E

1 Kings 3 in the TBT1E2

1 Kings 3 in the TFTIP

1 Kings 3 in the TFTU

1 Kings 3 in the TGNTATF3T

1 Kings 3 in the THAI

1 Kings 3 in the TNFD

1 Kings 3 in the TNT

1 Kings 3 in the TNTIK

1 Kings 3 in the TNTIL

1 Kings 3 in the TNTIN

1 Kings 3 in the TNTIP

1 Kings 3 in the TNTIZ

1 Kings 3 in the TOMA

1 Kings 3 in the TTENT

1 Kings 3 in the UBG

1 Kings 3 in the UGV

1 Kings 3 in the UGV2

1 Kings 3 in the UGV3

1 Kings 3 in the VBL

1 Kings 3 in the VDCC

1 Kings 3 in the YALU

1 Kings 3 in the YAPE

1 Kings 3 in the YBVTP

1 Kings 3 in the ZBP