1 Samuel 17 (BOICB)

1 Nʼoge a, ndị Filistia chịkọtara ndị agha ha ọnụ, zukọtaa nʼobodo Sokoh nke dị na Juda maka ibu agha. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼEfes Damim, nke dị nʼagbata Sokoh na Azeka. 2 Mgbe ahụ, Sọl na ndị Izrel niile zukọtara maa ụlọ ikwu nke ha na ndagwurugwu Ịla. Ha doro onwe ha nʼusoro agha izute ndị Filistia. 3 Ndị Filistia doro onwe ha nʼelu ugwu nʼotu akụkụ, ma ndị Izrel dokwara onwe ha nʼelu ugwu nʼakụkụ nke ọzọ. Ndagwurugwu dịkwa nʼetiti ha. 4 Mgbe ahụ, otu onye ọka agha aha ya bụ Golaịat, onye obodo Gat, sitere nʼetiti ụlọ ikwu ndị Filistia pụta. Nwoke a toro ogologo nke ukwuu; ịdị ogologo ya ga-erukwa mita atọ. 5 O kpu okpu agha e ji bronz kpụọ, ma yiri uwe agha nke ịdị arọ bronz e ji kpụọ ya ga-erukwa iri kilogram ise na asaa. 6 O yikwa ihe agha o ji kpuchie ụkwụ ya abụọ nke e ji bronz kpụọ, nyakwasịkwa nʼubu ya ùbe e ji bronz kpụọ. 7 A kpụrụ ùbe ya ka ọ dịrị ka osisi e ji ekwe akwa, jiri igwe ịdị arọ ya ga-eru kilogram asaa kpụọ ọnụ ọnụ ùbe ahụ. Onye na-ebu ọta o ji ekpuchi obi ya nọkwa nʼihu ya. 8 Golaịat guzoro kpọkuo ndị agha Izrel sị ha, “Gịnị mere unu ga-eji pụta guzo nʼusoro ibu agha. Ọ bụ na m abụghị onye Filistia? Ọ bụkwa na unu onwe unu abụghị ndị ozi Sọl? Họpụtaranụ onwe unu otu nwoke, ka ọ bịakwute m. 9 Ọ bụrụ na onye ahụ unu họpụtara etigbuo m, anyị ga-abụrụ unu ndị ohu, ma ọ bụrụkwanụ na m etigbuo ya, unu ga-abụrụ anyị ndị ohu!” 10 Mgbe ahụ, onye Filistia ahụ sịrị, “Taa, ana m ama usuu ndị agha Izrel aka nʼihu! Kpọpụtaranụ m otu nwoke ka mụ na ya lụọ ọgụ.” 11 Mgbe Sọl na ndị agha Izrel nụrụ ihe onye Filistia a kwuru, ha mara jijiji tụọkwa oke egwu. 12 Ma Devid bụ nwa Jesi, onye Efrat nke Betlehem dị na Juda. Jesi mụtara ndị ikom asatọ. Nʼoge nke Sọl, ọ ghọọla agadi nwoke. 13 Atọ nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, ndị bụ okenye, soro Sọl gaa agha. Aha ha bụ Eliab, ọkpara ya, Abinadab, nwa nke abụọ na Shama, nwa nke atọ. 14 Devid bụ ọdụdụ nwa. Ụmụnne ya ndị okenye atọ na-eso Sọl. 15 Ma Devid na-apụ jekwuru Sọl, ma na-alaghachikwa nʼụlọ ịzụ atụrụ nna ya na Betlehem. 16 Golaịat, onye Filistia na-abịaru nso ụtụtụ na uhuruchi, na-eguzo onwe ya otu a iri ụbọchị anọ. 17 Otu ụbọchị, Jesi gwara Devid okwu sị, “Bịa ka i wegara ụmụnne gị otu akpa ọka ndị a e ghere eghe. Chịrịkwa ogbe achịcha iri ndị a chịlara ha. 18 Wegakwara onyeisi usuu ha, iri chiizi, ndị a. Chọpụta otu ihe si agara ụmụnne gị natakwa ha ihe ị ga-egosi anyị na ha dị ndụ.” 19 Ha na Sọl na ndị ikom Izrel niile, nọ na ndagwurugwu Ịla, na-ebuso ndị Filistia agha. 20 Devid biliri njem nʼisi ụtụtụ, hapụ igwe atụrụ ya nʼaka onye na-elekọta atụrụ, buru onyinye ndị ahụ gawa dịka Jesi nyere ya nʼiwu. Ọ bịarutere ụlọ ikwu ndị Izrel mgbe ha na-apụ nʼihu agha, ha na-etikwa mkpu agha. 21 Ndị Izrel na ndị Filistia dokwara onwe ha nʼusoro izute onwe ha nʼagha, ndị agha megide ndị agha. 22 Devid hapụrụ ihe ndị ahụ nʼaka onye na-elekọta akpa niile, gbara ọsọ gaa nʼusoro ndị agha jụọ ụmụnne ya banyere udo ha. 23 Ma mgbe ha na ya nọ na-akparịta ụka, onye mmeri nʼọgbọ agha, onye Filistia nke Gat, Golaịat bụ aha ya, sitere nʼusoro ndị agha Filistia pụta, kwuokwa okwu niile ahụ dịka ọ na-ekwu na mbụ. Devid nụrụ ihe o kwuru. 