1 Samuel 23 (BOICB)

1 Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile. 2 Devid jụrụ ONYENWE ANYỊ ase sị, “Ọ bụ m jee buso ndị Filistia a agha?” ONYENWE ANYỊ zara ya, “Gaa, buso ndị Filistia agha, zọpụta Keila.” 3 Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?” 4 Devid jụrụ ONYENWE ANYỊ ọzọ, ma ONYENWE ANYỊ zara ya nke ugboro abụọ sị, “Jee, rịdaruo Keila, nʼihi na aga m anọnyere gị; ị ga-emerikwa ndị Filistia.” 5 Ya mere, Devid na ndị agha ya gara Keila buso ndị Filistia agha. Ndị agha Devid gburu ọtụtụ ndị Filistia kpokọrọ igwe anụ ụlọ ha. Ha zọpụtakwara ndị Keila. 6 (Ugbu a, Abịata nwa Ahimelek chịkwa efọọd nʼaka gbadaa, mgbe ọ gbakwujere Devid na Keila). 7 Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.” 8 Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya. 9 Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.” 10 Devid sịrị, “O! ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, anụla m na Sọl na-achọ ịbịa laa Keila na obodo a nʼiyi nʼihi m nọ nʼebe a. 11 Ndị nwe Keila ha ga-arara m nye nʼaka Sọl? Ọ bụ ezie na Sọl na-abịa dịka m nụrụ? O! ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, biko gwa ohu gị.”Ma ONYENWE ANYỊ sịrị, “Ọ ga-abịa.” 12 Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?” ONYENWE ANYỊ sịrị, “Ha ga-eme otu a.” 13 Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ. 14 Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya. 15 Mgbe Devid nọ na Horesh, nke dị nʼọzara Zif, ọ natara ozi na Sọl na-abịa igbu ya. 16 Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke. 17 Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.” 18 Ha abụọ gbara ndụ nʼihu ONYENWE ANYỊ. Devid nọgidere na Horesh, ma Jonatan laghachiri nʼụlọ ya. 19 Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn? 20 Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.” 21 Sọl zara ha sị, “ONYENWE ANYỊ gọzie unu nʼihi mmetụta ọnọdụ m na-emetụta unu nʼobi. 22 Gaanụ chọpụta nke ọma ebe ọ na-ezo onwe ya, na onye hụrụ ya, nʼihi na agwara m na ọ bụ onye aghụghọ. 23 Chọpụtanụ ebe ọ na-ezo onwe ya ma lọghachikwanụ bịa gwa m ihe unu chọpụtara. Mgbe ahụ, aga m eso unu jee. Ọ bụrụ na ọ nọ nʼala ahụ, aga m achọpụta ya; e, aga m enyobanye anya chọọ ya nʼikwu niile nke Juda.” 24 Ha biliri buru Sọl ụzọ gawa Zif. Nʼoge a, Devid na ndị agha ya nọ nʼọzara Maon, nʼime Araba, na ndịda Jeshimọn. 25 Sọl na ndị agha ya bịarutere ebe ahụ malite chọwa Devid. Mgbe a gwara Devid na Sọl na-achọ ya, o duuru ndị agha ya gbada gaa nʼoke nkume ahụ ma nọgide nʼọzara Maon. Mgbe Sọl nụrụ nke a, ọ chụgidekwara Devid ọsọ gaa nʼebe ahụ. 26 Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, Sọl na ndị agha ya nọ nʼotu akụkụ ugwu ahụ, Devid na ndị agha ya nọkwa nʼakụkụ nke ọzọ, na-eme ngwa ka ha gbanarị Sọl. Ma Sọl na ndị agha ya na-abịa nnọọ nso ijide Devid. 27 Ma nʼotu mgbe ahụ, onyeozi bịakwutere Sọl sị ya, “Mee ngwangwa, lọta, nʼihi na ndị Filistia apụtala ibuso Izrel agha.” 28 Ngwangwa, Sọl sitere nʼịchụ Devid chigharịa azụ, lọta ibuso ndị Filistia agha. Site nʼoge ahụ, a kpọrọ ebe ahụ Devid nọ, Sela Hamahlekot, nke pụtara, Nkume Nkewa. 29 Devid si nʼebe ahụ pụọ gaa biri nʼebe e wusiri ike nke En-Gedi, ebe o zoro onwe ya.