24 Mgbe ndị Izrel niile hụrụ nwoke a, ha gbara ọsọ pụọ nʼihu ya ma tụọkwa oke egwu. 25 Ndị Izrel sịrị, “Unu hụrụ nwoke a na-eguzo onwe ya? Ọ bụ ka ọ kparịa nnọọ ndị Izrel ka o ji apụta? Eze kwere nkwa inye onye ọbụla ga-etigbu ya akụ nʼebe ọ bara ụba. Ọ ga-akpọnyekwa ya nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya, meekwa ka ndị ezinaụlọ onye ahụ gharakwa ịtụ ụtụ taks ọzọ nʼIzrel!” 26 Devid jụrụ ndị ikom nọ ya nso, “Gịnị ka a ga-emere nwoke ga-etigbu onye Filistia a, meekwa ka mkparị a ghara ịdịrị Izrel ọzọ? Onye ka onye Filistia a a na-ebighị ugwu bụ, na ọ ga-apụta na-akparị ndị agha Chineke dị ndụ?” 27 Ha gwara ya otu ihe ahụ ha kwuru na mbụ sị ya na ọ bụ ihe ahụ ka a ga-emere onye gburu ya. 28 Mgbe Eliab, nwanne Devid nke okenye, nụrụ ka ya na ndị ikom ahụ na-ekwu okwu, o were iwe dị ọkụ megide ya, jụọ ya sị, “Gịnị ka ị bịara ime nʼebe a? Onye kwa ka ị hapụrụ atụrụ ole na ole ndị ahụ nʼọzara? Amaara m ụdị nganga dị nʼime gị na echiche ọjọọ juru gị obi. Ihe ị ji bịa nʼebe a bụ naanị ka ịhụchata ihe na-eme nʼagha.” 29 Ma Devid zara sị ya, “Oleekwanụ ihe m mere ugbu a? Adara m iwu nʼihi na m jụrụ ajụjụ?” 30 Devid chigharịkwara jekwuru onye ọzọ jụọkwa ya otu ajụjụ ahụ. Ọ natakwara otu ụdị ọsịsa ahụ. 31 Nʼikpeazụ, mgbe a matara ihe bụ uche Devid, e mere ka Sọl mara ihe banyere Devid. Sọl zikwara ozi ka a kpọọ ya. 32 Devid sịrị Sọl, “Ka obi onye ọbụla ghara ịda mba nʼihi onye Filistia a; ohu gị ga-aga lụso ya ọgụ.” 33 Ma Sọl zaghachiri, “Ị pụghị ibuso onye Filistia a agha, megide ya, nʼihi na i bụ naanị nwantakịrị, ma ya onwe ya bu onye na-ebu agha siterị na mgbe ọ bụ okorobịa.” 34 Ma Devid gwara Sọl sị, “Ohu gị bụ onye na-elekọta atụrụ nna ya. Mgbe ọdụm maọbụ anụ ọhịa bịa bịara buru atụrụ site nʼigwe atụrụ ahụ, 35 achụụrụ m ya, tigbuo ya ma napụtakwa atụrụ ahụ site nʼọnụ ya. Mgbe o biliri imegide m, ejidere m ya nʼajị ya, tie ya ihe, gbuo ya. 36 Etigburu m ọdụm na anụ ọhịa bịa ahụ, ugbu a, apụkwara m ime onye Filistia a na-amaghị Chineke otu ihe ahụ, nʼihi na ọ kparịala usuu ndị agha Chineke dị ndụ! 37 ONYENWE ANYỊ ahụ napụtara m site nʼaka ọdụm na anụ ọhịa bịa ga-anapụtakwa m site nʼaka onye Filistia a!”Nʼikpeazụ, Sọl sịrị Devid, “Gaa, ka ONYENWE ANYỊ nọnyere gị.” 38 Mgbe ahụ, Sọl yinyere Devid uwe ime ahụ nke ya, yikwasịkwa ya uwe agha igwe, ma kpukwasị ya okpu bronz nʼisi. 39 Devid fanyere mma agha nʼime uwe ahụ, malite ijegharị ije, nʼihi na ọ maghị otu e si eyi uwe ndị ahụ ejegharị.