In Other Versions

1 Samuel 23 in the ANGEFD

1 Samuel 23 in the ANTPNG2D

1 Samuel 23 in the AS21

1 Samuel 23 in the BAGH

1 Samuel 23 in the BBPNG

1 Samuel 23 in the BBT1E

1 Samuel 23 in the BDS

1 Samuel 23 in the BEV

1 Samuel 23 in the BHAD

1 Samuel 23 in the BIB

1 Samuel 23 in the BLPT

1 Samuel 23 in the BNT

1 Samuel 23 in the BNTABOOT

1 Samuel 23 in the BNTLV

1 Samuel 23 in the BOATCB

1 Samuel 23 in the BOATCB2

1 Samuel 23 in the BOBCV

1 Samuel 23 in the BOCNT

1 Samuel 23 in the BOECS

1 Samuel 23 in the BOGWICC

1 Samuel 23 in the BOHCB

1 Samuel 23 in the BOHCV

1 Samuel 23 in the BOHLNT

1 Samuel 23 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 23 in the BOILNTAP

1 Samuel 23 in the BOITCV

1 Samuel 23 in the BOKCV

1 Samuel 23 in the BOKCV2

1 Samuel 23 in the BOKHWOG

1 Samuel 23 in the BOKSSV

1 Samuel 23 in the BOLCB

1 Samuel 23 in the BOLCB2

1 Samuel 23 in the BOMCV

1 Samuel 23 in the BONAV

1 Samuel 23 in the BONCB

1 Samuel 23 in the BONLT

1 Samuel 23 in the BONUT2

1 Samuel 23 in the BOPLNT

1 Samuel 23 in the BOSCB

1 Samuel 23 in the BOSNC

1 Samuel 23 in the BOTLNT

1 Samuel 23 in the BOVCB

1 Samuel 23 in the BOYCB

1 Samuel 23 in the BPBB

1 Samuel 23 in the BPH

1 Samuel 23 in the BSB

1 Samuel 23 in the CCB

1 Samuel 23 in the CUV

1 Samuel 23 in the CUVS

1 Samuel 23 in the DBT

1 Samuel 23 in the DGDNT

1 Samuel 23 in the DHNT

1 Samuel 23 in the DNT

1 Samuel 23 in the ELBE

1 Samuel 23 in the EMTV

1 Samuel 23 in the ESV

1 Samuel 23 in the FBV

1 Samuel 23 in the FEB

1 Samuel 23 in the GGMNT

1 Samuel 23 in the GNT

1 Samuel 23 in the HARY

1 Samuel 23 in the HNT

1 Samuel 23 in the IRVA

1 Samuel 23 in the IRVB

1 Samuel 23 in the IRVG

1 Samuel 23 in the IRVH

1 Samuel 23 in the IRVK

1 Samuel 23 in the IRVM

1 Samuel 23 in the IRVM2

1 Samuel 23 in the IRVO

1 Samuel 23 in the IRVP

1 Samuel 23 in the IRVT

1 Samuel 23 in the IRVT2

1 Samuel 23 in the IRVU

1 Samuel 23 in the ISVN

1 Samuel 23 in the JSNT

1 Samuel 23 in the KAPI

1 Samuel 23 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 23 in the KBV

1 Samuel 23 in the KJV

1 Samuel 23 in the KNFD

1 Samuel 23 in the LBA

1 Samuel 23 in the LBLA

1 Samuel 23 in the LNT

1 Samuel 23 in the LSV

1 Samuel 23 in the MAAL

1 Samuel 23 in the MBV

1 Samuel 23 in the MBV2

1 Samuel 23 in the MHNT

1 Samuel 23 in the MKNFD

1 Samuel 23 in the MNG

1 Samuel 23 in the MNT

1 Samuel 23 in the MNT2

1 Samuel 23 in the MRS1T

1 Samuel 23 in the NAA

1 Samuel 23 in the NASB

1 Samuel 23 in the NBLA

1 Samuel 23 in the NBS

1 Samuel 23 in the NBVTP

1 Samuel 23 in the NET2

1 Samuel 23 in the NIV11

1 Samuel 23 in the NNT

1 Samuel 23 in the NNT2

1 Samuel 23 in the NNT3

1 Samuel 23 in the PDDPT

1 Samuel 23 in the PFNT

1 Samuel 23 in the RMNT

1 Samuel 23 in the SBIAS

1 Samuel 23 in the SBIBS

1 Samuel 23 in the SBIBS2

1 Samuel 23 in the SBICS

1 Samuel 23 in the SBIDS

1 Samuel 23 in the SBIGS

1 Samuel 23 in the SBIHS

1 Samuel 23 in the SBIIS

1 Samuel 23 in the SBIIS2

1 Samuel 23 in the SBIIS3

1 Samuel 23 in the SBIKS

1 Samuel 23 in the SBIKS2

1 Samuel 23 in the SBIMS

1 Samuel 23 in the SBIOS

1 Samuel 23 in the SBIPS

1 Samuel 23 in the SBISS

1 Samuel 23 in the SBITS

1 Samuel 23 in the SBITS2

1 Samuel 23 in the SBITS3

1 Samuel 23 in the SBITS4

1 Samuel 23 in the SBIUS

1 Samuel 23 in the SBIVS

1 Samuel 23 in the SBT

1 Samuel 23 in the SBT1E

1 Samuel 23 in the SCHL

1 Samuel 23 in the SNT

1 Samuel 23 in the SUSU

1 Samuel 23 in the SUSU2

1 Samuel 23 in the SYNO

1 Samuel 23 in the TBIAOTANT

1 Samuel 23 in the TBT1E

1 Samuel 23 in the TBT1E2

1 Samuel 23 in the TFTIP

1 Samuel 23 in the TFTU

1 Samuel 23 in the TGNTATF3T

1 Samuel 23 in the THAI

1 Samuel 23 in the TNFD

1 Samuel 23 in the TNT

1 Samuel 23 in the TNTIK

1 Samuel 23 in the TNTIL

1 Samuel 23 in the TNTIN

1 Samuel 23 in the TNTIP

1 Samuel 23 in the TNTIZ

1 Samuel 23 in the TOMA

1 Samuel 23 in the TTENT

1 Samuel 23 in the UBG

1 Samuel 23 in the UGV

1 Samuel 23 in the UGV2

1 Samuel 23 in the UGV3

1 Samuel 23 in the VBL

1 Samuel 23 in the VDCC

1 Samuel 23 in the YALU

1 Samuel 23 in the YAPE

1 Samuel 23 in the YBVTP

1 Samuel 23 in the ZBP