Ọ dịghị anya, o gwara Sọl okwu sị, “Agaghị m eyi uwe ndị a nʼihi na o doghị m ahụ.” Ya mere, Devid yipụrụ ha. 40 Emesịa, o were mkpanaka ya nʼaka ya, site nʼiyi họpụta nkume ise dị mụrụmụrụ tinye ha nʼakpa nta dị nʼime akpa onye ọzụzụ atụrụ ya. O jidere ebe ya nʼaka ya, malite ịpụkwuru onye Filistia ahụ. 41 Onye Filistia ahụ, na-abịa nso na-apụkwute Devid, onye ahụ na-ebu ọta ya na-agakwa nʼihu ya. 42 O lere Devid anya hụ na ọ bụ naanị nwantakịrị nwoke, onye ahụ dị mma, onye mara mma ile anya. Nʼihi ya, o ledara Devid anya. 43 Ọ sịrị Devid, “Abụ m nkịta, na i ji mkpanaka na-abịakwute m?” Onye Filistia ahụ ji aha chi niile ya bụọ Devid ọnụ. 44 Ọ sịrị, “Bịa nʼebe a ka m were anụ ahụ gị mere anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa niile ihe oriri!” 45 Ma Devid sịrị onye Filistia ahụ, “I ji mma agha na ùbe igwe na ùbe osisi, na-abịakwute m, ma eji m aha ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke usuu ndị agha Izrel ahụ ị kparịrị, na-abịakwute gị. 46 Taa ka ONYENWE ANYỊ ga-enyefe gị nʼaka m. Aga m etigbu gị, bepụkwa gị isi. Taa aga m ewere anụ ahụ ndị agha Filistia niile nyefee nʼaka ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe, na ụmụ anụ ọhịa niile nke ụwa. Ụwa niile ga-amatakwa na Chineke nọ nʼIzrel. 47 Ndị niile guzokwa nʼebe a ga-amata na ONYENWE ANYỊ adịghị eji mma agha maọbụ ùbe azọpụta. Nʼihi na agha a bụ nke ONYENWE ANYỊ, ọ ga-ewerekwa unu niile nyefee anyị nʼaka.” 48 Mgbe onye Filistia ahụ na-abịa nso ibuso ya agha, Devid jiri ọsọ gbara gaa nʼihu agha izute ya. 49 Ọ manyere aka nʼime akpa ya wepụta otu nkume, maa ya mata onye Filistia ahụ nʼegedege ihu. Nkume ahụ mikpuru nʼegedege ihu ya, ọ dakwara kpuo ihu nʼala. 50 Otu a ka Devid si jiri ebe na nkume merie onye Filistia ahụ. O gburu onye Filistia ahụ ma o jighị mma ọbụla nʼaka ya gbuo ya. 51 Devid gbaara ọsọ jeruo nʼebe Golaịat dara, mịịrị mma agha ya site nʼọbọ, jiri ya gbuo ya. O ji ya bepụkwa isi ya!Mgbe ndị Filistia hụrụ na onye ọka agha ha adaala nwụọ, ha tụgharịrị gbawa ọsọ. 52 Mgbe ahụ, ndị agha Izrel na Juda tiri mkpu ọṅụ, biliekwa, malite ịchụ ndị Filistia ọsọ. Ha chụrụ ha ọsọ chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama Gat, na nʼọnụ ụzọ ama Ekrọn. Ndị Filistia nwụrụ anwụ dara nnọọ aghara aghara nʼụzọ Shaaraim nke gawara Gat na Ekrọn. 53 Emesịa, ndị Izrel lọghachiri bịa kwakọrọ ihe niile dị nʼụlọ ikwu ndị Filistia, nke ha hapụrụ gbaa ọsọ. 54 Devid buuru isi onye Filistia bulata na Jerusalem. Ma dobe ngwa agha onye Filistia ahụ nʼime ụlọ ikwu nke ya. 55 Mgbe Sọl nọ na-ele Devid anya ka ọ na-apụ izute onye Filistia ahụ, ọ sịrị Abna, ọchịagha ya, “Abna, nwa onye ka nwokorobịa ahụ bụ?”Abna zara sị, “Dịka i si adị ndụ, eze, amaghị m.” 56 Eze zara sị, “Chọpụta onye mụrụ nwokorobịa a.” 57 Mgbe Devid si nʼigbu onye Filistia ahụ lọghachi, Abna duuru ya, dute ya nʼihu Sọl. Isi onye Filistia a dịkwa nʼaka Devid. 58 Sọl jụrụ ya sị, “Nwokorobịa, nwa onye ka ị bụ?”Devid zara sị, “Abụ m nwa ohu gị nwoke Jesi onye Betlehem.”

In Other Versions

1 Samuel 17 in the ANGEFD

1 Samuel 17 in the ANTPNG2D

1 Samuel 17 in the AS21

1 Samuel 17 in the BAGH

1 Samuel 17 in the BBPNG

1 Samuel 17 in the BBT1E

1 Samuel 17 in the BDS

1 Samuel 17 in the BEV

1 Samuel 17 in the BHAD

1 Samuel 17 in the BIB

1 Samuel 17 in the BLPT

1 Samuel 17 in the BNT

1 Samuel 17 in the BNTABOOT

1 Samuel 17 in the BNTLV

1 Samuel 17 in the BOATCB

1 Samuel 17 in the BOATCB2

1 Samuel 17 in the BOBCV

1 Samuel 17 in the BOCNT

1 Samuel 17 in the BOECS

1 Samuel 17 in the BOGWICC

1 Samuel 17 in the BOHCB

1 Samuel 17 in the BOHCV

1 Samuel 17 in the BOHLNT

1 Samuel 17 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 17 in the BOILNTAP

1 Samuel 17 in the BOITCV

1 Samuel 17 in the BOKCV

1 Samuel 17 in the BOKCV2

1 Samuel 17 in the BOKHWOG

1 Samuel 17 in the BOKSSV

1 Samuel 17 in the BOLCB

1 Samuel 17 in the BOLCB2

1 Samuel 17 in the BOMCV

1 Samuel 17 in the BONAV

1 Samuel 17 in the BONCB

1 Samuel 17 in the BONLT

1 Samuel 17 in the BONUT2

1 Samuel 17 in the BOPLNT

1 Samuel 17 in the BOSCB

1 Samuel 17 in the BOSNC

1 Samuel 17 in the BOTLNT

1 Samuel 17 in the BOVCB

1 Samuel 17 in the BOYCB

1 Samuel 17 in the BPBB

1 Samuel 17 in the BPH

1 Samuel 17 in the BSB

1 Samuel 17 in the CCB

1 Samuel 17 in the CUV

1 Samuel 17 in the CUVS

1 Samuel 17 in the DBT

1 Samuel 17 in the DGDNT

1 Samuel 17 in the DHNT

1 Samuel 17 in the DNT

1 Samuel 17 in the ELBE

1 Samuel 17 in the EMTV

1 Samuel 17 in the ESV

1 Samuel 17 in the FBV

1 Samuel 17 in the FEB

1 Samuel 17 in the GGMNT

1 Samuel 17 in the GNT

1 Samuel 17 in the HARY

1 Samuel 17 in the HNT

1 Samuel 17 in the IRVA

1 Samuel 17 in the IRVB

1 Samuel 17 in the IRVG

1 Samuel 17 in the IRVH

1 Samuel 17 in the IRVK

1 Samuel 17 in the IRVM

1 Samuel 17 in the IRVM2

1 Samuel 17 in the IRVO

1 Samuel 17 in the IRVP

1 Samuel 17 in the IRVT

1 Samuel 17 in the IRVT2

1 Samuel 17 in the IRVU

1 Samuel 17 in the ISVN

1 Samuel 17 in the JSNT

1 Samuel 17 in the KAPI

1 Samuel 17 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 17 in the KBV

1 Samuel 17 in the KJV

1 Samuel 17 in the KNFD

1 Samuel 17 in the LBA

1 Samuel 17 in the LBLA

1 Samuel 17 in the LNT

1 Samuel 17 in the LSV

1 Samuel 17 in the MAAL

1 Samuel 17 in the MBV

1 Samuel 17 in the MBV2

1 Samuel 17 in the MHNT

1 Samuel 17 in the MKNFD

1 Samuel 17 in the MNG

1 Samuel 17 in the MNT

1 Samuel 17 in the MNT2

1 Samuel 17 in the MRS1T

1 Samuel 17 in the NAA

1 Samuel 17 in the NASB

1 Samuel 17 in the NBLA

1 Samuel 17 in the NBS

1 Samuel 17 in the NBVTP

1 Samuel 17 in the NET2

1 Samuel 17 in the NIV11

1 Samuel 17 in the NNT

1 Samuel 17 in the NNT2

1 Samuel 17 in the NNT3

1 Samuel 17 in the PDDPT

1 Samuel 17 in the PFNT

1 Samuel 17 in the RMNT

1 Samuel 17 in the SBIAS

1 Samuel 17 in the SBIBS

1 Samuel 17 in the SBIBS2

1 Samuel 17 in the SBICS

1 Samuel 17 in the SBIDS

1 Samuel 17 in the SBIGS

1 Samuel 17 in the SBIHS

1 Samuel 17 in the SBIIS

1 Samuel 17 in the SBIIS2

1 Samuel 17 in the SBIIS3

1 Samuel 17 in the SBIKS

1 Samuel 17 in the SBIKS2

1 Samuel 17 in the SBIMS

1 Samuel 17 in the SBIOS

1 Samuel 17 in the SBIPS

1 Samuel 17 in the SBISS

1 Samuel 17 in the SBITS

1 Samuel 17 in the SBITS2

1 Samuel 17 in the SBITS3

1 Samuel 17 in the SBITS4

1 Samuel 17 in the SBIUS

1 Samuel 17 in the SBIVS

1 Samuel 17 in the SBT

1 Samuel 17 in the SBT1E

1 Samuel 17 in the SCHL

1 Samuel 17 in the SNT

1 Samuel 17 in the SUSU

1 Samuel 17 in the SUSU2

1 Samuel 17 in the SYNO

1 Samuel 17 in the TBIAOTANT

1 Samuel 17 in the TBT1E

1 Samuel 17 in the TBT1E2

1 Samuel 17 in the TFTIP

1 Samuel 17 in the TFTU

1 Samuel 17 in the TGNTATF3T

1 Samuel 17 in the THAI

1 Samuel 17 in the TNFD

1 Samuel 17 in the TNT

1 Samuel 17 in the TNTIK

1 Samuel 17 in the TNTIL

1 Samuel 17 in the TNTIN

1 Samuel 17 in the TNTIP

1 Samuel 17 in the TNTIZ

1 Samuel 17 in the TOMA

1 Samuel 17 in the TTENT

1 Samuel 17 in the UBG

1 Samuel 17 in the UGV

1 Samuel 17 in the UGV2

1 Samuel 17 in the UGV3

1 Samuel 17 in the VBL

1 Samuel 17 in the VDCC

1 Samuel 17 in the YALU

1 Samuel 17 in the YAPE

1 Samuel 17 in the YBVTP

1 Samuel 17 in the ZBP